< Amahubo 30 >
1 Ngizakuphakamisa, Nkosi, ngoba ungenyusile, njalo kawuthokozisanga izitha zami ngami.
Abụ Ọma. Abụ nke ido obieze Devid nsọ. Aga m eto gị, O Onyenwe anyị, nʼihi na i sitere nʼebe dị omimi dọpụta m. I kweghị ka ndị iro m chịa m ọchị.
2 Nkosi Nkulunkulu wami, ngakhalela kuwe, wangisilisa.
O Onyenwe anyị Chineke m, akpọkuru m gị, ka i nyere m aka, ị gwọkwara m.
3 Nkosi, uwukhuphulile umphefumulo wami engcwabeni, ungigcinile ngiphila, ukuze ngingehleli emgodini. (Sheol )
O Onyenwe anyị, i si nʼala ili kpọpụta m, i mere ka m dịrị ndụ. (Sheol )
4 Hlabelelani eNkosini, lina bangcwele bayo, libonge ekukhunjulweni kobungcwele bayo.
Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ, unu ndị nsọ ya, toonu aha nsọ ya.
5 Ngoba ukuthukuthela kwayo kungokwesikhatshana, impilo isemuseni wayo. Ukulila kungahlala kusihlwa, kanti ekuseni kulentokozo.
Iwe ya adịghị adịgide tee anya, ma ime amara ya na-adị ruo ebighị ebi! Ịkwa akwa nwere ike dịrị ogologo abalị niile, ma iti mkpu ọṅụ ga-adị nʼụtụtụ.
6 Mina-ke ngathi ekuphumeleleni kwami: Kangiyikunyikinywa laphakade.
Mgbe m nọ nʼudo, asịrị m, “Ihe ọbụla apụghị ịnapụ m udo m.”
7 Nkosi, ngomusa wakho wenzile intaba yami iqine; wabufihla ubuso bakho, ngahlupheka.
O Onyenwe anyị, mgbe i gosiri m ihuọma, i mere ka m kwụrụ chịm dịka ugwu; ma mgbe i zoro ihu gị site nʼebe m nọ, adara m mba.
8 Ngakhala kuwe, Nkosi; ngancenga eNkosini.
Ọ bụ gị, Onyenwe anyị, ka m kpọkuru; ọ bụkwa onyenwe anyị ka m rịọrọ arịrịọ amara sị,
9 Kulenzuzo bani egazini lami ekutshoneni kwami emgodini? Uthuli luzakudumisa na? Luzatshumayela iqiniso lakho yini?
“Uru gịnị dị ma m laa nʼiyi? Uru gịnị dị ma m rịda nʼili? Uzuzu aja ọ ga-enye gị otuto? Ọ ga-ekwusa banyere ikwesi ntụkwasị obi gị?”
10 Zwana, Nkosi, ube lomusa kimi; Nkosi, woba ngumsizi wami.
O Onyenwe anyị, gee m ntị ma meere m ebere; O Onyenwe anyị, bụụrụ m onye inyeaka.
11 Uphendule ukukhala kwami kwaba yikusina; ukhuphile isaka lami, wangibhincisa intokozo,
I meela ka iti mkpu akwa m ghọọ ite egwu; ị napụrụ m akwa mkpe m, ma yinye m ọṅụ dịka akwa mmemme.
12 ukuze udumo lwami luhlabele indumiso kuwe, lungathuli; Nkosi, Nkulunkulu wami, ngizakubonga kuze kube nininini.
I mere nke a ka obi m bụọ maka otuto gị, ghara ịnọ nwayọọ. O Onyenwe anyị Chineke m, aga m eto gị ruo mgbe ebighị ebi.