< Amahubo 78 >

1 Lalelani, bantu bami, umthetho wami, libeke indlebe yenu emazwini omlomo wami.
Abụ maskil nke Asaf. Ndị m, nụrụnụ ihe m na-ezi; geenụ ntị nʼokwu ọnụ m.
2 Ngizavula umlomo wami ngomfanekiso, ngikhuphe izimfihlakalo zendulo,
Aga m eji ilu malite okwu m, aga m ekwu ọtụtụ ihe omimi, ihe ndị sitere na mgbe ochie;
3 esizizwileyo lesizaziyo, obaba abasitshela zona.
ihe ndị anyị nụrụla, marakwa, ihe ndị nna nna anyị ha gwara anyị.
4 Kasiyikuzifihlela abantwana babo, kusizukulwana esilandelayo, silandisa izindumiso zeNkosi, lamandla ayo, lezimangaliso ezenzileyo.
Anyị agaghị ezonarị ụmụ anyị ihe ndị a, kama anyị ga-akọrọ ọgbọ nke na-abịa nʼihu akụkọ ịdị ike Onyenwe anyị, na ọrụ ebube ya, na ihe ịtụnanya niile o mere.
5 Ngoba wamisa ubufakazi koJakobe, wabeka umlayo koIsrayeli, awulaya obaba, ukuze bawazise abantwana babo,
O nyere Jekọb iwu banyere ụkpụrụ ya, mekwaa ka iwu ahụ guzosie ike nʼIzrel, bụ nke ọ dọrọ nna nna anyị ha aka na ntị, ka ha kuziere ụmụ ha,
6 ukuze isizukulwana esilandelayo sazi, abantwana abazazalwa, basukume batshele abantwana babo,
ka ọgbọ na-eso ha nwee ike mụta ya, ọ bụladị ọgbọ nke a ka amụbeghị, ndị nke ga-agwakwa ha ụmụ ha.
7 ukuze babeke ithemba labo kuNkulunkulu, bangayikhohlwa imisebenzi kaNkulunkulu, kodwa bagcine imithetho yakhe;
Mgbe ahụ, ha ga-atụkwasị Chineke obi ha, ma ghara ichefu ọrụ ya niile dị iche iche. Ha ga-edebekwa iwu ya niile.
8 njalo bangabi njengaboyise, isizukulwana esilenkani lesivukelayo, isizukulwana esingaqondisanga inhliziyo yaso, lesimoya waso ungathembekanga kuNkulunkulu.
Ha agakwaghị adị ka ndị nna nna ha, ọgbọ ndị nnupu isi na ndị isiike; ndị obi ha na-adịghị nʼebe Chineke nọ, ndị mmụọ ha na-ekwesighị ntụkwasị obi nye ya.
9 Abantwana bakoEfrayimi, behlomile betshoka ngamadandili, babuyela emuva mhla wempi.
Ndị ikom Ifrem, nʼagbanyeghị na ha kwere ụta ha, chigharịrị azụ, gbaa ọsọ nʼụbọchị agha.
10 Kabasilondolozanga isivumelwano sikaNkulunkulu, bala ukuhamba emlayweni wakhe.
Ha edebeghị ọgbụgba ndụ Chineke. Ha jụkwara ibi ndụ dịka iwu ya si dị.
11 Bakhohlwa izenzo zakhe lezimangaliso zakhe ayebatshengisa zona.
Ha chefuru ihe o mere, ọrụ ịtụnanya o gosiri ha.
12 Phambi kwaboyise wenza isimangaliso elizweni leGibhithe, egangeni leZowani.
Chineke rụrụ ọrụ ebube ndị a nʼihu nna nna ha nʼala Ijipt na nʼọhịa Zoan.
13 Waqhekeza ulwandle, wabachaphisa, wenza amanzi ema njengenqumbi.
O kewara oke osimiri, site nʼetiti ya dufee ha. O mere ka mmiri ahụ guzo ọtọ dịka mgbidi.
14 Wabakhokhela ngeyezi emini, lebusuku bonke ngokukhanya komlilo.
O ji igwe ojii duo ha nʼije nʼehihie, jirikwa ìhè sitere nʼọkụ ahụ, duo ha ogologo abalị niile.
15 Waqhekeza amadwala enkangala, wabanathisa kungathi kuvela ezinzikini ezinkulu.
Ọ gbawara oke nkume dị nʼọzara, si otu a nye ha mmiri hiri nne, dịka a ga-asị na ọ bụ mmiri si nʼọtụtụ oke osimiri.
16 Waseveza izifula edwaleni, wenza amanzi ehla njengemifula.
O mere ka mmiri iyi site na nkume gbapụta, mee ka mmiri rudata dịka osimiri.
17 Kodwa baphinda futhi ukona kuye, ngokumvukela oPhezukonke enkangala.
Ha nọgidere na-emehie megide ya. Ha nupuru isi nʼọzara megide Onye kachasị ihe niile elu.
18 Bamlinga uNkulunkulu enhliziyweni yabo ngokucela ukudla kwenkanuko yabo.
Ha kpachara anya nwaa Chineke ọnwụnwa, mgbe ha rịọrọ ya nri nke obi ha chọrọ.
19 Basebekhuluma bemelene loNkulunkulu bathi: UNkulunkulu angalungisa itafula enkangala yini?
Ha kwuhiere Chineke; jụọ ya ọnụ sị, “Chineke ọ pụrụ inye anyị ezi nri na mmiri ọṅụṅụ nʼọzara a?
20 Khangela, watshaya idwala, kwampompoza amanzi, lezifula zagabha; anganika lesinkwa yini? angalungisela abantu bakhe inyama na?
Ọ bụ ezie na o tiri nkume ahụ ihe, mee ka mmiri sọpụta, mmiri iyi sọpụtara nʼebe o hiri nne, ma ọ pụrụ inye anyị nri? Ọ pụrụ inye ndị ya anụ?”
21 Ngakho iNkosi yezwa yathukuthela; umlilo wasubaselwa uJakobe, njalo lolaka lwavukela uIsrayeli,
Mgbe Onyenwe anyị nụrụ ihe ha kwuru, iwe were ya; ọkụ ya repịara Jekọb, iwe ọkụ ya biliri megide Izrel.
22 ngoba kabakholwanga kuNkulunkulu, kabathembanga esindisweni lwakhe.
Nʼihi na ha ekwenyeghị na Chineke, maọbụ tụkwasị obi na nzọpụta ya.
23 Lanxa walaya amayezi ngaphezulu, wavula iminyango yamazulu,
Nʼagbanyeghị ihe ndị a, o nyere mbara eluigwe iwu meghekwa ọnụ ụzọ niile nke eluigwe.
24 wabanisela imana ukuthi badle, wabapha amabele amazulu.
O mere ka mánà zokwasị ndị mmadụ a dịka mmiri, ka ha rie. O nyere ha mkpụrụ ọka nke si nʼeluigwe.
25 Umuntu wadla isinkwa sabalamandla; wabathumela ukudla ukuze basuthe.
Ndị mmadụ tara achịcha ndị mmụọ ozi. O zitere ha nri niile ha nwere ike iri.
26 Wenza umoya wempumalanga wavunguza emazulwini; langamandla akhe waqhuba umoya weningizimu.
O sitere nʼeluigwe tọpụ ikuku nke ọwụwa anyanwụ, o jikwa ike ya duo ikuku nke ndịda.
27 Wasenisela phezu kwabo inyama njengothuli, lenyoni ezilempiko njengetshebetshebe lolwandle;
O zidatara ha anụ dị ukwuu dịka ọ bụ uzuzu, anụ ufe ọnụọgụgụ ha dịka ọnụọgụgụ aja dị nʼala ọnụ oke osimiri.
28 wazenza zawela phakathi kwenkamba yabo, zagombolozela indawo zabo zokuhlala.
O mere ka ụmụ anụ ufe ndị a daara ha nʼala nʼetiti ọmụma ụlọ ikwu ha nakwa gburugburu ụlọ ikwu ha.
29 Ngakho badla basutha kakhulu, ngoba wabalethela isiloyiso sabo.
Ha riri ihe tutu ruo mgbe ha enwekwaghị ike iri ọzọ, nʼihi na o nyere ha ihe obi ha chọrọ.
30 Kabehlukananga lenkanuko yabo; ukudla kusesemlonyeni wabo,
Ha erisibeghị nri ahụ obi ha chọrọ, anụ ụfọdụ dịkwa ha nʼọnụ,
31 ulaka lukaNkulunkulu lwaselubavukela, wabulala kwabakhulupheleyo babo, watshaya abakhethiweyo bakoIsrayeli.
mgbe iwe Chineke biliri imegide ha; o tigburu ndị kachasị ike nʼetiti ha, tigbukwaa ụmụ okorobịa ndị Izrel.
32 Kulokhu konke bajinga besona, njalo kabakholwanga ngenxa yezimangaliso zakhe.
Ma na-eleghị ihe ndị a anya, ha gakwara nʼihu na mmehie ha, jụkwa ikwere nʼọrụ ebube niile Onyenwe anyị rụrụ.
33 Ngakho waziqeda izinsuku zabo ngeze, leminyaka yabo ovalweni.
O mere ka ụbọchị ndụ ha bụrụ ihe efu. O mekwara ka afọ ha gwụsịa nʼobi ọlụlọ mmiri.
34 Lapho ebabulala, bamdinga, baphenduka, bamdingisisa uNkulunkulu.
Mgbe ọbụla Chineke tigburu ha, ha na-achọ ya; ha na-alaghachi azụ, chọsie ya ike.
35 Bakhumbula ukuthi uNkulunkulu ulidwala labo, loNkulunkulu oPhezukonke ungumhlengi wabo.
Ha na-echeta na Chineke bụ Oke nkume ha, na Chineke nke kachasị ihe niile elu bụrụ ha Onye Mgbapụta.
36 Kodwa bamyenga ngomlomo wabo, baqamba amanga kuye ngolimi lwabo.
Ma mgbe ahụ, ha ga-eji naanị okwu efu fee ya ofufe, were ire ha na-aghara ya ụgha.
37 Ngoba inhliziyo yabo yayingaqondanga kuye, njalo bengathembekanga esivumelwaneni sakhe.
Obi ha ekwesịkwaghị ike nye ya. Ha ekwesighị ntụkwasị obi nye ọgbụgba ndụ ya.
38 Kodwa yena elesihawu wathethelela ububi babo, kababhubhisanga; yebo, kanengi walunqanda ulaka lwakhe, kakuvusanga konke ukuthukuthela kwakhe.
Ma o meere ha ebere. Ọ gbaghara ha mmehie ha. Ọ laghị ha nʼiyi. Ọtụtụ oge ka o jidere iwe ya. Ọ kpalịkwaghị oke iwe ya.
39 Ngoba wakhumbula ukuthi bayinyama, umoya odlulayo, ongabuyiyo.
Nʼihi na o chetara na ha bụ naanị anụ ahụ nke o kere eke, chetakwa na ha dịka ikuku nke na-adịghị alọghachi azụ mgbe ọ gabigasịrị.
40 Kanengi kangakanani bemvukela ehlane, bemdabukisa enkangala.
Ọtụtụ oge ka ha nupuru isi megide ya nʼọzara; ha kpasuru ya iwe nʼala ahụ tọgbọrọ nʼefu.
41 Yebo baphenduka bamlinga uNkulunkulu, bamdabukisa oNgcwele kaIsrayeli.
Mgbe mgbe, ha nwara Chineke; ha kpasuru Onye Nsọ nke Izrel iwe.
42 Kabasikhumbulanga isandla sakhe, usuku abahlenga ngalo esitheni.
Ha echetaghị ike ya, ụbọchị ahụ ọ gbapụtara ha site nʼaka ndị na-emegbu ha;
43 Ukuthi wamisa njani izibonakaliso zakhe eGibhithe, lezimangaliso zakhe emmangweni weZowani,
nʼụbọchị o gosipụtara ihe ịrịbama niile nʼala Ijipt, ọrụ ebube ya niile nʼọhịa Zoan.
44 lokuthi waphendula imifula yabo yaba ligazi, lezifula zabo, ukuze banganathi.
O mere ka osimiri ha niile ghọọ ọbara. Ha enwekwaghị ike ịṅụ mmiri si na ha.
45 Wathumela phakathi kwabo umtshitshi wezibawu, ezabadlayo, lamaxoxo ababhubhisayo.
O zigakwara igwe ijiji nʼetiti ha, nke tara ha, zitekwa awọ nʼala ha, nke bibiri ha.
46 Wasenika imihogoyi isivuno sabo, lomsebenzi wabo isikhonyane.
O zitekwara ụmụ ụkpana ndị tachapụrụ mkpụrụ a kụrụ nʼubi ha, zitekwa igurube nke ripịara ihe niile a gaara eweta dịka ihe ubi.
47 Wabulala ivini labo ngesiqhotho, lemikhiwa yabo yesikhamore ngongqwaqwane.
O ji oke mkpụrụ mmiri mebie osisi vaịnị ha, jirikwa igirigi jụrụ oke oyi bibie osisi sikamọ ha niile.
48 Wasenikela izifuyo zabo esiqhothweni, lemihlambi yabo kuyo imibane.
O weere ehi ha niile nyefee mkpụrụ mmiri, werekwa anụ ụlọ ha nyefee amụma egbe eluigwe.
49 Waphosela phezu kwabo ukuvutha kolaka lwakhe, ukuthukuthela, lokucunuka, lokuhlupheka, ngokuthuma izithunywa zobubi.
O zipụrụ iwe ọkụ ya nʼetiti ha, oke iwe ya, na iwe ya, na mmeso nke iwe ya, ndị mmụọ ozi na-ebibi ihe na-eleghị anya nʼazụ.
50 Walungisela ulaka lwakhe indlela, kanqandanga umphefumulo wabo ekufeni, kodwa wanikela impilo yabo kumatshayabhuqe wesifo.
O doziri ụzọ nke iwe ya ga-eso; o gbochighị ka ha ghara ịnwụ; kama o nyefere ndụ ha nʼaka ọrịa na-efe efe.
51 Wasetshaya wonke amazibulo eGibhithe, okokuqala kwamandla emathenteni kaHamu.
O tigburu nwa ọbụla e bụ ụzọ mụọ nʼala Ijipt, mkpụrụ mbụ nke ndị ikom nʼime ụlọ ikwu Ham.
52 Wasebakhupha abantu bakhe njengezimvu, wabakhokhela enkangala njengomhlambi.
Ma o dupụtara ndị nke ya dịka igwe atụrụ; o duuru ha dịka atụrụ gafee ọzara.
53 Wasebakhokhela bephephile ukuze bangesabi; kodwa ulwandle lwasibekela izitha zabo.
O duuru ha nʼudo, ụjọ atụkwaghị ha, ma osimiri kpuchigidere ndị iro ha.
54 Wasebafikisa emkhawulweni wendawo yakhe engcwele, le intaba, isandla sakhe sokunene esayizuzayo.
Otu a ka o si duru ha bịaruo nʼoke ala nsọ ya, ala ugwu ugwu ahụ nke aka nri ya nwetara.
55 Wasebaxotsha abezizwe phambi kwabo; wababela ilifa ngomzila, wahlalisa izizwe zakoIsrayeli emathenteni azo.
Ọ chụpụrụ mba niile nʼihu ha, tụọ ala ha kesara ha dịka ihe nketa; o mere ka ebo niile nke Izrel biri nʼụlọ nke aka ha.
56 Kanti bamlinga, bamvukela uNkulunkulu oPhezukonke, kabazigcinanga izifakazelo zakhe.
Ma ha nwara Chineke ọnwụnwa, nupu isi megide Onye kachasị ihe niile elu; ha edebeghị ụkpụrụ ya.
57 Kodwa babuyela emuva, benza ngokungathembeki njengaboyise, baphanjulwa njengedandili elikhohlisayo.
Dịka nna nna ha, ha bụ ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi, na ndị aghụghọ, ha dịka ụta a na-ekweghị nke ọma.
58 Ngoba bamthukuthelisa ngezindawo zabo eziphakemeyo, bavusa umona wakhe ngezithombe zabo ezibaziweyo.
Nʼihi ebe nchụaja ha wuru, ha mere ka iwe wee ya; sitekwa nʼarụsị ha pịrị apị, ha kpaliri ekworo ya.
59 UNkulunkulu esizwa wathukuthela, wamenyanya kakhulu uIsrayeli.
Mgbe Chineke nụrụ ha, iwe were ya nke ukwuu. Ọ jụrụ ndị Izrel kpamkpam.
60 Ngakho walitshiya ithabhanekele leShilo, ithente alimisa phakathi kwabantu.
Ọ gbakụtara ụlọ nzute ya nke dị na Shaịlo azụ, ụlọ ikwu ahụ ọ mara nʼetiti ndị mmadụ.
61 Wasenikela amandla akhe ekuthunjweni, lenkazimulo yakhe esandleni sesitha.
O nyefere igbe ọgbụgba ndụ ike ya ka a dọta ya nʼagha, o nyefekwara onye iro ahụ ebube ya nʼaka.
62 Wasenikela abantu bakhe enkembeni, waselithukuthelela ilifa lakhe.
O kwere ka e gbuo ndị ya nʼagha; iwe ya dị ọkụ megide ihe nketa ya.
63 Umlilo waqeda amajaha abo, lezintombi zabo kazihlatshelelwanga.
Ọkụ repịara ụmụ okorobịa ha, ọ dịkwaghị onye a gụụrụ egwu ọlụlụ di na nwunye, nʼetiti ụmụ agbọghọ ha;
64 Abapristi babo bawa ngenkemba, labafelokazi babo kabalilanga.
E gburu ndị nchụaja ha nʼagha; ndị inyom ha ndị di ha nwụrụ enwekwaghị ike iru ụjụ.
65 Khona iNkosi yavuka njengobelele, njengeqhawe eliklabalala ngenxa yewayini.
Mgbe ahụ, onyenwe anyị tetara dịka onye si nʼụra teta, dịka dike si nʼụra mmanya teta.
66 Yazitshaya izitha zayo emuva, yazithela ihlazo phakade.
Ọ chụghachiri ndị iro ya azụ, mee ha ihe ihere nke ga-adịgide ruo ebighị ebi.
67 Yasilahla ithente likaJosefa, kayikhethanga isizwe sakoEfrayimi.
Ọ jụrụ ụlọ ikwu Josef, ọ họpụtaghị ebo Ifrem;
68 Kodwa yakhetha isizwe sakoJuda, intaba yeZiyoni eyithandayo.
ma ọ họọrọ ebo Juda, na ugwu Zayọn, nke ọ hụrụ nʼanya.
69 Yayakha indlu yayo engcwele njengezingqonga, njengomhlaba ewusekeleyo kuze kube nininini.
O wuru ụlọnsọ ya ka ọ dị ka ebe dị elu, dịka ụwa nke o mere ka o guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi.
70 Yasikhetha uDavida inceku yayo, yamthatha ezibayeni zezimvu;
Ọ họpụtara Devid, ohu ya, kpọrọ ya site nʼọgba igwe atụrụ;
71 ekulandeleni izimvukazi ezenyisayo, yamletha ukwelusa uJakobe abantu bayo, loIsrayeli ilifa layo.
o si nʼebe ọ nọ na-azụ atụrụ kpọrọ ya, ka ọ bịa bụrụ onye na-azụ ndị ya Jekọb, na Izrel, ihe nketa ya dịka atụrụ.
72 Njalo wabelusa njengobuqotho benhliziyo yakhe, wabakhokhela ngobugabazi bezandla zakhe.
Devid ji izuoke nke obi ya zụọ ha, aka nke maara ihe ọ na-eme ka o ji duo ha.

< Amahubo 78 >