< ULukha 17 >

1 Wasesithi kubafundi: Kakungeke kwenzeke ukuthi kungaveli izikhubekiso; kodwa maye kulowo ezivela ngaye!
Ọ sịrị ndị na-eso ụzọ ya, “Ihe ndị nke na-eme ka mmadụ jehie aghaghị ịdị, ma ahụhụ ga-adịrị onye ọbụla ọnọdụ ndị a ga-esi nʼaka ya bịa.
2 Kungaba ngcono kuye ukuthi ilitshe lokuchola elikhulu ligaxwe entanyeni yakhe, abesephoselwa olwandle, kulokuthi akhubekise abe munye kulaba abancinyane.
Ọ ga-akara gị mma ka e kenye gị nkume igwe nri nʼolu, tụnye gị nʼime oke osimiri, karịa na ị ga-eduhie otu nʼime ụmụntakịrị ndị a ụzọ.
3 Zinanzeleleni lina. Njalo nxa umfowenu ekona, mkhuze; futhi nxa ephenduka, mthethelele.
Kpachapụrụnụ onwe unu anya! “Ọ bụrụ na nwanna gị e mejọọ gị, baara ya mba. Ọ bụrụ na o chegharịa, gbaghara ya.
4 Njalo loba ekona kuze kube kasikhombisa ngosuku, abesebuya kuwe kasikhombisa ngosuku, esithi: Ngiyaphenduka; uzamthethelela.
Ọ bụrụkwa na o mejọọ gị ugboro asaa nʼotu ụbọchị, rịọkwa gị ugboro asaa sị, ‘E chegharịala m,’ ị ghaghị ịgbaghara ya.”
5 Abaphostoli basebesithi eNkosini: Yandisa kithi ukholo.
Ndị ozi ya sịrị ya, “Onyenwe anyị, mee ka okwukwe anyị dị ukwuu!”
6 INkosi yasisithi: Uba lilokholo olungangohlamvu lwemasitedi, belingatsho kulesisihlahla somabhulosi ukuthi: Quphuka, ugxumekeke olwandle; futhi besizalilalela.
Onyenwe anyị zara, “Ọ bụrụ na unu nwere okwukwe nke ha ka mkpụrụ mọstaadị, unu nwere ike ị sị osisi ukwu a, Ka e site na mgbọrọgwụ hopu gị ma kụọkwa gị nʼime oke osimiri, ọ ga-erubere unu isi.
7 Kodwa nguwuphi kini olenceku elimayo kumbe eyelusayo, ohle athi kiyo ingena ivela ensimini: Sondela, uhlale ekudleni?
“Ọ bụ onye nʼime unu nke nwere ohu onye si ebe ọ gara rụọ ọrụ maọbụ ịzụ atụrụ lọbata, ga-asị ya, ‘Mee ngwangwa nọdụ ala rie nri’?
8 Kodwa kazukutsho yini kuyo ukuthi: Lungisa engingakudla, uzibhince ungincedise, ngize ngidle nginathe; njalo emva kwalokhu udle unathe wena?
Ọ gaghị asị ya, ‘Siere m nri ọsịịsọ, kwadoo onwe gị jere m ozi ka m na-eri na aṅụkwa ihe ọṅụṅụ; emesịa ị ga-eri nri ma ṅụọ ihe ọṅụṅụ nke gị’?
9 Uyayibonga yini leyonceku, ngoba yenze izinto ezilayiweyo? Angicabangi.
Ọ ga-ekele ohu ahụ nʼihi na ọ rụrụ ọrụ o kwesiri ịrụ?
10 Kunjalo-ke lani, nxa selikwenzile konke elikulayiweyo, kalibokuthi: Sizinceku ezingasizi lutho, ngoba senze lokhu ebesifanele ukukwenza.
Nʼotu aka ahụ, mgbe unu rụchara ọrụ niile unu kwesiri ịrụ, ihe unu ga-ekwu bụ, ‘Anyị bụ ụmụ ohu na-ekwesighị ekwesi, anyị emeela ihe anyị kwesiri ime.’”
11 Kwasekusithi esahamba esiya eJerusalema, yena wadabula phakathi laphakathi kweSamariya leGalili.
Ka ọ na-aga Jerusalem, o sitere nʼụzọ dị nʼagbata Sameria na Galili.
12 Esangena emzaneni othile, amadoda alitshumi alobulephero amhlangabeza, ema khatshana;
Mgbe ọ banyere nʼotu obodo nta, ndị ekpenta iri sitere nʼebe dị anya zute ya.
13 wona asephakamisa ilizwi, esithi: Jesu, Nkosi, sihawukele!
Ha tiri mkpu nʼoke olu sị, “Jisọs nna anyị ukwuu, mere anyị ebere.”
14 Futhi kuthe ewabona wathi kuwo: Hambani liyeziveza kubapristi. Kwasekusithi ekusukeni kwawo, ahlanjululwa.
Mgbe ọ hụrụ ha, ọ sịrị ha, “Gaanụ gosi ndị nchụaja onwe unu.” Dị ka ha na-aga, e mere ka ha dị ọcha.
15 Futhi omunye wawo, esebonile ukuthi usilisiwe, wabuyela, edumisa uNkulunkulu ngelizwi elikhulu;
Mgbe otu nʼime ha chọpụtara na a gwọọla ya, ọ laghachiri azụ, jiri oke olu na-eto Chineke.
16 wasesiwa ngobuso enyaweni zakhe, embonga; njalo yena wayengumSamariya.
Ọ dara nʼala nʼụkwụ ya, kelee ya. Ọ bụ onye Sameria.
17 Kodwa uJesu waphendula wathi: Kakuhlanjululwanga yini abalitshumi? Bangaphi pho abayisificamunwemunye?
Jisọs jụrụ sị, “Ọ bụghị mmadụ iri ka e mere ka ha dị ọcha, ebeekwanụ ka itoolu ndị ọzọ nọ?
18 Akuficakalanga ababuya ukunika uNkulunkulu udumo, ngaphandle kwalo owezizweni.
Ọ bu naanị onye mba ọzọ a lọghachiri inye Chineke otuto?”
19 Wasesithi kuye: Sukuma uhambe; ukholo lwakho lukusindisile.
Mgbe ahụ, ọ sịrị ya, “Bilie, laa, okwukwe gị agwọọla gị.”
20 Kwathi ebuzwa ngabaFarisi, ukuthi umbuso kaNkulunkulu uzakuza nini, wasebaphendula wathi: Umbuso kaNkulunkulu kawuzi ngokukhanyayo;
Ma mgbe ndị Farisii jụrụ ya sị, Olee mgbe alaeze Chineke ga-abịa? O kwuru, “Ọbịbịa alaeze Chineke agaghị a bụ nʼụzọ a ga-eji anya efu hụ ya.
21 njalo kabayikutsho ukuthi: Khangelani nanku, kumbe: Khangelani nankuya. Ngoba khangelani, umbuso kaNkulunkulu uphakathi kwenu.
Ha agaghịkwa asị, ‘Lee, ọ nọ nʼebe a,’ maọbụ, ‘nʼebe ahụ,’ nʼihi nʼezie, alaeze Chineke nọ nʼetiti unu.”
22 Wasesithi kubafundi: Kuzafika insuku lapho elizafisa ukubona lube lunye lwezinsuku zeNdodana yomuntu, kodwa kaliyikulubona.
Mgbe ahụ, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, “Oge na-abịa mgbe ọ ga-agụsi unu agụụ ike ịhụ otu nʼime ụbọchị nke Nwa nke Mmadụ, ma unu agaghị ahụ ya.
23 Njalo bazakuthi kini: Khangelani nangu, kumbe: Khangelani nanguya; lingayi, njalo lingalandeli.
Ha ga-asị unu, ‘Lee, nʼebe ahụ,’ maọbụ, ‘Lee, nʼebe a,’ unu agala, unu esokwala ha.
24 Ngoba njengombane ophazimayo ukhanyisa kusukela kokunye ukucina ngaphansi kwezulu kusiya kokunye ukucina ngaphansi kwezulu, izakuba njalo leNdodana yomuntu osukwini lwayo.
Nʼihi na Nwa nke Mmadụ nʼụbọchị ya ga-adị ka amụma nke eluigwe nke na-enye ìhè na mbara eluigwe site nʼotu ebe ruo nʼebe nke ọzọ.
25 Kodwa kuqala imele ihlupheke izinto ezinengi njalo ilahlwe yilesisizukulwana.
Ma ọ ghaghị ibu ụzọ hụọ ọtụtụ ahụhụ, ọgbọ a ga-ajụkwa ya.
26 Futhi njengoba kwenzeka ensukwini zikaNowa, kuzakuba njalo lensukwini zeNdodana yomuntu.
“Dị ka ọ dị nʼụbọchị Noa, otu a ka ọ ga-adịkwa nʼụbọchị Nwa nke Mmadụ.
27 Babesidla, benatha, bethatha, besendiswa, kwaze kwaba lusuku uNowa angena ngalo emkhunjini, kwasekufika uzamcolo, wababhubhisa bonke.
Ha nọ na-eri na-aṅụ, na-alụ nwunye na-ekekwa ụmụ ha di, ruo mgbe Noa banyere nʼụgbọ mmiri. Oke iju mmiri ahụ bịakwara laa ha nʼiyi.
28 Ngokufananayo futhi njengoba kwenzeka ensukwini zikaLothi; babesidla, benatha, bethenga, bethengisa, behlanyela, besakha;
“Otu a ka ọ dịkwa nʼoge Lọt. Ha nọ na-eri, na-aṅụ, na-azụrịtakwa ahịa, na-akụ mkpụrụ, na-arụkwa ụlọ.
29 kodwa ngosuku uLothi aphuma ngalo eSodoma, kwana umlilo lesibabule kuvela ezulwini, kwababhubhisa bonke;
Ma nʼụbọchị ahụ Lọt si nʼobodo Sọdọm pụta, ọkụ na nkume dị ọkụ sitere nʼeluigwe zoo ka mmiri, laa ha niile nʼiyi.
30 kuzakuba njalo ngosuku ezakwembulwa ngalo iNdodana yomuntu.
“Otu a ka ọ ga-adịkwa nʼụbọchị a ga-eme ka Nwa nke Mmadụ pụta ìhè.
31 Ngalolosuku, lowo ophezu kophahla lwendlu, lempahla zakhe zisendlini, angehli ukuyazithatha; losensimini ngokunjalo angabuyeli ezintweni ezisemuva.
Nʼụbọchị ahụ, onye ọbụla nọ nʼelu ụlọ, ma ihe ya dị nʼime ụlọ, arịtukwala ịba nʼime ụlọ iburu ngwongwo ndị ahụ. Nʼotu aka ahụ, onye ọbụla nọ nʼubi, ya ghara ịlọghachita.
32 Khumbulani umkaLothi.
Chetakwanụ nwunye Lọt.
33 Loba ngubani odinga ukusindisa impilo yakhe izamlahlekela; kodwa loba ngubani olahlekelwa yiyo uzayilondoloza.
Onye ọbụla chọrọ iche ndụ ya nche ka ọ ga-efunarị, ma onye ọbụla na-atụfu ndụ ya ga-echebe ya.
34 Ngithi kini: Ngalobobusuku kuzakuba khona ababili embhedeni munye; omunye uzasuswa, lomunye atshiywe.
Asị m unu, nʼanyasị ahụ mmadụ abụọ ga-edina nʼotu akwa, a ga-ewepụ otu nʼime ha hapụ onye nke ọzọ.
35 Kuzakuba khona abesifazana ababili bechola ndawonye; omunye uzasuswa, lomunye atshiywe.
Ụmụ nwanyị abụọ ga na-akwọ ọka nʼotu ebe, a ga-ewere otu ma hapụ nke ọzọ.”
36 Kuzakuba khona ababili ensimini; omunye uzasuswa, lomunye atshiywe.
Ụmụ nwoke abụọ ga-anọ nʼubi, a ga-ewere otu onye hapụ nke ọzọ.
37 Basebephendula bathi kuye: Ngaphi, Nkosi? Wasesithi kubo: Lapho okukhona isidumbu, kulapho amanqe azabuthana khona.
Ha jụrụ ya sị, “Olee ebe, Onyenwe anyị?” Ọ sịrị ha, “Ebe ọbụla ozu dị, ka udele na-ezukọta.”

< ULukha 17 >