< Salmenes 79 >
1 En salme av Asaf. Gud! Hedninger har trengt inn i din arv, de har gjort ditt hellige tempel urent, de har gjort Jerusalem til grushoper.
Abụ Ọma Asaf. O Chineke, mba dị iche iche abatala nʼihe nketa gị; ha emerụọla ụlọnsọ ukwuu gị, ha etikpọọla Jerusalem, mee ka ọ tọgbọrọ nʼefu.
2 De har gitt dine tjeneres lik til føde for himmelens fugler, dine helliges kjøtt til ville dyr.
Ha ewerela ozu ndị ohu gị nye anụ ufe niile nke eluigwe ka ọ bụrụ ihe oriri nye ha, werekwa ozu nke ndị nsọ gị nye anụ ọhịa niile nke ụwa.
3 De har utøst deres blod som vann rundt omkring Jerusalem, og der var ingen som la dem i graven.
Ha awụpụla ọbara dịka mmiri nʼakụkụ niile nke Jerusalem, ọ dịghị otu onye fọdụrụ nke ga-eli ndị nwụrụ anwụ.
4 Vi er blitt til skam for våre naboer, til spott og hån for dem som er omkring oss.
Anyị aghọọla ihe ịta ụta nʼebe ndị agbataobi anyị nọ, ghọọkwara ndị gbara anyị gburugburu ihe ịchị ọchị, na ihe ịkwa emo.
5 Hvor lenge, Herre, vil du være vred evindelig? Hvor lenge skal din nidkjærhet brenne som ild?
O Onyenwe anyị, ruo olee mgbe? Ị ga-ewe iwe ruo mgbe ebighị ebi? Ruo olee mgbe ka ekworo gị ga na-ere dịka ọkụ?
6 Utøs din harme over hedningene, som ikke kjenner dig, og over de riker som ikke påkaller ditt navn!
Wụkwasị mba niile ndị na-amaghị gị dịka Chineke oke iwe gị, bụ alaeze niile ndị ahụ na-adịghị akpọku aha gị;
7 For de har fortært Jakob og lagt hans bolig øde.
nʼihi na ha eripịala Jekọb mekwaa ka ebe obibi ya tọgbọrọ nʼefu.
8 Tilregn oss ikke våre forfedres misgjerninger! La din miskunn snarlig komme oss i møte, for vi er såre elendige!
Atala anyị ahụhụ mmehie nke nna nna anyị mere; ka ebere gị bịa ngwangwa zute anyị, nʼihi na anyị nọ nʼọnọdụ oke mkpa.
9 Hjelp oss, vår frelses Gud, for ditt navns æres skyld, og fri oss og forlat oss våre synder for ditt navns skyld!
Nyere anyị aka, O Chineke, Onye Nzọpụta anyị, nʼihi ebube nke aha gị; napụta anyị, gbaghara mmehie anyị niile nʼihi aha gị.
10 Hvorfor skal hedningene si: Hvor er deres Gud? La det for våre øine kjennes blandt hedningene at dine tjeneres utøste blod blir hevnet,
Gịnị mere ndị mba ọzọ ji na-ajụ ajụjụ sị, “Olee ebe Chineke ha nọ?” Nʼihu anyị, mee ka a mara nʼetiti ndị mba ọzọ, na ị na-abọ ọbọ ọbara ndị ohu gị niile a wufuru.
11 la den fangnes sukk komme for ditt åsyn, la dødens barn bli i live efter din arms styrke,
Gee ntị nʼịsụ ude nke ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ; site nʼike nke aka gị chebe ndị niile a mara ikpe ọnwụ.
12 og betal våre naboer syvfold i deres fang den hån som de har hånet dig med, Herre!
Bọọ ọbọ ugboro asaa megide ndị agbataobi anyị nʼihi ụta ha tara gị, O Onyenwe anyị.
13 Og vi, ditt folk og den hjord du før, vi vil love dig evindelig; fra slekt til slekt vil vi fortelle din pris.
Mgbe ahụ, anyị bụ ndị gị, ụmụ igwe atụrụ gị ga-eto gị ruo mgbe niile ebighị ebi; anyị ga na-ekwupụta otuto gị, site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.