< Amahubo 33 >

1 Thokozani eNkosini, balungileyo. Ukudumisa kubafanele abaqotho.
Tienụ mkpu ọṅụ nye Onyenwe anyị, unu ndị ezi omume; nʼihi na ọ bụ ihe ziri ezi ka ndị obi ha ziri ezi too ya.
2 Dumisani iNkosi ngechacho, lihlabelele kuyo ngogubhu olulentambo ezilitshumi.
Werenụ ụbọ akwara too Onyenwe anyị; werenụ une nke nwere akwara iri kpọọrọ ya egwu.
3 Ihlabeleleni ingoma entsha, litshaye kuhle ngenhlokomo.
Bụkuonụ ya abụ ọhụrụ; were ǹka kpọọ ụbọ akwara ma tiekwa mkpu ọṅụ.
4 Ngoba ilizwi leNkosi liqotho, lomsebenzi wayo wonke ngowobuqotho.
Nʼihi na okwu Onyenwe anyị niile ziri ezi bụrụkwa eziokwu; o kwesiri ntụkwasị obi nʼọrụ ya niile.
5 Ithanda ukulunga lesahlulelo; umhlaba ugcwele umusa weNkosi.
Onyenwe anyị na-ahụ ezi omume na ikpe ziri ezi nʼanya; ụwa niile jupụtara nʼịhụnanya ya nke na-enweghị ọgwụgwụ.
6 Ngelizwi leNkosi amazulu enziwa, lalo lonke ibutho lawo ngomoya womlomo wayo.
Ọ bụ site nʼokwu ọnụ Onyenwe anyị ka e ji kee eluigwe niile, jirikwa nkuume nke ọnụ ya mee anwụ, na ọnwa na kpakpando niile.
7 Ibuthelela amanzi olwandle njengenqumbi, ifake inziki eziphaleni.
Ọ bụ ya kekwara osimiri niile chịkọta ha nʼotu ebe, kpaa oke ebe ha ga-anọ dịka ụlọakụ dị ukwuu.
8 Umhlaba wonke kawuyesabe iNkosi, bonke abakhileyo bomhlaba kabathuthumele ngayo.
Ka ụwa niile tụọ Onyenwe anyị egwu; ka mmadụ niile bi nʼụwa sọpụrụ ya.
9 Ngoba yona yakhuluma, kwaba khona; yona yalaya, kwema.
Nʼihi na o kwuru okwu, okwu ahụ mezukwara; o nyere iwu, iwu ahụ guzokwara chịm.
10 INkosi ichitha icebo lezizwe, iphuthisa imicabango yabantu.
Onyenwe anyị na-emebi atụmatụ mba niile; ọ na-emebi ebumnobi ụmụ mmadụ.
11 Icebo leNkosi limi kuze kube nininini, imicabango yenhliziyo yayo ezizukulwaneni ngezizukulwana.
Atụmatụ Onyenwe anyị na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi, ebumnobi ya ruo ọgbọ niile.
12 Sibusisiwe isizwe esiNkulunkulu waso yiNkosi, abantu ebakhethileyo baba yilifa layo.
Mba a gọziri agọzi ka mba ahụ bụ, bụ ndị Chineke bụ Onyenwe anyị ha; bụ ndị ọ họpụtara ka ha bụrụ ihe nketa ya.
13 INkosi iyakhangela phansi isemazulwini, ibone bonke abantwana babantu.
Onyenwe anyị si nʼeluigwe na-ele ndị mmadụ bi nʼụwa anya. Ọ na-ahụzu ụmụ mmadụ niile anya.
14 Isendaweni emisiweyo yokuhlala kwayo ikhangela bonke abakhileyo bomhlaba.
O sitere nʼebe obibi ya na-ele onye ọbụla bi nʼelu ụwa anya.
15 Ibumba inhliziyo yabo bonke, inanzelele zonke izenzo zabo.
Ebe ọ bụ ya kpụrụ obi mmadụ niile nʼotu na otu; ọ na-ahụzu, na-amazukwa ihe niile ha na-eme.
16 Kayikho inkosi esindiswa yibunengi bebutho, iqhawe kalikhululwa ngamandla amakhulu.
Ọnụọgụgụ ndị agha eze apụghị ịzọpụta ya; o nweghị onye agha ọbụla na-azọpụta onwe ya, site nʼịdị ukwuu nke ike ya.
17 Ibhiza liyize ekunqobeni, njalo kalikhululi ngobukhulu bamandla alo.
Ịnyịnya agha ezukwaghị iwetara ndị na-agba ha mmeri nʼagha. Ọ bụ ezie na ịnyịnya dị ike, ma ha apụghị ịzọpụta ndị nwe ha.
18 Khangela, ilihlo leNkosi liphezu kwabayesabayo, kwalabo abathembela emuseni wayo,
Ma Onyenwe anyị ji anya ya na-eche ndị niile na-atụ ya egwu nche, ya bụ ndị niile na-atụkwasị obi ha nʼịhụnanya ya, nke na-adịghị agwụ agwụ.
19 ukukhulula umphefumulo wabo ekufeni, lokubaphilisa endlaleni.
Ọ ga-anapụta ha site nʼaka ọnwụ. Ọ ga-echebekwa ha ọ bụladị nʼoge ụnwụ.
20 Umphefumulo wethu ulindela iNkosi; ilusizo lwethu lesihlangu sethu.
Anyị ji olileanya eche Onyenwe anyị; ọ bụ ya bụ inyeaka anyị na ọta anyị.
21 Ngoba inhliziyo yethu izathokoza kuyo, ngoba sithembele ebizweni layo elingcwele.
Obi anyị na-aṅụrị ọṅụ nʼime ya; nʼihi na anyị tụkwasịrị aha nsọ ya obi.
22 Umusa wakho, Nkosi, kawube phezu kwethu, njengokulindela kwethu kuwe.
O Onyenwe anyị, ka ịhụnanya gị na-adịgidere anyị, dịka olileanya anyị dị na gị.

< Amahubo 33 >