< ایّوب 25 >

پس بلدد شوحی در جواب گفت: ۱ 1
Mgbe ahụ, Bildad onye Shua zara sị:
«سلطنت و هیبت از آن اوست وسلامتی را در مکان های بلند خود ایجاد می‌کند. ۲ 2
“Ike ọchịchị na oke egwu bụ nke Chineke; Ọ bụ ya na-eme ka udo dịrị nʼeluigwe.
آیا افواج او شمرده می‌شود و کیست که نور اوبر وی طلوع نمی کند؟ ۳ 3
Onye pụrụ ịgụta usuu ndị agha ya ọnụ? Onye kwa ka ìhè ya na-adịghị enwukwasị?
پس انسان چگونه نزد خدا عادل شمرده شود؟ و کسی‌که از زن زاییده شود، چگونه پاک باشد؟ ۴ 4
Mmadụ ọ ga-esi aṅaa bụrụ onye ezi omume nʼihu Chineke? Mmadụ nwanyị mụrụ ọ ga-esi aṅaa dị ọcha?
اینک ماه نیز روشنایی ندارد و ستارگان در نظر او پاک نیستند. ۵ 5
Lee, ọ bụladị ọnwa adịghị achawapụta, ọzọ kpakpando adịghị ọcha nʼanya ya,
پس چندمرتبه زیاده انسان که مثل خزنده زمین و بنی آدم که مثل کرم می‌باشد.» ۶ 6
ka ọfọdụzie nwa mmadụ efu mụrụ, nke bụ naanị ikpuru, mmadụ, nke bụ naanị idide.”

< ایّوب 25 >