< KwabaseRoma 9 >

1 Ngikhuluma iqiniso kuKristu, kangiqambi manga, isazela sami sifakazelana lami ngoMoya oNgcwele,
Ana m ekwu eziokwu nʼime Kraịst. Anaghị m ekwu okwu ụgha. Akọnuche m nke Mmụọ Nsọ na-achị na-agbakwara m ama.
2 ukuthi ngilokudabuka okukhulu, lobuhlungu obungapheliyo enhliziyweni yami.
A nọ m nʼọnọdụ oke ihe mwute na ihe mgbu dị ukwuu nʼobi m.
3 Ngoba ngingafisa ukuthi mina uqobo ngiqalekiswe kuKristu ngenxa yabazalwane bami, izihlobo zami ngokwenyama;
A sị na ọ bụ ihe ga-ekwe mee, ejikeere m ịbụ onye a bụrụ ọnụ na onye e wepụrụ site nʼebe Kraịst nọ nʼihi ụmụnna m na ndị ikwu m,
4 abangamaIsrayeli, okungokwabo ukuma kwabantwana, lenkazimulo, lezivumelwano, lokunikwa komlayo, lenkonzo kaNkulunkulu, lezithembiso,
bụ ndị Izrel. Ndị Chineke họọrọ ka ha bụrụ ụmụ ya, ndị o nyere ebube ya na ọgbụgba ndụ ya. O nyekwara ha iwu na ife ofufe nʼụlọnsọ ukwu ahụ na ọtụtụ nkwa dị iche iche.
5 abangababo obaba, njalo avela kubo uKristu ngokwenyama, ophezu kwakho konke, uNkulunkulu obongekayo kuze kube nininini. Ameni. (aiōn g165)
Ha si nʼagbụrụ nna nna anyị ochie ha. Kraịst nʼonwe ya, nʼụdịdị mmadụ, sikwa nʼagbụrụ ha pụta, onye bụ Chineke nke ihe niile, onye a na-eto ruo ebighị ebi. Amen. (aiōn g165)
6 Kodwa kakunjengokuthi ilizwi likaNkulunkulu lehlulekile. Ngoba kakusibo bonke abavela kuIsrayeli, abanguIsrayeli;
Ọ bụghị dị ka a ga-asị na okwu Chineke na-ala azụ. Nʼihi na ọ bụghị onye ọbụla a mụrụ nʼezinaụlọ ndị Izrel bụ onye Izrel.
7 njalo kungesikuthi ngoba bayinzalo kaAbrahama, bonke bangabantwana; kodwa: NgoIsaka inzalo izabizelwa kuwe.
Na ha sitere nʼagbụrụ Ebraham pụta emeghị ka ha bụrụ ụmụ Ebraham nʼezie. Ma nʼakụkụ nke ọzọ, “Ọ bụ site nʼAịzik ka a ga-akpọ mkpụrụ gị aha.”
8 Lokhu kutsho ukuthi, kakusibo abantwana benyama, bona bangabantwana bakaNkulunkulu; kodwa abantwana besithembiso bathiwa yinzalo.
Nke a na-egosi na ọ bụghị ndị niile a mụrụ na-anụ ahụ bụ ụmụ Chineke, kama ụmụ ndị ahụ e kwere na nkwa bụ ndị a na-agụnye dị ka ụmụ Ebraham site na nkwa ahụ.
9 Ngoba ilizwi lesithembiso yileli elokuthi: Ngalesisikhathi ngizafika, njalo uSara uzakuba lendodana.
Lee ka e si kwee nkwa ahụ, “Mgbe oge ahụ a kara aka ruru, aga m alọghachi, Sera ga-amụkwa nwa nwoke.”
10 Kakusikho lokhu kuphela, kodwa loRebeka esekhulelwe ngomunye, ubaba wethu uIsaka;
Ọ bụghị naanị nke a. Ụmụ Ribeka si nʼotu nna, ya bụ nna nna anyị Aịzik.
11 ngoba abantwana bengakazalwa, bengakenzi okuhle loba okubi, ukuze icebo likaNkulunkulu elingokokukhetha lime, kungaveli emisebenzini, kodwa kuvele kobizayo,
Ma tupu a mụọ ụmụ ejima ndị a, ma ọ bụkwanụ tupu ha emee ihe ọbụla dị mma maọbụ nke dị njọ, iji mee ka ọchịchọ Chineke banyere nhọpụta ha guzoro,
12 kwatshiwo kuye ukuthi: Omkhulu uzakhonza omncinyane,
ọ bụghị site nʼọrụ kama ọ bụ site nʼonye ahụ nke na-akpọ, nʼihi na a gwara ya sị, “Nke okenye ga-ejere nke nta ozi.”
13 njengokulotshiweyo ukuthi: UJakobe ngamthanda, kodwa uEsawu ngamzonda.
Dịka e dere ya, “Jekọb ka m hụrụ nʼanya ma Ịsọ ka m kpọrọ asị.”
14 Pho-ke sizakuthini? Kukhona ukungalungi kuNkulunkulu yini? Phinde!
Gịnịkwa ka anyị ga-ekwu? Chineke ọ bụ onye ajọ omume? Mba!
15 Ngoba uthi kuMozisi: Ngizakuba lomusa kwengilomusa kuye, njalo ngimhawukele engimhawukelayo.
Nʼihi na ọ gwara Mosis, “Onye m chọrọ imere ebere ka m ga-emere ebere, ọ bụkwa onye m chọrọ imere ọmịiko ka m ga-enwere ọmịiko.”
16 Ngakho kakusikho kothandayo, njalo kakusikho kogijimayo, kodwa ngokukaNkulunkulu olesihawu.
Ya mere, ọ dabereghị nʼọchịchọ nke mmadụ maọbụ ịrụsị ọrụ ike ya kama ọ dabere nʼebere Chineke.
17 Ngoba umbhalo uthi kuFaro: Ngakuphakamisela khona lokho, ukuze ngibonakalise amandla ami ngawe, njalo ukuze ibizo lami litshunyayelwe emhlabeni wonke.
Nʼihi nʼakwụkwọ nsọ gwara Fero, “Emere m ka ị bụrụ ihe ị bụ nʼihi nke a, ka m were gị zipụta ike m, ka e nwe ike kwusaa aha m nʼụwa niile.”
18 Ngakho uhawukela lowo athanda ukumhawukela; njalo amenze abe lukhuni lowo athanda ukumenza lukhuni.
Ọ pụtara ihe na ọ bụ naanị ndị Chineke chọrọ ka ọ na-emere ebere, ndị ọ chọkwara ka ọ na-eme ka ha bụrụ ndị obi ha kpọchiri akpọchi.
19 Ngakho uzakuthi kimi: Usasolelani? Ngoba ngubani ongamelana lentando yakhe?
Ma eleghị anya unu pụrụ ịgwa m, “Gịnị kwanụ mere o ji ata anyị ụta? Onye kwanụ pụrụ iguzogide ihe o zubere ime?”
20 Hatshi bo, wena muntu, ungubani wena ophikisana loNkulunkulu? Okubunjiweyo kungatsho yini kowakubumbayo ukuthi: Wangenzelani ngabanje?
Onye ka ị bụ gị mmadụ efu, iji ajụ Chineke ajụjụ? “Nkata mmadụ na-akpa ọ ga-ajụ onye na-akpa ya ajụjụ, ‘Onye sị gị kpaa m otu a?’”
21 Kumbe umbumbi kalagunya yini phezu kwebumba, ukuthi ngesigaqa sisinye enze isitsha esinye esihloniphekayo, lesinye esingahloniphekiyo?
Otu a kwa, onye ọkpụ ite o nweghị ike isite nʼotu ụrọ ahụ o nwere kpụọ ụdị ite ọbụla masịrị ya, ụfọdụ ite pụrụ iche na ụfọdụ e ji eje ozi nʼụlọ?
22 Njalo uba uNkulunkulu ethanda ukubonakalisa ulaka lwakhe, lokwazisa amandla akhe, wathwala ngokubekezela okukhulu izitsha zolaka ezilungiselwe ukubhujiswa;
Ọ bụrụkwanụ na Chineke ekpebie igosi iwe ya na ime ka a mara ike ya site nʼinwe oke ndidi banyere ndị oke iwe ya ga-adakwasị bụ ndị a kwadoro maka mbibi?
23 njalo ukuze azise inotho yenkazimulo yakhe phezu kwezitsha zomusa, ayezilungisele ngaphambili inkazimulo,
Ma ọ bụrụkwanụ na o mere nke a iji mee ka ndị ahụ ọ na-emere ebere mata ịba ụba nke ebube ya, bụ ndị o bururị ụzọ kwadoo maka ebube a.
24 ngitsho thina, asibizileyo, kungeyisikho kumaJuda kuphela, kodwa lakwabezizwe?
Ọ bụladị anyị bụ ndị ọ kpọkwara, ọ bụghị naanị site na ndị Juu kama site na ndị mba ọzọ?
25 Njengalokhu akutsho lakuHoseya: Abangeyisibo abantu bami ngizababiza ngokuthi ngabantu bami; lowayengathandwa ngokuthi ngothandekayo;
Dịka o kwuru nʼakwụkwọ Hosiya, “Aga m akpọ ha ‘ndị m,’ bụ ndị na-abụghị ndị m. Aga m akpọkwa ya ‘onye m hụrụ nʼanya’ bụ onye m na-ahụghị nʼanya.”
26 njalo kuzakuthi, endaweni lapho okwathiwa khona kubo: Kalisibo abantu bami, khona lapho bazabizwa ngokuthi ngabantwana bakaNkulunkulu ophilayo.
Ma, “Nʼotu ebe ahụ a nọ sị ha, ‘Unu abụghị ndị m,’ bụkwa ebe a ga-anọ kpọọ ha, ‘Ụmụ nke Chineke dị ndụ.’”
27 LoIsaya umemeza ngoIsrayeli esithi: Lanxa inani labantwana bakoIsrayeli lingangetshebetshebe lolwandle, insali izasindiswa;
Aịzaya bere akwa nʼihi ụmụ Izrel, “Ọ bụ ezie na ọnụọgụgụ ụmụ Izrel dịka uzuzu dị nʼakụkụ osimiri, maọbụ naanị mmadụ ole na ole ka a ga-azọpụta.
28 ngoba uzaqeda isenzo asiqume ngokulunga; ngoba iNkosi izakwenza isenzo siqunywe ngokuphangisa emhlabeni.
Nʼihi na Onyenwe anyị na-aga ikpe ụwa a ikpe. Ọ ga-eme ọsịịsọ nʼikpe ahụ ma kpebie ya.”
29 Njalo njengoba uIsaya watsho ngaphambili ukuthi: Uba iNkosi yamabandla ibingasitshiyelanga inzalo, besizakuba njengeSodoma, njalo besizakwenziwa sifanane leGomora.
Ọ bụkwa dịka Aịzaya kwuru na mbụ, “Ọ bụrụ na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ahapụrụghị anyị ụmụ ụmụ, anyị gara adị ka Sọdọm, anyị gaara adịkwa ka Gọmọra.”
30 Pho sizakuthini? Ukuthi abezizwe abangadingisisi ukulunga, bakubambile ukulunga, ukulunga-ke okungokholo;
Gịnịkwa ka anyị ga-ekwu? Anyị ga-asị na o enyela ndị mba ọzọ na-enweghị oge ha gbasoro ezi omume, ma ha natara ya, bụ ezi omume nke sitere nʼokwukwe,
31 kodwa uIsrayeli, edingisisa umlayo wokulunga, kawufinyelelanga umlayo wokulunga.
ma ndị Izrel na-agbaso iwu nke ezi omume, enwebeghị ike ime onwe ha ndị a ga-anabata.
32 Ngani? Ngoba kabadingisisanga ngokholo, kodwa ngokungathi ngemisebenzi yomlayo; ngoba bakhubeka elitsheni lokukhubekisa,
Gịnị gbochiri ha? Ọ bụ nʼihi na ha agbasoghị ya site nʼokwukwe. Kama ha chere na ọ bụ site nʼọrụ. Ha zọhiere ụkwụ nʼoke nkume ịsọ ngọngọ ahụ.
33 njengokulotshiweyo ukuthi: Khangela ngibeka eSiyoni ilitshe lokukhubekisa ledwala lokuwisa; laye wonke okholwa kuye kayikuyangeka.
Dịka e dere ya, “Lee, ana m atọgbọ na Zayọn nkume nke na-eme ka ndị mmadụ sọọ ngọngọ, oke nkume nke na-eme ka ha daa. Ma onye nke kweere na ya, agaghị eme ka ihere mee ya.”

< KwabaseRoma 9 >