< اول قرنتیان 6 >

آیا کسی از شما چون بر دیگری مدعی باشد، جرات دارد که مرافعه برد پیش ظالمان نه نزد مقدسان؟ ۱ 1
Mgbe onye ọbụla nʼetiti unu nwere esemokwu megide ibe ya, unu ọ pụrụ i buru okwu ahụ gaa nʼụlọikpe ka ndị ajọ omume kpeere unu ikpe, karịa ịga ya nʼihu ndị nsọ?
یا نمی دانید که مقدسان، دنیا را داوری خواهند کرد؛ و اگر دنیا از شما حکم یابد، آیا قابل مقدمات کمتر نیستید؟ ۲ 2
Ọ bụ na unu amabeghị na ọ bụ ndị nsọ ga-ekpe ụwa ikpe? Ọ bụrụkwa na unu ga-ekpe ụwa ikpe, ọ pụtara na unu etozughị oke idozi okwu ntakịrị dapụtara nʼetiti unu?
آیانمی دانید که فرشتگان را داوری خواهیم کرد تاچه رسد به امور روزگار؟ ۳ 3
Ọ bụ na unu amataghị na ọ bụ anyị ga-ekpe ndị mmụọ ozi ikpe? Gịnị ga-emekwa ka anyị ghara idozi okwu ụka dịkarịsịrị nta nke ndụ a?
پس چون در مقدمات روزگار مرافعه دارید، آیا آنانی را که در کلیساحقیر شمرده می‌شوند، می‌نشانید؟ ۴ 4
Ya mere, ọ bụrụ na esemokwu dị otu a adapụta nʼetiti unu, unu ga-ewere okwu ahụ jekwuru ndị ibi ndụ ha na-akpọ nzukọ ihe efu ka ha kpee ya?
بجهت انفعال شما می‌گویم، آیا در میان شما یک نفر دانانیست که بتواند در میان برادران خود حکم کند؟ ۵ 5
Ana m ekwu nke a ime ka ihere mee unu. Ọ ga-abụ na e nweghị ike ịchọta ọ bụladị otu onye maara ihe nʼetiti unu, onye ga na-ekpe ikpe dị nʼetiti nwanna na ibe ya?
بلکه برادر با برادر به محاکمه می‌رود و آن هم نزد بی‌ایمانان! ۶ 6
Ma lee, nwanna na-akpọrọ nwanna ya aga ụlọ ikpe, ka ndị na-ekweghị ekwe kpee ha ikpe!
بلکه الان شما را بالکلیه قصوری است که بایکدیگر مرافعه دارید. چرا بیشتر مظلوم نمی شوید و چرا بیشتر مغبون نمی شوید؟ ۷ 7
Ebe unu na-enwe esemokwu nke ikpe ikpe nʼetiti unu, ọ pụtara na unu bụ ndị emeriri kpamkpam. Nʼihi gịnị ka unu na-adịghị ekwe ka emejọ unu? Nʼihi gịnị ka unu na-adịghị ekwe ka a ghọgbuo unu?
بلکه شما ظلم می‌کنید و مغبون می‌سازید و این را نیزبه برادران خود! ۸ 8
Ma unu onwe unu na-emejọ, ma na-aghọgbu, ọ bụladị ụmụnna unu nʼime Kraịst.
آیا نمی دانید که ظالمان وارث ملکوت خدا نمی شوند؟ فریب مخورید، زیرافاسقان و بت‌پرستان و زانیان و متنعمان و لواط ۹ 9
Ọ bụ na unu amaghị na ndị na-eme ajọ omume dị otu a enweghị oke ọbụla nʼalaeze Chineke? Unu ekwela ka eduhie unu. Nʼihi na ọ dịghị onye ọbụla na-akwa iko, na ndị na-efe arụsị, ndị ikom nwere nwunye na-akwa iko, na ndị ikom na-eji ndị ikom ibe ha akwa iko,
و دزدان و طمعکاران و میگساران و فحاشان وستمگران وارث ملکوت خدا نخواهند شد. ۱۰ 10
ndị niile na-ezu ohi, ndị anya ukwu, ndị na-aṅụbiga mmanya oke, ndị nkwutọ, maọbụ ndị na-apụnara mmadụ ihe ha nwere, agaghị eketa oke nʼalaeze Chineke.
وبعضی از شما چنین می‌بودید لکن غسل یافته ومقدس گردیده و عادل کرده شده‌اید به نام عیسی خداوند و به روح خدای ما. ۱۱ 11
Na mbụ, ụfọdụ nʼime unu na-ebi ndụ dị otu a. Ma ugbu a, a sachapụla mmehie unu, doo unu nsọ nye Chineke. Ọ bụkwa site nʼaha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst na nʼime Mmụọ nke Chineke anyị ka a gụrụ unu ka ndị ezi omume.
همه‌چیز برای من جایز است لکن هرچیزمفید نیست. همه‌چیز برای من رواست، لیکن نمی گذارم که چیزی بر من تسلط یابد. ۱۲ 12
Ị na-asị, “Enwere m ike ime ihe niile m maara na m kwesiri ime,” ma ọ bụghị ihe niile ga-abara m uru. “Enwere m ike ime ihe niile m maara ziri ezi,” ma a gaghị ekwe ka ihe ọbụla na-achị m.
خوراک برای شکم است و شکم برای خوراک، لکن خدااین و آن را فانی خواهد ساخت. اما جسم برای زنانیست، بلکه برای خداوند است و خداوند برای جسم. ۱۳ 13
Unu na-asị, “E mere ihe oriri maka afọ, meekwa afọ maka ihe oriri, ma Chineke ga-emebi ma afọ ma ihe oriri.” Ekeghị ahụ anyị maka ịkwa iko, kama o mere ya maka Onyenwe anyị, Onyenwe anyị dịkwa maka ahụ anyị.
و خدا خداوند را برخیزانید و ما را نیز به قوت خود خواهد برخیزانید. ۱۴ 14
Chineke mere ka Onyenwe anyị site nʼọnwụ bilie, ọ ga-ejikwa ike ya mee ka anyị si nʼọnwụ bilie.
آیا نمی دانید که بدنهای شما اعضای مسیح است؟ پس آیااعضای مسیح را برداشته، اعضای فاحشه گردانم؟ حاشا! ۱۵ 15
Ọ bụ na unu amataghị na ahụ unu bụ akụkụ ahụ Kraịst? Ọ dị mma na m ga-eji ahụ Kraịst mee ka e jikọtaa ya na ahụ nwanyị akwụna? Tụfiaa!
آیا نمی دانید که هرکه با فاحشه پیوندد، با وی یکتن باشد؟ زیرا می‌گوید «هردویک تن خواهند بود». ۱۶ 16
Ọ bụ na unu amataghị na onye ya na nwanyị akwụna na-enwe mmekọrịta, ya na nwanyị ahụ bụ otu ahụ? Nʼihi na e kwuru, “Ha abụọ ga-abụ otu anụ ahụ.”
لکن کسی‌که با خداوندپیوندد یکروح است. ۱۷ 17
Ma onye ọbụla e jikọtara ya na Onyenwe anyị, ya na onye ahụ ga-abụ otu nʼime mmụọ.
از زنا بگریزید. هر گناهی که آدمی می‌کند بیرون از بدن است، لکن زانی بربدن خود گناه می‌ورزد. ۱۸ 18
Gbaaranụ mmehie ịkwa iko ọsọ. Ọ dịghị mmehie ọzọ na-emetụta anụ ahụ mmadụ dịka mmehie ịkwa iko. Ọ bụ mmehie mmadụ na-eme megide anụ ahụ ya.
یا نمی دانید که بدن شما هیکل روح‌القدس است که در شما است که از خدا یافته‌اید و از آن خود نیستید؟ ۱۹ 19
Ọ bụ na unu amataghị na ahụ unu bụ ụlọnsọ nke Mmụọ Nsọ ahụ Chineke nyere unu, onye bi nʼime unu? Anụ ahụ unu abụkwaghị nke unu onwe unu, kama unu bụ nke Chineke.
زیرا که به قیمتی خریده شدید، پس خدا را به بدن خودتمجید نمایید. ۲۰ 20
E jiri oke ọnụahịa zọpụta unu. Ya mere jirinụ anụ ahụ unu nye Chineke otuto.

< اول قرنتیان 6 >