< دوم سموئیل 4 >

وقتی ایشبوشت پادشاه شنید که ابنیر در حبرون کشته شده است، هراسان گشت و تمام قومش نیز مضطرب شدند. 1
Mgbe Ishboshet nwa Sọl nụrụ na Abna anwụọla na Hebrọn. Ọ tụrụ egwu. Ndị Izrel tụkwara egwu hie nne.
ایشبوشت دو فرمانده سپاه داشت به نامهای بعنه و ریکاب. آنها پسران رمون بئیروتی از قبیلهٔ بنیامین بودند. (با اینکه اهالی بئیروت به جتایم فرار کرده و در آنجا ساکن شده بودند، ولی باز جزو قبیلهٔ بنیامین محسوب می‌شدند.) 2
Nʼoge a, nwa Sọl nwere mmadụ abụọ ndị bụ ndịisi ndị na-aga apụnara ndị mmadụ ihe. Aha otu onye bụ Baana, aha onye nke ọzọ bụ Rekab. Ha abụọ bụ ụmụ Rimọn onye Beerọt, nke dị nʼebo Benjamin. A na-agụ ndị Beerọt dịka ndị Benjamin,
3
nʼihi na ndị Beerọt gbara ọsọ agha gbalaa Gitaim, obodo ndị Benjamin. Ha bikwa nʼebe ahụ ruo taa dịka ndị ọbịa.
(در ضمن، شائول نوهٔ لنگی داشت به نام مفیبوشت که پسر یوناتان بود. هنگامی که شائول و یوناتان در جنگ یزرعیل کشته شدند، مفیبوشت پنج ساله بود. وقتی خبر مرگ شائول و یوناتان به پایتخت رسید، دایهٔ مفیبوشت، او را برداشت و فرار کرد. ولی هنگام فرار به زمین خورد و بچه از دستش افتاد و پایش لنگ شد.) 4
(Jonatan nwa Sọl nwere otu nwa nwoke dara ngwụrọ nʼụkwụ ya abụọ. Ọ gbara afọ ise mgbe akụkọ banyere Sọl na Jonatan si Jezril bịarute ha. Nwanyị na-eku ya kuuru ya bido ịgbapụ ọsọ, ma dịka ọ na-agba ọsọ, nwantakịrị nwoke ahụ dara nʼala ghọọ onye ngwụrọ. Aha ya bụ Mefiboshet.)
یک روز ظهر، موقعی که ایشبوشت پادشاه خوابیده بود، ریکاب و بعنه وارد خانهٔ او شدند. 5
Nʼoge a, Rekab na Baana ụmụ Rimọn, onye Beerọt bịaruru nʼụlọ Ishboshet nʼoge ehihie, mgbe ọ nọ na-ezu ike.
آنها به بهانهٔ گرفتن یک کیسه گندم به کاخ او آمدند و مخفیانه به اتاق پادشاه رفتند. سپس او را کشته، سرش را از تنش جدا کردند و آن را با خود برداشته، از راه بیابان گریختند. آنها تمام شب در راه بودند 6
Ha banyere nʼime ime ụlọ, dịka a ga-asị na ha na-aga iburu ọka wiiti. Mgbe ha banyere nʼebe ahụ, ha mara Ishboshet mma nʼafọ. Emesịa, Rekab na nwanne ya Baana si nʼụlọ ahụ zopu onwe ha.
7
Ha abatala nʼụlọ mgbe Ishboshet dinara nʼelu ihe ndina ya, nʼime ụlọ ndina ya. Mgbe ha machara ya mma, gbuo ya, ha bipụrụ ya isi. Buru isi ya gbalaga. Jee ije abalị ahụ niile gafee ọzara.
تا به حبرون رسیدند. ریکاب و بعنه سر بریده شدهٔ ایشبوشت را به داوود تقدیم کرده، گفتند: «این سر ایشبوشت، پسر دشمنت شائول است که می‌خواست تو را بکشد. امروز خداوند انتقام تو را از شائول و تمام خاندان او گرفته است!» 8
Ha buuru isi Ishboshet butere Devid na Hebrọn, sị eze, “Taa ka Onyenwe anyị bọọrọ onyenwe m eze ọbọ megide Sọl na mkpụrụ ya. Nke a bụ isi Ishboshet, nwa onye iro gị Sọl, onye chọsịrị ike iwepụ ndụ gị.”
اما داوود جواب داد: «به خداوند زنده که مرا از دست دشمنانم نجات داد، قسم 9
Ma Devid zara Rekab na Baana ụmụ Rimọn onye Beerọt okwu sị ha, “Dịka Onyenwe anyị si adị ndụ, onye napụtara m site na nsogbu m niile,
که من آن شخصی را که خبر کشته شدن شائول را به صقلغ آورد و گمان می‌کرد که مژده می‌آورد، کشتم. آن مژدگانی‌ای بود که به او دادم. 10
mgbe otu onye bịakwutere m gwa m na Sọl anwụọla, na-eche nʼobi ya na o wetaara m oziọma. Egburu m ya na Ziklag, si otu ahụ kwụọ ya ụgwọ oziọma ahụ o chere na ọ wetaara m.
حال، آیا سزای مردان شروری که شخص بی‌گناهی را در خانهٔ خود و در رختخوابش به قتل رسانده‌اند، کمتر از این باید باشد؟ بدانید که شما را نیز خواهم کشت.» 11
Ọ bụladị karịa nke a, mgbe ndị ikom ajọ omume gburu nwoke onye aka ya dị ọcha nʼụlọ ya, nʼelu ihe ndina ya? M ga-ahapụ ịbọtara onye e gburu egbu ọbọ, si otu a kpochapụ unu nʼụwa!”
بعد داوود به افرادش دستور داد که هر دو را بکشند. پس آنها را کشتند و دستها و پاهایشان را بریده، بدنهایشان را در کنار برکهٔ حبرون به دار آویختند؛ اما سر ایشبوشت را گرفته، در قبر ابنیر در حبرون دفن کردند. 12
Devid nyere ụmụ okorobịa ya iwu ka ha gbuo mmadụ abụọ ahụ. Ha gbukwara ha. Emesịa, ha bipụrụ aka ha na ụkwụ ha. Were ozu ha kwụba ya nʼakụkụ ọdọ mmiri Hebrọn. Ha wekwaara isi Ishboshet, lie ya nʼili Abna na Hebrọn.

< دوم سموئیل 4 >