< Amahubo 52 >

1 Uzincomelani ngokubi, qhawe? Umusa kaNkulunkulu ukulo lonke usuku.
Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ maskil Devid. Nke o bụrụ mgbe Doeg onye Edọm gara gwa Sọl sị, “Devid gara hụ Ahimelek nʼụlọ ya.” Gịnị mere i ji na-anya isi nʼihe ọjọọ, gị nwoke dị ike? Gịnị mere na ogologo ụbọchị niile, ị na-anya isi, gị onye Chineke na-eleda anya?
2 Ulimi lwakho luceba konke ukuganga, njengensingo ebukhali, lwenza inkohliso.
Ire gị na-atụ atụmatụ ịla nʼiyi; ọ dị ka agụba dị nkọ, gị onye na-ebi ndụ aghụghọ.
3 Uthanda okubi kulokuhle; amanga kulokukhuluma iqiniso. (Sela)
Ị hụrụ ihe ọjọọ nʼanya karịa ihe ọma, ị hụrụ okwu ụgha nʼanya karịa eziokwu. (Sela)
4 Uthanda wonke amazwi okuginya, limi lwenkohliso.
O onye ire aghụghọ! Ị hụrụ okwu ọbụla nke na-emegide mmadụ nʼanya.
5 UNkulunkulu laye uzakubhidliza phakade, akususe, akuhluthune ethenteni, akusiphune elizweni labaphilayo. (Sela)
Nʼezie, Chineke ga-akwatu gị ruo mgbe ebighị ebi. Ọ ga-ejide gị, dọpụta gị site nʼụlọ ikwu gị, ọ ga-ehopukwa gị site nʼala ndị dị ndụ. (Sela)
6 Abalungileyo bazakubona besabe, bazamhleka, besithi:
Ndị ezi omume ga-ahụ ya tụkwaa egwu; ha ga-achị ya ọchị na-asị,
7 Khangelani, umuntu ongamenzanga uNkulunkulu abe yinqaba yakhe, kodwa wathembela ebunengini benotho yakhe, eqinile ekugangeni kwakhe.
“Ugbu a, lee nwoke ahụ, onye jụrụ ime Chineke ebe mgbaba ya. Ọ tụkwasịrị obi ya na akụnụba ya nke dị ukwuu. O sitekwara na ibibi ndị ọzọ ghọọ onye dị ike!”
8 Kodwa nginjengesihlahla somhlwathi esiluhlaza endlini kaNkulunkulu. Ngiyathemba emuseni kaNkulunkulu phakade laphakade.
Ma adị m ka osisi oliv, nke na-eto na-awasa nʼụlọnsọ ukwu Chineke. Ana m atụkwasị obi m nʼịhụnanya Chineke, nke na-adịgide ruo mgbe niile ebighị ebi.
9 Ngizakudumisa kuze kube phakade ngoba ukwenzile. Ngizalindela ibizo lakho, ngoba lihle phambi kwabangcwele bakho.
Aga m eto gị ruo mgbe niile ebighị ebi nʼihi ihe i mere; aga m eto gị nʼihu ndị gị dị nsọ. Olileanya m ga-adị nʼime aha gị, nʼihi na aha gị dị mma.

< Amahubo 52 >