< Yohani 1 >
1 Penapo pakutumbula, kwakona vindu vyoha viwumbiki lepi avili mmonga mweakemeliwi Lilovi. Lilovi avili na Chapanga. Mwene avili Chapanga.
Na mbụ okwu ahụ dịrịị, okwu ahụ na Chineke nọ, okwu ahụ bụkwa Chineke.
2 Kuhuma kutumbula avili pamonga na Chapanga.
Ya na Chineke nọ site na mbụ.
3 Kupitila mwene, Chapanga awumbili vindu vyoha, kawaka chindu hati chimonga chechawumbiki changali mwene.
E sitere na ya kee ihe niile, ọ dịghịkwa ihe ọbụla e kere eke nke a na-ekeghị site na ya.
4 Mwene ndi chinyepa cha wumi na wumi wene uletili lumuli kwa vandu.
Nʼime ya ka ndụ dịrịị, ndụ ahụ bụkwa ìhè nye mmadụ niile,
5 Lumuli lwenulo lulangasa kuchitita, na chene chitita chihotola lepi kulujimisa.
ìhè ahụ na-enwu nʼime ọchịchịrị, ma ọchịchịrị ahụ emenyụghị ya.
6 Chapanga amtumili mundu mmonga liina laki Yohani,
Ọ dị otu nwoke Chineke zitere, aha ya bụ Jọn.
7 mwene abweli kuvajovela vandu kuluvala lumuli lwenulo. Abweli muni vandu voha vayuwana na kusadika ujumbi waki.
Ọ bịara dị ka onye akaebe ịgba ama banyere ìhè ahụ, ka mmadụ niile site nʼaka ya kwere.
8 Yohani mwene avi lepi lumuli lwenulo, nambu abweli kuvajovela vandu kuluvala lumuli lwenulo.
Ya onwe ya abụghị ìhè ahụ, ọ bịara naanị ịgba akaebe banyere ìhè ahụ.
9 Lwenulo ndi lumuli lwa chakaka, lumuli lwelubwela pamulima na kuvalangasila vandu voha.
Ezi ìhè ahụ nke na-enye mmadụ ọbụla ìhè na-abịa nʼime ụwa.
10 Hinu, lilovi lila avili pamulima na kupitila mwene Chapanga awumbili mulima, nambu vandu va pamulima wammanyili lepi.
Ọ bịara nʼụwa, ma ụwa bụ ihe e kere site nʼaka ya, ma ụwa amataghị onye ọ bụ.
11 Abwelili pavandu vaki mwene, nambu vandu vaki vampokili lepi.
Ọ bịakwutere ihe ndị ahụ bụ ndị nke ya, ma ndị ahụ bụ ndị nke ya anabataghị ya.
12 Nambu vandu vevampokili, na kumsadika, avapeli uhotola wa kuvya vana va Chapanga.
Ma ndị ahụ niile nabatara ya, ndị ahụ niile kweere nʼaha ya ka o nyere ike ịghọ ụmụ Chineke.
13 Vavi vana va Chapanga lepi kwa kuvelekewa ngati vandu chevivelekewa. Amala vavelikwi lepi ngati vandu chevigana, nambu kwa maganu ga Chapanga mwene.
Ụmụ a na-amụghị site nʼọbara, maọbụ site na mkpebi nke anụ ahụ, ma ọ bụkwanụ mkpebi nke mmadụ, kama site na Chineke.
14 Lilovi lila akavya mundu, akatama kwitu. Ndi tiuwene ukulu waki, ukulu waki mwene nga Mwana wa Dadi Chapanga, amemili ubwina wa Chapanga na uchakaka.
Okwu ahụ ghọrọ anụ ahụ birikwa nʼetiti anyị. Anyị ahụla ebube ya, ebube nke onye naanị ya bụ Ọkpara Nna mụrụ, onye si nʼebe Nna nọ bịa, onye jupụtara nʼamara na eziokwu.
15 Yohani avajovili vandu malovi gaki. Akajova kwa lwami, “Mwenuyu ndi yula mwenamuluwili penajovili, ‘Ibwela mundu mweigelekela pahali pangu mkulu kuliku nene, muni amali kuvya kwakona nene kuvelekewa.’”
Jọn gbara ama banyere ya mgbe ọ na-eti mkpu na-asị, “Onye a bụ onye ahụ m kwuru banyere ya, ‘Onye na-abịa m nʼazụ dị ukwuu karịa m, nʼihi na o bukwa m ụzọ dịrị.’”
16 Ndava cheavili ubwina waki wamahele tete tavoha tipokili mota yamahele.
Site nʼịba ụba nke amara ya, anyị niile anatala amara a tụkwasịrị nʼamara.
17 Chapanga atipeli malagizu kupitila Musa, nambu ubwina wa Chapanga na chakaka utibwelili kupitila Yesu Kilisitu.
Nʼihi na e nyere iwu site nʼaka Mosis, ma amara na eziokwu bịara site nʼaka Jisọs Kraịst.
18 Kawaka mundu mweamuwene Chapanga katu. Nambu nga Mwana waki yuyo mweavi Chapanga na mweaganiwi na Dadi, mwene atimanyisi mambu gaki.
Ọ dịbeghị onye ọbụla hụrụla Chineke, ma Chineke, onye naanị ya bụ Ọkpara Nna mụrụ. Onye ya na Nna dị na mma, emeela ka anyị mata ya.
19 Genaga ndi malovi Yohani geajovili ndava yaki lukumbi vachilongosi va Vayawudi ku Yelusalemu pevavatumili vamteta va Chapanga na Valawi vamkotayi, “Veve wayani?”
Nke a bụ ịgba ama Jọn mgbe ndị ndu ndị Juu nọ na Jerusalem zipụrụ ndị nchụaja na ndị Livayị ka ha bịa jụọ ya onye ọ bụ?
20 Yohani abelili lepi kuyangula likotesi lenilo, nambu akajova hotohoto, “Nene lepi Kilisitu Msangula.”
O mechighị ọnụ ya, kama o kwupụtara sị, “Abụghị m Kraịst ahụ.”
21 Kangi vakamkota, “Hinu veve ndi wayani? Wu, veve ndi Eliya?” Yohani akayangula, “Lepi.” Vakamkota kangi, “Veve ndi yula mlota wa Chapanga?” Akavayangula, “Lepi!”
Mgbe ahụ ha jụrụ ya sị, “Ị bụkwanụ onye? Ị bụ Ịlaịja?” Ọ zara sị ha, “Abụghị m ya.” “Ị bụ Onye amụma ahụ?” “Mba.”
22 Kangi vakamkota, “Hinu wayani veve? Wijova wuli kukuvala wamwene? Utijovelayi na tete tikavayangula vevatitumili.”
Ha sịrị ya, “Ị bụ onye? Nye anyị ọsịsa anyị ga-eweghachiri ndị zitere anyị. Gịnị ka i kwuru banyere onwe gị?”
23 Yohani akayangula, nene ndi yula mlota Isaya ajovili malovi gaki, “Nene ndi lwami lwa mundu ikemela kulugangatu. ‘Mgolosayi njila ya Bambu.’”
Ọ sịrị, dịka Aịzaya onye amụma kwuru, “Abụ m onye na-eti mkpu nʼime ọzara, ‘Meenụ ka ụzọ Onyenwe anyị guzozie.’”
24 Vandu avo vatumwili na Vafalisayu,
Ma ndị Farisii ahụ ezitere
25 vakamkota Yohani, “Ngati veve lepi Kilisitu Msangula mweahaguliwi na Chapanga, amala Eliya, amala mlota wa Chapanga, ndava kyani wibatiza?”
jụrụ ya, sị, “Gịnị mere i ji na-eme baptizim ọ bụrụ na ị bụghị Kraịst maọbụ Ịlaịja, maọbụ onye amụma ahụ?”
26 Yohani akavayangula, “Nene nibatiza kwa manji, nambu avi mmonga pagati yinu, mwakona kummanya.
Jọn zara ha sị, “Eji m mmiri na-eme baptizim, ma ọ dị otu onye nọ nʼetiti unu nke unu na-amaghị.
27 Mweibwela pahali pangu, ndi nene niganikiwa lepi hati kuwopola nyosi za champali zaki.”
Onye ahụ nke na-abịa nʼazụ m, onye m na-erughị ịtọpụ eriri akpụkpọụkwụ ya.”
28 Mambu genago gakitiki kumuji wa Betania, kumwambu ya mfuleni Yoludani, Yohani kweavi mukubatiza.
Ihe a mere na Betani nʼofe osimiri Jọdan bụ ebe Jọn nọ na-eme baptizim.
29 Chilau yaki, Yohani amuwene Yesu akumbwelela akajova, “Lola, mwenuyu ndi Mwana limbelele wa Chapanga, ndi mweiwusa kumbudila Chapanga pamulima!
Nʼechi ya, ọ hụrụ ka Jisọs na-abịakwute ya sị, “Leekwa, Nwa Atụrụ Chineke, onye na-ebupụ mmehie ụwa.
30 Ndi mwenamlongalili yula penajovili, ‘Pahali pa nene ibwela mundu mkulu kuliku nene, mwene avili kwakona nene kuvelekewa!’
Ọ bụ onye a ka m kwuru okwu ya mgbe ahụ m sịrị, ‘otu nwoke na-abịa nʼazụ m, onye dị ukwuu karịa m, nʼihi na o bukwa m ụzọ dịrị.’
31 Hati namwene nangammanya, nambu nibweli kubatiza na manji muni vandu va Isilaeli vammanyayi.”
Mụ onwe m amataghị ya, ma a bịara m were mmiri na-eme baptizim nʼihi nke a, ka e kpughee ya nye ndị Izrel.”
32 Kangi Yohani atijovili gala geagawene, “Namuwene Mpungu Msopi akumuhelelela ngati ngunda kuhuma kunani na kutula panani yaki.
Mgbe ahụ Jọn gbara ama a sị, “Ahụrụ m ka Mmụọ Nsọ sitere nʼeluigwe rịdata dị ka nduru, nọkwasị ya.
33 Nene nangammanya, nambu yula mweanitumili kubatiza vandu na manji amali kunijovela, ‘Mundu mweakumlola Mpungu Msopi akumuhelelela kuhuma kunani na kutama panani yaki, ndi mweibatiza na Mpungu Msopi.’
Mụ onwe m amabughị ya, ma onye ahụ zitere m ka m jiri mmiri mee baptizim kwuru, ‘Onye ahụ ị ga-ahụ, onye Mmụọ Nsọ ga-ebekwasị, ma nọgidekwa, ọ bụ ya ga-eji Mmụọ Nsọ mee baptizim.’
34 Kangi Yohani akajova nene nigalolili mambu aga na nikuvajovela uchakaka kuvya mwenuyu ndi Mwana waki Chapanga.”
Mụ onwe m ahụla ya, na-agbakwa ama na onye a bụ Ọkpara Chineke.”
35 Kangi chilau yaki, Yohani avili pandu penapo, pamonga na vawuliwa vaki vavili.
Nʼechi ya, Jọn na mmadụ abụọ ndị na-eso ụzọ ya guzoro nʼebe ahụ ọzọ.
36 Peamuwene Yesu ipita akajova, “Lola! Uyu ndi Mwana Limbelele wa Chapanga.”
Mgbe ọ hụrụ Jisọs ka ọ na-agafe, ọ sịrị, “Leenụ, Nwa Atụrụ Chineke.”
37 Vawuliwa vavili vala pevayuwini malovi geajovayi Yohani gala vakamlanda Yesu.
Mgbe mmadụ abụọ ahụ na-eso ụzọ ya nụrụ nke a, ha tụgharịrị soro Jisọs.
38 Yesu ang'anamwiki, avawene vawuliwa vala vakumlanda, akavakota, “Mwilonda kyani?” Vakamkota, “Labi witama koki?” Labi mana yaki Muwula.
Mgbe Jisọs tụgharịrị hụ ka ha na-eso ya, ọ sịrị ha, “Gịnị ka unu chọrọ?” Ha sịrị ya, “Rabbi” (nke pụtara “Onye ozizi”), “olee ebe i bi?”
39 Yesu akavajovela, “Mbwela, na nyenye yati mwilola,” Vawuliwa vala vakamlanda yavili lukumbi lwa saa kumi ya kimihi na vakatama kwaki ligono lenilo.
Ọ sịrị ha, “Bịanụ, unu ga-ahụ.” Ha sooro ya ga hụ ebe ọ na-anọ. Ha nọnyekwara ya ụbọchị ahụ niile. Ọ bụ nʼihe dị ka elekere anọ nke mgbede.
40 Andelea, mlongo waki Simoni Petili avi mmonga pagati ya vavili avo vevamyuwini Yohani geajovili, vakamlanda Yesu.
Otu nʼime mmadụ abụọ ahụ nụrụ ihe Jọn kwuru, nke sooro ya bụ Andru nwanne Saimọn Pita.
41 Andelea akatumbula kumlonda Simoni mlongo waki, akamjovela “Timuwene Msangula.” Ndi kujova “Kilisitu.”
Ihe mbụ o mere bụ ịchọta Saimọn nwanne ya sị ya, “Anyị achọtala Mezaya ahụ” (onye a na-akpọkwa Kraịst).
42 Kangi ampeliki Simoni kwa Yesu. Ndi Yesu akamlolokesa Simoni akajova, “Simoni veve mwana wa Yohani. Hinu yati ukemelewa Kefa,” Kwa Chigiliki ndi Petili, mana yaki “Litalau.”
Ọ kpọtaara ya Jisọs. O lere ya anya sị, “Ị bụ Saimọn nwa Jọn. A ga-akpọ gị Sefas” (nke nsụgharị ya, pụtara Pita).
43 Chilau yaki Yesu akawuka, kuhamba kumulima wa Galilaya ndi amkolili Filipi, akamjovela “Nilandayi.”
Nʼechi ya, o kpebiri ịga Galili. Mgbe ọ hụrụ Filip, ọ sịrị ya, “Soro m.”
44 Filipi mkolonjinji wa ku Betisaida, muji wevitama Andelea na Petili.
Filip bụ onye obodo Betsaida dị ka Andru na Pita.
45 Filipi amkoli Natanyeli, akamjovela, “Timuwene mwene, mweayandikiwi na Musa muchitabu cha malagizu, na vamlota va Chapanga vayandiki mambu gaki, Yesu wa kuhuma kumuji wa Nazaleti mwana wa Yosefu.”
Filip chọtara Nataniel sị ya, “Anyị achọtala onye ahụ Mosis dere banyere ya nʼiwu, onye ndị amụma dekwara banyere ya, Jisọs onye Nazaret, nwa Josef.”
46 Natanyeli akamkota Filipi, “Chindu cha bwina chihotola wuli kuhumila ku Nazaleti?” Mwene akamjovela, “Bwelayi ulole.”
Nataniel sịrị ya, “Ihe ọma ọbụla ọ pụrụ i si na Nazaret pụta?” Ma Filip sịrị ya, “Bịa ka ị hụrụ.”
47 Yesu peamuwene Natanyeli akumbwelela, akajova, “Lola! Chakaka mwenuyu ndi Mwiisilaeli chakaka, kawaka udese mugati yaki hati padebe.”
Mgbe Jisọs hụrụ ka Nataniel na-abịaru ya nso, o kwuru sị, “Leenụ ezi nwa afọ Izrel onye aghụghọ na-adịghị nʼime ya.”
48 Natanyeli akamkota Yesu, “Unimanyi wuli?” “Mwene akamyangula, kwakona Filipi angakukemela nakuwene pewavi pahi pa mkongo wa mkuyu.”
Nataniel sịrị ya, “Olee otu i si mata onye m bụ?” Jisọs sịrị ya, “Tupu Filip akpọ gị, ahụlarị m gị ka ị nọ nʼokpuru osisi fiig.”
49 Penapo Natanyeli akamjovela, “Muwula,” Veve ndi Mwana wa Chapanga! “Veve ndi Nkosi wa Isilaeli!”
Mgbe ahụ, Nataniel zaghachiri, “Onye ozizi, ị bụ Ọkpara Chineke; ị bụ eze Izrel.”
50 Yesu akamjovela usadika ndava nikujovili nakuwene pahi ya mkongo wa mkuyu? Yati ukugawona gavaha neju ya aga.
Jisọs zara sị ya, “I kwere nʼihi na agwara m gị na ahụrụ m gị nʼokpuru osisi fiig? Ị ga-ahụ ihe dị ukwuu karịa nke a.”
51 Ndi akayonjokesa kujova, “Chakaka nikuvajovela, yati mwilola kunani kwa Chapanga kudinduka na vamitumu va kunani kwa Chapanga vikwela na kuhelela panani pa Mwana wa Mundu.”
Ọ sịkwara ya, “Nʼezie, nʼezie agwa m unu, unu ga-ahụ eluigwe ka o meghere hụkwa ndị mmụọ ozi Chineke ka ha na-arịgokwuru, ma na-arịdakwuru Nwa nke Mmadụ.”