< Amahubo 73 >

1 Qotho uNkulunkulu ulungile kuIsrayeli, kulabo abahlambulukileyo enhliziyweni.
Abụ Ọma Asaf. Nʼezie, Chineke dịịrị Izrel mma, dịkwara ndị obi ha dị ọcha.
2 Kodwa mina inyawo zami zaphose zasuka, izinyathelo zami zaphose zatshelela.
Ma mụ onwe m, ọ fọdụrụ nwantịị ka m zọhie ụkwụ, ọ fọdụrụ nwantịị ka ụkwụ m gbụchapụ.
3 Ngoba ngaba lomhawu ngabazikhukhumezayo, ngibona ukuphumelela kwababi.
Nʼihi na e kwosara m ndị mpako ekworo; mgbe m hụrụ ịba ụba nke ndị ajọ omume.
4 Ngoba kakulazibopho ekufeni kwabo, kodwa amandla abo aqinile.
Ha anaghị adọgbu onwe ha; ahụ ha gbara abụba, siekwa ike.
5 Kabakho enhluphekweni njengabanye abantu, njalo kabahlutshwa njengabanye abantu.
Nsogbu niile mmadụ ibe ha na-enwe adịghị erute ha. Ha enweghị mkpa ọbụla nke na-akpa ha dịka ndị ọzọ nwere.
6 Ngakho-ke ukuzigqaja kuyabazungeza njengeketane, udlame luyabasibekela njengesembatho.
Nʼihi nke a, nganga bụ ihe ịnya nʼolu ha; ha jikwa ihe ike kpuchie onwe ha dịka uwe.
7 Amehlo abo aqumbile ngamafutha; iminakano yenhliziyo iyaphuphuma.
Mmehie na-esite nʼobi ọjọọ ha apụta; echiche ọjọọ ha enweghị ngụta.
8 Bayakloloda, bakhulume ngobubi ngocindezelo; bakhuluma besekuphakameni.
Ha na-akwa emo, na-ejikwa iro ekwu okwu; nʼime mpako ha, ha na-aba mba imegbu ndị ọzọ.
9 Bamisa umlomo wabo umelene lamazulu, lolimi lwabo luhamba emhlabeni.
Ha ji ọnụ ha na-ekwu na eluigwe bụ nke ha, ha jikwa ire ha kwuo na ụwa niile bụ nke ha.
10 Ngakho abantu bakhe bayaphendukela lapha, lamanzi enkezo egcweleyo akhanyelwa bona.
Nʼihi nke a, ndị ha na-eso ha, na-aṅụrụ okwu ha ebe ọ bara ụba dịka mmiri.
11 Njalo bathi: UNkulunkulu wazi njani? Kukhona ulwazi yini koPhezukonke?
Ha na-asị, “Olee otu Chineke ga-esi mara? Ọ dịkwanụ ihe Onye kachasị ihe niile elu maara?”
12 Khangela, laba ngabangelaNkulunkulu, kanti bayaphumelela elizweni, bandisa inotho.
Otu a ka ndị ajọ omume dị, ha na-ebi ndụ na-enweghị nsogbu; akụnụba ha na-amụbakwa.
13 Isibili ngihlambulule inhliziyo yami ngeze, ngageza izandla zami ngokungelacala.
Nʼezie, ọ bụ naanị nʼefu ka m debere obi m ọcha, nʼefu ka m kwọrọ aka m abụọ nʼemeghị ihe ọjọọ.
14 Ngoba ngihlutshiwe usuku lonke, lesijeziso sami sisekuseni yonke.
Ogologo ụbọchị niile, anọ m na nsogbu; ụtụtụ niile ka m na-anata ntaramahụhụ.
15 Uba bengingathi: Ngizakhuluma ngokunje, khangela, ngabe ngisikhohlisile isizukulwana sabantwana bakho.
Ọ bụrụ na m kwuru sị, “Nke a ka m ga-ekwu,” agaara m abụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nʼetiti ụmụ gị.
16 Lapho nganakana ukwazi lokhu, kwakubuhlungu emehlweni ami,
Mgbe m gbalịrị ịghọta ihe ndị a niile, ọ ghọọrọ m ihe mwute,
17 ngaze ngangena ezindlini ezingcwele zikaNkulunkulu; ngasengikuqedisisa ukuphela kwabo.
tutu ruo mgbe m bara nʼebe nsọ Chineke; mgbe ahụ ka m ghọtara ihe ga-eme ha nʼikpeazụ.
18 Isibili ubamisa endaweni ezitshelelayo, ubawisela ekubhujisweni.
Nʼezie, ị na-eguzo ha nʼala na-achị achị; ị na-atụda ha, laa ha nʼiyi.
19 Yeka ukuchitheka kwabo njengokucwayiza kwelihlo! Baphela baqedwe ngokwesabisayo.
Lee, ka ha si laa nʼiyi nʼotu ntabi anya, bụrụ ndị ihe egwu dị iche iche kpochapụrụ kpamkpam!
20 Njengephupho ekuphaphameni, Nkosi, nxa uvuka uzadelela umfanekiso wabo.
Dịka nrọ, mgbe mmadụ na-eteta, otu a, O Onyenwe anyị, mgbe i tetara, ị ga-eleda ha anya dịka echiche na-agaghị emezu.
21 Ngakho inhliziyo yami yaba buhlungu, ngahlatshwa ezinsweni zami.
Mgbe m nọ nʼobi mwute; mmụọ m dara mba.
22 Njalo ngaba yisiphukuphuku esingaziyo, ngaba njengenyamazana kuwe.
Abụ m onye nzuzu na onye na-amaghị ihe. Adị m ka anụ ọhịa nʼihu gị.
23 Kodwa mina ngihlezi ngilawe; ubambe isandla sami sokunene.
Ma ana m anọnyere gị mgbe niile; ị na-ejide m nʼaka nri m.
24 Uzangikhokhela ngeseluleko sakho, lemva kwalokho ungemukele enkazimulweni.
Ị na-eji ndụmọdụ gị na-edu m, ma emesịa, ị ga-anabata m nʼebube gị.
25 Ngilobani emazulwini ngaphandle kwakho? Njalo kakukho engikufisayo emhlabeni ngaphandle kwakho.
Onye ka m nwere nʼeluigwe ma ọ bụghị gị? Ọ dịghị ihe ụwa a nwere nke m ga-achọsi ike karịa gị.
26 Inyama yami lenhliziyo yami kuyaphela; uNkulunkulu ulidwala lenhliziyo yami lesabelo sami kuze kube nininini.
Anụ ahụ m na mkpụrụobi m nwere ike ịda mba, ma Chineke bụ ike nke obi m, na ihe nketa m ruo ebighị ebi.
27 Ngoba khangela, abakhatshana lawe bazabhubha; ubachithile bonke abaphingayo ngokusuka kuwe.
Ndị niile nọpụrụ gị nʼebe dị anya ga-ala nʼiyi. Ị ga-alakwa ndị niile na-ekwesighị ntụkwasị obi, nye gị nʼiyi.
28 Kodwa mina kungilungele ukusondela kuNkulunkulu; ngibeke isiphephelo sami eNkosini uJehova, ukutshumayela zonke izenzo zakho.
Ma nye mụ onwe m, ọ dị mma ịnọ Chineke nso. Emeela m Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ebe mgbaba m. Aga m akọ banyere ọrụ gị niile dị iche iche.

< Amahubo 73 >