< Amahubo 6 >

1 Nkosi, ungangikhuzi entukuthelweni yakho, ungangijezisi ekuvutheni kolaka lwakho.
Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Nke e ji ụbọ akwara abụ. Nʼusoro Sheminit. Abụ Ọma Devid. O Onyenwe anyị, abarala m mba mgbe ị na-ewe iwe. Atala m ahụhụ nʼoge ọnụma gị.
2 Woba lomusa kimi, Nkosi, ngoba ngibuthakathaka. Nkosi, ngisilisa mina, ngoba amathambo ami ayakhathazeka.
Biko, meere m ebere Onyenwe anyị, nʼihi na adịghị m ike. Gwọọ m, nʼihi na ọkpụkpụ m niile nọ nʼihe mgbu.
3 Lomphefumulo wami ukhathazekile kakhulu: Kodwa wena, Nkosi, koze kube nini?
Mkpụrụobi m nọ nʼọnọdụ ihe mgbu. Ruo ole mgbe, O Onyenwe anyị, ka ị ga-anọgide na-agba m nkịtị?
4 Phenduka, Nkosi, khulula umphefumulo wami; ungisindise ngenxa yomusa wakho.
Onyenwe anyị, biko, bịa zọpụta m; nʼihi ịhụnanya gị na-enweghị ọgwụgwụ, napụta m.
5 Ngoba ekufeni kakukho ukukukhumbula; engcwabeni ngubani ozakubonga? (Sheol h7585)
Nʼetiti ndị nwụrụ anwụ ọ dịghị onye na-ekwupụta aha gị. O nwere onye na-eto gị site nʼala ili? (Sheol h7585)
6 Ngikhathele yikububula kwami; ubusuku bonke ngintshezisa icansi lami, ngezinyembezi zami ngimanzise umbheda wami.
Ike agwụla m nʼihi ịsụ ude. Abalị niile, ana m eji ịkwa akwa mee ka ihe ndina m jupụta na mmiri, ana m eji anya mmiri dee ihe ndina m.
7 Ilihlo lami lidliwe ngenxa yosizi, liyaguga ngenxa yezitha zami zonke.
Anya m adịghị ahụzikwa ụzọ nke ọma nʼihi ihe mwute; ọ kaala nka nʼihi mmeso ndị iro m.
8 Sukani kimi, lonke benzi bobubi, ngoba iNkosi izwile ilizwi lokulila kwami.
Sitenụ nʼebe m nọ wezuga onwe unu, unu ndị na-eme ajọ ihe, nʼihi na Onyenwe anyị anụla akwa m niile.
9 INkosi izwile ukuncenga kwami; iNkosi izakwemukela umkhuleko wami.
Onyenwe anyị anụla akwa m; ọ nụla arịrịọ nke m na-arịọ ya ka o meere m ebere. Ọ nabatala ekpere m.
10 Zonke izitha zami zizayangeka zitshaywe luvalo kakhulu; zizaphenduka, zihle ziyangeke.
Ka ndị iro m niile bụrụ ndị ihere ga-eme. Ha ga-ada mba, bụrụkwa ndị ga-eji ihere laghachi ebe ha si bịa.

< Amahubo 6 >