< ULevi 3 >

1 Uba-ke umnikelo wakhe ungumhlatshelo weminikelo yokuthula, nxa enikela okwenkomo, ingabe iduna kumbe insikazi, uzawunikela ungelasici phambi kweNkosi.
“‘Ọ bụrụ na onye ọbụla achọọ inye onyinye aja udo, o nwere ike jiri anụ ụlọ si nʼigwe ehi, oke ehi maọbụ nwunye ehi. Ma anụ ahụ ọ ga-ewebata nʼihu Onyenwe anyị aghaghị ịbụ ehi na-enweghị nkwarụ.
2 Uzabeka isandla sakhe enhlokweni yomnikelo wakhe, awuhlabe emnyango wethente lenhlangano; amadodana kaAroni angabapristi azafafaza-ke igazi phezu kwelathi inhlangothi zonke.
Onye ahụ wetara ya, ga-ebikwasị aka ya nʼisi anụ ahụ, gbuo ya nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute. Mgbe ahụ ụmụ Erọn ndị ikom, bụ ndị nchụaja, ga-efesa ọbara ya nʼakụkụ niile nke ebe ịchụ aja.
3 Uzanikela okuvela kuwo umhlatshelo weminikelo yokuthula umnikelo owenzelwe iNkosi ngomlilo, idanga, lamahwahwa wonke asemibilini,
Site nʼonyinye aja udo, ị ga-eweta onyinye nsure ọkụ nye Onyenwe anyị: abụba niile kpuchiri ihe dị nʼime afọ ya, na abụba niile nke metụtara ha,
4 lezinso zombili lamahwahwa akuzo asezinkalweni, lamahwahwa angaphezu kwesibindi uzawasusa lezinso.
akụrụ ya abụọ na abụba nke dị nʼelu ha ruo nʼakụkụ ukwu ya, na umeju ya na abụba kpuchiri umeju ya, nke ọ ga-ewepụ ya na akụrụ ya.
5 Njalo amadodana kaAroni azawatshisa elathini phezu komnikelo wokutshiswa ophezu kwenkuni eziphezu komlilo; kungumnikelo owenziwe ngomlilo oloqhatshi olumnandi eNkosini.
Mgbe ahụ, ụmụ Erọn ga-esunye ha ọkụ nʼelu aja nsure ọkụ a tụkwasịrị nʼosisi e sunyere ọkụ, ọ bụ onyinye nsure ọkụ, nke na-esi isi ụtọ nye Onyenwe anyị.
6 Uba-ke umnikelo wakhe ongumhlatshelo weminikelo yokuthula eNkosini ungowomhlambi, iduna kumbe insikazi, uzawunikela ungelasici.
“‘Ọ bụrụ na onyinye aja udo a na-achụrụ Onyenwe anyị bụ site nʼigwe ewu maọbụ atụrụ, ọ ghaghị ịbụ mkpi maọbụ nne ewu na-enweghị ntụpọ.
7 Uba enikela iwundlu, libe ngumnikelo wakhe, uzalinikela phambi kweNkosi,
Ọ bụrụ onyinye atụrụ, onye ahụ ga-ewebata ya nʼihu Onyenwe anyị.
8 abeke isandla sakhe enhlokweni yomnikelo wakhe, awuhlabe phambi kwethente lenhlangano; amadodana kaAroni azafafaza-ke igazi lawo phezu kwelathi inhlangothi zonke.
Ọ ga-ebikwasị aka ya nʼisi atụrụ ahụ, gbuo ya nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute. Ndị nchụaja, ụmụ Erọn, ga-efesa ọbara ya nʼakụkụ niile nke ebe ịchụ aja ahụ.
9 Uzanikela okuvela kuwo umhlatshelo weminikelo yokuthula, umnikelo owenzelwe iNkosi ngomlilo, amahwahwa awo, umsila wonke ononileyo ewuquma eduze lomgogodla, ledanga, lamahwahwa wonke asemibilini,
Ị ga-esite nʼonyinye aja udo a, weta onyinye nsure ọkụ nye Onyenwe anyị: abụba ya, na abụba niile dị nʼọdụdụ ya nke a ga-esite nʼakụkụ ọkpụkpụ azụ ya bepụta, na abụba kpuchiri ihe dị nʼime afọ ya; na abụba niile nke metụtara ha,
10 lezinso zombili lamahwahwa akuzo asezinkalweni, lamahwahwa angaphezu kwesibindi uzawasusa lezinso.
na akụrụ ya abụọ, na abụba kpuchiri ha ruo nʼakụkụ ukwu ya, na umeju ya, na abụba kpuchiri ya; nke ọ ga-ewepụ ya na akụrụ ya.
11 Umpristi uzakutshisa-ke elathini, kuyikudla komnikelo owenzelwe iNkosi ngomlilo.
Onye nchụaja ga-akpọ ha ọkụ nʼebe ịchụ aja dịka ihe oriri, onyinye nsure ọkụ nye Onyenwe anyị.
12 Uba-ke umnikelo wakhe uyimbuzi, uzawunikela phambi kweNkosi,
“‘Ọ bụrụ na onye ọbụla eweta ewu dịka onyinye ọ na-eche nʼihu Onyenwe anyị,
13 abeke isandla sakhe enhlokweni yayo, ayihlabe phambi kwethente lenhlangano; amadodana kaAroni azafafaza-ke igazi layo phezu kwelathi inhlangothi zonke.
ọ ga-ebikwasị aka ya nʼisi ewu ahụ, gbuo ya nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute. Ụmụ Erọn ndị ikom ga-efesa ọbara ya nʼakụkụ niile nke ebe ịchụ aja.
14 Uzanikela okuvela kiyo umnikelo wakhe, umnikelo owenzelwe iNkosi ngomlilo, idanga, lamahwahwa wonke asemibilini,
Ọ bụ site nʼonyinye nke i wetara ka ị ga-esi chee onyinye nsure ọkụ nye Onyenwe anyị: abụba niile kpuchiri ihe dị nʼime afọ ya na abụba niile metụtara ha,
15 lezinso zombili lamahwahwa akuzo asezinkalweni, lamahwahwa angaphezu kwesibindi uzawasusa lezinso.
na akụrụ ya abụọ, na abụba kpuchiri ha ruo nʼakụkụ ukwu ya, na ihe kpuchiri umeju ya; nke ọ ga-ewepụ ya na akụrụ ya.
16 Njalo umpristi uzakutshisa elathini, kuyikudla komnikelo owenziwe ngomlilo, kube luqhatshi olumnandi. Wonke amahwahwa ngaweNkosi.
Onye nchụaja ga-akpọ ha ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja dịka ihe oriri, onyinye nsure ọkụ, nke na-esi isi ụtọ. Abụba niile bụ nke Onyenwe anyị.
17 Yisimiso saphakade ezizukulwaneni zenu, emizini yenu yonke, sokuthi lingadli ngitsho amahwahwa lagazi.
“‘Iwu ndị a ga-adịgide site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ. Unu ga-edebezu ya nʼebe ọbụla unu bi. Unu agaghị eri abụba maọbụ ọbara ọbụla.’”

< ULevi 3 >