< Amahubo 115 >

1 Kakungabi kithi, Nkosi, kakungabi kithi, kodwa ebizweni lakho nika udumo, ngenxa yomusa wakho, ngenxa yeqiniso lakho.
Ọ bụghị anyị ka ọ dịrị, o Onyenwe anyị, ọ bụghị anyị ka ọ dịrị, kama ọ bụ aha gị ka ebube na-adịrị, nʼihi ịhụnanya gị na ikwesi ntụkwasị obi gị.
2 Kungani izizwe zizakuthi: Ungaphi pho uNkulunkulu wabo?
Gịnị mere ọtụtụ mba niile nke ụwa ji na-ajụ sị, “Olee ebe Chineke ha nọ?”
3 Kodwa uNkulunkulu wethu usemazulwini, wenza konke akuthandayo.
Chineke anyị bi nʼeluigwe. Ọ bụkwa ihe tọrọ ya ụtọ nʼobi ka ọ na-eme.
4 Izithombe zabo yisiliva legolide, umsebenzi wezandla zomuntu.
Arụsị ha niile bụ ọlaọcha na ọlaedo ka e ji kpụọ ha, ha bụ ọrụ aka mmadụ.
5 Zilomlomo, kodwa kazikhulumi; zilamehlo, kodwa kaziboni;
Ha nwere ọnụ ma ha adịghị ekwu okwu, ha nwere anya abụọ ma ha adịghị ahụ ụzọ;
6 zilendlebe, kodwa kazizwa; zilempumulo, kodwa kazinuki;
ha nwere ntị ma ha adịghị anụ ihe, ha nwekwara imi ma ha adịghị anụ isisi ọbụla;
7 zilezandla, kodwa kaziphathi; inyawo zilazo, kodwa kazihambi; kazikhulumi ngomphimbo wazo.
ha nwere aka, ma ha adịghị emetụ ihe ọbụla aka, ha nwere ụkwụ, ma ha adịghị eje ije; ha enweghị ike iji akpịrị ha mee mkpọtụ ọbụla.
8 Abazenzayo kabafanane lazo, wonke othembela kuzo.
Ndị na-eme ha ga-adịkwa ka ha. Ndị na-atụkwasị ha obi ga-adịkwa ka ha.
9 Israyeli, themba eNkosini. Ilusizo lwabo lesihlangu sabo.
Ụmụ Izrel, tụkwasịnụ Onyenwe anyị obi ọ bụ onye inyeaka ha na ọta ha.
10 Ndlu kaAroni, themba eNkosini. Ilusizo lwabo lesihlangu sabo.
Ezinaụlọ Erọn, tụkwasịnụ Onyenwe anyị obi. Ọ bụ ya bụ onye inyeaka ha na ọta ha.
11 Lina elesaba iNkosi, thembani eNkosini. Ilusizo lwabo lesihlangu sabo.
Unu ndị na-atụ egwu ya, tụkwasịnụ Onyenwe anyị obi ọ bụ onye inyeaka ha na ọta ha.
12 INkosi isikhumbule, izabusisa, ibusise indlu kaIsrayeli, ibusise indlu kaAroni;
Onyenwe anyị na-echeta anyị, ọ ga-agọzikwa anyị, ọ ga-agọzi ndị ya bụ Izrel, ọ ga-agọzi ezinaụlọ Erọn,
13 izabusisa labo abayesabayo iNkosi, abancinyane kanye labakhulu.
ọ ga-agọzi ndị niile na-atụ egwu Onyenwe anyị, ma onye nta ma onye ukwu.
14 INkosi izalandisa, lina labantwana benu.
Ka Onyenwe anyị mee ka unu mụbaa, unu na ụmụ unu.
15 Libusisiwe eNkosini, eyenza amazulu lomhlaba.
Ka Onyenwe anyị onye kere eluigwe na elu ụwa gọzie unu.
16 Amazulu, amazulu ngaweNkosi, kodwa umhlaba iwunike abantwana babantu.
Eluigwe niile bụ nke Onyenwe anyị, ọ bụkwa ya nyere ụmụ mmadụ elu ụwa niile.
17 Abafileyo kabayidumisi iNkosi, hatshi-ke loba ngubani owehlela ekuthuleni.
Ọ bụghị ndị nwụrụ anwụ na-eto Onyenwe anyị, ndị na-arịda nʼebe ịnọ duu;
18 Kodwa thina sizayibonga iNkosi kusukela khathesi kuze kube nininini. Dumisani iNkosi!
ọ bụ anyị ga-aja Onyenwe anyị mma, site ugbu a ruo mgbe ebighị ebi. Toonu Onyenwe anyị.

< Amahubo 115 >