< Apenbaring 15 >
1 Og jeg så et annet tegn i himmelen, stort og underfullt: syv engler som hadde de syv siste plager; for med dem er Guds vrede fullendt.
Ahụkwara m ihe ịrịbama ọzọ nʼeluigwe. Ọ dị ebube dịkwa oke egwu. Ndị mmụọ ozi asaa ji ụzọ ahụhụ asaa. Ha bụ ahụhụ nke ikpeazụ ndị ga-eweta iwe Chineke na ngwụcha.
2 Og jeg så likesom et glasshav blandet med ild; og dem som hadde seiret over dyret og dets billede og dets navns tall, så jeg stå ved glasshavet med Guds harper i hånd;
Ahụrụ m ihe dịka oke osimiri enyo a gwakọtara ya na ọkụ, na ndị ahụ nweterala mmeri nʼebe anụ ọhịa ahụ na oyiyi ya, na ọnụọgụgụ aha ya. Ha guzo nʼakụkụ oke osimiri enyo ahụ, jidekwa ụbọ akwara nke Chineke nʼaka ha.
3 og de sang Moses', Guds tjeners sang og Lammets sang og sa: Store og underfulle er dine gjerninger, Herre Gud, du allmektige! rettferdige og sanne er dine veier, du folkenes konge!
Ha na-abụ abụ Mosis ohu Chineke, na abụ Nwa atụrụ ahụ. “Ọrụ gị niile dị ukwuu dịkwa ebube, Onyenwe anyị Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile. Ụzọ gị niile ziri ezi, bụrụkwa eziokwu, Gị, Eze nke mba niile.
4 Hvem skulde ikke frykte, Herre, og ære ditt navn? Du alene er hellig, og alle folkene skal komme og tilbede for ditt åsyn, fordi dine rettferdige dommer er blitt åpenbaret.
Onye ga-aghara ịtụ gị egwu, Onyenwe anyị, onye ga-agharakwa ito aha gị? Nʼihi na ọ bụ naanị gị dị nsọ. Mba niile ga-abịakwa ịkpọ isiala nʼihu gị, nʼihi na emeela ka ọrụ ezi omume gị pụta ìhè.”
5 Og derefter så jeg, og templet med vidnesbyrdets telt i himmelen blev åpnet,
Mgbe nke a gasịrị, elere m anya hụ, na e meghere, ụlọnsọ ukwu dị nʼeluigwe, ya bụ, ụlọ ikwu nke iwu ọgbụgba ndụ ahụ.
6 og de syv engler som hadde de syv plager, kom ut av templet, klædd i rent og skinnende lin og ombundet om brystet med gullbelter.
Mmụọ ozi asaa ndị ahụ ji ihe ntaramahụhụ asaa sị nʼụlọnsọ ahụ pụta. Ha yi uwe ogho ọcha, akwa ọcha na-enwu ezigbo ọcha. E kekwasịrị ihe okike ọlaedo gburugburu obi ha.
7 Og et av de fire livsvesener gav de syv engler syv gullskåler fylt med Guds vrede, hans som lever i all evighet. (aiōn )
Otu nʼime anụ anọ ndị ahụ dị ndụ bunyere mmụọ ozi asaa ndị ahụ efere ọlaedo asaa a gbajuru ọnụma Chineke, bụ onye ahụ na-adị ndụ mgbe niile ebighị ebi. (aiōn )
8 Og templet blev fylt med røk av Guds herlighet og av hans makt; og ingen kunde gå inn i templet før de syv englers syv plager var fullendt.
Mgbe ahụ ụlọnsọ ahụ jupụtara nʼanwụrụ ọkụ si nʼebube na ike Chineke na-apụta. O nweghị onye ọbụla nwere ike ịba nʼụlọnsọ ahụ tutu ruo mgbe ntaramahụhụ asaa nke ndị mmụọ ozi asaa ahụ gwụchara.