< 1 تسالونیکیان 4 >

خلاصه‌ای برادران، از شما در عیسی خداوند استدعا و التماس می‌کنیم که چنانکه از ما یافته‌اید که به چه نوع باید رفتار کنیدو خدا را راضی سازید، به همانطور زیادتر ترقی نمایید. ۱ 1
Nʼikpeazụ, ụmụnna anyị, anyị na-arịọ ma na-akwagidekwa unu nʼime Onyenwe anyị Jisọs, dị ka unu mụtara site nʼaka anyị otu unu kwesiri isi bie ndụ, nakwa ime ihe ga-atọ Chineke ụtọ. Unu na-eme nke a karịa.
زیرا می‌دانید چه احکام از جانب عیسی خداوند به شما دادیم. ۲ 2
Nʼihi na unu maara ụdị ndụmọdụ ahụ sị nʼaka Onyenwe anyị Jisọs nke anyị nyere unu.
زیرا که این است اراده خدا یعنی قدوسیت شما تا از زنا بپرهیزید. ۳ 3
Nʼihi na nke a bụ ọchịchọ Chineke, bụ ị dị nsọ unu. Ka unu wezuga onwe unu site na ịkwa iko,
تاهرکسی از شما بداند چگونه باید ظرف خویشتن را در قدوسیت و عزت دریابد، ۴ 4
ka onye ọbụla nʼime unu mata ido ahụ nke onwe ya nʼugwu na nʼịdị nsọ.
و نه در هوس شهوت، مثل امت هایی که خدا را نمی شناسند. ۵ 5
Ọ bụghị nʼụzọ imejupụta ọchịchọ ọjọọ nke anụ ahụ dị ka ndị mba ọzọ na-amaghị Chineke.
و تا کسی در این امر دست تطاول یا طمع بر برادر خود دراز نکند، زیرا خداوند از تمامی چنین کارها انتقام کشنده است. ۶ 6
Ka onye ọbụla ghara imegbu maọbụ ịghọgbu nwanna ya nʼokwu a. Nʼihi na Onyenwe anyị ga-ata onye na-eme ihe dị otu a ahụhụ, dị ka anyị gwara unu na mbụ, na-adọsikwa unu aka na ntị ike.
چنانکه سابق نیز به شما گفته و حکم کرده‌ایم، زیرا خدا ما را به ناپاکی نخوانده است، بلکه به قدوسیت. ۷ 7
Nʼihi na ọkpụkpọ Chineke kpọrọ anyị abụghị ka anyị na-ebi ndụ adịghị ọcha kama ọ chọrọ ka anyị dịrị nsọ.
لهذا هرکه حقیر شمارد، انسان را حقیر نمی شمارد، بلکه خدا را که روح قدوس خود را به شما عطا کرده است. ۸ 8
Ya mere, onye ọbụla nke jụrụ ịnara ntụziaka a, ọ bụghị mmadụ ka ọ jụrụ, kama ọ bụ Chineke onye na-enye unu Mmụọ Nsọ ya.
اما در خصوص محبت برادرانه، لازم نیست که به شما بنویسم، زیرا خود شما از خدا آموخته شده‌اید که یکدیگر را محبت نمایید؛ ۹ 9
Ugbu a, ihe gbasara ịhụnanya nke kwesiri ịdị nʼetiti ụmụnna, o kwesighị ka anyị gwa unu ihe ọzọ banyere ya. Nʼihi na unu onwe unu bụ ndị Chineke kuziri ka unu nwee ịhụnanya nʼebe ibe unu nọ.
و چنین هم می‌کنید با همه برادرانی که در تمام مکادونیه می‌باشند. لیکن‌ای برادران از شما التماس داریم که زیادتر ترقی کنید. ۱۰ 10
Ma nʼezie, unu na-ahụ ụmụnna anyị niile bi na Masidonia nʼanya. Ma anyị na-arịọsịkwa unu arịrịọ ike sị unu na-ahụkwa ha nʼanya karịa ka unu hụrụ ha ugbu a.
و حریص باشید در اینکه آرام شوید و به‌کارهای خود مشغول شده، به‌دستهای خویش کسب نمایید، چنانکه شما راحکم کردیم، ۱۱ 11
Nweenụ agụụ ibi ndụ nwayọọ, na-arụkwanụ ọrụ dịịrị unu. Jirikwanụ aka unu na-arụ ọrụ dịka anyị gwara unu,
تا نزد آنانی که خارج‌اند بطورشایسته رفتار کنید و به هیچ‌چیز محتاج نباشید. ۱۲ 12
nke a ga-eme ka ndụ unu na-ebi kwa ụbọchị wetara unu nsọpụrụ nʼebe ndị na-ekweghị ekwe nọ, meekwa ka unu ghara i dabere nʼonye ọbụla.
اما‌ای برادران نمی خواهیم شما از حالت خوابیدگان بی‌خبر باشید که مبادا مثل دیگران که امید ندارند، محزون شوید. ۱۳ 13
Ụmụnna m, anyị chọrọ ka unu mata ihe banyere ndị otu anyị ndị dara nʼụra ọnwụ, ya ewutela unu dịka o si ewute ndị ọzọ ndị na-enweghị olileanya.
زیرا اگر باورمی کنیم که عیسی مرد و برخاست، به همینطورنیز خدا آنانی را که در عیسی خوابیده‌اند با وی خواهد آورد. ۱۴ 14
Nʼihi na ebe ọ bụ na anyị kweere na Jisọs nwụrụ ma sitekwa nʼọnwụ bilie, nʼotu aka ahụ, anyị kwenyekwara na site na Jisọs, Chineke ga-akpọlite ndị niile nwụrụ anwụ.
زیرا این را به شما از کلام خدامی گوییم که ما که زنده و تا آمدن خداوند باقی باشیم برخوابیدگان سبقت نخواهیم جست. ۱۵ 15
Nʼihi na okwu nke Onyenwe anyị nke anyị na-akụziri unu bụ nke a, na anyị ndị dị ndụ ruo ọbịbịa Onyenwe anyị agaghị ebu ndị dara nʼụra ọnwụ ụzọ.
زیرا خود خداوند با صدا و با آواز رئیس فرشتگان و با صور خدا از آسمان نازل خواهدشد و مردگان در مسیح اول خواهند برخاست. ۱۶ 16
Nʼihi na Onyenwe anyị nʼonwe ya ga-esi nʼeluigwe rịdata, ọ ga-ewere olu ike kpọọ oku, werekwa olu nke onyeisi ndị mmụọ ozi na ụda opi ike nke Chineke. Mgbe ahụ ndị niile nwụrụ nʼime Kraịst ga-ebu ụzọ bilie.
آنگاه ما که زنده و باقی باشیم، با ایشان در ابرهاربوده خواهیم شد تا خداوند را در هوا استقبال کنیم و همچنین همیشه با خداوند خواهیم بود. ۱۷ 17
Mgbe ahụ, anyị onwe anyị, ndị dị ndụ, ndị fọdụrụ nʼụwa, ka a ga-eweli anyị na ha elu nʼime igwe ojii, ịga izute Onyenwe anyị na mbara eluigwe, ebe anyị na Onyenwe anyị ga-anọ ruo mgbe ebighị ebi.
پس بدین سخنان همدیگر را تسلی دهید. ۱۸ 18
Ya mere, werenụ okwu ndị a, na-agba onwe unu ume mgbe niile.

< 1 تسالونیکیان 4 >