< اول تواریخ 7 >

پسران یساکار: تولاع، فوه، یاشوب، شمرون. 1
Isaka mụrụ ụmụ anọ: Tola, na Pua, na Jashub, na Shịmrọn.
پسران تولاع که هر یک از آنها رئیس یک طایفه بود: عزی، رفایا، یری‌ئیل، یحمای، یبسام و سموئیل. در زمان داوود پادشاه، تعداد کل مردان جنگی این طایفه‌ها ۲۲٬۶۰۰ نفر بود. 2
Ụmụ Tola ndị ghọrọ ndịisi ezi bụ ndị a: Uzi, na Refaya, na Jeriel, na Jamai, na Ibsam, na Samuel. Nʼoge Devid bụ eze, ọnụọgụgụ ndị agha sitere nʼetiti ha dị iri puku abụọ na abụọ, na narị isii.
یزرحیا پسر عزی بود. یزرحیا و چهار پسرش به نامهای میکائیل، عوبدیا، یوئیل و یشیا، هر یک رئیس طایفه‌ای بودند. 3
Uzi mụrụ Izrahaya. Izrahaya amụta ndị a: Maikel, Ọbadaya, Juel na Ishaya. Ha niile bụkwa ndịisi ikwu ha.
آنها زنان و پسران زیادی داشتند به طوری که توانستند ۳۶٬۰۰۰ مرد برای خدمت سربازی بفرستند. 4
Ndị bụ ndị agha nʼetiti ụmụ ụmụ ha nʼoge Devid bụ eze ruru iri puku atọ na isii, nʼihi na ha niile lụrụ ọtụtụ ndị inyom, mụọ ọtụtụ ụmụ.
تعداد کل مردانی که از قبیلهٔ یساکار برای خدمت سربازی آمادگی داشتند ۸۷٬۰۰۰ جنگجوی زبده بود که نام تمام آنها در نسب نامه نوشته شد. 5
Ụmụnne ha bụ ndị na-alụ agha bụ ndị agbụrụ Isaka dị iri puku asatọ na asaa nʼọnụọgụgụ, dịka e depụtara aha ha nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ.
پسران بنیامین اینها بودند: بالع، باکر و یدی‌ئیل. 6
Benjamin mụrụ ndị ikom atọ: Bela, Beka na Jediael,
پسران بالع: اصبون، عزی، عزی‌ئیل، یریموت، عیری. این پنج نفر رئیس طایفه بودند. تعداد سربازان این طوایف به ۲۲٬۰۳۴ نفر می‌رسید که نام آنها در نسب نامه نوشته شد. 7
Bela mụrụ ụmụ ise: Ezbon, Uzi, Uziel, Jerimot na Iri. Ha niile bụ ndịisi ezi. Ọnụọgụgụ ndị agha ha dị iri puku abụọ na abụọ na iri atọ na anọ. E dekwara aha ndị a niile nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ.
پسران باکر: زمیره، یوعاش، الیعازار، الیوعینای، عمری، یریموت، ابیا، عناتوت و علمت. 8
Ụmụ ndị ikom Beka mụrụ bụ Zemira, Joash, Elieza, Elioenai, Omri, Jeremot, Abija, Anatot na Alemet.
تعداد سربازان این طایفه به ۲۰٬۲۰۰ نفر می‌رسید که نام آنها همراه نام رؤسای طوایف در نسب نامه ثبت شد. 9
Akwụkwọ ebe e dere usoro ọmụmụ ha depụtara aha ndịisi ezinaụlọ, na iri puku ndị agha abụọ na narị abụọ.
بلهان پسر یدیع‌ئیل بود. پسران بلهان اینها بودند: یعیش، بنیامین، ایهود، کنعنه، زیتان، ترشیش و اخیشاحر. 10
Jediael mụrụ otu nwa nwoke: aha ya bụ Bilhan. Ụmụ Bilhan bụ Jeush, Benjamin, Ehud, Kenaana, Zetan, Tashish na Ahishaha.
اینها رؤسای طوایف یدیع‌ئیل بودند که ۱۷٬۲۰۰ مرد جنگی داشتند. 11
Ụmụ ndị ikom Jediael ndị a bụ ndịisi ezinaụlọ. E nwere nʼetiti ha ndị agha ọnụọgụgụ ha dị puku iri na asaa na narị abụọ, ndị nọ na njikere ibu agha.
شوفی‌ها و حوفی‌ها از نسل عیر بودند و حوشی‌ها از نسل احیر. 12
Ndị Shupim na ndị Hupim bụ ụmụ ụmụ Er ebe ndị Hushim bụ ụmụ ụmụ Aha.
پسران نفتالی: یحصی‌ئیل، جونی، یصر و شلوم. (اینها نوه‌های بلهه، کنیز یعقوب بودند.) 13
Ụmụ Naftalị mụtara bụ Jaziel, Guni, Jeza na Shalum bụ ụmụ Bilha.
پسران منسی که از کنیز او که ارامی بود، به دنیا آمدند، اسرئیل و ماخیر (پدر جلعاد) بودند. 14
Ụmụ Manase: Asriel, onye iko ya nwanyị bụ onye Aram mụtara, na Makia. Makia bụ nna Gilead.
ماخیر از میان شوفی‌ها و حوفی‌ها برای خود زن گرفت. او خواهری به نام معکه داشت. صلفحاد یکی دیگر از فرزندان منسی بود که فقط چند دختر داشت. 15
Makia sitere nʼetiti ndị Hupim na Shupim lụọ nwunye. Aha nwanne ya nwanyị bụ Maaka. Otu onye ọzọ si nʼagbụrụ Manase bụ Zelofehad, onye mụtara naanị ụmụ ndị inyom.
زن ماخیر که او هم معکه نام داشت پسری زایید و نام او را فارش گذاشتند. اسم برادرش شارش بود و پسرانش اولام و راقم نام داشتند. 16
Maaka nwunye Makia mụtara otu nwa nwoke ọ gụrụ Peresh. Aha nwanne ya bụ Sheresh, onye mụtara Ụlam na Rakem.
بدان پسر اولام بود. اینها پسران جلعاد، نوه‌های ماخیر و نبیره‌های منسی بودند. 17
Nwa nwoke Ụlam mụtara bụ Bedan. Ndị a bụ ụmụ Gilead, nwa nwa Makia, nwa Manase.
همولکه (خواهر جلعاد) سه پسر به دنیا آورد به نامهای: ایشهود، ابیعزر و محله. 18
Hamoleket, nwanne nwanyị Makia mụrụ Ishod, Abieza na Mahla.
اخیان، شکیم، لقحی، انیعام پسران شمیداع بودند. 19
Shemida mụrụ ụmụ ikom ndị a: Ahian, Shekem, Liiki na Aniam.
نسل افرایم به ترتیب عبارت بودند از: شوتالح، بارد، تحت، العادا، تحت، زاباد، شوتالح، عازر و العاد. العاد و عازر قصد داشتند گله‌های جتی‌ها را که در آن سرزمین ساکن بودند غارت کنند، ولی به دست روستایی‌های آنجا کشته شدند. 20
Ụmụ Ifrem bụ Shutela, Bered, Tahat, Eleada, Tahat
21
na Zabad nwa ya, na Shutela nwa ya. Eza na Elead bụ ndị gara ịchịkọrọ anụ ụlọ ndị Gat, ndị ikom nwe obodo ahụ jidere ha gbuo ha nʼebe ahụ.
پدرشان افرایم مدت زیادی برای آنها ماتم گرفت و اقوامش به دلداری او آمدند. 22
Ifrem nna ha ruru ụjụ nke ukwuu nʼihi ọnwụ ha, ma ụmụnna ya kasịrị ya obi.
پس از آن، زن افرایم حامله شده پسری زایید و به یاد آن مصیبت نام او را بریعه (یعنی «فاجعه») گذاشتند. 23
Mgbe nwunye ya mụrụ nwa nwoke ọzọ, ọ kpọrọ aha ya Beriya, nke pụtara, Ihe ndaba ọjọọ, nʼihi ọnwụ Elead na Eza.
نام دختر افرایم، شیره بود. شیره، بیت‌حورون پایین و بالا و اوزین شیره را بنا کرد. 24
Aha nwa Ifrem nke nwanyị bụ Sheera. Sheera bụ onye wuru akụkụ ugwu na ndịda Bet-Horon, wuokwa Uzen-Sheera.
افرایم پسر دیگری داشت به نام رافح که نسل او عبارت بودند از: راشف، تالح، تاحن، 25
Ndị a bụkwa ụmụ Ifrem: Refa, nna Reshef, onye bụ nna Tela. Tela bụ nna Tahan,
لعدان، عمیهود، الیشمع، 26
onye bụ nna Ladan, Ladan bụ nna Amihud, onye bụ nna Elishama.
نون و یوشع. 27
Elishama bụ nna Nun, onye bụ nna Joshua.
ناحیه‌ای که آنها در آن زندگی می‌کردند شامل بیت‌ئیل و روستاهای اطرافش بود که از طرف شرق تا نعران و از سمت غرب تا جازر و روستاهای حوالی آن امتداد می‌یافت. شهرهای دیگر این ناحیه شکیم و ایه با دهکده‌های اطراف آنها بودند. 28
Betel na obodo ndị ọzọ gbara ya gburugburu, ya bụ Naaran, nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, na Gaza na obodo nta ya, ndị dị nʼọdịda anyanwụ, na Shekem, na obodo ndị ọzọ, tutu ruo Aya, na obodo nta ya niile, so nʼala ha.
قبیلهٔ منسی که از نسل یوسف پسر یعقوب بودند، شهرهای زیر و نواحی اطراف آنها را در اختیار داشتند: بیت‌شان، تعناک، مجدو و دُر. 29
Ụmụ Manase, nwa Josef, nwa nwa Izrel, bikwa nʼobodo ndị a dị nʼoke ala ha: Bet-Shan, na Teanak, na Megido, na Doa, tinyere obodo nta ha niile.
پسران اشیر عبارت بودند از: یمنه، یشوه، یشوی و بریعه. اشیر دختری به نام سارح نیز داشت. 30
Asha mụrụ ndị a: Imna, Ishva, Ishvi na Beriya. Nwa ya nwanyị bụ Sera.
پسران بریعه عبارت بودند از: حابر و ملکی‌ئیل (پدر برزاوت). 31
Beriya amụta ndị a: Heba na Malkiel, onye bụ nna Biazait.
پسران حابر عبارت بودند از: یفلیط، شومیر و حوتام. حابر دختری به نام شوعا نیز داشت. 32
Heba bụ onye mụrụ Jaflet, Shoma na Hotam. Nwanne ha nwanyị bụ Shua.
پسران یفلیط عبارت بودند از: فاسک، بمهال و عشوت. 33
Ụmụ Jaflet mụrụ bụ Pasak, Bimhal na Ashvat. Ndị a bụ ụmụ Jaflet.
پسران شومیر برادر یفلیط اینها بودند: روهجه، یحبه و ارام. 34
Shoma amụọ Ahi, Roga, Huba na Aram.
پسران برادر او هیلام عبارت بودند از: صوفح، یمناع، شالش و عامال. 35
Nwanne ya nwoke Helem mụrụ Zofa, Imana, Shelesh na Amal.
پسران صوفح عبارت بودند از: سوح، حرنفر، شوعال، بیری، یمره، 36
Zofa amụta ndị a: Sua, Hanefa, Shual, Beri, Imra,
باصر، هود، شما، شلشه، یتران و بئیرا. 37
Beza, Hod, Shama, Shilsha, Itran na Beera.
پسران یتر عبارت بودند از: یفنه، فسفا و آرا. 38
Jeta mụtara Jefune, Pispa na Ara.
پسران علا عبارت بودند از: آرح، حنی‌ئیل و رصیا. 39
Ụla amụta Ara, Haniel na Rizia.
همهٔ فرزندان اشیر که سران طایفه‌ها بودند، جنگاورانی کارآزموده و رهبرانی برجسته محسوب می‌شدند. تعداد مردان جنگی این طایفه که در نسب نامه ثبت گردید ۲۶٬۰۰۰ نفر بود. 40
Ụmụ ụmụ Asha ndị a niile bụ ndịisi ezi, ndị a sara anya na mmiri họpụta, ndị bụ dimkpa nʼagha, ndị ndu a ma ama. Ọnụọgụgụ ndị ha tozuru ije agha dị puku iri abụọ na isii, ndị e depụtara aha ha nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ.

< اول تواریخ 7 >