< Amahubo 91 >

1 Ohlezi ekusithekeni koPhezukonke uzahlala emthunzini kaSomandla.
Onye ahụ na-ebi nʼebe mgbaba Onye kachasị ihe niile elu ga-ezu ike nʼokpuru ndo Onye pụrụ ime ihe niile.
2 Ngizakuthi eNkosini: Uyisiphephelo sami lenqaba yami, uNkulunkulu wami, engithemba kuye.
Nke a ka m ga-ekwu maka Onyenwe anyị, “Ọ bụ ebe mgbaba m na ebe nchebe m e wusiri ike, Chineke m, onye m na-atụkwasị obi m.”
3 Sibili yena uzakukhulula emjibileni womthiyi, kuye umatshayabhuqe wesifo obhubhisayo.
Nʼezie, ọ ga-anapụta gị site nʼọnya nke onye osi ọnya na site nʼaka ajọ ọrịa na-efe efe na-eweta ịla nʼiyi.
4 Uzakusibekela ngensiba zakhe, uzathembela langaphansi kwempiko zakhe; iqiniso lakhe liyisihlangu lehawu.
Ọ ga-eji nku ya kpuchie gị. Ọ bụkwa nʼokpuru nku ya abụọ, ka ị ga-agbaba zere ndụ, ikwesi ntụkwasị obi ya ga-echebe gị, ghọkwaara gị ọta.
5 Kawuyikwesaba isesabiso sebusuku, umtshoko ophaphayo emini,
Ị gaghị atụ egwu ihe ịtụ oke egwu nke abalị, maọbụ àkụ na-efegharị nʼehihie,
6 umatshayabhuqe wesifo ohambayo emnyameni, incithakalo ebhubhisayo emini enkulu.
maọbụ ajọ ọrịa na-efe efe, nke na-ejegharị nʼọchịchịrị, ma ọ bụkwanụ ihe mbibi mberede na-eme nʼehihie.
7 Bazakuwa abayinkulungwane eceleni kwakho, labayizinkulungwane ezilitshumi ngakwesokunene sakho; kuwe kakuyikusondela.
Puku mmadụ pụrụ ịda nʼakụkụ gị, iri puku mmadụ nwekwara ike ịda nʼakụkụ aka nri gị, ma ihe ọjọọ ndị a agaghị erute gị nso.
8 Uzakhangela nje ngamehlo akho, ubone impindiselo kwababi.
Ọ bụ naanị anya gị abụọ ka ị ga-eji hụ ntaramahụhụ nke ndị ajọ omume.
9 Ngoba wena, Nkosi, uyisiphephelo sami; umenzile oPhezukonke waba yindawo yakho yokuhlala.
Ọ bụrụ na i mee Onye kachasị ihe niile elu ebe obibi gị, ọ bụladị Onyenwe anyị, onye bụ ebe mgbaba m,
10 Kakulabubi obuzakwehlela, lenhlupheko kayiyikusondela ethenteni lakho.
mgbe ahụ, ihe ọjọọ ọbụla enweghị ike ịdakwasị gị; ihe ike ọbụla enweghị ike ịbịaru ụlọ obibi gị nso.
11 Ngoba uzalaya ingilosi zakhe ngawe, ukuthi zikulondoloze endleleni zakho zonke.
Nʼihi na ọ ga-enye ndị mmụọ ozi ya iwu banyere gị, ka ha chebe gị nʼụzọ gị niile.
12 Zizakuphatha ezandleni, hlezi utshayeke ngonyawo lwakho elitsheni.
Ha ga-eji ọbụ aka ha, bulie gị elu ime ka ị ghara ịkpọbi ụkwụ gị na nkume.
13 Uzanyathela isilwane lebululu, uzagxoba ibhongo lesilwane, lomgobho.
Ị ga-azọkwasị ọdụm na ajụala ụkwụ, zọgbukwaa ọdụm na-akpa ike, na agwọ ọjọọ.
14 Ngoba uyangithanda kakhulu, ngakho ngizamkhulula; ngizambeka phezulu, ngoba uyalazi ibizo lami.
“Nʼihi na ọ hụrụ m nʼanya, Mụ onwe m ga-agbapụta ya, ka Onyenwe anyị kwuru; aga m echebe ya, nʼihi na ọ maara aha m.
15 Uzangibiza, njalo ngimphendule; ngibe laye ekuhluphekeni, ngimkhulule, ngimnike udumo.
Ọ ga-akpọku m, aga m azakwa ya. Aga m anọnyere ya nʼime nsogbu ya, aga m adọpụta, ma sọpụrụkwa ya.
16 Ngizamsuthisa ngobude bezinsuku, ngimtshengise usindiso lwami.
Aga m eji ogologo ndụ mee ka afọ ju ya, gosikwa ya nzọpụta m.”

< Amahubo 91 >