< Amahubo 27 >

1 INkosi iyikukhanya kwami losindiso lwami; ngizakwesaba bani? INkosi ingamandla empilo yami; ngizakwethuka bani?
Abụ Ọma Devid. Onyenwe anyị bụ ìhè m na nzọpụta m, onye ka m ga-atụ egwu ya? Onyenwe anyị bụ ebe siri ike nke ndụ m, ọ bụkwa onye ka m ga-atụ egwu?
2 Lapho ababi, izitha zami labamelana lami, besondela kimi ukudla inyama yami, bona bakhubeka bawa.
Mgbe ndị na-eme ihe ọjọọ busoro m agha ka ha ripịa anụ ahụ m, ọ bụ ndị iro m na ndị kpọrọ m asị, bụ ndị ga-asọ ngọngọ ma dakwaa.
3 Loba ibutho lingamisa inkamba limelene lami, inhliziyo yami kayiyikwesaba; loba impi ingangivukela, kulokhu ngizathemba.
Ọ bụrụ na usuu ndị agha agbaa m gburugburu, obi m agaghị atụ ụjọ ọbụla; ọ bụladị na agha adaa imegide m, nʼoge ahụ, ka m ga-enwe ntụkwasị obi.
4 Into yinye engiyicela eNkosini, yiyo engizayidinga, yikuthi ngihlale endlini yeNkosi insuku zonke zempilo yami, ukuze ngibone ubuhle beNkosi, ngibuzisise ethempelini layo.
Naanị otu ihe ka m rịọrọ nʼaka Onyenwe anyị, nke ahụ bụkwa ihe m na-achọsi ike; ka m biri nʼụlọ Onyenwe anyị ụbọchị niile nke ndụ m, na ka m lekwasị ịma mma Onyenwe anyị, na ka m chọọ ya nʼime ụlọnsọ ukwuu ya.
5 Ngoba izangifihla edumbeni layo ngosuku lobubi, ingifihle ekusithekeni kwethente layo, ingiphakamisele edwaleni.
Nʼihi na nʼụbọchị nsogbu, ọ ga-echebe m nʼime ebe obibi ya; ọ ga-ezo m nʼime ụlọ ikwu ya; ma bulie m elu, debe m nʼelu oke nkume.
6 Khathesi-ke ikhanda lami lizaphakanyiswa phezu kwezitha zami ezingihanqileyo; ngakho ngizanikela iminikelo yokuthaba ethenteni layo; ngizahlabela, yebo ngihlabele indumiso eNkosini.
Mgbe ahụ, a ga-eweli isi m elu karịa ndị iro m gbara m gburugburu; aga m eji iti mkpu ọṅụ, chụọ aja nʼụlọ ikwu ya; aga m abụ abụ, kụọ egwu nye Onyenwe anyị.
7 Zwana, Nkosi, ilizwi lami lapho ngikhala, njalo ungihawukele, ungiphendule.
Gee ntị mgbe m na-akpọku gị Onyenwe anyị. Meere m ebere, zaa m.
8 Uthe: Dingani ubuso bami. Inhliziyo yami yathi kuwe: Ubuso bakho, Nkosi, ngizabudinga.
Obi m na-ekwu banyere gị, “Chọọ ihu ya!” Ihu gị, Onyenwe anyị, ka m ga-achọ.
9 Ungangifihleli ubuso bakho; ungayixotshi inceku yakho ngokuthukuthela; ubulusizo lwami; ungangitshiyi, ungangideli, Nkulunkulu wosindiso lwami.
Ezonarịla m ihu gị, agbakụtala ohu gị azụ nʼiwe; nʼihi na ị bụrịị onye inyeaka m. O Chineke, Onye nzọpụta m, ahapụkwala m.
10 Lapho umama lobaba bengitshiya, khona iNkosi izangemukela.
Ọ bụrụrị na nne na nna m ahapụ m, Onyenwe anyị ga-anabata m.
11 Ngifundisa indlela yakho, Nkosi, ungikhokhele endleleni eqondileyo, ngenxa yezitha zami.
Zi m ụzọ gị, O Onyenwe anyị; duo m nʼụzọ kwesiri nʼihi ndị na-akpagbu m.
12 Unganginikeli entandweni yezitha zami, ngoba abafakazi bamanga bangivukele, lovutha isihluku.
Ararala m nyefee nʼaka ndị kpọrọ m asị nʼihi ọchịchọ ha, ọtụtụ ndị ama ụgha ebiliela imegide m, ha na-ekupụ ihe ike dịka ume.
13 Ngangizaphela ngaphandle kokuthi ngakholwa ukuthi ngizabona okuhle kweNkosi elizweni labaphilayo.
Olileanya m bụ nke a: Aga m ahụ ịdị mma Onyenwe anyị nʼala ndị dị ndụ.
14 Lindela iNkosi, ube lamandla, lenhliziyo yakho iqine, yebo, lindela iNkosi.
Chere Onyenwe anyị; dịrị ike, nwekwaa ume, ma chere Onyenwe anyị.

< Amahubo 27 >