< Amahubo 71 >
1 Kuwe, Nkosi, ngiyaphephela; kangingayangeki lanininini.
Onyenwe anyị, nʼime gị ka m gbabara izere ndụ; ekwela ka ihere mee m.
2 Ngikhulula ngokulunga kwakho, ungophule; beka indlebe yakho kimi, ungisindise.
Site nʼezi omume gị, gbapụta m, mee ka m nwere onwe m; tọọ ntị gị nʼala nụrụ olu m ma zọpụta m.
3 Woba lidwala lokuhlala kimi, ngiye kulo njalonjalo; ulayile ukungisindisa, ngoba ulidwala lami lenqaba yami.
Ghọọrọ m oke nkume nke ebe mgbaba, ebe m nwere ike ịgbaba mgbe ọbụla; nye iwu maka nzọpụta m, nʼihi na ị bụ oke nkume m na ebe m e wusiri ike.
4 Nkulunkulu wami, ngophula esandleni somubi lesandleni songalunganga lolesihluku.
O Chineke m, site nʼaka ndị ajọ omume na ndị mmadụ na-eme ihe ọjọọ, ndị afọ tara mmiri, gbapụta m.
5 Ngoba wena, ulithemba lami Nkosi, Jehova, ithemba lami kwasebutsheni bami.
Nʼihi na gị onwe gị bụrịị olileanya m, Onyenwe m Onyenwe anyị, ntụkwasị obi m site na mgbe m bụ nwantakịrị.
6 Ngeyame kuwe kwasesizalweni; nguwe owangikhupha esiswini sikamama; indumiso yami ingawe njalonjalo.
Ọ bụ gị ka m tụkwasịrị obi, site nʼoge amụrụ m; gị onwe gị wepụtara m site nʼafọ nne m. Aga m anọgide na-eto gị.
7 Benginjengesimangaliso kwabanengi; kodwa wena uyisiphephelo sami esiqinileyo.
Adịla m ka ihe ama nye ọtụtụ mmadụ, ma ị bụ ebe mgbaba m siri ike.
8 Umlomo wami kawugcwaliswe ngendumiso yakho, usuku lonke ngodumo lwakho.
Ọnụ m jupụtara nʼotuto gị, ọ na-ekwupụta ịma mma gị ogologo ụbọchị niile.
9 Ungangilahli esikhathini sokuluphala, ungangitshiyi ekupheleni kwamandla ami.
Agbakụtala m azụ mgbe m mere agadi; ahapụkwala m mgbe ike adịghịkwa m.
10 Ngoba izitha zami zikhuluma zimelene lami, labacathamela umphefumulo wami bayacebisana,
Nʼihi na ndị iro m na-ekwu okwu megide m; ndị ahụ na-achọ igbu m na-agbarịta izu nzuzo.
11 besithi: UNkulunkulu umtshiyile; zingelani, limbambe, ngoba kakho okhululayo.
Ha na-asị, “Chineke agbakụtala ya azụ; chụọ ya ọsọ, jidekwa ya, nʼihi na o nweghị onye ọbụla ga-agbapụta ya.”
12 Nkulunkulu, ungabi khatshana lami; Nkulunkulu wami, phangisela usizo lwami.
O Chineke, anọla m ebe dị anya; O Chineke m, bịa ngwangwa nyere m aka.
13 Kabayangeke baphele abayizitha zomphefumulo wami, kabasitshekelwe yikuyangeka lehlazo labo abadinga ukoniwa kwami.
Ka e were ihere kpuchie ndị na-ebo m ebubo ụgha; ka ihere na nleda anya bụrụ ihe ga-ekpuchi ndị ahụ na-achọ imerụ m ahụ.
14 Kodwa mina ngizathemba njalonjalo, ngengeze ekudunyisweni kwakho konke.
Ma mụ onwe m ga-anọgide na-enwe olileanya mgbe niile; aga m eto gị mgbe niile karịa otu m toro gị na mbụ.
15 Umlomo wami uzalandisa ukulunga kwakho, usuku lonke usindiso lwakho, ngoba kangiwazi amanani akho.
Ọnụ m ga-ekwu banyere ezi omume gị na nzọpụta gị ogologo ụbọchị niile, ọ bụ ezie na-amaghị m ọtụtụ ya.
16 Ngizahamba emandleni eNkosi uJehova, ngiqambe ukulunga kwakho, okwakho kuphela.
Aga m abịa kwusaakwa ịdị ukwu ọrụ gị niile, Onyenwe m Onyenwe anyị, aga m ekwusa ezi omume gị, e, naanị nke gị.
17 Nkulunkulu, ungifundisile kusukela ebutsheni bami, njalo kuze kube khathesi ngitshumayele izimangaliso zakho.
O Chineke, site na mgbe m bụ nwantakịrị, i kuzielera m ihe, ruo taa, ana m ekwupụta banyere ọrụ ebube gị niile.
18 Lalapho sengiluphele sengiyimpunga, Nkulunkulu, ungangitshiyi, ngize ngitshumayele ingalo yakho kuso isizukulwana, amandla akho kuye wonke ozakuza.
O Chineke m, ọ bụladị mgbe m mere agadi, mgbe isi awọ juru m isi, ahapụla m, tutu ruo mgbe m ga-ekwupụta ike gị nye ọgbọ nke na-abịa, na ịdị ike gị nye ndị niile na-abịa nʼoge dị nʼihu.
19 Lokulunga kwakho, Nkulunkulu, kufika ezingqongeni, owenze izinto ezinkulu; Nkulunkulu, ngubani onjengawe?
O Chineke, ezi omume gị na-eru nʼeluigwe, gị onye merela ọtụtụ ihe dị ukwu. O Chineke, onye dị ka gị?
20 Ongenze ngabona inhlupheko ezinengi lezibuhlungu, uzangivuselela futhi, ungikhuphule futhi ezinzikini zomhlaba.
Nʼagbanyeghị na i meela ka m gabiga ọtụtụ nsogbu nke dị ilu, ị ga-atụte ndụ m ọzọ; site nʼebe dị omimi nke ụwa, ị ga-adọkpụpụta m ọzọ.
21 Uzakwandisa ubukhulu bami, ungiduduze inhlangothi zonke.
Ị ga-eme m ka m dịrị ukwuu karịa ka m dị na mbụ. Ị ga-akasịkwa m obi ọzọ.
22 Lami ngizakudumisa ngogubhu lwezintambo, iqiniso lakho, Nkulunkulu wami; ngizahlabelela izibongo kuwe ngechacho, wena ongcwele kaIsrayeli.
O Chineke m, aga m eji ụbọ akwara too gị, nʼihi ikwesi ntụkwasị obi gị; aga m eji une bụkuo gị abụ otuto, gị Onye nsọ nke Izrel.
23 Indebe zami zizamemeza ngentokozo lapho ngihlabelela kuwe, lomphefumulo wami owuhlengileyo.
Egbugbere ọnụ m ga-eti mkpu ọṅụ mgbe m na-abụku gị abụ otuto, mụ, onye ị gbapụtara.
24 Futhi ulimi lwami luzakhuluma ngokulunga kwakho usuku lonke, ngoba bayangekile, ngoba badumazeka, abadinga ukoniwa kwami.
Ogologo ụbọchị niile, aga m ekwupụta ọrụ ezi omume gị niile, nʼihi na ndị ahụ chọrọ imerụ m ahụ, ka e tinyere nʼọnọdụ ihere na ọgbaaghara.