< ULukha 22 >
1 Kwasekusondela umkhosi wesinkwa esingelamvubelo, othiwa liphasika.
Nʼoge a, Mmemme Achịcha na-ekoghị eko nke a na-akpọ Ngabiga na-eru nso.
2 Abapristi abakhulu lababhali basebedinga ukuthi bangambulala njani; ngoba babesesaba abantu.
Ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu nọkwa na-achọ ụzọ ha ga-esi gbuo ya, nʼihi na ha na-atụ egwu ndị mmadụ.
3 USathane wasengena kuJudasi othiwa nguIskariyothi, owayengowenani labalitshumi lambili.
Mgbe ahụ, ekwensu banyere nʼime Judas, onye a na-akpọ Iskarịọt, otu nʼime mmadụ iri na abụọ na-eso ụzọ ya.
4 Wasesuka wayakhuluma labapristi abakhulu lezinduna ngokuthi angamnikela njani kubo.
Ọ gakwuru ndịisi nchụaja, na ndịisi ndị nlekọta nke ụlọnsọ ukwu ahụ, ya na ha akparịta ụka otu ọ ga-esi rara ya nyefee ya nʼaka ha.
5 Basebethokoza, basebevumelana ukumnika imali.
Ha ṅụrịrị ọṅụ ma kwekwa nkwa inye ya ego.
6 Wasevuma, njalo wadinga ithuba elihle lokumnikela kubo lingekho ixuku.
O kwenyere, na-achọkwa ohere ga-adị mma ọ ga-eji nyefee ya nʼaka ha mgbe igwe mmadụ na-agaghị anọ.
7 Lwaselufika usuku lwesinkwa esingelamvubelo, okwakumele kuhlatshwe ngalo iphasika.
O ruo nʼụbọchị Mmemme Achịcha na-ekoghị eko ahụ bụ ụbọchị a na-eji atụrụ Ngabiga achụ aja.
8 Wasethuma uPetro loJohane, esithi: Hambani liyesilungisela iphasika, ukuze sidle.
O zipụrụ Pita na Jọn sị, “Gaanụ kwadoo maka oriri Ngabiga nke anyị ga-eri.”
9 Basebesithi kuye: Uthanda ukuthi silungise ngaphi?
Ha sịrị ya, “Ebee ka ị chọrọ ka anyị gaa kwadoo maka ya?”
10 Wasesithi kubo: Khangelani, kuzakuthi selingenile emzini, umuntu uzahlangana lani ethwele imbiza yamanzi; limlandele endlini azangena kuyo.
Ọ sịrị ha, “Lee, ka unu na-abata nʼobodo, otu nwoke bu ite mmiri ga-ezute unu, soronụ ya baa nʼụlọ ọbụla ọ banyere.
11 Beselisithi kumninindlu: Uthi uMfundisi kuwe: Ingaphi indlu yezihambi, lapho engingadlela khona iphasika labafundi bami?
Sịnụ onyenwe ụlọ ahụ, ‘Onye ozizi sịrị, Olee ụlọ ndị ọbịa ebe mụ na ndị na-eso ụzọ m ga-anọ rie oriri Ngabiga?’
12 Yena-ke uzalitshengisa indlu enkulu ephezulu eyendlelweyo; lilungise khona.
Ọ ga-egosi unu otu ọnụụlọ buru ibu dị nʼelu ụlọ nke e dozicharala ihe niile, kwadoonụ nri anyị nʼebe ahụ.”
13 Bahamba-ke bafica njengokutsho kwakhe kubo; basebelungisa iphasika.
Ha gara chọpụta ihe niile dị ka ọ gwara ha. Ha kwadokwara nri Ngabiga ahụ.
14 Kwathi selifikile ihola, wahlala phansi, labaphostoli abalitshumi lambili belaye.
Mgbe oge awa ahụ ruru, ya na ndị na-eso ụzọ ya gara ebe ahụ nọdụ ala iri ihe.
15 Wasesithi kubo: Ngokunxwanela nginxwanele ukudla lani leliphasika ngingakahlupheki;
Ọ sịrị ha, “Ọ gụrụ m nnọọ agụụ ka mụ na unu rie nri Ngabiga a tupu mụ ataa ahụhụ.
16 ngoba ngithi kini: Kangisoze ngidle futhi kulo, lize ligcwaliseke embusweni kaNkulunkulu.
Nʼihi na asị m unu, agaghị m erikwa ya ọzọ tutu ruo mgbe a ga-emezu ya nʼalaeze Chineke.”
17 Wasethatha inkezo, esebongile wathi: Thathani lokhu, beselisabelana;
O buru iko, mgbe o nyechara ekele ọ sịrị, “Burunu nke a kesaa nʼetiti unu.
18 ngoba ngithi kini: Kangisoze nginathe okwesithelo sevini, kuze kufike umbuso kaNkulunkulu.
Nʼihi na asị m unu, site ugbu a ga nʼihu, agaghị m aṅụ mmanya sitere na mkpụrụ vaịnị ọzọ, ruo mgbe alaeze Chineke ga-abịa.”
19 Wasethatha isinkwa, esebongile wasihlephuna, wabanika, esithi: Lokhu kungumzimba wami, owanikelelwa lina; lokhu kwenzeni ukungikhumbula.
O werekwara otu ogbe achịcha, mgbe o nyechara ekele, ọ nyawaa ya nye ha sị, “Nke a bụ ahụ m nke e nyere nʼihi unu. Na-emenụ nke a iji na-echeta m.”
20 Ngokunjalo lenkezo emva kokudla, esithi: Inkezo le iyisivumelwano esitsha egazini lami, elichithelwa lina.
Nʼotu ụzọ ahụ, mgbe ha risiri nri anyasị o buuru iko sị, “Iko a bụ iko nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ nʼọbara m, nke a na-awụpụ nʼihi unu.
21 Kodwa khangelani, isandla songinikelayo silami etafuleni.
Ma lee, onye ahụ nke ga-arara m nye nọnyeere m, o sokwa m na-eri nri.
22 Ngoba isibili iNdodana yomuntu ihamba njengokumisiweyo; kodwa maye kulowomuntu enikelwa nguye!
Nwa nke Mmadụ na-aga ịnwụ dị ka e kpebiri ya, ma ahụhụ ga-adịrị nwoke ahụ a ga-esi nʼaka ya rara ya nye.”
23 Bona basebeqala ukubuzana ukuthi kambe ngubani kubo ozakwenza lokho.
Ha bidoro ịjụrịta onwe ha onye ọ bụ nʼetiti ha ga-eme nke a.
24 Kwavela lokuphikisana phakathi kwabo okokuthi nguwuphi kubo ongathiwa ngomkhulu.
Ịrụ ụka malitere nʼetiti ha banyere onye nʼime ha ka a na-agụ na ọ dị ukwuu karịa ibe ya.
25 Wasesithi kubo: Amakhosi abezizwe azibusa ngobulukhuni, leziphathamandla zazo zithiwa ngabasizi.
Ma ọ sịrị ha, “Ndị eze ndị mba ọzọ na-eji aka ike na-achị ndị nọ nʼokpuru ha. Otu aka ahụkwa, a na-akpọ ndị na-achị achị enyi ndị mmadụ.
26 Kodwa lina kakungabi njalo; kodwa omkhulu phakathi kwenu kabe njengomncinyane, longumkhokheli njengosebenzayo.
Ma unu onwe unu agaghị adị otu a. Kama onye kachasị ibe ya ịdị elu dịrị ka onye dịkarịsịrị nta. Ka onyeisi dịrị ka onye na-eje ozi.
27 Ngoba nguwuphi omkhulu, lowo ohleziyo ekudleni kumbe lowo osebenzayo? Kayisilowo yini ohlezi ekudleni? Kodwa mina ngiphakathi kwenu njengaye osebenzayo.
Onye dị elu karịa ibe ya? Ọ bụ onye nọdụrụ ala rie nri na tebul ka ọ bụ onye siri nri dozie ya na tebul? Ọ bụghị onye nọdụrụ ala rie nri na tebul? Ma adị m ka onye na-eje ozi nʼetiti unu.
28 Lina-ke liyibo ababehlezi lami ezilingweni zami;
Ọ bụ unu onwe unu bụ ndị nọnyere m nʼoge ọnwụnwa m niile.
29 njalo mina ngilimisele umbuso, njengoba uBaba engimisele,
Ana m enye unu alaeze dị ka Nna m nyere m ya.
30 ukuthi lidle linathe etafuleni lami embusweni wami, lihlale ezihlalweni zobukhosi, lisehlulela izizwe ezilitshumi lambili zakoIsrayeli.
Ka unu nwe ike isoro m rie ma ṅụọkwa nʼalaeze m. Sorokwa m nọdụ nʼocheeze na-ekpe ebo iri na abụọ nke Izrel ikpe.
31 INkosi yasisithi: Simoni, Simoni, khangela, uSathane ulifunisisile, ukuze alihlungule njengamabele;
“Saimọn, Saimọn, lee ekwensu arịọla ike ịyọcha unu dị ka ọka wiiti.
32 kodwa mina ngikukhulekele, ukuze ukholo lwakho lungapheli; wena-ke nxa usuphendukile uqinise abazalwane bakho.
Ma ekpeelara m gị ekpere ka okwukwe gị ghara ịda. Mgbe ị kwudosiri ike, gbaakwa ụmụnna gị ume.”
33 Kodwa wathi kuye: Nkosi, lentolongweni lekufeni ngilungele ukuya khona lawe.
Ma ọ sịrị ya, “Onyenwe anyị, ejikeere m isoro gị gaa mkpọrọ, ma sorokwa gị nwụọ.”
34 Kodwa yena wathi: Ngiyakutshela, Petro, iqhude kaliyikukhala lamuhla, ungakaphiki kathathu ukuthi uyangazi.
Jisọs zara, “Agwa m gị Pita, tupu oke ọkụkụ akwaa akwa taa, ị ga-agọnarị m ugboro atọ, si na ị maghị onye m bụ.”
35 Wasesithi kubo: Mhla ngilithuma lingelamxhaka lesikhwama lamanyathela, laswela yini ulutho? Basebesithi: Kasiswelanga lutho.
Ọ gwara ha, “Mgbe m zipụrụ unu na mbụ sị unu ewerekwala ego, maọbụ akpa maọbụ akpụkpọụkwụ, o nwere ihe kọrọ unu?” Ha sịrị, “O nweghị ihe kọrọ anyị.”
36 Wasesithi kubo: Kodwa khathesi lowo olomxhaka kawuthathe, ngokunjalo lesikhwama; lalowo ongelakho, athengise isembatho sakhe, athenge inkemba.
Ọ sịrị ha, “Ugbu a, ọ bụrụ na i nwere akpa ego, were ya, ma werekwa akpa ije. Ọ bụrụkwa na i nweghị mma agha ree uwe mgbokwasị gị zụtara onwe gị otu.
37 Ngoba ngithi kini, kusamele kugcwaliseke kimi lokhu okulotshiweyo, ukuthi: Wabalwa kanye lezoni; ngoba lalezizinto eziqondane lami zilesiphetho.
Nʼihi na agwa m unu, na a ga-emejupụta ihe ndị a e dere nʼakwụkwọ nsọ nʼime m, A gụkọtara ya na ndị na-emebi iwu. Nʼezie, ihe e dere banyere m eruwela mgbe ọ ga-emezu.”
38 Basebesithi: Nkosi, khangela, nanzi inkemba ezimbili. Wasesithi kubo: Kwanele.
Ha sịrị, “Onyenwe anyị, lee mma agha abụọ dị ebe a.” Ọ sịrị ha, “Nke ahụ ezuola.”
39 Wasephuma waya entabeni yeMihlwathi njengokwejwayela; labafundi bakhe bamlandela.
Jisọs pụrụ gaa nʼUgwu Oliv dị ka ọ na-eme mgbe dum, ndị na-eso ụzọ ya sokwa ya gaa.
40 Esefikile kuleyondawo, wathi kubo: Khulekani ukuthi lingangeni ekulingweni.
Mgbe o ruru nʼebe ahụ, ọ sịrị ha, “Kpeenụ ekpere ka unu ghara ịdaba nʼọnwụnwa.”
41 Yena wasemonyuka kubo okungaba libanga lokuphosa ilitshe, waguqa phansi ngamadolo wakhuleka,
Ọ hapụrụ ha gaa ihe ha ka nzọ ụkwụ ole na ole nọrọ nʼebe ahụ gbuo ikpere nʼala kpee ekpere, sị,
42 esithi: Baba, uba uthanda, susa linkezo kimi; kodwa-ke kungenziwa intando yami, kodwa eyakho.
“Nna ọ bụrụ na ị chọrọ, nara m iko a, ma otu ọ dị, ọ bụghị ka e mee uche m, kama ka e mezuo uche gị.”
43 Kwabonakala kuye ingilosi evela ezulwini imqinisa.
Otu mmụọ ozi si nʼeluigwe bịakwutere ya, gbaakwa ya ume.
44 Esesesizini olunzima, wakhuleka kakhulu. Njalo izithukuthuku zakhe zaba njengamathonsi egazi zawela emhlabathini.
Site nʼoke ihe mgbu, o kpere ekpere kpesie ike, nke mere na ọsụsọ si ya nʼahụ na-adapụ nʼala dị ka ọkpụrụkpụ ọbara.
45 Esesukumile emkhulekweni, weza kubafundi bakhe, wabafica belele ngenxa yokudabuka,
Mgbe o kpechara ekpere bilie, ọ bịakwutere ndị na-eso ụzọ ya hụ ha ka ha na-arahụ ụra nʼihi ihe mwute nke obi.
46 wasesithi kubo: Lilaleleni? Vukani likhuleke, ukuze lingangeni ekulingweni.
Ọ sịrị ha, “Gịnị mere unu ji na-arahụ ụra? Bilienụ kpee ekpere ka unu ghara ịdaba nʼọnwụnwa.”
47 Kwathi esakhuluma, khangela, ixuku, lalowo okuthiwa nguJudasi, omunye wabalitshumi lambili, ehamba phambi kwabo, wasesondela kuJesu ukumanga.
Mgbe ọ ka kpụ okwu nʼọnụ, igwe mmadụ bịara, onye du ha bụ onye a na-akpọ Judas, bụ otu nʼime mmadụ iri na abụọ ahụ na-eso ụzọ ya. Ọ bịaruru Jisọs nso, isutu ya ọnụ.
48 Kodwa uJesu wathi kuye: Judasi, uyayinikela yini iNdodana yomuntu ngokuyanga?
Ma Jisọs sịrị ya, “Judas, ọ bụ site nʼisutu ọnụ ka i ji arara Nwa nke Mmadụ nye?”
49 Kwathi labo ababengakuye sebebona okuzakwenzeka bathi kuye: Nkosi, sigadle yini ngenkemba?
Mgbe ndị nọ ya gburugburu hụrụ ihe gaje ime, ha sịrị, “Onyenwe anyị, ọ bụ anyị were mma agha gbuo?”
50 Omunye wabo wasegadla inceku yompristi omkhulu, waquma indlebe yayo yokunene.
Otu nʼime ha ji mma gbuo ohu onyeisi nchụaja, gbupụ ntị aka nri ya.
51 Kodwa uJesu waphendula wathi: Yekelani kuze kube yilokhu. Wasethinta indlebe yayo, wayisilisa.
Ma Jisọs sịrị, “O zuola!” O metụkwara ntị nwoke ahụ aka gwọọ ya.
52 UJesu wasesithi kubapristi abakhulu lezinduna zethempeli labadala ababeze kuye: Liphume njengokuyamelana lomphangi yini lilezinkemba lezinduku?
Mgbe ahụ, Jisọs sịrị ndịisi nchụaja, na ndị nlekọta nke ụlọnsọ ukwu na ndị okenye, “Gịnị mere unu ji chịrị mma agha na mkpọ bịa ijide m, dị ka a ga-asị na m bụ onye ohi o ji egbe ezu?
53 Nxa bengilani insuku ngensuku ethempelini, kalelulanga izandla ukumelana lami; kodwa leli lihola lenu, lamandla obumnyama.
Mgbe mụ na unu na-anọ kwa ụbọchị nʼime ụlọnsọ ukwu ahụ, ma unu emetụghị m aka. Ma ugbu a bụ oge awa unu bụrụkwa mgbe ike ọchịchịrị na-achị achị.”
54 Sebembambile bamqhuba, bamusa endlini yompristi omkhulu. UPetro waselandela ekhatshana.
Mgbe ahụ ha jidere ya duru ya pụọ, gaa nʼụlọ onyeisi nchụaja. Pita sokwara ha nʼazụ kama ọ nọ nʼebe dị anya.
55 Sebebasile umlilo phakathi kweguma, sebehlezi phansi ndawonye, uPetro wahlala phakathi kwabo.
Mgbe ha kwanyere ọkụ nʼetiti mbara ezi obi ahụ, ma nọdụ ala gba ọkụ ahụ gburugburu, Pita sokwara ha nọdụ ala.
56 Kodwa incekukazi ethile imbona ehlezi emlilweni, yamjolozela, yathi: Lumuntu laye ube laye.
Ka ọ na-anya ọkụ ahụ, otu nwaagbọghọ na-eje ozi hụrụ ya, o leruru ya anya nke ọma, sị, “Onye a na Jisọs nọkọrọ.”
57 Kodwa wamphika, wathi: Mama, kangimazi.
Ma ọ gọrọ agọ sị, “Nwanyị, amaghị m onye ọ bụ.”
58 Emva kwesikhatshana omunye wasembona wathi: Lawe ungomunye wabo. Kodwa uPetro wathi: Ndoda, kangisuye.
Mgbe oge nta gasịrị, onye ọzọ hụkwara ya kwukwaa sị, “Gị onwe gị bụkwa otu onye nʼime ha.” Ma Pita kwuru sị, “Nwoke m, abụghị m.”
59 Sekungaba kwedlule ihola elilodwa, omunye waqinisa, esithi: Isibili laye ube laye; ngoba futhi ungumGalili.
Mgbe ihe dị ka otu awa gafere, onye ọzọ bịakwara kwusie okwu ike, “Nʼezie, nwoke a so ya nʼihi na ọ bụ onye Galili.”
60 Kodwa uPetro wathi: Ndoda, kangazi ukuthi uthini. Njalo khonokho esakhuluma lakhala iqhude.
Pita sịrị, “Nwoke m, amaghị m ihe ị na-ekwu maka ya?” Dị ka ọ kpụ okwu ahụ nʼọnụ, oke ọkpa kwara akwa.
61 INkosi yasiphenduka yamkhangela uPetro. UPetro waselikhumbula ilizwi leNkosi, ukuthi yakhuluma njani kuye isithi: Iqhude lingakakhali, uzangiphika kathathu.
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị tụgharịrị lee Pita anya. Pita chetakwara okwu Onyenwe anyị gwara ya nke bụ, “Tupu oke ọkpa akwa akwa taa, ị ga-agọnarị m ugboro atọ.”
62 UPetro wasephuma phandle wakhala kabuhlungu.
Ma ọ pụrụ nʼezi gaa bee akwa na mwute.
63 Lamadoda ayembambile uJesu amklolodela, amtshaya.
Ndị ahụ na-eche ya nche bidoro na-akwa ya emo na-etikwa ya ihe.
64 Amembesa, amtshaya ubuso, asembuza, esithi: Profetha! Ngubani okutshayileyo?
Ha jiri akwa kechie ya anya, sị ya, “Buo amụma, onye tiri gị ihe?”
65 Akhuluma lezinye izinto ezinengi kuye ehlambaza.
Ha kwukwara ọtụtụ okwu ọjọọ na nke mkparị megide ya.
66 Kwathi sekusile, abadala babantu babuthana, labapristi abakhulu lababhali, basebemusa emphakathini wabo, bathi:
Mgbe chi bọrọ, nzukọ ndị okenye na ndịisi nchụaja, na ndị ozizi iwu zukọtara, a kpọtakwara Jisọs nʼihu ha.
67 Uba unguKristu, sitshele. Wasesithi kubo: Uba ngilitshela, kalisoze likholwe;
Ha na-ekwu, “Ọ bụrụ na ị bụ Kraịst, gwa anyị.” Ọ sịrị ha, “Ọ bụrụ na m agwa unu, unu agaghị ekwe.
68 njalo uba lami ngilibuza, kalisoze lingiphendule, loba lingikhulule.
Ọ bụrụkwa na m ajụọ unu ajụjụ, unu agaghị aza m.
69 Kusukela khathesi iNdodana yomuntu izahlala ngakwesokunene samandla kaNkulunkulu.
Ma site ugbu a gawa, Nwa nke Mmadụ ga-anọdụ ala nʼaka nri nke ike Chineke.”
70 Basebesithi bonke: Kanti uyiNdodana kaNkulunkulu? Wasesithi kubo: Kutsho lina ukuthi ngiyiyo.
Ha niile sịrị, “Gị onwe gị, ị bụ Ọkpara Chineke?” Ọ sịrị ha, “Unu kwuru na Abụ m.”
71 Basebesithi: Pho sisafunelani ubufakazi? Ngoba sesizizwele uqobo lwethu emlonyeni wakhe.
Mgbe ahụ ha sịrị, “Gịnị mere anyị ji na-achọ onye akaebe ọzọ? Anyị ejirila ntị anyị nụrụ ya site nʼọnụ ya.”