< مکاشفهٔ یوحنا 17 >
و یکی از آن هفت فرشتهای که هفت پیاله را داشتند، آمد و به من خطاب کرده، گفت: «بیا تا قضای آن فاحشه بزرگ را که برآبهای بسیار نشسته است به تو نشان دهم، | ۱ 1 |
Otu nʼime ndị mmụọ ozi asaa ndị ahụ ji efere bịara sị m, “Bịa, aga m egosi gị ahụhụ ga-abịakwasị onye ahụ ụwa niile maara dịka akwụna, onye ahụ na-anọkwasị nʼelu ọtụtụ mmiri nke ụwa.
که پادشاهان جهان با او زنا کردند و ساکنان زمین، ازخمر زنای او مست شدند.» | ۲ 2 |
Ndị eze ụwa esorola ya kwaa iko nʼotu ihe ndina, emeekwara ka ndị niile bi nʼụwa bụrụ ndị mmanya ịkwa iko ya na-egbu.”
پس مرا در روح به بیابان برد و زنی را دیدم بر وحش قرمزی سوارشده که از نامهای کفر پر بود و هفت سر و ده شاخ داشت. | ۳ 3 |
O duuru m nʼime mmụọ baa nʼọzara. Nʼebe ahụ ka m nọ hụ otu nwanyị nọkwasịrị nʼelu otu anụ ọhịa na-acha ọbara ọbara. Anụ ọhịa ahụ nwere isi asaa na mpi iri. Aha ndị e dere anụ ọhịa ahụ nʼahụ bụ naanị okwu ikwulu Chineke.
و آن زن، به ارغوانی و قرمز ملبس بود وبه طلا و جواهر و مروارید مزین و پیالهای زرین بهدست خود پر از خبائث و نجاسات زنای خودداشت. | ۴ 4 |
Nwanyị ahụ yi akwa na-acha odo odo na nke na-achakwa ọbara ọbara, gbarakwa ihe ịchọ mma e ji ọlaedo, nkume dị oke ọnụahịa na pieal kpụọ. O jikwa iko ọlaedo nʼaka ya nke jupụtara nʼihe arụ na ihe ure niile o ji na-akwa iko ya.
و بر پیشانیاش این اسم مرقوم بود: «سرو بابل عظیم و مادر فواحش و خبائث دنیا.» | ۵ 5 |
Aha e dekwasịrị ya nʼegedege ihu bụ ihe omimi: Obodo ukwu ahụ bụ Babilọn, nne ndị na-akwa iko na nke ihe arụ niile nke ụwa.
وآن زن را دیدم، مست از خون مقدسین و از خون شهدای عیسی و از دیدن او بینهایت تعجب نمودم. | ۶ 6 |
Ejikwa m anya m hụ na nwanyị ahụ aṅụjuola ọbara ndị nsọ afọ, ya na ọbara ndị ama Jisọs. Mgbe m hụrụ ya, ọ gbagwojuru m anya.
و فرشته مرا گفت: «چرا متعجب شدی؟ من سر زن و آن وحش را که هفت سر و ده شاخ دارد که حامل اوست، به تو بیان مینمایم. | ۷ 7 |
Ma mmụọ ozi ahụ sịrị m, “Gịnị mere ihe ị hụrụ ji ju gị anya? Aga m akọwara gị ihe omimi banyere nwanyị a na anụ ọhịa ahụ nke na-ebugharị ya, bụ nke nwere isi asaa na mpi iri.
آن وحش که دیدی، بود و نیست و از هاویه خواهدبرآمد و به هلاکت خواهد رفت؛ و ساکنان زمین، جز آنانی که نامهای ایشان از بنای عالم در دفترحیات مرقوم است، در حیرت خواهند افتاد ازدیدن آن وحش که بود و نیست و ظاهر خواهدشد. (Abyssos ) | ۸ 8 |
Anụ ọhịa ahụ ị hụrụ, nwere mgbe ọ dịịrị, ma ugbu a, ọ dịkwaghị. Ma ọ ga-esi nʼolulu Abis ahụ pụta banye na mbibi. Ma nlọghachi ya ga-eju ndị ahụ a na-edeghị aha ha nʼime akwụkwọ ndụ ahụ site nʼoge e kere ụwa anya. Nʼihi na e nwere mgbe ọ dịịrị, ma ugbu a, ọ dịkwaghị, ma ọ ga-emesi bịa. (Abyssos )
«اینجاست ذهنی که حکمت دارد. این هفت سر، هفت کوه میباشد که زن بر آنها نشسته است؛ | ۹ 9 |
“Nke a chọrọ uche nke nwere amamihe. Isi asaa ahụ nọchiri anya ugwu asaa ahụ nke nwanyị ahụ na-anọdụ nʼelu ha. Ha na-anọchikwa anya ndị eze asaa.
و هفت پادشاه هستند که پنج افتادهاند و یکی هست و دیگری هنوز نیامده است و چون آیدمی باید اندکی بماند. | ۱۰ 10 |
Ise nʼime ha adaala, otu ka nọ, nke ọzọ abịabeghị. Mgbe ọ bịara, ọ ga-anọ nwantakịrị oge.
و آن وحش که بود ونیست، هشتمین است و از آن هفت است و به هلاکت میرود. | ۱۱ 11 |
Anụ ọhịa ahụ nke dịrịị ma ọ dịkwaghị, bụ onye nke asatọ, ọ bụ onye otu ndị eze asaa ahụ ma a lakwara ya nʼiyi.
و آن ده شاخ که دیدی، ده پادشاه هستند که هنوز سلطنت نیافتهاند بلکه یک ساعت با وحش چون پادشاهان قدرت مییابند. | ۱۲ 12 |
“Mpi iri ahụ ị hụrụ nọchiri anya ndị eze iri na-anatabeghị alaeze. Ha na anụ ọhịa ahụ ga-anata ike ọchịchị dịka eze sọọsọ otu awa.
اینها یک رای دارند و قوت و قدرت خود را به وحش میدهند. | ۱۳ 13 |
Ha ji otu obi na-enye anụ ọhịa ahụ ike ha na ịchị isi ha.
ایشان با بره جنگ خواهندنمود و بره بر ایشان غالب خواهد آمد، زیرا که اوربالارباب و پادشاه پادشاهان است و آنانی نیز که با وی هستند که خوانده شده و برگزیده وامینند.» | ۱۴ 14 |
Ha ga-ebu agha megide Nwa Atụrụ ahụ, ma Nwa Atụrụ ahụ ga-emeri ha nʼihi na ọ bụ Onyenwe kachasị ndị nwenụ niile nakwa Eze kachasị ndị eze niile. Ndị so ya bụkwa ndị a kpọrọ, na ndị a họpụtara, ndị ya kwesikwara ntụkwasị obi.”
و مرا میگوید: «آبهایی که دیدی، آنجایی که فاحشه نشسته است، قومها و جماعتها وامتها و زبانها میباشد. | ۱۵ 15 |
Mgbe ahụ ọ sịrị m, “Mmiri ndị ahụ ị hụrụ, ebe nwanyị akwụna ahụ nọ, bụ ndị mmadụ dị iche iche, igwe mmadụ, na mba dị iche iche na nʼasụsụ dị iche iche.
و اما ده شاخ که دیدی و وحش، اینها فاحشه را دشمن خواهند داشت واو را بینوا و عریان خواهند نمود و گوشتش راخواهند خورد و او را به آتش خواهند سوزانید، | ۱۶ 16 |
Anụ ọhịa ahụ na mpi iri ahụ ị hụrụ ga-akpọ nwanyị akwụna ahụ asị. Ha ga-agba ya ọtọ, laakwa ya nʼiyi, ha ga-eri anụ ya, werekwa ọkụ rechapụ ya.
زیرا خدا در دل ایشان نهاده است که اراده او رابهجا آرند و یک رای شده، سلطنت خود را به وحش بدهند تا کلام خدا تمام شود. | ۱۷ 17 |
Chineke etinyela ya nʼobi ha imejupụta nzube ya site nʼinwe otu obi nakwa inyefe anụ ọhịa ahụ ikike ọchịchị alaeze ha, tutu ruo mgbe a ga-emezu okwu Chineke.
و زنی که دیدی، آن شهر عظیم است که بر پادشاهان جهان سلطنت میکند.» | ۱۸ 18 |
Ma nwanyị a ị hụrụ bụ obodo ukwu ahụ na-achị ndị eze niile nke ụwa.”