< دوم پادشاهان 7 >
و الیشع گفت: «کلام خداوند را بشنوید. خداوند چنین میگوید که «فردا مثل این وقت یک کیل آرد نرم به یک مثقال و دو کیل جوبه یک مثقال نزد دروازه سامره فروخته میشود.» | ۱ 1 |
Ịlaisha zara sị ya, “Nụrụ okwu Onyenwe anyị. Nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu, Nʼoge dịka mgbe a echi, a ga-ere otu akpa nta ụtụ ọka otu shekel, rekwaa akpa nta ọka balị abụọ otu shekel nʼọnụ ụzọ ama obodo Sameria.”
و سرداری که پادشاه بر دست وی تکیه مینموددر جواب مرد خدا گفت: «اینک اگر خداوندپنجرهها هم در آسمان بسازد، آیا این چیز واقع تواند شد؟» او گفت: «همانا تو به چشم خودخواهی دید اما از آن نخواهی خورد.» | ۲ 2 |
Ọchịagha ahụ, nke eze na-adabere nʼaka ya, sịrị onye nke Chineke, “Lee, a sịkwarị na Onyenwe anyị emeghee oghere idee nke eluigwe, nke a ọ pụrụ ime?” Ma Ịlaisha zara ya, “Ị ga-eji anya gị abụọ hụ ya, ma ị gaghị eri site nʼime ya.”
و چهار مرد مبروص نزد دهنه دروازه بودند و به یکدیگر گفتند: «چرا ما اینجا بنشینیم تابمیریم؟ | ۳ 3 |
Nʼoge a, e nwere ndị ekpenta anọ nọ nʼezi mgbidi gbara Sameria gburugburu, nʼakụkụ ọnụ ụzọ e si abata obodo ahụ. Ha sịrịtara onwe ha, “Gịnị ka anyị nọ nʼebe a na-eme? Ọ bụ ka anyị nọrọ nʼebe a tutu anyị anwụọ?
اگر گوییم به شهر داخل شویم هماناقحطی در شهر است و در آنجا خواهیم مرد و اگردر اینجا بمانیم، خواهیم مرد. پس حال برویم وخود را به اردوی ارامیان بیندازیم. اگر ما را زنده نگاه دارند، زنده خواهیم ماند و اگر ما را بکشند، خواهیم مرد.» | ۴ 4 |
Ọ bụrụ na anyị asị, ‘Anyị ga-abanye nʼime obodo,’ ụnwụ dị nʼebe ahụ, anyị ga-anwụkwa. Ọ bụrụkwanụ na anyị anọgide nʼebe a anyị ga-anwụ. Ya mere ka anyị gafeenụ banye nʼọmụma ụlọ ikwu ndị agha Aram, were onwe anyị nyefee ha nʼaka. Ọ bụrụ na ha edebe anyị ndụ, anyị ga-adị ndụ, ọ bụrụ na ha egbuo anyị, anyị ga-anwụkwa.”
پس وقت شام برخاستند تا به اردوی ارامیان بروند، اما چون به کنار اردوی ارامیان رسیدند اینک کسی در آنجا نبود. | ۵ 5 |
Nʼoge uhuruchi, ha biliri gaa nʼọmụma ụlọ ikwu ndị agha Aram. Mgbe ha bịarutere nʼọnụ ụlọ ikwu ahụ, o nwekwaghị onye nọ nʼebe ahụ,
زیراخداوند صدای ارابهها و صدای اسبان و صدای لشکر عظیمی را در اردوی ارامیان شنوانید و به یکدیگر گفتند: «اینک پادشاه اسرائیل، پادشاهان حتیان و پادشاهان مصریان را به ضد ما اجیر کرده است تا بر ما بیایند.» | ۶ 6 |
nʼihi na Onyenwe anyị mere ka ndị Aram nụ ụzụ ụgbọ agha na nke ịnyịnya, na nke usuu ndị agha. Nke a mere ka onye ọbụla gwa ibe ya sị, “Lee, eze ndị Izrel egoola ndị agha ndị Het, na ndị eze Ijipt ibuso anyị agha.”
پس برخاسته، به وقت شام فرار کردند و خیمهها و اسبان و الاغها و اردوی خود را به طوری که بود ترک کرده، از ترس جان خود گریختند. | ۷ 7 |
Ha biliri gbapụ ọsọ nʼabalị ahụ, hapụ ụlọ ikwu ha niile, na ịnyịnya ha niile, na ịnyịnya ibu ha niile, na ihe niile otu o si dịrị, ma gbapụ ọsọ ndụ.
و آن مبروصان به کنار اردوآمده، به خیمهای داخل شدند و اکل و شرب نموده، از آنجا نقره و طلا و لباس گرفته، رفتند وآنها را پنهان کردند و برگشته، به خیمهای دیگرداخل شده، از آن نیز بردند؛ و رفته، پنهان کردند. | ۸ 8 |
Mgbe ndị ekpenta ahụ rutere ogige ndị agha ndị Siria, ha banyere nʼime otu ụlọ rie ihe, ṅụkwaa ihe ọṅụṅụ dị nʼime ya. Ha chịịrị ọlaọcha na ọlaedo na uwe ọma niile dị nʼime ya gaa zoo ha. Ọzọkwa, ha lọghachiri banye nʼụlọ ọzọ kwakọrọ ụfọdụ ihe dị nʼime ya gaa zoo.
پس به یکدیگر گفتند: «ما خوب نمی کنیم؛ امروز روز بشارت است و ما خاموش میمانیم واگر تا روشنایی صبح به تاخیر اندازیم، بلایی به ماخواهد رسید، پس الان بیایید برویم و به خانه پادشاه خبر دهیم.» | ۹ 9 |
Ma mgbe ahụ ha sịrịtara onwe ha, “Ihe anyị na-eme ezighị ezi. Taa bụ ụbọchị oziọma, ma lee ka anyị na-agba nkịtị. Ọ bụrụ na anyị echere ruo ìhè ụtụtụ, a ga-achọpụta ajọọ omume anyị. Ugbu a bịanụ, ka anyị gaa gwa ndị nọ nʼụlọeze, ihe anyị hụrụ.”
پس رفته، دربانان شهر راصدا زدند و ایشان را مخبر ساخته، گفتند: «به اردوی ارامیان درآمدیم و اینک در آنجا نه کسی و نه صدای انسانی بود مگر اسبان بسته شده، والاغها بسته شده و خیمهها به حالت خود.» | ۱۰ 10 |
Ya mere, ha gara kpọkuo ndị nche ọnụ ụzọ obodo ahụ, gwa ha sị, “Anyị banyere nʼogige ndị agha Aram, o nweghị mmadụ ọbụla nọ nʼebe ahụ, ọ dịghị olu mmadụ anyị nụrụ nʼebe ahụ, naanị ịnyịnya na ịnyịnya ibu elibere nʼosisi, na ụlọ ikwu ha a hapụrụ dịka ha dị.”
پس دربانان صدا زده، خاندان پادشاه را دراندرون اطلاع دادند. | ۱۱ 11 |
Ndị na-eche nche tiri mkpu kọọrọ ndị nọ nʼụlọeze ihe mere.
و پادشاه در شب برخاست و به خادمان خود گفت: «به تحقیق شمارا خبر میدهم که ارامیان به ما چه خواهند کرد: میدانند که ما گرسنه هستیم پس از اردو بیرون رفته، خود را در صحرا پنهان کردهاند و میگویندچون از شهر بیرون آیند، ایشان را زنده خواهیم گرفت و به شهر داخل خواهیم شد.» | ۱۲ 12 |
Eze biliri nʼabalị ahụ gwa ndịisi ọrụ ya sị, “Ka m gwa unu ihe ndị Aram mere anyị. Ha maara na anyị nọ nʼoke agụụ, nʼihi ya, ha akpacharala anya hapụ ọmụma ụlọ ikwu ha gaa zoo onwe ha nʼime ọhịa. Echiche ha bụ, ‘Ndị a ga-apụtarịrị, mgbe ahụ, anyị ga-ejide ha na ndụ, banyekwa nʼime obodo ha.’”
و یکی ازخادمانش در جواب وی گفت: «پنج راس ازاسبان باقیمانده که در شهر باقیاند، بگیرند(اینک آنها مثل تمامی گروه اسرائیل که در آن باقیاند یا مانند تمامی گروه اسرائیل که هلاک شدهاند، میباشند) و بفرستیم تا دریافت نماییم.» | ۱۳ 13 |
Ma otu onye nʼime ndịisi agha ya zara sị ya, “Ka ụfọdụ mmadụ duru ịnyịnya ise ndị ahụ fọdụrụ nʼobodo. Ọ bụrụ na ndị a alọtaghị ọnọdụ ha ga-adị ka nke ndị Izrel niile fọdụrụ nʼebe, e, ha ga-adị ka ndị Izrel niile a gụrụ dịka ndị nwụrụ anwụ. Ya mere, ka anyị zipụ ha ka ha gaa chọpụta ihe mere.”
پس دو ارابه با اسبها گرفتند و پادشاه از عقب لشکر ارام فرستاده، گفت: «بروید و تحقیق کنید.» | ۱۴ 14 |
Ya mere, ha họpụtara ụgbọ agha abụọ na ịnyịnya ndị na-adọkpụ ha. Eze zipụrụ ha ịchụso ndị agha Aram, O nyere ndị na-agba ha iwu sị, “Gaanụ chọpụta ihe mere.”
پس از عقب ایشان تا اردن رفتند و اینک تمامی راه از لباس و ظروفی که ارامیان از تعجیل خود انداخته بودند، پر بود. پس رسولان برگشته، پادشاه را مخبر ساختند. | ۱۵ 15 |
Ha sogidere ha ruo nʼosimiri Jọdan. Nʼakụkụ ụzọ niile jupụtara nʼuwe na ngwa agha ndị agha Aram tufuru mgbe ha na-eme ngwangwa. Ndị ahụ e zipụrụ lọghachiri bịa kọọrọ eze ihe ha hụrụ.
و قوم بیرون رفته، اردوی ارامیان را غارت کردند و یک کیل آرد نرم به یک مثقال و دو کیل جو به یک مثقال به موجب کلام خداوند به فروش رفت. | ۱۶ 16 |
Ndị Izrel niile pụrụ gaa kwakọrọ ihe dị nʼọmụma ụlọ ikwu ndị Aram. Nke bụ na e rere otu akpa nta ụtụ ọka a kwọrọ nke ọma otu shekel, rekwaa akpa ọka balị abụọ otu shekel dịka Onyenwe anyị si kwuo.
و پادشاه آن سردار را که بر دست وی تکیه مینمود بر دروازه گماشت و خلق، او را نزددروازه پایمال کردند که مرد برحسب کلامی که مرد خدا گفت هنگامی که پادشاه نزد وی فرودآمد. | ۱۷ 17 |
Eze họpụtara ọchịagha ahụ, nke ọ na-adabere nʼaka ya, nye ya ọrụ ilekọta ọnụ ụzọ obodo ahụ. Ma ndị si nʼobodo na-enupụta nuturu ya, zọọ ya ụkwụ, zọgbuo ya mgbe ha na-agbapụta. Ọ nwụrụ dịka Ịlaisha onye nke Chineke kwuru mgbe eze bịakwutere ya ụnyaahụ, ijide ya.
و واقع شد به نهجی که مرد خدا، پادشاه را خطاب کرده، گفته بود که فردا مثل این وقت دو کیل جو به یک مثقال و یک کیل آرد نرم به یک مثقال نزد دروازه سامره فروخته خواهد شد. | ۱۸ 18 |
Ihe niile mezuru dịka onye nke Chineke gwara eze okwu sị ya, “A ga-ere akpa nta ọka balị abụọ otu shekel na otu akpa nta ụtụ ọka otu shekel, nʼọnụ ụzọ ama Sameria.”
و آن سردار در جواب مرد خدا گفته بود: اگر خداوند پنجرهها هم در آسمان بگشاید، آیامثل این امر واقع تواند شد؟ و او گفت: «اینک به چشمان خود خواهی دید اما از آن نخواهی خورد.» | ۱۹ 19 |
Nʼoge ahụ, ọchịagha ahụ na-ejere eze ozi zara sị ya, “Ihe dị otu a agaghị eme, ọ bụladị na Onyenwe anyị emeghee eluigwe mee ka nri zoo, nke a ọ ga-eme?” Ma onye nke Chineke zara ya, “Ị ga-eji anya gị hụ ya, ma ị gaghị eso rie ya.”
پس او را همچنین واقع شد زیرا خلق او را نزد دروازه پایمال کردند که مرد. | ۲۰ 20 |
Ọ bụkwa otu a ka o si mee, nʼihi na ndị mmadụ zọgburu ya nʼụkwụ nʼọnụ ụzọ ama, ebe ọ nọ nwụọ.