< دوم تواریخ 32 >

و بعد از این امور و این امانت، سنخاریب، پادشاه آشور آمده، به یهودا داخل شد، و به ضد شهرهای حصارداراردو زده، خواست که آنها را برای خود مفتوح نماید. ۱ 1
Mgbe Hezekaya ji ikwesi ntụkwasị obi rụchaa ọrụ ndị a niile, Senakerib bụ eze Asịrịa, bịara nʼime Juda megide ya. Ọ nọchibidoro obodo niile nke e wusiri ike, na-eche na ọ ga-emeri ha nye onwe ya.
و چون حزقیا دید که سنخاریب آمده است و قصد مقاتله با اورشلیم دارد، ۲ 2
Mgbe o doro eze anya na Senakerib bịara ka o buo agha megide Jerusalem,
آنگاه باسرداران و شجاعان خود مشورت کرد که آب چشمه های بیرون شهر را مسدود نماید. پس اورااعانت کردند. ۳ 3
Hezekaya mere ngwangwa kpọkọta ụmụ eze niile na ndịisi agha ya. Mgbe ha zukọtara, ha kpebiri iwuchi isi iyi ahụ niile na-esi nʼazụ obodo na-asọpụta. Ha mekwara otu a.
و خلق بسیاری جمع شده، همه چشمه‌ها و نهری را که از میان زمین جاری بودمسدود کردند، و گفتند: «چرا باید پادشاهان آشور بیایند و آب فراوان بیابند؟» ۴ 4
Ha kpọkọtara ọtụtụ ndị ọrụ, ndị gara gbochie isi iyi niile, mee ka mmiri gharakwa ịsọpụta nʼala ahụ niile. Ha mere nke a nʼihi na ha achọghị ka eze ndị Asịrịa na ndị agha ya nweta mmiri ha ga-aṅụ mgbe ha bịaruru ibuso Jerusalem agha.
پس خویشتن را تقویت داده، تمامی حصار را که شکسته بود، تعمیر نمود و آن را تا برجها بلند نمود و حصاردیگری بیرون آن بنا کرد و ملو را در شهر داودمستحکم نمود و اسلحه‌ها و سپرهای بسیاری ساخت. ۵ 5
Hezekaya wuzikwara mgbidi obodo ahụ, wusie ha ike nʼebe niile ọ na-ada ada. O wukwara mgbidi ọzọ gburugburu mgbidi nke ochie ahụ. O wusikwara ebe siri ike nke Milo dị nʼobodo Devid ike, kpụọkwa ọtụtụ ngwa agha na ọta.
و سرداران جنگی بر قوم گماشت وایشان را در جای وسیع نزد دروازه شهر جمع کرده، سخنان دلاویز به ایشان گفت ۶ 6
O tinyere ndị agha niile nọ nʼobodo ahụ nʼokpuru ndịisi agha na-achị ha, mee ka ha niile zukọta nʼọnụ ụzọ ama nke obodo. Nʼebe ahụ ka ọ nọ gwa ha okwu sị ha,
که «دلیر وقوی باشید! و از پادشاه آشور و تمامی جمیعتی که با وی هستند، ترسان و هراسان مشوید! زیرا آنکه با ماست از آنکه با وی است قوی تر می‌باشد. ۷ 7
“Dịrịnụ ike, unu adakwala mba. Unu atụla ụjọ maọbụ daa mba nʼihi eze Asịrịa na usuu ndị agha ya, nʼihi na onye dịnyeere anyị ka ya ike.
با او بازوی بشری است و با ما یهوه خدای مااست تا ما را نصرت دهد و در جنگهای ما جنگ کند.» پس قوم بر سخنان حزقیا پادشاه یهودااعتماد نمودند. ۸ 8
Ihe nọnyere ya bụ ogwe aka nke anụ ahụ, ma nke nọnyere anyị bụ Onyenwe anyị, Chineke anyị, inyere anyị aka na ibu agha anyị niile.” Okwu a, nke Hezekaya bụ eze Juda kwuru, mere ka ndị Juda nwee agbamume.
و بعد از آن سنخاریب، پادشاه آشور، بندگان خود را به اورشلیم فرستاد و خودش با تمامی حشمتش در برابر لاکیش بودند که به حزقیاپادشاه یهودا و تمامی یهودا که در اورشلیم بودند، بگویند: ۹ 9
Mgbe e mesiri, mgbe Senakerib eze Asịrịa na ndị agha ya niile nọchibidoro Lakish, o zipụrụ ndị ọrụ ya gaa Jerusalem, ka ha jiri ozi a gaa maka Hezekaya, bụ eze Juda na ndị Juda niile ndị nọ nʼebe ahụ:
«سنخاریب پادشاه آشورچنین می‌فرماید: بر چه چیز اعتماد دارید که درمحاصره در اورشلیم می‌مانید؟ ۱۰ 10
“Nke a bụ ihe Senakerib, bụ eze Asịrịa sịrị: Ọ bụ na gịnị ka ntụkwasị obi gị dabere, mere i ji nọgidesie ike na Jerusalem nʼọnọdụ nnọchibido a?
آیا حزقیا شمارا اغوا نمی کند تا شما را با قحط و تشنگی به موت تسلیم نماید که می‌گوید: یهوه خدای ما، مارا از دست پادشاه آشور رهایی خواهد داد؟ ۱۱ 11
Mgbe Hezekaya na-asị, ‘Onyenwe anyị bụ Chineke anyị ga-azọpụta anyị site nʼaka eze Asịrịa,’ ọ bụ aghụghọ ka ọ na-aghọ unu. Ọ na-eduhie unu, na-achọ ka unu nwụọ nʼagụụ nakwa akpịrị ịkpọ nkụ.
آیا همین حزقیا مکانهای بلند و مذبحهای اورا منهدم نساخته، و به یهودا و اورشلیم امرنفرموده و نگفته است که پیش یک مذبح سجده نمایید و بر آن بخور بسوزانید؟ ۱۲ 12
Ọ bụghị Hezekaya na onwe ya wezugara ebe ya niile dị elu na ebe ịchụ aja ya niile, na-asị Juda na Jerusalem, ‘Unu aghaghị ịkpọ isiala nʼotu ebe ịchụ aja, chụọkwa aja nʼelu ya’?
آیا نمی دانیدکه من و پدرانم به همه طوایف کشورها چه کرده‌ایم؟ مگر خدایان امت های آن کشورها هیچ قدرتی داشتند که زمین خود را از دست من برهانند؟ ۱۳ 13
“Unu amaghị ihe mụ na nna m ha bụ ndị bu m ụzọ chịa mere ndị ala ọzọ? Chi niile nke mba ndị ahụ niile ha nwere ike zọpụta ala ha site nʼaka m?
کدام‌یک از همه خدایان این امت هایی که پدران من آنها را هلاک ساخته‌اند، قادر بر رهانیدن قوم خود از دست من بود تاخدای شما قادر باشد که شما را از دست من رهایی دهد؟ ۱۴ 14
Ọ bụ onye nʼetiti chi niile nke mba ndị a niile, bụ ndị nna nna m ha bibiri, napụtarala ndị ya site nʼaka m? Aṅaa ka chi unu ga-esi zọpụta unu site nʼaka m?
پس حال، حزقیا شما را فریب ندهد و شما را به اینطور اغوا ننماید و بر اواعتماد منمایید، زیرا هیچ خدا از خدایان جمیع امت‌ها و ممالک قادر نبوده است که قوم خود را ازدست من و از دست پدرانم رهایی دهد، پس به طریق اولی خدای شما شما را از دست من نخواهد رهانید.» ۱۵ 15
Unu ekwela ka Hezekaya duhie unu, rafuokwa unu otu a. Unu ekwenyekwarala ya, nʼihi na ọ dịghị chi ọbụla maọbụ nke mba ọbụla maọbụ alaeze ọbụla pụrụ ịnapụta ndị ya site nʼaka m maọbụ nʼaka nna m ha. Ka ọ bụrụzie chi unu ga-abụ nke ga-anapụta unu site nʼaka m!”
و بندگانش سخنان زیاده به ضد یهوه خدا وبه ضد بنده‌اش حزقیا گفتند. ۱۶ 16
Nʼụzọ dị otu a ka ndị ozi Senakerib ahụ ji leda Onyenwe anyị Chineke, na Hezekaya anya kwuokwa okwu mkparị megide ha.
و مکتوبی نیزنوشته، یهوه خدای اسرائیل را اهانت نمود و به ضد وی حرف زده، گفت: «چنانکه خدایان امت های کشورها قوم خود را از دست من رهایی ندادند، همچنین خدای حزقیا قوم خویش را ازدست من نخواهد رهانید.» ۱۷ 17
Emesịa, Senakerib dekwara akwụkwọ mkparị ndị ọzọ, nke ọ nọ nʼime ya kwuluo Onyenwe anyị Chineke Izrel, na-asị, “Dịka chi ndị ala ọzọ niile enweghị ike zọpụta ndị ha site nʼaka m, otu a kwa, Chineke nke Hezekaya apụghịkwa ịzọpụta ndị ya site nʼaka m.”
و به آواز بلند به زبان یهود به اهل اورشلیم که بر دیوار بودند، ندادر‌دادند تا ایشان را ترسان و مشوش ساخته، شهررا بگیرند. ۱۸ 18
Mgbe ahụ, ha ji oke olu kpọkuo ndị Jerusalem, bụ ndị nọ na mgbidi ahụ nʼasụsụ Hibru, imenye ha egwu nakwa ime ka ụjọ tụọ ha, ka ha nwee ike were obodo ahụ.
و درباره خدای اورشلیم مثل خدایان امت های جهان که مصنوع دست آدمیان می‌باشند، سخن‌گفتند. ۱۹ 19
Ha kwuru okwu ọjọọ dị iche iche banyere Chineke nke Jerusalem, dịka ha si kwuo megide chi niile nke ndị ọzọ dị nʼụwa, bụ ọrụ aka mmadụ.
پس حزقیا پادشاه و اشعیاء ابن آموص نبی درباره این دعا کردند و به سوی آسمان فریادبرآوردند. ۲۰ 20
Mgbe ahụ, Hezekaya bụ eze, na Aịzaya onye amụma, nwa Emọz, kpọkuru Chineke nke eluigwe nʼekpere.
و خداوند فرشته‌ای فرستاده، همه شجاعان جنگی و روسا و سرداران را که دراردوی پادشاه آشور بودند، هلاک ساخت و او باروی شرمنده به زمین خود مراجعت نمود. وچون به خانه خدای خویش داخل شد، آنانی که از صلبش بیرون آمده بودند، او را در آنجا به شمشیر کشتند. ۲۱ 21
Onyenwe anyị zipụrụ otu mmụọ ozi, onye gara tigbuo ndị agha niile bụ dike, ndị ọchịagha na ndịisi niile nọ nʼọmụma ụlọ ikwu nke eze Asịrịa. Ya mere, Senakerib ji oke ihere laghachi nʼala ya. Ma mgbe ọ gara nʼụlọ chi ya, ụfọdụ nʼime ụmụ ya ndị ikom, ndị bụ anụ ahụ na ọbara ya, were mma agha gbuo ya nʼebe ahụ.
پس خداوند حزقیا و سکنه اورشلیم را از دست سنحاریب پادشاه آشور و ازدست همه رهایی داده، ایشان را از هر طرف نگاهداری نمود. ۲۲ 22
Otu a ka Onyenwe anyị si zọpụta Hezekaya na ndị Jerusalem, site nʼaka Senakerib eze Asịrịa, na sitekwa nʼaka ndị iro ya ndị ọzọ. Udo dịkwara nʼala ya niile.
و بسیاری هدایا به اورشلیم برای خداوند و پیشکشها برای حزقیا پادشاه یهودا آوردند و او بعد از آن به نظر همه امت هامحترم شد. ۲۳ 23
Site nʼoge ahụ, Hezekaya ghọrọ eze a maara aha ya na mba niile dị Juda gburugburu. Ọtụtụ mmadụ bidokwara ibutere Onyenwe anyị onyinye dị iche iche na Jerusalem. Hezekaya nʼonwe ya nwetakwara onyinye nke ya.
و در آن ایام حزقیا بیمار و مشرف به موت شد. اما چون نزد خداوند دعا نمود، او با وی تکلم کرد و وی را علامتی داد. ۲۴ 24
Ma nʼoge ahụ, Hezekaya rịara ọrịa, ruo na ọ gaara anwụ. Ma o kpere ekpere rịọ Onyenwe anyị ka ọ gwọọ ya. Ọ zara ekpere ya, gosikwa ya ihe ịrịbama dị ebube.
لیکن حزقیا موافق احسانی که به وی داده شده بود، عمل ننمود زیرادلش مغرور شد و غضب بر او و یهودا و اورشلیم افروخته گردید. ۲۵ 25
Ma Hezekaya ejighị obi ya niile kelee Chineke ekele nʼihi na nganga batara ya nʼobi. Nke a mere ka iwe wee Onyenwe anyị megide ya na ndị Jerusalem na Juda.
اما حزقیا با ساکنان اورشلیم، از غرور دلش تواضع نمود، لهذا غضب خداونددر ایام حزقیا بر ایشان نازل نشد. ۲۶ 26
Mgbe Hezekaya na ndị Jerusalem wedara onwe ha nʼala, iwe Onyenwe anyị dajụrụ nʼebe ha nọ, ọ takwaghị ha ahụhụ nʼoge niile ahụ Hezekaya dị ndụ.
و حزقیا دولت و حشمت بسیار عظیمی داشت و به جهت خود مخزنها برای نقره و طلا وسنگهای گرانبها و عطریات و سپرها و هر گونه اسباب نفیسه ساخت. ۲۷ 27
Ya mere, Hezekaya ghọrọ eze bara ọgaranya, bụrụkwa onye a na-asọpụrụ. O wuru ụlọakụ maka ichebe ọlaọcha ya na ọlaedo, na nkume dị oke ọnụahịa, na ụda na-esi isi ụtọ, na ọta na efere ọlaedo ya.
و انبارها برای محصولات از گندم و شیره و روغن و آخرها برای انواع بهایم و آغلها به جهت گله‌ها. ۲۸ 28
O wukwara ọtụtụ ụlọ ọzọ ebe a na-echebe ọka, na mmanya vaịnị ọhụrụ, na mmanụ oliv. O wukwara ụlọ anụmanụ maka ọtụtụ igwe ewu na atụrụ ya.
و به جهت خود شهرها ساخت و مواشی گله‌ها و رمه های بسیار تحصیل نمود زیرا خدا اندوخته های بسیارفراوان به او عطا فرمود. ۲۹ 29
O wukwara ọtụtụ obodo nta dị iche iche, nweekwa ọtụtụ igwe anụ ụlọ, na igwe ehi, nʼihi na Chineke mere ka ọ baa ụba.
و همین حزقیا منبع عالی آب جیحون را مسدود ساخته، آن را به راه راست به طرف غربی شهر داود فرود آورد. پس حزقیا در تمامی اعمالش کامیاب شد. ۳۰ 30
Hezekaya bụkwa onye gbochiri mmiri iyi Gaihọn nʼakụkụ elu elu ya, gwuo olulu ebe mmiri ahụ si sọgharịa na-asọbata nʼakụkụ ọdịda anyanwụ nke obodo Devid. Ihe niile o mere gaara ya nke ọma.
اما درامر ایلچیان سرداران بابل که نزد وی فرستاده شده بودند تا درباره آیتی که در زمین ظاهر شده بودپرسش نمایند، خدا او را واگذاشت تا او راامتحان نماید و هر‌چه در دلش بود بداند. ۳۱ 31
Ma mgbe ndị ozi nke ndị na-achị Babilọn zitere ka ha jụọ ya banyere ihe ebube ahụ nke mere nʼala ahụ, Chineke hapụrụ ya i nwalee ya, ka ọ mara ihe niile dị ya nʼobi.
و بقیه وقایع حزقیا و حسنات او اینک دررویای اشعیا ابن آموص نبی و در تواریخ پادشاهان یهودا و اسرائیل مکتوب است. ۳۲ 32
Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Hezekaya, na ọrụ ebere niile nke ọ rụrụ ka edere nʼakwụkwọ ọhụ onye amụma bụ Aịzaya, nwa Emọz, dịkwa nʼakwụkwọ akụkọ ndị eze Juda na Izrel niile.
پس حزقیا با پدران خود خوابید و او را در بلندی مقبره پسران داود دفن کردند، و تمامی یهودا وساکنان اورشلیم او را در حین وفاتش اکرام نمودند، و پسرش منسی در جایش سلطنت نمود. ۳۳ 33
Hezekaya sooro ndị nna nna ya dinaa nʼọnwụ, e lie ya nʼugwu nʼebe ili ndị nna nna Devid dị. Ndị Juda niile na ndị niile bi na Jerusalem kwanyere ya ugwu nʼọnwụ ya. Manase nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.

< دوم تواریخ 32 >