< دوم قرنتیان 12 >

لابد است که فخر کنم، هرچند شایسته من نیست. لیکن به رویاها و مکاشفات خداوند می‌آیم. ۱ 1
Aghaghị m ịnya isi, ọ bụ ezie na ọ baghị uru, ugbu a ka m gwa unu ihe banyere ọhụ m hụrụ, na ihe niile Onyenwe anyị kpughere gosi m.
شخصی را در مسیح می‌شناسم، چهارده سال قبل از این. آیا در جسم؟ نمی دانم! و آیا بیرون از جسم؟ نمی دانم! خدامی داند. چنین شخصی که تا آسمان سوم ربوده شد. ۲ 2
Amaara m otu nwoke nọ nʼime Kraịst, onye e duuru gaa nʼeluigwe nke atọ ihe dị ka afọ iri na anọ gara aga, maọbụ nʼanụ ahụ, maọbụ nʼime mmụọ amaghị m, ma Chineke ma.
و چنین شخص را می‌شناسم، خواه درجسم و خواه جدا از جسم، نمی دانم، خدامی داند، ۳ 3
Amatakwara m nwoke dị otu a, maọbụ nʼanụ ahụ, maọbụ nʼime mmụọ amaghị m, ma Chineke maara
که به فردوس ربوده شد و سخنان ناگفتنی شنید که انسان را جایز نیست به آنها تکلم کند. ۴ 4
onye a, nke a kpọọrọ banye na paradaịs, ebe ọ nụrụ ihe ọnụ mmadụ na-apụghị ịkọwa, nke e nyeghịkwa mmadụ ọbụla ike ikwu ihe banyere ya.
از چنین شخص فخر خواهم کرد، لیکن ازخود جز از ضعفهای خویش فخر نمی کنم. ۵ 5
Ekwesiri m ịnya isi nʼihi nwoke dị otu a ma agaghị m anya isi maka mụ onwe m, ma ọ bụghị maka adịghị ike m.
زیرااگر بخواهم فخر بکنم، بی‌فهم نمی باشم چونکه راست می‌گویم. لیکن اجتناب می‌کنم مبادا کسی در حق من گمانی برد فوق از آنچه در من بیند یا ازمن شنود. ۶ 6
A sị na m chọrọ ịnya isi, agaghị m abụ onye nzuzu, nʼihi na aga m ekwu naanị eziokwu. Otu ọ dị, agaghị m anya isi ka onye ọbụla ghara ịgụ ọnọdụ m karịa ihe ọ hụrụ nʼime m, maọbụ karịa ihe ọ nụrụ nʼọnụ m.
و تا آنکه از زیادتی مکاشفات زیاده سرافرازی ننمایم، خاری در جسم من داده شد، فرشته شیطان، تا مرا لطمه زند، مبادا زیاده سرافرازی نمایم. ۷ 7
Ma nʼihi na ọtụtụ ihe ndị a m ji anya m hụ bụ ihe pụrụ ime ka m bulie onwe m elu karịa ka o si kwesi. E tinyere ihe mgbu nʼanụ ahụ m ka ọ na-adụ m dịka ogwu. Ihe mgbu a dị nʼanụ ahụ m na-eti m aka dịka onyeozi nke ekwensu, na-eme ka m ghara ịfụlị onwe m elu karịa.
و درباره آن از خداوند سه دفعه استدعا نمودم تا از من برود. ۸ 8
Ekpeela m ekpere ugboro atọ rịọ Onyenwe anyị ka o wepụrụ m ahụ mgbu a.
مرا گفت: «فیض من تو را کافی است، زیرا که قوت من درضعف کامل می‌گردد.» پس به شادی بسیار ازضعفهای خود بیشتر فخر خواهم نمود تا قوت مسیح در من ساکن شود. ۹ 9
Ma ọ sịrị m, “Amara m ezuorola gị. Nʼihi na ike m na-ezu oke nʼime adịghị ike.” Ugbu a, obi dị m ụtọ ịnya isi banyere adịghị ike m. Nʼihi na ọ bụ site nʼọnọdụ adịghị ike m ka ike ebube Kraịst ga-esi nọgide nʼahụ m.
بنابراین، از ضعفها ورسوایی‌ها و احتیاجات و زحمات و تنگیهابخاطر مسیح شادمانم، زیرا که چون ناتوانم، آنگاه توانا هستم. ۱۰ 10
Ọ bụ nʼihi Kraịst ka m na-anọgide nʼadịghị ike m niile, mkparị ndị mmadụ, ihe isi ike niile, mkpagbu niile na ihe ndakwasị dị iche iche. Nʼihi na mgbe m na-adịghị ike ka m na-enwe ike karịa.
بی‌فهم شده‌ام. شما مرا مجبور ساختید. زیرا می‌بایست شما مرا مدح کرده باشید، از آنروکه من از بزرگترین رسولان به هیچ وجه کمترنیستم، هرچند هیچ هستم. ۱۱ 11
Emeela m onwe m onye nzuzu ma unu onwe unu rugidere m ime ya. O kwesiri ka unu bụrụ ndị mbụ ga-eto m. Ọ bụ ezie a na-abụghị m ihe ọbụla, ma o were m anya na ọ dịghị ụzọ ọbụla m si dị ala nʼebe ndị ahụ unu na-eche na ha kachasị elu nʼetiti ndị ozi.
بدرستی که علامات رسول در میان شما با کمال صبر از آیات و معجزات و قوات پدید گشت. ۱۲ 12
Ejiri m ndidi rụọ ọrụ nʼetiti unu, ihe iji gosi na abụ m nwaazụ nʼeziokwu. Egosiri m unu ihe ịrịbama, ọrụ ebube dị iche iche, na ọtụtụ oke ọrụ.
زیرا کدام چیزاست که در آن از سایر کلیساها قاصر بودید؟ مگراینکه من بر شما بار ننهادم. این بی‌انصافی را از من ببخشید! ۱۳ 13
Olee ụzọ unu si dị ala nʼebe chọọchị ndị ọzọ dị, ma ọ bụghị na m abụghị ibu arọ nye unu? Gbagharanụ m mmejọ a.
اینک مرتبه سوم مهیا هستم که نزد شمابیایم و بر شما بار نخواهم نهاد از آنرو که نه مال شما بلکه خود شما را طالبم، زیرا که نمی بایدفرزندان برای والدین ذخیره کنند، بلکه والدین برای فرزندان. ۱۴ 14
Nke a bụ ugboro atọ m na-ejikere ịbịakwute unu. Agaghị m abụrụ unu ibu arọ, ihe dị m mkpa abụghị akụ unu nwere, kama unu onwe unu. Ọ bụghị ụmụntakịrị ka ọ dịrị ịkpadoro nne na nna ha ihe, kama ọ bụ ọrụ dịrị nne na nna ịkpadoro ụmụ ha ihe.
اما من به‌کمال خوشی برای جانهای شما صرف می‌کنم و صرف کرده خواهم شد. و اگر شما را بیشتر محبت نمایم، آیا کمترمحبت بینم؟ ۱۵ 15
Nʼezie, ọ na-atọ m ụtọ iwere onwe m na ihe niile m nwere nye unu, nʼihi na ahụrụ m unu nʼanya. Ma ọ bụrụ na m hụrụ unu nʼanya karịa, ọ ga-adị mma ma unu hụ m nʼanya nke nta?
اما باشد، من بر شما بار ننهادم بلکه چون حیله گر بودم، شما را به مکر به چنگ آوردم. ۱۶ 16
Nʼagbanyeghị na-abụrụ m unu ibu arọ, ụfọdụ nʼime unu na-ekwu, ọ bụ ezie na ọ dịghị anara anyị ihe ọbụla, maọbụ onye aghụghọ. Ma eleghị anya, o nwere ụzọ aghụghọ dị iche iche o si anara anyị ihe.
آیا به یکی از آنانی که نزد شمافرستادم، نفع از شما بردم؟ ۱۷ 17
Ọ dị onye ọbụla m ziteere unu, iji si nʼaka ya rigbuo unu?
به تیطس التماس نمودم و با وی برادر را فرستادم. آیا تیطس از شمانفع برد؟ مگر به یک روح و یک روش رفتارننمودیم؟ ۱۸ 18
Arịọrọ m Taịtọs ka ọ bịakwute unu, ya na nwanna anyị nwoke ọzọ. Taịtọs o rigburu unu? O nwere ihe dị iche nʼuche na omume mụ na ya?
آیا بعد از این مدت، گمان می‌کنید که نزدشما حجت می‌آوریم؟ به حضور خدا در مسیح سخن می‌گوییم. لیکن همه‌چیز‌ای عزیزان برای بنای شما است. ۱۹ 19
Unu chere na ihe anyị na-eme oge niile ndị a bụ ịgọpụ onwe anyị nʼihu unu? Ọ bụ nʼihu Chineke ka anyị na-ekwu nke a nʼime Kraịst. Ndị m hụrụ nʼanya, ihe ndị a anyị na-ekwu bụ maka ọdịmma unu.
زیرا می‌ترسم که چون آیم شما را نه‌چنانکه می‌خواهم بیابم و شما مرا بیابیدچنانکه نمی خواهید که مبادا نزاع و حسد وخشمها و تعصب و بهتان و نمامی و غرور وفتنه‌ها باشد. ۲۰ 20
Nʼihi na ihe na-atụ m egwu bụ na mgbe m bịara nʼetiti unu, ihe m ga-ahụ agaghị atọ m ụtọ. Mgbe ahụ mmeso m ga-emeso unu agakwaghị atọ unu atọ. Nʼihi na ana m atụ egwu na mgbe m bịakwutere unu ọzọ, aga m ahụ ọtụtụ nʼime unu ka unu na-ese okwu, aga m ahụ ka unu na-ekwosa ibe unu ekworo, aga m ahụ unu ka unu na-akpasu ibe unu iwe. Aga m ahụ ọtụtụ ndị na-afụli onwe ha elu, ndị na-ekwu ọtụtụ ihe ọjọọ dị iche iche megide ndị ọzọ; aga m ahụ ọtụtụ ndị jupụtara nʼaghụghọ na ịkpa iche iche.
و چون بازآیم، خدای من مرا نزدشما فروتن سازد و ماتم کنم برای بسیاری از آنانی که پیشتر گناه کردند و از ناپاکی و زنا و فجوری که کرده بودند، توبه ننمودند. ۲۱ 21
Ana m atụ egwu na mgbe m ga-abịakwute unu ọzọ, Chineke m ga-eme ka m weda onwe m ala nʼihu unu, mee ka m kwa akwa nʼihi ụfọdụ nʼime unu ndị mehiere na mbụ, ma ha achọghị ichegharị site nʼihe ọjọọ ha mere, na nʼihi ọtụtụ nʼime unu na-adị ndụ rere ure, ndụ na-adịghị ọcha, ndụ ịkwa iko, na ndụ ọjọọ.

< دوم قرنتیان 12 >