< Izaga 31 >

1 Amazwi kaLemuweli inkosi yeMasa, unina amfundisa wona.
Ndị a bụ okwu si nʼọnụ Lemuel, eze Masa. Ha bụ okwu ndị ahụ nne eze Lemuel kuziri ya.
2 Ini, ndodana yami! Ini-ke, ndodana yesizalo sami! Ini-ke, ndodana yezithembiso zami!
Gee ntị, nwa m, gee ntị, nwa nke afọ m. Gee ntị, nwa m, nwa nke ọziza ekpere m niile.
3 Unganiki amandla akho kwabesifazana, kumbe izindlela zakho ekubhubhiseni amakhosi.
Enyela ụmụ nwanyị ike gị, enyekwela ịdị ike gị nʼaka ndị nʼala ndị eze nʼiyi.
4 Kakusikwamakhosi, Lemuweli, kakusikwamakhosi ukunatha iwayini, kumbe okweziphathamandla ukuloyisa okunathwayo okulamandla.
Lemuel nwa m, ọ bụghị ihe kwesiri ekwesi na ndị eze ga-aṅụ mmanya. O kwesikwaghị ka agụụ ịṅụ mmanya bụrụ ihe ga na-agụ ndị eze.
5 Hlezi anathe, akhohlwe isimiso, aguqule isahlulelo sawo wonke amadodana enhlupheko.
Ka ha ghara ịṅụbiga mmanya oke si otu a chefuo ikpe ikpe ziri ezi dịka iwu kwuru. Ka ha gharakwa isite nʼịṅụbiga mmanya oke napụ ndị a na-emegbu emegbu ikpe ziri ezi ha kwesiri inweta.
6 Phana okunathwayo okulamandla kobhubhayo, lewayini kwabababayo emphefumulweni.
Ndị e kwesiri inye mmanya bụ ndị ahụ na-ala nʼiyi, ndị ahụ nọ nʼọnọdụ oke ihe mgbu nke obi.
7 Kanathe, akhohlwe ubuyanga bakhe, angabe esakhumbula usizi lwakhe.
Ka ha ṅụọ chefuo ọnọdụ ọjọọ ha, ka ha gharakwa icheta ọnọdụ nhụju anya ha.
8 Vulela isimungulu umlomo wakho, udaba lwabo bonke abamiselwe incithakalo.
Jisie ike kwuchite ọnụ ndị ahụ na-enweghị ike ikwuru ọnụ onwe ha; kwuchitekwa ọnụ ndị niile ọnọdụ ha dị ala.
9 Vula umlomo wakho, wahlulele ngokulunga, umele ilungelo lomyanga loswelayo.
Kwusie okwu ike, kpeekwa ikpe ziri ezi. Gbooro ndị ogbenye na ndị mkpa na-akpa ọgụ site nʼaka ndị na-emegbu ha.
10 Ngubani ongathola umfazi okhuthela okulungileyo? Ngoba intengo yakhe iyedlula kakhulu amatshe amahle.
Nwanyị nwere ugwu onye ga-achọtali ya? Ọ dị oke ọnụ karịa nkume rubi.
11 Inhliziyo yomkakhe ithemba kuye, ukuze angasweli impango.
Di nwanyị dị otu a na-atụkwasị obi ya niile nʼime ya, ọ dịghị ihe dị mkpa nke na-akọ ya.
12 Umenzela okuhle, hatshi okubi, insuku zonke zempilo yakhe.
Ihe nwanyị dị otu a na-ewetara di ya bụ naanị ihe ọma. Ihe ọjọọ ọbụla adịghị esi nʼaka ya abịakwasị di ya ụbọchị niile nke ndụ ya.
13 Udinga uboya bezimvu lefilakisi, asebenze ngenjabulo yezandla zakhe.
Ọ na-ahọrọ ajị anụ na flakisi jiri ya na-arụ ọrụ na-atọ aka ya ụtọ.
14 Ufanana lemikhumbi yomthengisi; uletha ukudla kwakhe kuvela khatshana.
Ọ na-esite nʼebe dị anya na-ebubata ihe oriri nʼụlọ ya dịka a ga-asị na ọ bụ ụgbọ mmiri.
15 Uvuka kusesebusuku, anike indlu yakhe ukudla, lesabelo kuzincekukazi zakhe.
Tupu chi abọzie, nwanyị a esitelarị nʼihe ndina bilie kwadooro ezinaụlọ ya ihe oriri, ma debekwara odibo ndị inyom na-ejere ya ozi oke ihe oriri nke ha.
16 Anakane ngensimu ayizuze; ngesithelo sezandla zakhe ahlanyele ivini.
Ọ na-apụ nyochapụta ịdị mma ala ubi, ma zụpụta ya. Ọ bụ ego ọ rụpụtara nʼonwe ya ka o ji arụ ọrụ ubi vaịnị.
17 Uyabhinca ukhalo lwakhe ngamandla, aqinise ingalo zakhe.
Ike ịrụ ọrụ adịghị agwụ ya. Ọ dị nnọọ ike, bụrụkwa onye na-arụpụta ihe dị iche iche.
18 Uyananzelela ukuthi ukuthengisa kwakhe kuhle; isibane sakhe kasicitshi ebusuku.
Ọ na-elezi anya hụ na ihe ahịa o mepụtara dị ezi oke ọnụahịa; ọ bụ nke a mere o ji na-arụ ọrụ ruo nʼime ime abalị.
19 Welulela izandla zakhe kuluthi lokuphotha, lezandla zakhe zibambe isigodo esilezintambo.
Nʼọbụaka ya ka o jidere osisi ịtụ ogho akwa; mkpịsịaka ya na-ejidesikwa ozele e ji na-ekwe akwa ike.
20 Welulela umyanga isandla sakhe, elulele izandla zakhe koswelayo.
Ọ na-agbasapụ aka inyere ndị ogbenye na ndị mkpa na-akpa aka.
21 Kesabi iliqhwa elikhithikileyo ngenxa yabendlu yakhe, ngoba bonke abendlu yakhe bagqokiswe okubomvu.
Udu mmiri maọbụ oge oke oyi adịghị eche ya uche nʼihi na ndị niile nọ nʼezinaụlọ ya nwere uwe ha ga-eji chụọ oyi.
22 Uzenzela izembeso; isigqoko sakhe sililembu elicolekileyo leliyibubende.
Ọ na-akpa akwa a na-agbasa nʼelu ihe ndina, ma ya onwe ya na-eyikwa uwe e ji ezi akwa ọcha na akwa odo odo dụọ.
23 Umkakhe uyaziwa emasangweni, lapho ehlezi labadala belizwe.
Di ya bụ onye a na-asọpụrụ nʼọnụ ụzọ ama obodo ebe ọ na-ewere ọnọdụ nʼetiti ndị okenye nke ala ahụ.
24 Wenza ilembu elicolekileyo kakhulu, alithengise; anike umthengi ibhanti.
Ọ na-akpa ma na-adụkwa akwa dị iche iche, ya na ihe ike nʼukwu, ndị ọ na-eresi ndị ahịa ndị ọzọ.
25 Amandla lodumo kuyisigqoko sakhe; uyahleka mayelana losuku olulandelayo.
Ọ bụ nwanyị dị ike, onye a na-asọpụrụ asọpụrụ. Ụjọ adịghị atụkwa ya maka ihe ga-eme nʼoge dị nʼihu.
26 Uvula umlomo wakhe ngenhlakanipho; lemfundiso yomusa iselimini lwakhe.
Ọ na-eji amamihe na-ekwu okwu ntụziaka kwesiri dịkwa nʼire ya.
27 Uqaphela inhambo zomuzi wakhe; kadli isinkwa sobuvila.
Ọ na-etinye uche nʼihe niile banyere ezinaụlọ ya, ọ naghị arụ ọrụ umengwụ.
28 Abantwana bakhe bayavuka bathi ubusisiwe, lomkakhe laye uyamdumisa:
Ụmụ ya na-ebili gọzie ya; otu a kwa di ya ga-eto ya ezi otuto.
29 Manengi amadodakazi enze ngenkuthalo, kodwa wena wenyukile phezu kwawo wonke.
Ọ ga-asị; “E nwere ọtụtụ ndị inyom ndị bụ ezi nwunye nye di ha, ma gị onwe gị kachasị ha niile mma.”
30 Ubuhle buyinkohliso, lokubukeka kuyize; owesifazana owesaba iNkosi yena uzadunyiswa.
Ịma mma nke elu ahụ adịghị egosi ihe mmadụ bụ, nʼihi na ịma mma adịghị adịgide ogologo oge. Ma nwanyị ọbụla nke na-atụ egwu Onyenwe anyị bụ onye e kwesiri ito.
31 Mnikeni okuvela esithelweni sezandla zakhe, lemisebenzi yakhe kayimdumise emasangweni.
E kwesiri ito ya nʼihi ọrụ ọma niile nke aka ya rụpụtara. Ka ọrụ ya niile wetara ya otuto nʼọnụ ụzọ ama nke obodo.

< Izaga 31 >