< دوم پطرس 3 >

این رساله دوم را‌ای حبیبان الان به شمامی نویسم که به این هردو، دل پاک شما را به طریق یادگاری برمی انگیزانم، ۱ 1
Ndị enyi m, nke a bụ akwụkwọ nke abụọ m na-edetara unu. Nʼime ha abụọ, ihe m mere bụ ichetara unu ihe ndị ahụ niile unu maara na itute uche unu banyere echiche zuruoke.
تا بخاطر آریدکلماتی که انبیای مقدس، پیش گفته‌اند و حکم خداوند و نجات‌دهنده را که به رسولان شما داده شد. ۲ 2
Achọrọ m ka unu cheta okwu ndị amụma dị nsọ kwuru mgbe ochie na iwu nke Onyenwe anyị na Onye nzọpụta anyị nyere site na ndị ozi ya.
و نخست این را می‌دانید که در ایام آخرمستهزئین با استهزا ظاهر خواهند شد که بر وفق شهوات خود رفتار نموده، ۳ 3
Na mbụ, unu ga-amata nke a, na nʼoge ikpeazụ, ndị na-akwa emo ga-apụta, site nʼịkwa emo gbaso agụ ihe ọjọọ niile nke anụ ahụ ha chọrọ
خواهند گفت: «کجاست وعده آمدن او؟ زیرا از زمانی که پدران به خواب رفتند، هرچیز به همینطوری که ازابتدای آفرینش بود، باقی است.» ۴ 4
na-asị, “O kwere unu nkwa na ọ ga-abịa, gịnị mere na ọ bịabeghị? Kemgbe nna nna anyị ha nwụrụ, ihe niile ka dị otu ha dị na mbụ, site nʼokike ụwa.”
زیرا که ایشان عمد از این غافل هستند که به کلام خدا آسمانهااز قدیم بود و زمین از آب و به آب قائم گردید. ۵ 5
Ha kpachaara anya chefuo na site nʼogologo oge gara aga, e sitere nʼokwu ọnụ Chineke kee eluigwe ma meekwa ka ụwa dịrị site na mmiri nke gbara ụwa gburugburu.
وبه این هردو، عالمی که آن وقت بود در آب غرق شده، هلاک گشت. ۶ 6
Ọ bụkwa site na mmiri ndị a ka e ji bibie ma laa nʼiyi ụwa nke dị nʼoge ahụ.
لکن آسمان و زمین الان به همان کلام برای آتش ذخیره شده و تا روز داوری و هلاکت، مردم بی‌دین نگاه داشته شده‌اند. ۷ 7
Ọ bụkwa otu okwu ahụ ka e ji nye iwu ka e chebe eluigwe na ụwa tutu ruo ụbọchị ahụ, mgbe a ga-eji ọkụ laa ha nʼiyi nʼụbọchị ahụ a ga-ekpe ndị niile na-amaghị Chineke ikpe, laakwa ha nʼiyi.
لکن‌ای حبیبان، این یک چیز از شما مخفی نماند که یک روز نزد خدا چون هزار سال است وهزار سال چون یک روز. ۸ 8
Ndị enyi m, unu echefula otu okwu a, nʼanya Chineke, otu ụbọchị dịka puku afọ, puku afọ dịkwa ka otu ụbọchị.
خداوند در وعده خودتاخیر نمی نماید چنانکه بعضی تاخیرمی پندارند، بلکه بر شما تحمل می‌نماید چون نمی خواهد که کسی هلاک گردد بلکه همه به توبه گرایند. ۹ 9
Onyenwe anyị anaghị anọ ọdụ nʼimezu nkwa ya, dịka ndị ụfọdụ nʼahụta ya na ọ bụ ịnọ ọdụ. Kama o nwere ntachiobi nʼebe unu nọ, nʼihi na ọ chọghị ka onye ọbụla laa nʼiyi, kama ọ chọrọ ka onye ọbụla bịaruo na nchegharị.
لکن روز خداوند چون دزد خواهدآمد که در آن آسمانها به صدای عظیم زایل خواهند شد و عناصر سوخته شده، از هم خواهدپاشید و زمین و کارهایی که در آن است سوخته خواهد شد. ۱۰ 10
Ma ụbọchị Onyenwe anyị ga-abịa dịka onye ohi. Nʼụbọchị ahụ, eluigwe ga-eji oke ụzụ gafee. Ihe niile dị nʼeluigwe ga-agba ọkụ, laa nʼiyi. Ụwa na ọrụ niile a rụrụ nʼime ya ga-erepịakwa ọkụ nʼotu ntabi anya.
پس چون جمیع اینها متفرق خواهندگردید، شما چطور مردمان باید باشید، در هرسیرت مقدس و دینداری؟ ۱۱ 11
Ebe ọ bụ na ihe niile gbara anyị gburugburu ga-esi otu a laa nʼiyi, ụdị ndị dị aṅaa ka unu kwesiri ịbụ? Unu kwesiri ị na-ebi ndụ dị nsọ na nke ịsọpụrụ Chineke,
و آمدن روز خدارا انتظار بکشید و آن را بشتابانید که در آن آسمانها سوخته شده، از هم متفرق خواهند شد وعناصر از حرارت گداخته خواهد گردید. ۱۲ 12
dịka unu na-ele anya ọbịbịa ụbọchị nke Chineke, na-echesikwa ya ike ka ọ bịa ngwangwa. Nʼihi na ọ bụ ụbọchị a ga-amụnye eluigwe niile ọkụ, mee ka ihe niile dị na ya gbaze bụrụ ihe na-agaghị adịkwa.
ولی بحسب وعده او، منتظر آسمانهای جدید و زمین جدید هستیم که در آنها عدالت ساکن خواهد بود. ۱۳ 13
Ma anyị na-ele anya mmezu nkwa ahụ o kwere, nkwa inye anyị eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ ebe ezi omume naanị ga-adị.
لهذا‌ای حبیبان، چون انتظار این چیزها رامی کشید، جد و جهد نمایید تا نزد او بی‌داغ و بی عیب در سلامتی یافت شوید. ۱۴ 14
Bikonu ndị m hụrụ nʼanya, mgbe unu nọ na-ele anya ihe ndị a, jisienụ ike hụ na aka unu dị ọcha, ndị na-enweghị ịta ụta na ndị ha na ya dị nʼudo.
و تحمل خداوند ما را نجات بدانید، چنانکه برادر حبیب ماپولس نیز برحسب حکمتی که به وی داده شد، به شما نوشت. ۱۵ 15
Chetakwanụ na ntachiobi Onyenwe anyị pụtara nzọpụta, dịka ezi nwanna anyị Pọl jiri amamihe Chineke nyere ya deere unu ihe banyere ya.
و همچنین در سایر رساله های خود این چیزها را بیان می‌نماید که در آنها بعضی چیزهاست که فهمیدن آنها مشکل است و مردمان بی‌علم و ناپایدار آنها را مثل سایر کتب تحریف می کنند تا به هلاکت خود برسند. ۱۶ 16
O na-ede otu ihe ahụ nʼakwụkwọ ozi ya niile, na-ekwu ihe banyere ihe ndị a nʼime ha. E nwere ụfọdụ ihe o kwuru nke siri ike ịghọta nke ndị nzuzu na ndị na-amaghị ihe na-akọwa dịka ha si chepụta nʼobi ha. Ha asụgharịala ihe o dere dịka ha na-emekwa mpaghara akwụkwọ nsọ ụfọdụ, si otu a wetara onwe ha ịla nʼiyi.
پس شما‌ای حبیبان، چون این امور را ازپیش می‌دانید، باحذر باشید که مبادا به گمراهی بی‌دینان ربوده شده، از پایداری خود بیفتید. ۱۷ 17
Ya mere, ezi ndị enyi m, ebe unu matara nke a, nọrọnụ na nche ka a ghara isite na njehie ndị na-emebi iwu duhie unu, ime ka unu si nʼọnọdụ unu daa.
بلکه در فیض و معرفت خداوند و نجات‌دهنده ما عیسی مسیح ترقی کنید، که او را از کنون تاابدالاباد جلال باد. آمین. (aiōn g165) ۱۸ 18
Bụrụnụ ndị na-eto eto nʼime amara. Bụrụkwanụ ndị na-aga nʼihu ịmụta ihe banyere Onyenwe anyị na Onye nzọpụta anyị Jisọs Kraịst nke ọma. Ka otuto dịrị ya ugbu a na mgbe niile ebighị ebi. Amen. (aiōn g165)

< دوم پطرس 3 >

The World is Destroyed by Water
The World is Destroyed by Water