< Izaga 26 >

1 Njengeliqhwa elikhithikileyo ehlobo lanjengezulu ngesikhathi sokuvuna, ngokunjalo udumo kalusifanelanga isithutha.
Ịhụ onye nzuzu a na-enye nsọpụrụ dịka ịhụ mkpụrụ mmiri ka ọ na-ada nʼoge ọkọchị maọbụ mmiri na-ezo nʼoge owuwe ihe ubi.
2 Njengenyoni ekuzulazuleni, njengenkonjane ekuphapheni, ngokunjalo isiqalekiso kungelasizatho kasiyikufika.
Dịka nnụnụ nta na-efegharị efegharị, maọbụ dịka eleke na-awụgharị otu a ka ọbụbụ ọnụ na-ekwesighị agaghị ere.
3 Isiswepu ngesebhiza, itomu ngelikababhemi, loswazi ngolomhlana wezithutha.
Ụtarị dịrị ịnyịnya, ịnyịnya ibu ka a na-ekenye mkpụmkpụ igwe nʼọnụ; otu a kwa ka apịpịa dị nye azụ ndị nzuzu.
4 Ungaphenduli isithutha ngokobuthutha baso, hlezi lawe ufanane laso.
A zaghachila onye nzuzu dịka enweghị uche ya si dị, ma ọ bụghị ya gị onwe gị ga-adị ka ya.
5 Phendula isithutha ngokobuthutha baso, hlezi sibe ngesihlakaniphileyo emehlweni aso.
Zaa onye nzuzu dịka enweghị uche ya si dị, ma ọ bụghị ya ọ ga-abụ onye maara ihe nʼanya onwe ya.
6 Othumela amazwi ngesandla sesithutha, uquma inyawo, unatha isihluku.
Iziga ozi site nʼaka onye nzuzu dịka mmadụ ibipụ ụkwụ ya maọbụ ịṅụ ihe ike dịka mmiri.
7 Imilenze yesiqhuli iyalengalenga; sinjalo isaga emlonyeni wezithutha.
Dịka onye ngwụrọ si eji ụkwụ ya eje ije, otu a ka ilu si esite nʼọnụ onye nzuzu apụta.
8 Njengokubophela ilitshe esavutheni, unjalo onika udumo esithutheni.
Ọ baghị uru inye onye nzuzu nsọpụrụ, nʼihi na ọ gaghị anọgide. Ọ dị ka ịwụ ọkụkọ mmiri nʼazụ.
9 Njengameva enyuka esandleni sesidakwa sinjalo isaga emlonyeni wezithutha.
Dịka ogwu manyere nʼaka onye na-aṅụbiga mmanya oke otu a ka ilu dị nʼọnụ onye nzuzu.
10 Omkhulu owabumba konke uvuza isithutha, avuze abadlulayo.
Dịka ọgba ụta si agba ụta ya na-enweghị onye o bụ nʼobi, otu a ka ọ dị bụ onye na-enye onye nzuzu maọbụ onye o bụla na-agafe nʼụzọ ọrụ ka o rụọra ya.
11 Njengenja ebuyela emahlanzweni ayongokunjalo isithutha siphinda ubuthutha baso.
Dịka nkịta laghachiri ọzọ nʼihe ọ gbọrọ, otu a ka ndị nzuzu dị mgbe ha na-emekwa omume enweghị uche ha.
12 Uyabona yini umuntu ohlakaniphileyo emehlweni akhe? Kulethemba elikhulu esithutheni kulaye.
Ị hụrụ onye mara ihe nʼanya nke onwe ya? Olileanya dị nye onye nzuzu karịa ndị dị otu a.
13 Olivila uthi: Kulesilwane endleleni; isilwane sisezitaladeni.
Onye umengwụ na-asị, “Ọdụm nọ nʼokporoụzọ, ọdụm ji oke iwe na-awagharị nọ nʼama niile!”
14 Isivalo siphenduka ngamabhanti aso, ngokunjalo ivila embhedeni walo.
Dịka ibo ọnụ ụzọ si emegharị nʼihe nkonye ya, otu a ka onye umengwụ si na-atụgharị onwe ya nʼelu ihe ndina ya.
15 Ivila lifihla isandla salo emganwini, liyavilapha ukusibuyisela emlonyeni walo.
Onye umengwụ na-amanye aka nʼefere nri ma oke umengwụ a naghị ekwe ka o weghachi ya tinye nʼọnụ ya.
16 Ivila lihlakaniphile emehlweni alo okwedlula abayisikhombisa abangaphendula ngenhlakanipho.
Nʼuche ya, onye umengwụ na-eche na ọ maara ihe karịa ndị ikom asaa na-eji ezi uche azaghachi okwu.
17 Odlulayo engenela ingxabano engeyisiyo eyakhe ungobamba indlebe zenja.
Onye na-etinye onwe ya nʼesemokwu na-agbasaghị ya dị ka mmadụ na-apụ nʼokporoụzọ dọkpụrụ nkịta ọbụla ọ hụrụ na ntị.
18 Njengohlanya oluphosa izikhuni ezivuthayo, imitshoko, lokufa,
Dịka onye ara na-agba àkụ na-ere ọkụ nke na-eweta ọnwụ,
19 unjalo umuntu okhohlisa umakhelwane wakhe, abesesithi: Kangisomi yini?
ka nwoke ahụ bụ nke na-aghọgbu onye agbataobi ya ma sị, “ọ bụ naanị egwuregwu ka m na-egwu.”
20 Uba kungelankuni umlilo uyacitsha; njalo uba kungelakunyeya, ukuxabana kuyathula.
Ọkụ na-anyụ mgbe nkụ gwụrụ, otu a kwa esemokwu na-akwụsị mgbe a kwụsịrị ikwu ndị ọzọ okwu nʼazụ.
21 Njengamalahle emalahleni avuthayo, lenkuni emlilweni, unjalo umuntu wenkani ngowokubasa ingxabano.
Dịka icheku si eme ka nkụ nwuru ọkụ, otu a ka onye na-ese okwu si eme ka ọgụ nwuru ọkụ.
22 Amazwi onyeyayo anjengezibondlo ezehlela kokungaphakathi kwesisu.
Okwu niile nke onye na-agba asịrị na-ekwu dịka iberibe nri nʼatọ ezi ụtọ, ha na-agbadakwa nʼime ime ala afọ.
23 Indebe ezivuthayo lenhliziyo embi kungamanyele esiliva ahuqa ukhamba.
Dịka ite aja ụrọ nke e ji ọlaọcha na-abaghị uru techie, ka egbugbere ọnụ dị nro nke obi jupụtara nʼihe ọjọọ bụ.
24 Ozondayo uyazenzisa ngezindebe zakhe, kodwa ufaka inkohliso ngaphakathi kwakhe.
Ndị iro na-eji egbugbere ọnụ ha gbanwee onwe ha, ma nʼime obi ha ọ bụ naanị aghụghọ dị ya.
25 Lapho esenza ilizwi lakhe libe ngelomusa, ungamkholwa, ngoba izinengiso eziyisikhombisa zisenhliziyweni yakhe.
Okwu ọnụ ya nwere ike tọọ ụtọ na ntị ma ekwenyerela ha, nʼihi na ihe arụ asaa jupụtara nʼime obi ha.
26 Inzondo isibekelwa ngenkohliso; ububi bakhe buzakwembulwa ebandleni.
Ọ bụ ezie na ọ ga na-eme ka ọ hụrụ gị nʼanya, ma iro ya ga-apụta ihe, mmadụ niile ga-ahụkwa ya.
27 Ogebhayo umgodi uzawela kuwo, logiqa ilitshe, lizabuyela kuye.
Onye na-egwuru ibe ya olulu ga-adaba nʼime ya. Ọzọ, onye na-enuda nkume, ya ka nkume ahụ ga-adagbu.
28 Ulimi lwamanga luzonda olubachobozayo, lomlomo obutshelezi usebenza incithakalo.
Onye ị kpọrọ asị bụ onye ị ga-achọ iwetara ihe mgbu site nʼịgha ụgha. Okwu ọma na-esighị nʼobi mmadụ pụta na-eweta ịla nʼiyi.

< Izaga 26 >