< UMikha 6 >

1 Ake lizwe lokhu iNkosi ekutshoyo: Sukuma, ulwe lezintaba, lamaqaqa kawalizwe ilizwi lakho.
Geenụ ntị nʼihe Onyenwe anyị na-ekwu, “Bilienụ ọtọ, ma kwuonụ nʼihu ugwu niile ụzọ m siri mejọọ unu. Ka ugwu nta niile nụkwa ihe i nwere ikwu.
2 Zwanini, lina zintaba, impikisano leNkosi, lani zisekelo zomhlaba ezihlezi zikhona; ngoba iNkosi ilempikisano labantu bayo, njalo izalungisana loIsrayeli.
“Ma ugbu a geenụ ntị, unu ugwu niile, geenụ ntị, unu ntọala ebighị ebi niile nke ụwa, nʼihi na Onyenwe anyị nwere ikpe megide ndị nke ya. Ọ bụkwa Izrel ka ọ ga-arụso ụka.
3 Wena sizwe sami, ngenzeni kuwe? Njalo kuyini engikudinise kukho? Fakaza umelene lami.
“Unu bụ ndị m, gịnị ka m mere unu? Gwanụ m ụzọ m si boo unu ibu arọ? Zaanụ m.
4 Ngoba ngakukhuphula elizweni leGibhithe, ngakuhlenga endlini yobugqili; ngathuma phambi kwakho oMozisi, uAroni, loMiriyamu.
Nʼihi na e si m nʼala Ijipt kpọpụta unu. Agbapụtara m unu site na ịbụ ohu, nye unu Mosis na Erọn na Miriam ka ha nyere unu aka.
5 Sizwe sami, ake ukhumbule lokho uBalaki inkosi yakoMowabi eyakucebayo, lalokho uBalami indodana kaBeyori owakuphendula kuye, kusukela eShitimi kwaze kwaba seGiligali; ukuze wazi ukulunga kweNkosi.
Ndị m, chetanụ ihe Balak eze Moab zubere na ihe Belam nwa Beoa zara ya. Chetanụ njem unu site nʼobodo Shitim ruo obodo Gilgal, ka unu hụ nzọpụta nke Onyenwe anyị.”
6 Ngizakuza lani phambi kweNkosi, ngikhothame phambi kukaNkulunkulu ophakemeyo? Ngizakuza phambi kwayo ngileminikelo yokutshiswa, ngilamathole alomnyaka owodwa yini?
Gịnị ka m ga-eji bịa nʼihu Onyenwe anyị, ịkpọ isiala nʼihu Chineke onye dị oke elu? M ga-eji onyinye aja nsure ọkụ bịa nʼihu ya nke e ji ụmụ ehi gbara otu afọ chụọ?
7 INkosi izathokoza yini ngezinkulungwane zezinqama, ngezinkulungwane ezilitshumi zemifula yamafutha? Ngizanikela izibulo lami yini ngenxa yesiphambeko sami, isithelo sesisu sami ngenxa yesono somphefumulo wami?
Ọ ga-atọ Onyenwe anyị ụtọ, bụ ọtụtụ puku ebule, ya na iri puku mmanụ na-asọ dịka iyi? Aga m eji nwa mbụ m chụọ aja njehie m, maọbụ mkpụrụ nke ahụ m chụọ aja maka mmehie nke mkpụrụobi m?
8 Ikutshengisile, wena muntu, lokho okuhle; njalo iNkosi ifunani kuwe, ngaphandle kokwenza ukulunga, lokuthanda umusa, lokuhamba ngokuzithoba loNkulunkulu wakho?
Nʼihi na o gosila gị, gị mmadụ, ihe dị mma. Gịnịkwa bụ ihe ahụ Onyenwe anyị na-achọ nʼaka gị, Ọ bụ na ọ bụghị ikpe ziri ezi, na ịhụ ime ebere nʼanya, na iji obi dị umeala soro Chineke gị na-eje ije?
9 Ilizwi likaJehova liyamemeza kuwo umuzi, lenhlakanipho izabona ibizo lakho; zwanini uswazi, lolumisileyo.
Gee ntị! Olu Onyenwe anyị na-ada na-akpọku ndị obodo ahụ, nʼezie, ịtụ egwu gị bụ inwe amamihe. “Nụrụnụ olu mkpanaka na Onye hiwere ya.
10 Kusekhona inotho yenkohlakalo yini endlini yokhohlakeleyo, le-efa elinciphayo elinengekayo?
Ọ ga-abụ na m ga-echezọ akụ ị kpara nʼụzọ na-ezighị ezi, gị ụlọ ajọ omume, ya na ihe ọtụtụ nke na-erughị eru unu ji ere ahịa, bụ nke abụrụ ọnụ?
11 Bengingaba ngohlanzekileyo ngesikali sobubi yini, langesikhwama sezilinganiso zenkohliso?
M ga-asị onye na-eji ihe ọtụtụ aghụghọ azụ ahịa, na onye bu akpa nke ihe ọtụtụ aghụghọ dị iche iche juru nʼime ya na aka ya dị ọcha?
12 Ngoba abanothileyo bayo bagcwele udlakela, labakhileyo bayo bakhuluma amanga, lolimi lwabo lulenkohliso emlonyeni wabo.
Ndị ọgaranya unu bụ ndị na-eme ihe ike, ndị mmadụ nọ nʼime gị na-agha ụgha, ire ha na-ekwu naanị okwu aghụghọ.
13 Ngakho lami ngizakugulisa ngokukutshaya, ngikwenze incithakalo ngenxa yezono zakho.
Nʼihi ya, ebidola m ịla unu nʼiyi, na ime ka unu bụrụ ndị e bibiri nʼihi mmehie unu
14 Wena uzakudla, kodwa ungasuthi; njalo ukuphelelwa ngamandla kwakho kuzakuba ngaphakathi kwakho; futhi uzasusa, kodwa ungakhululi; lalokhu okukhululayo ngizakunikela enkembeni.
Unu ga-eri nri ma afọ agaghị eju unu; afọ agaghị ejukwa unu eju. Unu ga-ewezuga ihe, ma unu agaghị echekwa ha, nʼihi na ihe ọbụla unu nwere ike chekwaa, ka m ga-ewere nyefee nʼaka mma agha.
15 Wena uzahlanyela, kodwa ungavuni; wena uzanyathela izithelo zemihlwathi, kodwa ungazigcobi wena ngamafutha; lewayini elitsha, kodwa unganathi iwayini.
Unu ga-akụ mkpụrụ, ma unu agaghị ewe ihe ubi, unu ga-azọchapụta mmanụ oliv, ma unu agaghị ete ya nʼahụ unu; unu ga-azọchapụtakwa mmanya site na mkpụrụ vaịnị, ma unu agaghị aṅụ mmanya ya.
16 Ngoba izimiso zikaOmri ziyagcinwa, lawo wonke umsebenzi wendlu kaAhabi, futhi lihamba ngamacebo abo; ukuze ngikwenze ube yincithakalo, labakhileyo bayo babe ngokuncifelwayo; ngokunjalo lizathwala ihlazo labantu bami.
Unu edebela ụkpụrụ niile bụ nke Omri, na omenaala niile nke ụlọ Ehab, unu gbasokwara ndụmọdụ ha niile. Nʼihi ya, aga m enyefe unu nʼaka mbibi mee ka ndị gị ghọọkwa ihe ọchị, unu ga-aghọkwara mba niile ihe nkọcha.”

< UMikha 6 >