< UMathewu 23 >

1 Khona uJesu wakhuluma emaxukwini lakubafundi bakhe,
Mgbe ahụ Jisọs gwara igwe mmadụ ahụ niile na ndị na-eso ụzọ ya sị,
2 esithi: Ababhali labaFarisi bahlezi esihlalweni sikaMozisi;
“Ndị ozizi iwu na ndị Farisii na-anọ nʼoche Mosis.
3 ngakho konke lokhu abalitshela khona ukuthi likugcine, kugcineni likwenze; kodwa lingenzi njengokwemisebenzi yabo, ngoba bayakhuluma bangenzi.
Ya mere, meenụ ma na-edebekwanụ ihe niile ha na-agwa unu. Ma unu esokwala omume ha. Nʼihi na ha adịghị eme ihe ha na-ekwusa. Ha na-ekwu otu ihe ma na-eme ihe ọzọ.
4 Ngoba bayabopha imithwalo enzima njalo elukhuni ukuthwalwa, bayibeke emahlombe abantu, kodwa kabafuni ukuyisusa ngomunwe wabo.
Ha na-eke ibu dị arọ dịkwa ike obubu bokwasị ndị ọzọ nʼubu, ma ha onwe ha agaghị eweli ọ bụladị otu mkpịsịaka i buli ha.
5 Njalo imisebenzi yabo yonke bayenza ukuze babonwe ngabantu; ngoba benza amafilakteriyu abo abe banzi, njalo bakhulisa intshaka zezembatho zabo;
“Ihe niile ha na-eme bụ ka ndị mmadụ hụ ha. Ha na-eme ka igbe ntae tinyere iwu ndị dị mkpa e depụtara nke ha na-ekekwasị nʼegedege ihu na nʼaka dị obosara na-emekwa ka ọnụnụ uwe ha buo ibu.
6 bathanda izihlalo zabahloniphekayo ekudleni kwantambama, lezihlalo eziqakathekileyo emasinagogeni,
Ha hụrụ ịnọ nʼisi oche nʼoge mmemme oriri ọbụla na ịnọkwasị nʼoche kachasị elu nʼụlọ ekpere nʼanya.
7 lokubingelelwa emidangeni, lokubizwa ngabantu ngokuthi: Rabi, Rabi.
Ọ na-amasị ha mgbe a na-ekele ha ekele pụrụ iche nʼọma ahịa, ndị ọzọ a na-akpọkwa ha, ‘Onye ozizi.’
8 Kodwa lina kalingabizwa ngokuthi Rabi; ngoba munye ongumfundisi wenu, uKristu; njalo lina lonke lingabazalwane.
“Unu ekwela ka onye ọbụla kpọọ unu ‘Onye ozizi,’ nʼihi na unu nwere naanị otu Onye ozizi. Unu niile bụkwa ụmụnne. Ọ dịghị onye ka ibe ya ukwuu.
9 Futhi lingabizi muntu emhlabeni ngokuthi nguyihlo; ngoba munye onguYihlo, osemazulwini;
Unu akpọkwala onye ọbụla nʼụwa a ‘Nna,’ nʼihi na unu nwere otu Nna nke bi nʼeluigwe.
10 kalingabizwa ngokuthi lingabafundisi; ngoba munye ongumfundisi wenu, uKristu.
Unu ekwela ka a kpọọ unu ndị ndu, nʼihi na ọ bụ naanị otu onyendu ka unu nwere, ya bụ Kraịst.
11 Kodwa omkhulu kini uzakuba yinceku yenu.
Onye dị ukwuu nʼetiti unu ga-abụ onye na-ejere unu ozi.
12 Lalowo oziphakamisayo, uzathotshiswa; lalowo ozithobayo, uzaphakanyiswa.
Nʼihi na onye ọbụla ga-ebuli onwe ya elu ka a ga-eweda nʼala. Ma onye ọbụla wedara onwe ya ala, ka a ga-ebuli elu.”
13 Kodwa maye kini, babhali labaFarisi, bazenzisi, ngoba livalela abantu umbuso wamazulu; ngoba kalingeni lina, labangenayo kalibavumeli ukuthi bangene.
“Ahụhụ ga-adịrị unu ndị Farisii na ndị ozizi iwu, ndị ihu abụọ! Nʼihi na unu na-emechibido ndị ọzọ ụzọ ha ga-esi bata nʼalaeze eluigwe, ma unu onwe unu adịghị abata. Unu adịghịkwa enye ndị ọzọ ohere ịbata.
14 Maye kini, babhali labaFarisi, bazenzisi, ngoba lidla izindlu zabafelokazi, langokuzenzisa lenza imikhuleko emide; ngakho lizakwemukela ukulahlwa okukhulu.
“Ahụhụ ga-adịrị unu ndị ozizi iwu na ndị Farisii, ndị ihu abụọ! Nʼihi na unu na-eripịa ụlọ ndị inyom di ha nwụrụ, ọ bụladị mgbe unu na-ekpe ogologo ekpere ka mmadụ hụ unu. Unu ga-anata ikpe ọmụma dị ukwuu.
15 Maye kini, babhali labaFarisi, bazenzisi, ngoba libhoda ulwandle lomhlaba ukuthi lenze abe munye ophendukela kumaJuda, kuthi nxa esenziwe njalo, limenze umntwana wesihogo ngokuphindwe kabili kulani. (Geenna g1067)
“Ahụhụ ga-adakwasị unu ndị ozizi iwu na ndị Farisii, ndị ihu abụọ! Nʼihi na unu na-agafe oke osimiri na mba dị iche iche, ime ka otu onye chegharịa, bụrụ onye na-eso ụzọ unu. Ma mgbe unu mesịrị nke a, unu na-alaghachi mee ya okpukpu abụọ ka ọ bụrụ nwa ọkụ ala mmụọ karịa onwe unu. (Geenna g1067)
16 Maye kini, bakhokheli abayiziphofu, abathi: Loba ngubani ofunga ngethempeli, akulutho; kodwa loba ngubani ofunga ngegolide lethempeli, ulomlandu.
“Ahụhụ ga-adịrị unu ndị ndu kpuru ìsì! Nʼihi na unu na-asị, Onye ọbụla jiri ụlọnsọ ṅụọ iyi, iyi ọ ṅụrụ bụ ihe efu. Ma onye ọbụla jiri ọlaedo dị nʼime ụlọnsọ ṅụọ iyi kwesiri imezu iyi ahụ ọ ṅụrụ.
17 Zithutha leziphofu! Ngoba yikuphi okukhulu, igolide, kumbe ithempeli elenza igolide libe ngcwele?
Ndị nzuzu kpuru ìsì! Olee nke karịrị ukwuu? Ọ bụ ọlaedo ahụ, ka ọ bụ ụlọnsọ nke doro ọlaedo ahụ nsọ?
18 Njalo: Loba ngubani ofunga ngelathi, akulutho; kodwa loba ngubani ofunga ngomnikelo ophezu kwalo, ulomlandu.
Unu na-ezikwa ndị mmadụ sị, ‘Ọ bụrụ na mmadụ ejiri ebe ịchụ aja ṅụọ iyi, iyi ahụ ọ ṅụrụ bụ ihe efu. Ma onye ọbụla ga-eji onyinye dị nʼelu ebe ịchụ aja ṅụọ iyi ga-emezu iyi ahụ ọ ṅụrụ.’
19 Zithutha leziphofu! Ngoba yikuphi okukhulu, umnikelo, kumbe ilathi elenza umnikelo ube ngcwele?
Leenụ ka unu si bụrụ ndị ìsì! Olee nke karịrị ukwuu? Ọ bụ onyinye dị nʼelu ebe ịchụ aja ka ọ bụ ebe ịchụ aja na-edo onyinye ahụ nsọ?
20 Ngakho ofunga ngelathi ufunga ngalo langakho konke okuphezu kwalo;
Ya mere, mgbe onye ọbụla ji ebe ịchụ aja ṅụọ iyi, ọ bụ ebe ịchụ aja ahụ na onyinye dị nʼelu ya ka o ji ṅụọ iyi ahụ.
21 lofunga ngethempeli ufunga ngalo langaye ohlala kulo;
Otu a kwa, onye ji ụlọnsọ ahụ ṅụọ iyi jikwa ụlọnsọ ahụ na onye bi nʼime ya na-aṅụ iyi.
22 lofunga ngezulu ufunga ngesihlalo sobukhosi sikaNkulunkulu langaye ohlala phezu kwaso.
Mgbe mmadụ jikwa eluigwe ṅụọ iyi, ọ bụ ocheeze Chineke na onye nọdụrụ nʼelu ocheeze ahụ ka o ji ṅụọ iyi.
23 Maye kini, babhali labaFarisi, bazenzisi, ngoba lithela okwetshumi kwetshwayi leganga ledile lekhumini; liyekele okunzima komlayo, ukwahlulela lesihawu lokholo; belifanele ukwenza lezizinto, lingaziyekeli lalezo.
“E, ahụhụ ga-adakwasị unu ndị Farisii na ndị ozizi iwu. Ndị ihu abụọ! Nʼihi na unu na-asa anya unu mmiri nye, ọ bụladị onyinye otu ụzọ nʼime ụzọ iri unu ruo nʼakwụkwọ nri dịkarịsịrị nta dị nʼubi unu, dịka mint, diil na kumin, ma unu akpọghị ikpe ziri ezi na ebere, na okwukwe ihe dị mkpa. Ihe ndị a ka unu kwesiri ibu ụzọ mee ma gharakwa ileghara iwu ndị ọzọ anya.
24 Bakhokheli abayiziphofu, likhetha umiyane, kodwa liginye ikamela.
Ndị ndu kpuru ìsì! Unu na-azapụ ijiji site na mmanya unu na-aṅụ, ma unu na-eloda ịnyịnya kamel.
25 Maye kini, babhali labaFarisi, bazenzisi, ngoba lihlambulula ingaphandle yenkezo leyomganu, kodwa ngaphakathi kugcwele ukuphanga lobuhwaba.
“Ahụhụ ga-adakwasị unu, ndị Farisii na ndị ozizi iwu, ndị ihu abụọ! Nʼihi na unu na-elezi anya nke ọma mee ka azụ iko mmiri unu, na azụ efere unu dị ọcha, ma ime ha jupụtara na ịpụnarị mmadụ ihe nʼike na ọchịchọ ọjọọ niile.
26 MFarisi oyisiphofu! Hlambulula kuqala ingaphakathi yenkezo leyomganu, ukuze kuhlambuluke lengaphandle yakho.
Gị onye Farisii kpuru ìsì! Buru ụzọ mee ka ime iko dị ọcha, mgbe ahụ azụ ya ga-adịkwa ọcha.
27 Maye kini, babhali labaFarisi, bazenzisi, ngoba lifanana lamangcwaba aconjwe aba mhlophe, abonakala emahle ngaphandle, kanti ngaphakathi agcwele amathambo abafileyo lokungcola konke.
“Ahụhụ ga-adịrị unu ndị Farisii na ndị ozizi iwu, ndị ihu abụọ! Nʼihi na unu yiri ili e tere nzu, nke na-egosi onwe ya dị ka ihe mara mma, ma ime ya jupụtara nʼọkpụkpụ ndị nwụrụ anwụ, na ihe niile na-adịghị ọcha.
28 Kunjalo lani ngaphandle libonakala ebantwini lilungile, kanti ngaphakathi ligcwele ukuzenzisa lobubi.
Nʼụzọ dị otu a, unu na-egosi onwe unu dị ka ndị ezi omume, ma nʼime unu, unu jupụtara nʼihu abụọ na ndị ajọ omume.
29 Maye kini, babhali labaFarisi, bazenzisi, ngoba lakha amangcwaba abaprofethi, licecise amangcwaba abalungileyo,
“E, ahụhụ ga-adịrị unu ndị Farisii na ndị ozizi iwu, ndị ihu abụọ! Nʼihi na unu na-ewu ili ndị amụma na-ewerekwa ihe ịchọ mma na-edozi nkume ncheta ndị ezi omume.
30 lithi: Uba besikhona ensukwini zabobaba bethu, besingayikuhlanganyela labo egazini labaprofethi.
Unu na-asịkwa, ọ bụrụ na anyị nọ nʼoge nna anyị ha, anyị agaraghị eso ha wufuo ọbara ndị amụma.
31 Kunjalo liyazifakazela lina ukuthi lingamadodana alabo ababulala abaprofethi;
Site nʼụzọ dị otu a, unu na-agba akaebe megide onwe unu na unu bụ ụmụ ndị gburu ndị amụma.
32 lina-ke gcwalisani isilinganiso saboyihlo!
Gaanụ sorokwa nzọ ụkwụ nna unu ha, ka unu rụzuo ọrụ ahụ ha malitere.
33 Zinyoka, nzalo yamabululu, lizaphepha njani ukulahlwa kwesihogo? (Geenna g1067)
“Ụmụ agwọ! Ụmụ ajụala! Unu si aṅaa chee na unu ga-agbanarị ikpe nke ịba nʼọkụ ala mmụọ? (Geenna g1067)
34 Ngakho, khangelani, mina ngithuma kini abaprofethi labahlakaniphileyo lababhali; labanye babo lizababulala libabethele; labanye lizabatshaya ngesiswepu emasinagogeni enu libazingele imizi ngemizi;
Ya mere, aga m ezitere unu ndị amụma, ndị amamihe na ndị nkuzi. Ụfọdụ nʼime ha ka unu ga-egbu, ụfọdụ ka unu ga-akpọgide nʼobe, ndị ọzọkwa ka unu ga-apịa ihe nʼụlọ nzukọ unu. Unu ga-achụkwa ha ọsọ site nʼotu obodo gaa nʼobodo ọzọ.
35 ukuze kwehlele phezu kwenu igazi lonke elilungileyo elachithwa emhlabeni, kusukela egazini likaAbela olungileyo, kuze kufike egazini likaZakariya indodana kaBarakiya, elambulala phakathi kwethempeli lelathi.
Ka ọgbọ a bụrụ ndị ikpe mara nʼihi ọbara nke ndị ezi omume niile e gburu nʼụwa, site nʼọbara Ebel ruo na nke Zekaraya nwa Berekaya, onye unu gburu nʼetiti ụlọnsọ nʼebe ịchụ aja unu.
36 Ngiqinisile ngithi kini: Zonke lezizinto zizakwehlela phezu kwalesisizukulwana.
Nʼezie agwa m unu, ihe ndị a niile, ga-abịakwasị ọgbọ a.
37 Jerusalema, Jerusalema, wena obulala abaprofethi njalo obakhanda ngamatshe labo abathunywe kuwe! Bengithanda kangakanani ukubuthela ndawonye abantwana bakho, njengesikhukhukazi sibuthela amatsiyane aso ngaphansi kwempiko, kodwa kalivumanga.
“O Jerusalem, Jerusalem! Gị obodo na-egbu ndị amụma, na nke na-atụ ndị niile e ziteere gị nkume. Ugboro ole ka m chọrọ ịchịkọta ụmụ gị dị ka nne ọkụkụ si achịkọta ụmụ ya nʼokpuru nku ya ichebe ha? Ma ị chọghị ka m mee otu a!
38 Khangelani, indlu yenu itshiyiwe kini ilunxiwa.
Lee, a hapụrụla unu ụlọ unu ka ọ tọgbọrọ nʼefu.
39 Ngoba ngithi kini: Kalisoze langibona kusukela khathesi, lize lithi: Ubusisiwe ozayo ebizweni leNkosi.
Nʼihi na asị m unu, unu agaghị ahụ m anya ọzọ tutu ruo mgbe unu ga-asị, Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ nke na-abịa nʼaha Onyenwe anyị.”

< UMathewu 23 >