< Izaga 24 >
1 Ungabi lamhawu ngabantu ababi, ungaloyisi ukuba labo.
Ekwosola ndị ajọ omume ekworo, ka ihe banyere ha ghara ịtọ gị ụtọ.
2 Ngoba inhliziyo yabo iceba udlakela, lezindebe zabo zikhuluma uhlupho.
Nʼihi na-atụmatụ obi ha niile bụ otu ha ga-esi mee ihe ike, egbugbere ọnụ ha na-ekwu naanị maka ọgbaaghara.
3 Ngenhlakanipho indlu iyakhiwa, langokuqedisisa iqiniswe.
Ọ bụ amamihe ka e ji ewu ụlọ, ọ bụkwa nghọta ka e ji eme ka o guzosie ike.
4 Langolwazi amakamelo agcwaliswa ngempahla zonke eziligugu lezimnandi.
Sitekwa nʼihe ọmụma ka akụ niile ji ejupụta nʼime ya, bụ akụ ndị pụrụ iche ma dịkwa oke ọnụahịa.
5 Umuntu ohlakaniphileyo ulamandla, lomuntu ololwazi uqinisa amandla.
Onye maara ihe na-emeri site nʼịdị ike, ndị nwere ọmụma ihe na-akpali ike ha.
6 Ngoba ngezeluleko ezihlakaniphileyo ungalawula impi yakho, lokukhululwa kusebunengini babeluleki.
Ejela ọgụ ma ọ bụghị na i nwetara ezi ndụmọdụ, nʼihi na nzọpụta dị nʼige ọtụtụ ndị ndụmọdụ ntị.
7 Inhlakanipho enkulu iphakeme esiwuleni; esangweni kasivuli umlomo waso.
Amamihe dị elu nke ukwuu nye ndị nzuzu, ha gaghị asaghe ọnụ ha nʼọgbakọ ọnụ ụzọ ama.
8 Oceba ukwenza okubi, bazambiza ngokuthi ngumnikazi wamacebo amabi.
Onye na-eche echiche ime ihe ọjọọ ka a ga-agụ dịka onye nzube ihe ọjọọ
9 Umcabango wobuwula yisono, lesideleli siyisinengiso emuntwini.
Nzube niile nke onye na-enweghị uche bụ mmehie, ndị mmadụ na-akpọ onye na-akwa emo asị.
10 Uba uzitshengisa uxega ngosuku lokuhlupheka, amandla akho mancinyane.
Ọ bụrụ na ị pụghị iguzosi ike nʼoge nsogbu, ị bụ nnọọ onye ike ya dị ntakịrị.
11 Bophule abasiwa ekufeni, labatatalikela ekubulaweni, kungathi ungabanqanda.
Napụta ndị a na-eduba nʼọnwụ. Napụtakwa ndị ahụ a mara ikpe ọnwụ nʼụzọ na-ezighị ezi.
12 Uba usithi: Khangela besingakwazi lokhu; ohlola izinhliziyo yena kayikukunanzelela yini? Olondoloza umphefumulo wakho yena kakwazi yini? ngitsho ubuyisela emuntwini njengokomsebenzi wakhe?
Ọ bụrụ na ị sị, “Anyị amaghị banyere ihe ndị a,” ọ bụ na onye na-enyocha obi aghọtaghị ya? Ọ bụ na onye na-eche ndụ gị amaghị ya? Ọ bụ na ọ gaghị akwụghachi onye ọbụla ụgwọ dịka akaọrụ ya siri dị?
13 Dlana uluju, ndodana yami, ngoba lulungile, lohlanga loluju lumnandi elwangeni lwakho.
Nwa m nwoke, rachaa mmanụ aṅụ nʼihi na ọ dị mma. Mmanụ aṅụ nke si nʼugbugbo mmanụ aṅụ na-adị gị ụtọ nʼọnụ.
14 Lunjalo ulwazi lwenhlakanipho emphefumulweni wakho; uba uluthola, kuzakuba lomvuzo, lethemba lakho kaliyikuqunywa.
Marakwa na otu a ka amamihe kwesiri isi tọọ obi gị ụtọ. Ọ bụrụ na i chọta ya i nwere olileanya nke ga-adịgide.
15 Wena okhohlakeleyo, ungacathameli umuzi wolungileyo; ungachithi indawo yakhe yokuphumula.
Adịla ka onye na-emebi iwu, onye echiche ya niile bụ imegide ụlọ onye ezi omume. A gakwala ga kwakọrọ ihe dị nʼụlọ ya.
16 Ngoba olungileyo uzakuwa kasikhombisa, avuke futhi; kodwa abakhohlakeleyo bazakhubeka ebubini.
Nʼihi na onye ezi omume nwere ike daa ugboro asaa ma o ga-ebilikwa ọzọ. Ma ndị na-emebi iwu na-asọ ngọngọ mgbe nsogbu bịakwasịrị ha.
17 Ungathokozi ngokuwa kwesitha sakho, lekukhubekeni kwaso inhliziyo yakho kayingajabuli;
Aṅụrịla ọṅụ mgbe onye iro gị dabara na nsogbu. Ka obi gharakwa ịtọ gị ụtọ mgbe ọ dara.
18 hlezi iNkosi ikubone, kube kubi emehlweni ayo, iphendule ulaka lwayo ilususe kuso.
Nʼihi na Onyenwe anyị pụrụ iwe iwe nʼihi ya megide gị ma kwụsị ịta ya ahụhụ.
19 Ungazikhathazi ngenxa yabenzi bobubi, ungabi lamhawu ngabakhohlakeleyo;
Ekwosola onye na-emebi iwu ekworo, maọbụ nwe anya ukwu nʼebe onye ajọ omume nọọ.
20 ngoba omubi kayikuba lomvuzo; isibane sabakhohlakeleyo sizacitshwa.
Nʼihi na onye na-emebi iwu enweghị ọdịnihu; a ga-afụnyụkwa ọkụ onye ajọ omume.
21 Ndodana yami, yesaba uJehova lenkosi; ungahlanganyeli labaguquguqukayo;
Nwa m, tụọ egwu Onyenwe anyị na onye bụ eze, esonyerela ndị ozi na-enupu isi megide nna ha ukwu.
22 ngoba incithakalo yabo izavuka masinyane; njalo ngubani owazi ukuchitheka kwabo bobabili?
Nʼihi na ọ bụ na mberede ka ị ga-eso ha daba na nhụju anya. Onye maara ihe ga-abụ ọgwụgwụ ya?
23 Lala ngawabahlakaniphileyo. Ukunaka ubuso kusahlulelo kakulunganga.
Ndị a bụkwa okwu ọzọ ndị amamihe kwuru, iji gosi na ikpe ikpe na-akwụghị ọtọ adịghị mma.
24 Othi kokhohlakeleyo: Wena ulungile; abantu bazamqalekisa, izizwe zizamthukuthelela.
Onye ọbụla nke na-asị onye ikpe mara, “Onye ezi omume ka ị bụ,” ga-anata ọbụbụ ọnụ site nʼọnụ ọtụtụ mmadụ, mba niile ga-eweso ya iwe.
25 Kodwa kulabo abamkhuzayo kuzakuba lentokozo, lesibusiso esihle sizabehlela.
Ma ọ ga-adịrị ndị ahụ na-abara onye ikpe mara mba na mma, ha ga-anatakwa ezi ngọzị.
26 Ophendula ngamazwi aqondileyo uzakwanga indebe.
Ọsịsa ziri ezi bụ ihe na-egosi ikwesi ntụkwasị obi.
27 Lungisa umsebenzi wakho ngaphandle, uzilungiselele wona ensimini, emva kwalokho wakhe indlu yakho.
Rụchaa ọrụ gị dị nʼezi. Dozie ala ubi gị. Emesịa wuoro onwe gị ụlọ.
28 Ungabi ngumfakazi umelene lomakhelwane wakho kungelasizatho, kumbe ukhohlise ngendebe zakho.
Agbala ama ụgha megide onye agbataobi gị nʼefu. Ọ bụ egbugbere ọnụ gị abụọ ka ị ga-eji ghọọ aghụghọ?
29 Ungathi: Njengokwenza kwakhe kimi ngizakwenza njalo kuye; ngizaphindisela emuntwini njengokomsebenzi wakhe.
Asịla, “Aga m emeso ha dịka ha siri meso m. Aga m akwụghachi ha ụgwọ ihe ha mere.”
30 Ngedlula ensimini yevila, lesivinini somuntu oswele ingqondo;
Esitere m nʼubi otu onye umengwụ gafee, bụ ubi vaịnị nke onye na-enweghị uche,
31 khangela-ke, konke kwakumile ameva, imbabazane yayisibekele ubuso bakho, lomthangala wakho wamatshe udilikile.
hụ na ogwu etochiela ya, ahịhịa etochiekwala ya; mgbidi dị ya gburugburu adaakwala.
32 Mina-ke ngakukhangela, ngakubeka enhliziyweni yami; ngakubona, ngemukela imfundiso.
Elegharịrị m ya anya site na ya mụta otu ihe a:
33 Ubuthongo obuncinyane, ukuwozela okuncinyane, ukusonga izandla okuncinyane ukuthi kulalwe,
Nwa ụra nta, nwa iru ụra nta, nwa ịchịkọba aka nta zuo ike
34 besebusiza ubuyanga bakho njengesihambi, lenswelo zakho njengomuntu ohlomileyo.
ụbịam ga-abịakwasị gị dịka onye ohi, ụkọ abịakwasịkwa gị dịka onye na-apụnara mmadụ ihe.