< عبرانیان 7 >

زیرا این ملکیصدق، پادشاه سالیم و کاهن خدای تعالی، هنگامی که ابراهیم ازشکست دادن ملوک، مراجعت می‌کرد، او رااستقبال کرده، بدو برکت داد. ۱ 1
Melkizedek a bụ eze Salem, bụrụkwa onye nchụaja Chineke Onye kachasị ihe niile elu. Ọ zutere Ebraham mgbe o si na mmeri o meriri ọtụtụ ndị eze ahụ na-alọghachi, gọziekwa ya.
و ابراهیم نیز ازهمه‌چیزها ده‌یک بدو داد؛ که او اول ترجمه شده «پادشاه عدالت» است و بعد ملک سالیم نیز یعنی «پادشاه سلامتی». ۲ 2
Ebraham nyekwara ya otu ụzọ nʼime ụzọ iri nke ihe niile. Ihe mbụ aha ya pụtara bụ, “eze ezi omume,” ọzọkwa bụ “eze nke Salem,” nke pụtara, “eze udo.”
بی‌پدر و بی‌مادر وبی نسب نامه و بدون ابتدای ایام و انتهای حیات بلکه به شبیه پسر خدا شده، کاهن دایمی می‌ماند. ۳ 3
O nweghị nna, o nwekwaghị nne, nke ọ na-enwe agbụrụ. O nweghị mmalite nke ụbọchị a mụrụ ya, maọbụ ọgwụgwụ ndụ, e mere ya dị ka Ọkpara Chineke. Ọ na-anọgide bụrụ onye nchụaja ruo mgbe ebighị ebi.
پس ملاحظه کنید که این شخص چقدربزرگ بود که ابراهیم پاتریارخ نیز از بهترین غنایم، ده‌یک بدو داد. ۴ 4
Leenụ otu o siri bụrụ onye dị ukwuu, ọ bụladị Ebraham bụ nna nna anyị nyere ya otu ụzọ nʼime ụzọ iri site nʼihe ọ kwatara nʼagha!
و اما از اولاد لاوی کسانی که کهانت را می‌یابند، حکم دارند که از قوم بحسب شریعت ده‌یک بگیرند، یعنی از برادران خود، باآنکه ایشان نیز از صلب ابراهیم پدید آمدند. ۵ 5
Ma otu ọ dị, iwu kwadoro ka ụmụ Livayị bụ ndị ghọrọ ndị nchụaja na-anakọta otu ụzọ nʼime ụzọ iri site nʼaka ndị ọzọ, ya bụ, site nʼaka ndị ụmụnna ha ndị Izrel, nʼagbanyeghị na ụmụnna ha ndị ahụ bụkwa ụmụ ụmụ Ebraham.
لکن آن کس که نسبتی بدیشان نداشت، ازابراهیم ده‌یک گرفته و صاحب وعده‌ها را برکت داده است. ۶ 6
Ma nwoke a bụ onye na-esiteghị nʼagbụrụ naara otu ụzọ nʼụzọ iri site nʼaka Ebraham ma gọziekwa ya bụ onye ahụ nke natara nkwa ahụ.
و بدون هر شبهه، کوچک از بزرگ برکت داده می‌شود. ۷ 7
O nweghị ịrụrịta ụka ọbụla dị ya, na onye dị ukwuu na-agọzi onye dị nta.
و در اینجا مردمان مردنی ده‌یک می‌گیرند، اما در آنجا کسی‌که بر زنده بودن وی شهادت داده می‌شود. ۸ 8
Nʼotu aka ahụ, ndị na-anata otu ụzọ nʼụzọ iri bụ mmadụ na-anwụ anwụ, ma nʼaka nke ọzọ, onye na-anata ya bụ onye ahụ e kwupụtara na ọ na-adị ndụ.
حتی آنکه گویا می توان گفت که بوساطت ابراهیم از همان لاوی که ده‌یک می‌گیرد، ده‌یک گرفته شد، ۹ 9
Mmadụ pụrụ isi na Livayị onye natara otu ụzọ nʼụzọ iri kwụrụ otu ụzọ nʼụzọ iri nke ya site nʼaka Ebraham.
زیرا که هنوز در صلب پدر خود بود هنگامی که ملکیصدق او را استقبال کرد. ۱۰ 10
Nʼihi na mgbe Melkizedek zutere ya, ọ ka nọ nʼafọ nna nna ya.
و دیگر اگر از کهانت لاوی، کمال حاصل می‌شد (زیرا قوم شریعت را بر آن یافتند)، باز چه احتیاج می‌بود که کاهنی دیگر بر رتبه ملکیصدق مبعوث شود و مذکور شود که بر رتبه هارون نیست؟ ۱۱ 11
Ọ bụrụ na a pụrụ ime ka mmadụ zuo oke site nʼọnọdụ ndị nchụaja ndị Livayị, nʼihi na ọ bụ site nʼiwu e nyere ndị mmadụ ka e ji hiwee ọnọdụ ndị nchụaja. Olee uru ọ bara ka onye nchụaja ọzọ bịa, dị ka usoro Melkizedek si dị, na-abụghị dị ka usoro nke Erọn?
زیرا هر گاه کهانت تغییر می‌پذیرد، البته شریعت نیز تبدیل می‌یابد. ۱۲ 12
Ebe a gbanwere ọnọdụ ndị nchụaja, nʼotu aka ahụ, a ghaghị ịgbanwekwa iwu.
زیرا او که این سخنان در حق وی گفته می‌شود، از سبط دیگرظاهر شده است که احدی از آن، خدمت قربانگاه را نکرده است. ۱۳ 13
Nʼihi na onye ahụ e kwuru ihe ndị a banyere ya sitere nʼagbụrụ ọzọ, nke ọ dịbeghị onye ọbụla sitere na ya rụrụ ọrụ dị nʼebe ịchụ aja.
زیرا واضح است که خداوند مااز سبط یهودا طلوع فرمود که موسی در حق آن سبط از جهت کهانت هیچ نگفت. ۱۴ 14
Ọ bụ ihe a mara nke ọma na Onyenwe anyị si nʼagbụrụ Juda pụta, Mosis nʼonwe ya akpọtụghị agbụrụ ahụ aha mgbe ọ na-ekwu banyere ndị nchụaja.
و نیز بیشتر مبین است از اینکه به مثال ملکیصدق کاهنی بطور دیگر باید ظهور نماید ۱۵ 15
E meela ka a ghọta okwu anyị na-ekwu nke ọma, mgbe onye nchụaja ọzọ yiri Melkizedek pụtara.
که به شریعت و احکام جسمی مبعوث نشودبلکه به قوت حیات غیرفانی. ۱۶ 16
Onye ghọrọ onye nchụaja ma ọ bụghị site nʼusoro iwu nke ọmụmụ ndị nchụaja, kama site nʼike dị na ndụ nke na-apụghị ịla nʼiyi.
زیرا شهادت داده شد که «تو تا به ابد کاهن هستی بر رتبه ملکیصدق.» (aiōn g165) ۱۷ 17
Nʼihi na-agbara akaebe banyere ya, sị, “Gị onwe gị, bụ onye nchụaja ruo mgbe ebighị ebi, dị ka usoro Melkizedek si dị.” (aiōn g165)
زیرا که حاصل می‌شود هم نسخ حکم سابق بعلت ضعف و عدم فایده آن ۱۸ 18
Nʼotu aka ahụ, e wezugala usoro iwu ochie ahụ nʼihi adịghị ike ya na nʼihi abaghị uru ya
(از آن جهت که شریعت هیچ‌چیز را کامل نمی گرداند)، و هم برآوردن امید نیکوتر که به آن تقرب به خدامی جوییم. ۱۹ 19
(nʼihi na iwu ahụ emeghị ka ihe ọbụla zuo oke), ma nʼaka nke ọzọ, e webatala olileanya ka mma, bụ nke anyị na-esite na ya bịaruo Chineke nso.
و بقدر آنکه این بدون قسم نمی باشد. ۲۰ 20
Ma e ji ịṅụ iyi mee ka ọnọdụ onyeisi nchụaja a guzosie ike. O nweghị iyi a ṅụrụ mgbe ndị ọzọ ghọrọ ndị nchụaja.
زیرا ایشان بی‌قسم کاهن شده‌اند ولیکن این با قسم از او که به وی می‌گوید: «خداوند قسم خورد و تغییر اراده نخواهد داد که تو کاهن ابدی هستی بر رتبه ملکیصدق.» (aiōn g165) ۲۱ 21
Ma onye nke a ghọrọ onye nchụaja site nʼịṅụ iyi mgbe onye ahụ gwara ya, “Onyenwe anyị aṅụọla iyi, ọ gaghị agbanwe obi ya, ‘Ị bụ onye nchụaja ruo mgbe ebighị ebi.’” (aiōn g165)
به همین قدرنیکوتر است آن عهدی که عیسی ضامن آن گردید. ۲۲ 22
Nʼihi nke a, Jisọs aghọọla onye na-akwagide ọgbụgba ndụ ka mma.
و ایشان کاهنان بسیار می‌شوند، ازجهت آنکه موت از باقی بودن ایشان مانع است. ۲۳ 23
Ihe ọzọ, ndị nchụaja nke ochie ahụ dị ọtụtụ nʼọnụọgụgụ nʼihi na ọnwụ gbochiri ha ịga nʼihu nʼọrụ ha.
لکن وی چون تا به ابد باقی است، کهانت بی‌زوال دارد. (aiōn g165) ۲۴ 24
Ya mere, ebe ọ na-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi, ọ na-abụkwa onyeisi nchụaja mgbe niile. (aiōn g165)
از این جهت نیز قادر است که آنانی را که بوسیله وی نزد خدا آیند، نجات بی‌نهایت بخشد، چونکه دائم زنده است تاشفاعت ایشان را بکند. ۲۵ 25
Ya mere o nwere ike ịzọpụta ruo mgbe niile ndị ahụ na-abịakwute Chineke site na ya, nʼihi na ọ na-adị ndụ ruo mgbe niile ịrịọ arịrịọ nʼihi ha.
زیرا که ما را چنین رئیس کهنه شایسته است، قدوس و بی‌آزار و بی‌عیب و از گناهکاران جدا شده و از آسمانها بلندتر گردیده ۲۶ 26
Ya mere, ọ dị mkpa na anyị ga-enwe onyeisi nchụaja dị otu a, bụ onye dị nsọ, na onye na-enweghị ntụpọ, na onye dị ọcha, na onye e kewapụrụ site nʼebe ndị mmehie nọ, ma buliekwa ya elu karịa nʼeluigwe.
که هرروز محتاج نباشد به مثال آن روسای کهنه که اول برای گناهان خود و بعد برای قوم قربانی بگذراند، چونکه این را یک بار فقط به‌جا آورد هنگامی که خود را به قربانی گذرانید. ۲۷ 27
Ọ dịghị ka ndịisi nchụaja ndị ọzọ, nʼihi na ọ dịghị mkpa na ọ ga-achụ aja kwa ụbọchị, nʼihi mmehie nke aka ya, na nʼihi mmehie nke ndị ọzọ. Naanị otu aja nke dịrị mgbe niile ka ọ chụrụ maka mmehie mgbe o weere onwe ya nye dị ka aja.
از آنرو که شریعت مردمانی را که کمزوری دارند کاهن می‌سازد، لکن کلام قسم که بعد از شریعت است، پسر را که تاابدالاباد کامل شده است. (aiōn g165) ۲۸ 28
Nʼihi na iwu na-ahọpụta dị ka ndịisi nchụaja ndị mmadụ na-adịghị ike. Ma okwu nke ịṅụ iyi ahụ, nke na-eso iwu nʼazụ, họpụtara Ọkpara, onye e mere ka o zuo oke ruo mgbe ebighị ebi. (aiōn g165)

< عبرانیان 7 >