< 2 Krønikebok 24 >
1 Joas var syv år gammel da han blev konge, og regjerte firti år i Jerusalem; hans mor hette Sibja og var fra Be'erseba.
Joash gbara afọ asaa mgbe e mere ya eze, ọ chịrị iri afọ anọ na Jerusalem. Aha nne ya bụ Zibịa onye Bịasheba.
2 Joas gjorde hvad rett var i Herrens øine, så lenge presten Jojada levde.
Joash mere ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị nʼafọ niile nke Jehoiada bụ onye nchụaja, dị ndụ.
3 Jojada lot ham få to hustruer, og han fikk sønner og døtre.
Jehoiada lụtaara ya ndị inyom abụọ, ndị mụtaara ya ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
4 Siden fikk Joas i sinne å sette Herrens hus i stand.
Mgbe ihe ndị a gasịrị, Joash kpebiri ime ka ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị dị ọhụrụ.
5 Og han samlet prestene og levittene og sa til dem: Dra ut til byene i Juda og samle inn penger fra hele Israel til å utbedre eders Guds hus efter som det trenges fra år til år, og skynd eder med å gjøre dette! Men levittene skyndte sig ikke dermed.
Ọ kpọkọtara ndị nchụaja na ndị Livayị niile sị ha, “Gaanụ nʼobodo Juda niile nakọta ego ụtụ afọ nʼaka ndị Izrel niile, maka iwuzi ụlọnsọ Chineke unu. Meenụ ya ugbu a.” Ma ndị Livayị emeghị ya ngwangwa.
6 Da kalte kongen til sig ypperstepresten Jojada og sa til ham: Hvorfor har du ikke sett efter at levittene kommer med den avgift fra Juda og fra Jerusalem som er pålagt av Herrens tjener Moses, og som Israels menighet skal utrede til vidnesbyrdets telt?
Ya mere, eze kpọrọ Jehoiada bụ onyeisi nchụaja sị ya, “Gịnị mere i mebeghị ka ndị Livayị gaa nakọtaa, site nʼaka ndị bi nʼobodo Juda niile, na nʼobodo Jerusalem, ego ụtụ nke Mosis ohu Onyenwe anyị na ọgbakọ ụmụ Izrel nyere nʼiwu maka ụlọ ikwu nke iwu ọgbụgba ndụ?”
7 For den ugudelige Ataljas sønner har ødelagt Guds hus, og endog alle de hellige ting i Herrens hus har de brukt til Ba'alene.
Nʼoge a ụmụ ndị ikom Atalaya, nwanyị ọjọọ ahụ tipuru ụlọnsọ Chineke, bukọrọ ihe nsọ niile e ji efe Onyenwe anyị dị nʼime ya maka Baal.
8 Så bød kongen at de skulde gjøre en kiste og sette den utenfor porten til Herrens hus.
Ya mere, eze nyere iwu ka e wuo igbe onyinye, nke a ga-adọba nʼọnụ ụzọ e si abanye ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.
9 Og det blev kunngjort i Juda og Jerusalem at folk skulde komme til Herren med den avgift som Guds tjener Moses hadde pålagt Israel i ørkenen.
A kpọsara ya na Juda na Jerusalem niile sị ka ha wetara Onyenwe anyị ụtụ nke Mosis ohu Chineke kwagidere ụmụ Izrel nʼọzara na ha ga na-atụ.
10 Da bar alle høvdingene og alt folket pengene frem med glede og kastet dem i kisten, til alt var kommet inn.
Ndịisi na ndị mmadụ niile jiri obi ụtọ tụta ụtụ ha. Ha jiri onyinye ha bịa tụnye ha nʼigbe onyinye ahụ, tutu rụọ mgbe o juru nʼọnụ.
11 Og hver gang kisten av levittene blev båret inn til kongens tilsynsmenn, og de så at det var mange penger i den, da kom kongens skriver og den av ypperstepresten innsatte tilsynsmann og tømte den, og så bar de den tilbake på dens plass. Således gjorde de dag efter dag og samlet en mengde penger.
Mgbe ọbụla ndị Livayị bubataara ndị ozi eze igbe ahụ, ha hụ na-atụjuola ya ego, ode akwụkwọ eze ya na onyeozi nke onyeisi nchụaja ga-awụpụta ihe dị nʼigbe, ma bughachi okpokoro igbe ahụ nʼọnọdụ ya. Otu a ka ha mere ọtụtụ oge ruo mgbe ha nwetara ọtụtụ ego dị ukwuu.
12 Så overgav kongen og Jojada dem til dem som forestod arbeidet på Herrens hus, og de leide stenhuggere og tømmermenn til å sette Herrens hus i stand og likeledes jernsmeder og kobbersmeder til å utbedre Herrens hus.
Eze na Jehoiada weere ego ahụ niile nyefee ha nʼaka ndị ọrụ ụlọ Onyenwe anyị dị nʼaka, ha chọtara ndị ọka na-edo nkume, na ndị ọkpọ ǹtu. Ha tinyere ọrụ ime ka ụlọnsọ ahụ dị ọhụrụ nʼaka ndị a. Ha gokwara ndị ụzụ bịara kpụọ ihe niile gbasara bronz na igwe e ji rụọ ọrụ ahụ.
13 Og arbeidsfolkene arbeidet, og utbedringsarbeidet skred frem under deres hender, og de satte Guds hus i stand igjen efter dets rette mål og gjorde det sterkt.
Ndị e nyefere ọrụ ahụ nʼaka ji obi ha niile rụọ ọrụ nke mere na ọrụ ahụ gara nʼihu nke ọma. Ha rụziri ụlọnsọ ukwu Chineke dịka atụmatụ ya mbụ si dị, meekwa ya ka o sie ike karịa.
14 Og da de var ferdige, bar de resten av pengene til kongen og Jojada, og han lot gjøre redskaper derav til Herrens hus: redskaper til tjenesten og ofringen og skåler og gullkar og sølvkar. Og de ofret stadig brennoffere i Herrens hus, så lenge Jojada levde.
Mgbe ha rụsịrị ọrụ niile, ha weghachitere ego fọdụrụ, nye ya eze na Jehoiada, ha were ya rụta ngwa ije ozi maka ụlọnsọ Onyenwe anyị, ngwa ije ozi na ihe isure aja nsure ọkụ, na ngaji, ya na efere dị iche iche, na ihe ọlaọcha na ọlaedo. A na-achụ aja nsure ọkụ nʼụlọnsọ nye Onyenwe anyị ụbọchị niile Jehoiada dị ndụ.
15 Men Jojada blev gammel og mett av dager og døde; han var hundre og tretti år gammel da han døde.
Ma Jehoiada mere nnọọ agadi, jupụtakwa nʼọtụtụ afọ, ọ nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ na iri afọ atọ.
16 De begravde ham i Davids stad hos kongene, fordi han hadde gjort vel mot Israel og mot Gud og hans hus.
E liri ya nʼebe a na-eli ndị eze nʼobodo Devid nʼihi ihe ọma niile o meere Izrel na Chineke na ụlọnsọ ya.
17 Men efter Jojadas død kom Judas høvdinger og kastet sig ned for kongen; da gav kongen efter,
Mgbe Jehoiada nwụsịrị, ndịisi Juda bịara ịkwanyere eze Joash ugwu. O gekwara ha ntị.
18 og de forlot Herrens, sine fedres Guds hus og dyrket Astartebilledene og de andre avguder; og det kom vrede over Juda og Jerusalem for denne deres brøde.
Ha hapụrụ ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị Chineke nna nna ha, fee ogidi Ashera na arụsị ndị ọzọ. Nʼihi ikpe ọmụma ha wetaara onwe ha, iwe Chineke dakwasịrị Juda na Jerusalem.
19 Og Herren sendte profeter blandt dem for å føre dem tilbake til sig, og de advarte dem, men de hørte ikke på dem.
Onyenwe anyị zitere ọtụtụ ndị amụma, ndị bịara buo amụma maka ịkpọghachi ha azụ, ma ha mesiri obi ha ike, jụ ige ntị.
20 Da kom Guds Ånd over Sakarias, presten Jojadas sønn, og han stod frem for folket og sa til dem: Så sier Gud: Hvorfor overtreder I Herrens bud? På den måte kan det ikke gå eder vel. Fordi I har forlatt Herren, forlater han eder.
Mgbe ahụ, Mmụọ nke Chineke bịakwasịrị Zekaraya nwa Jehoiada onye nchụaja. O guzoro nʼihu ọha na eze gwa ha okwu sị; “Otu a ka Chineke sịrị, ‘Gịnị mere unu ji enupu isi nʼiwu Onyenwe anyị? Ihe agaghị agara unu nke ọma. Unu agbakụtala Onyenwe anyị azụ, ugbu a, ya onwe ya agbakụtakwala unu azụ.’”
21 Men de sammensvor sig mot ham og stenet ham på kongens befaling i forgården til Herrens hus.
Ma ndịisi Juda niile gbara izu megide ya, sitekwa nʼiwu eze nyere ha ji nkume tugbuo ya nʼogige ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.
22 Kong Joas kom ikke i hu den kjærlighet som hans far Jojada hadde vist ham - han drepte hans sønn; men i det samme han døde, ropte han: Herren skal se det og hevne det!
Eze Joash echetaghị ebere nke nna Zekaraya bụ Jehoiada meere ya kama o gburu nwa ya. Ma mgbe ọ na-anwụ, ọ sịrị, “Ka Onyenwe anyị hụkwa mmeso ọjọọ a ma kwụọkwa unu ụgwọ ajọ omume unu niile.”
23 Så skjedde det, da året var til ende, at syrernes hær drog op mot ham; de kom til Juda og Jerusalem og utryddet alle høvdingene i folket og sendte alt det hærfang de tok, til kongen i Damaskus.
O ruo ka ọ gbara otu afọ, ndị agha Aram bịara imegide Joash, ha wakporo Juda na Jerusalem gbuo ndị ndu niile site nʼetiti ndị mmadụ. Ha zigaara eze ha nọ na Damaskọs ihe niile ha kwatara nʼike.
24 Syrerhæren som kom, var bare liten; men enda gav Herren en meget tallrik hær i deres hånd, fordi de hadde forlatt Herren, sine fedres Gud. Således fullbyrdet de straffedommen over Joas.
Nʼagbanyeghị na ndị Aram kpọọ naanị ndị ikom ole na ole bịa, Onyenwe anyị raara igwe ndị agha dị ukwuu ranye ha nʼaka. Nʼihi na Juda gbakụtara Onyenwe anyị azụ, bụ Chineke nke nna nna ha, e mezuru ihe niile e kpere nʼikpe nʼahụ Joash.
25 Og da de drog bort fra ham - for de lot ham tilbake i svære lidelser - sammensvor hans tjenere sig mot ham, fordi han hadde drept presten Jojadas sønner, og de drepte ham på hans leie. Således døde han, og de begravde ham i Davids stad, men ikke i kongegravene.
Mgbe ndị agha Aram lara, hapụ Joash nʼọnọdụ mmerụ ahụ dị ukwuu, ndịisi ozi ya gbara izu gbuo ya, nʼihi ogbugbu o gburu nwa Jehoiada, onye nchụaja. Ha gburu ya mgbe o dina nʼihe ndina ya. Emesịa, ha liri ya nʼobodo Devid, ma ọ bụghị nʼebe a na-eli ndị eze.
26 De som sammensvor sig mot ham, var Sabad, sønn av ammonitterkvinnen Sim'at, og Josabad, sønn av moabitterkvinnen Simrit.
Ndị gbara izu gbuo ya bụ Zabad, onye nne ya bụ Shimeat onye Amọn, na Jehozabad, onye nne ya bụ Shimrit onye Moab.
27 Om hans sønner og de mange profetord som blev talt imot ham, og den grundige utbedring av Guds hus, derom er det skrevet i kongenes historiebok; og hans sønn Amasja blev konge i hans sted.
Ihe niile gbasara Joash na ụmụ ya, na amụma niile e buru banyere ya, na otu e si wuzie ụlọnsọ ukwu Chineke, ka e dere nʼakwụkwọ akụkọ ndị eze Izrel niile. Mgbe Joash nwụrụ, Amazaya nwa ya ghọrọ eze Juda.