< Amahubo 148 >

1 Dumisani iNkosi! Dumisani iNkosi lisemazulwini, idumiseni endaweni eziphezulu.
Toonu Onyenwe anyị. Toonu Onyenwe anyị site nʼeluigwe, toonu ya nʼebe niile kachasị elu.
2 Idumiseni lonke zingilosi zayo. Idumiseni lonke mabandla ayo.
Toonu ya, ndị mmụọ ozi ya niile, toonu ya, unu usuu ndị agha ya niile.
3 Idumiseni langa lenyanga. Idumiseni lonke zinkanyezi ezikhanyayo.
Toonu ya, anyanwụ na ọnwa toonu ya, kpakpando niile.
4 Idumiseni mazulu amazulu, lani manzi aphezu kwamazulu.
Toonu ya, unu eluigwe kachasị elu na unu mmiri dị nʼelu mbara eluigwe.
5 Kakudumise ibizo leNkosi; ngoba yona yalaya, kwasekudalwa.
Ka ha niile too aha Onyenwe anyị, nʼihi na ha niile malitere ịdị site nʼokwu ọnụ ya.
6 Yakumisa kuze kube nini lanini; yakhupha isimiso esingayikwedlula.
O doro ha nʼọnọdụ ha ga-anọ ruo mgbe ebighị ebi; o nyere iwu nke a na-agaghị agabiga.
7 Dumisani iNkosi lisemhlabeni, migobho yolwandle, lani zinziki zonke,
Toonu Onyenwe anyị, site nʼụwa, unu oke anụ mmiri niile na ogbu mmiri niile,
8 mlilo lesiqhotho, liqhwa elikhithikileyo lenkungu, siphepho esenza ilizwi layo;
na amụma, na mkpụrụ mmiri, na snoo na igwe ojii niile, na oke ifufe niile na-eme ihe o nyere nʼiwu,
9 zintaba lamaqaqa wonke, zihlahla zezithelo lemisedari yonke,
unu ugwu ukwu niile, na ugwu nta niile na osisi niile na-amị mkpụrụ na osisi sida niile
10 zinyamazana zeganga lezifuyo zonke, zinto ezihuquzelayo lenyoni eziphaphayo.
na anụ ọhịa, na anụ ụlọ niile, na ihe niile na-akpụ akpụ nʼala na nnụnụ niile,
11 Makhosi omhlaba, lani zizwe zonke, ziphathamandla, lani babusi bomhlaba,
ndị eze niile nke ụwa na mba niile dị iche iche, unu ụmụ eze na ndị niile na-achị achị nʼụwa,
12 majaha, lani-ke zintombi, maxhegu labatsha.
ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọ, ndị okenye na ụmụntakịrị.
13 Kabadumise ibizo leNkosi, ngoba ibizo layo lodwa liphakeme; ubukhosi bayo buphezu komhlaba lamazulu.
Ka ha niile too aha Onyenwe anyị, nʼihi na ọ bụ naanị aha ya ka e buliri elu; ebube ya dị ukwuu karịa eluigwe na ụwa.
14 Njalo iphakamisile uphondo lwabantu bayo, indumiso yabo bonke abangcwele bayo, eyabantwana bakoIsrayeli, abantu abaseduze layo. Dumisani iNkosi!
O meela ka mpi ndị ya dị elu, otuto ndị nsọ ya niile, nke Izrel ndị ọ hụrụ nʼanya. Toonu Onyenwe anyị.

< Amahubo 148 >