< اول تواریخ 28 >

داوود تمام مقامات مملکتی را به اورشلیم احضار کرد: رؤسای قبایل و طوایف، فرماندهان دوازده سپاه، مسئولان اموال و املاک و گله‌های پادشاه، مقامات دربار و جنگاوران شجاع. 1
Devid kpọkọtara ndịisi ozi niile nke Izrel, ka ha zukọọ na Jerusalem, bụ ndị ndu ebo Izrel niile, na ndị ọchịagha nke otu ndị agha nọ nʼọrụ eze. Ndị ọzọ bụ ndịisi agha na-achị ọtụtụ puku ndị agha, na ndịisi agha na-achị ọtụtụ narị ndị agha, na ndịisi ozi na-elekọta ihe niile na anụ ụlọ niile nke eze na ụmụ ya ndị ikom nwere, tinyere ndị ozi niile nọ nʼụlọeze, na ndị bụ dimkpa na ndị niile bụ dike nʼagha.
آنگاه داوود بر پا ایستاده، چنین گفت: «ای برادران من و ای قوم من! آرزو داشتم خانه‌ای بسازم تا صندوق عهد خداوند در آن قرار گیرد، و خدای ما در آن منزل کند. من هر چه برای این بنا لازم بود، جمع‌آوری کردم 2
Eze Devid biliri kwụrụ ọtọ sị, “Geenụ m ntị, unu ụmụnna m, na ndị m. Ọ bụrịị ihe dị m nʼobi iwu ụlọ nke ga-abụ ebe izuike nye igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, nke ga-abụ ebe mgbakwasị ụkwụ nye Chineke anyị. Edokọtachaala m ihe e ji ewu ya,
ولی خدا به من فرمود: تو خانه‌ای برای من نخواهی ساخت، زیرا مردی جنگاور هستی و خون ریخته‌ای. 3
ma Chineke sịrị m, ‘Ọ bụghị gị ga-ewu ụlọ nye Aha m, nʼihi na ị bụ onye na-ebu agha, onye wufuru ọbara site nʼigbu ọtụtụ mmadụ nʼagha.’
«با وجود این، خداوند، خدای اسرائیل از میان تمام اعضای خانوادهٔ پدرم مرا انتخاب کرده است تا سر سلسله‌ای باشم که همیشه بر اسرائیل سلطنت خواهد نمود. خدا قبیلهٔ یهودا را برگزید و از قبیلهٔ یهودا، خانوادهٔ پدرم را و از میان پسران پدرم، مرا انتخاب کرد و بر تمام اسرائیل پادشاه ساخت. 4
“Ma otu ọ dị, Onyenwe anyị, Chineke Izrel esitela nʼetiti ikwu m họpụta m, mee m eze Izrel ruo ebighị ebi. Ọ họọrọ ebo Juda dịka onyendu. Ọ bụkwa site nʼebo Juda ka o si họrọ ụlọ nna m, sitekwa nʼetiti ụmụnne m ndị ikom họrọ m. Mee m eze Izrel.
حال از میان پسران زیادی که خداوند به من بخشیده است، سلیمان را انتخاب کرده است تا به جای من بر تخت بنشیند و بر قوم خداوند سلطنت کند. 5
Onyenwe anyị enyela m ọtụtụ ụmụ ndị ikom, ma site nʼime ha ọ họpụtara Solomọn nwa m ka ọ nọkwasị nʼocheeze nke alaeze Onyenwe anyị dịka eze Izrel.
خداوند به من فرموده است: خانهٔ مرا پسر تو سلیمان بنا می‌کند، چون او را انتخاب کرده‌ام تا پسر من باشد و من پدر او. 6
Ọ gwara m, ‘Solomọn nwa gị, bụ onye ga-ewuru m ụlọ m, na ogige m niile, nʼihi na ahọpụtala m ya ị bụrụ m nwa, aga m abụkwara ya nna.
اگر بعد از این نیز دستورها و قوانین مرا اطاعت کند، همان‌طور که تا به حال کرده است، سلطنت او را تا به ابد پایدار می‌سازم. 7
Ọ bụrụkwa na o debe ihe niile m nyere nʼiwu, mezuo ha dịka o si eme nʼoge a. Aga m eme ka alaeze ya dịgide ruo ebighị ebi.’
«پس الان در حضور خدای ما و در حضور جماعت او اسرائیل به همهٔ شما دستور می‌دهم که احکام خداوند، خدای خود را به دقت اجرا کنید تا این سرزمین حاصلخیز را از دست ندهید، بلکه آن را برای فرزندان خود به ارث بگذارید تا برای همیشه ملک آنها باشد. 8
“Ya mere, ugbu a ana m enye unu iwu nʼihu ndị Izrel niile, na nʼihu ọgbakọ ndị nke Onyenwe anyị, na nʼihu Chineke anyị. Kpachapụnụ anya chọpụta ma debekwa iwu niile nke Onyenwe anyị Chineke unu, ka unu nwee ike nweta ezi ala nke a; ma nyefeekwa ya dịka ihe nketa nʼaka ụmụ ụmụ unu ruo ebighị ebi.
«حال ای پسر من سلیمان، بکوش تا خدای اجداد خود را بشناسی و با تمام دل و جان او را بپرستی و خدمت کنی. خداوند تمام دلها را می‌بیند و هر فکری را می‌داند. اگر در جستجوی خدا باشی، او را خواهی یافت؛ ولی اگر از او برگردی تو را تا به ابد طرد خواهد کرد. 9
“Ma gị, Solomọn nwa m, mara Chineke nke nna gị, jiri obi zuruoke, na mmụọ nwere njikere mgbe niile fee Onyenwe anyị ofufe, nʼihi na Onyenwe anyị na-enyocha obi mmadụ niile. Ọ na-aghọtakwa ihe niile anyị bu nʼobi na echiche niile. Ọ bụrụ na ị chọsie ụzọ ya ike, ị ga-achọta ya, ma ọ bụrụ na ị jụ ya, ọ ga-ajụ gị ruo ebighị ebi.
خداوند تو را برگزیده است تا عبادتگاه مقدّسش را بنا کنی. پس مواظب باش و با دلگرمی به این کار مشغول شو.» 10
Kpachapụ anya, nʼihi na Onyenwe anyị ahọrọla gị iwuru ya ụlọnsọ ya. Dị ike, rụọkwa ọrụ a e tinyere gị nʼaka.”
آنگاه داوود نقشهٔ ساختمان خانهٔ خدا و طرح فضای اطراف آن را به سلیمان داد: انبارها، بالاخانه‌ها، اتاقهای داخلی و قدس‌الاقداس برای تخت رحمت. 11
Mgbe ahụ, Devid nyere Solomọn nwa ya ihe e sere gbasara otu ọ ga-esi wuo ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị ahụ, na nke ụlọ ndị ọzọ niile ga-adị nʼime ya, na nʼakụkụ ya; ụlọakụ ya niile, na ime ụlọ elu ya, na ime ụlọ ya, na ụlọ ebe ikpuchi mmehie.
او همچنین نقشهٔ حیاط و اتاقهای دور تا دور آن، انبارهای خانهٔ خدا، و خزانه‌ها برای نگهداری هدایای وقف شده را به سلیمان داد. تمام این نقشه‌ها از طرف روح خدا به داوود الهام شده بود. 12
O nyekwara ya ihe osise gosiri ihe niile nke Mmụọ Nsọ tinyere ya nʼuche banyere ogige ụlọnsọ ukwuu Onyenwe anyị ahụ, na ọnụụlọ niile dị ya gburugburu, maka ụlọ nchịkọta akụ nke ụlọnsọ Chineke nakwa akụ niile nke e doro nsọ.
پادشاه دستورهای دیگری هم در مورد کار گروه‌های مختلف کاهنان و لاویان و نیز ساختن وسایل خانهٔ خدا به سلیمان داد. 13
Devid nyekwara Solomọn iwu otu ọ ga-esi kewaa ndị nchụaja na ndị Livayị, na iwu metụtara ọrụ ije ozi niile nke ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, na iwu metụtara ngwongwo niile e ji eje ozi.
داوود مقدار طلا و نقرهٔ لازم برای ساختن هر یک از وسایل خانهٔ خدا را وزن کرد و کنار گذاشت: 14
Ọ wepụtara ọlaedo dị ukwuu maka iji ya kpụọ ngwongwo ọlaedo a ga-eji jee ozi dị iche iche. Ọ wepụtakwara ọlaọcha dị ukwu maka iji ya kpụọ ngwongwo ọlaọcha a ga-eji jee ozi dị iche iche.
طلا و نقره برای ساختن چراغدانها و چراغها؛ 15
Ọ wepụtara ọlaedo nke e ji akpụ iheọkụ na ihe ịdọba iheọkụ. Wepụtakwa ọlaọcha ga-ezu ịkpụ oriọna ọlaọcha, na ihe ịdọba ha.
طلا برای ساختن میزهای نان حضور و نقره برای میزهای نقره‌ای؛ 16
Ọ wepụtara ọlaedo e ji akpụ tebul achịcha nsọ, na ọlaedo e ji akpụ tebul ndị ọzọ, na ọlaọcha e ji akpụ tebul ọlaọcha.
طلای خالص برای ساختن چنگکها، کاسه‌ها و پیاله‌ها، و طلا و نقره برای ساختن جامها؛ 17
Ọ wepụtara ọlaedo a nụchara anụcha a ga-eji kpụọ ndụdụ e ji adụrụ anụ e ji chụọ aja, efere ịkwọsa mmiri na ite mmiri; ọlaedo zuru nke e ji akpụta efere ọlaedo ọbụla, na ọlaọcha zuru nke e ji akpụta efere ọlaọcha ọbụla, wepụtakwa ọlaọcha na ọlaedo.
طلای خالص برای مذبح بخور و برای ارابۀ خداوند یعنی مجسمهٔ دو کروبی که بالهایشان روی صندوق عهد خداوند گسترده بود. 18
Nʼikpeazụ, o wepụtara ọlaedo a nụchara anụcha a ga-eji kpụọ ebe ịchụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ. O nyere ya ihe osise gosiri otu a ga-esi wuo ụgbọ agha, ya bụ, mmụọ ozi cherubim ndị ahụ e ji ọlaedo kpụọ, ndị gbasapụrụ nku ha nʼelu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị.
داوود به سلیمان گفت: «جزئیات این نقشه از طرف خداوند به من داده شد و من همهٔ آنها را نوشتم. 19
Devid kwuru sị, “E deela ihe niile gbasara osise ụlọnsọ ukwu a nʼakwụkwọ nke m sitere na ntụziaka Onyenwe anyị nweta. Onyenwe anyị nyekwara m nghọta banyere ihe niile metụtara osise ụlọnsọ ukwu a.”
حال قوی و دلیر باش و کار را شروع کن. ترس و واهمه را از خود دور کن زیرا خداوند، خدای من با توست و تو را تنها نمی‌گذارد تا بتوانی کار ساختن خانهٔ خداوند را تمام کنی. 20
Devid gwakwara nwa ya Solomọn okwu sị, “Dị ike, nwee obi ike, rụọ ọrụ a. Atụla ụjọ, adakwala mba, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke, bụ Chineke m, nọnyeere gị. Ọ gaghị ahapụ gị, maọbụ gbakụta gị azụ. Ọ ga-ahụ na ihe niile gaara gị nke ọma, tutu ruo mgbe ọrụ iwu ụlọnsọ Onyenwe anyị gwụsịrị.
گروه‌های کاهنان و لاویان آماده هستند در خانهٔ خدا خدمت کنند و صنعتگران ماهر مشتاقند تو را در هر کاری یاری دهند. تمام بنی‌اسرائیل و رهبرانشان تحت فرمان تو می‌باشند.» 21
Ndị nchụaja ndị a niile, na ndị Livayị jikeere ịrụ ọrụ niile metụtara ụlọnsọ ukwu Chineke ahụ. Ndị ọzọ bụ ndị ọka ọrụ dị iche iche ndị o metụrụ nʼobi ga-abịakwa inyere gị aka, ma ndị ozi, ma ndị Izrel niile; ha ga-emezu iwu ọbụla i nyere ha.”

< اول تواریخ 28 >