< ULevi 22 >

1 INkosi yasikhuluma kuMozisi isithi:
Onyenwe anyị gwara Mosis sị,
2 Tshono kuAroni lakumadodana akhe ukuthi bazehlukanise lezinto ezingcwele zabantwana bakoIsrayeli, bangangcolisi ibizo lami elingcwele; ngoba zingcwele kimi: NgiyiNkosi.
“Gwa Erọn na ụmụ ya ndị ikom ka ha jiri nsọpụrụ nabata onyinye dị nsọ nke ụmụ Izrel na-edo nsọ nye m, ka ha ghara imerụ aha nsọ m. Abụ m Onyenwe anyị.
3 Tshono kibo uthi: Loba nguwuphi umuntu ezizukulwaneni zenu owenzalo yenu yonke osondela ezintweni ezingcwele, abantwana bakoIsrayeli abazingcwelisela iNkosi, nxa ukungcola kwakhe kuphezu kwakhe, lowomuntu uzaqunywa asuke phambi kwami. NgiyiNkosi.
“Gwa ha sị, ‘Nʼọgbọ unu niile na-abịa, ọ bụrụ na enwee onye ọbụla nʼagbụrụ unu nke bịara nso nʼihe ndị ahụ dị nsọ ụmụ Izrel na-edo nsọ nye Onyenwe anyị, mgbe onye ahụ nọ ọnọdụ dịka onye rụrụ arụ, a ga-esi nʼihu m wezuga onye ahụ. Abụ m Onyenwe anyị.
4 Ngulowo lalowo owenzalo kaAroni, ongumlephero, loba olokugobhoza, kangadli ezintweni ezingcwele aze ahlambuluke. Lothinta lakuphi okungcoliswe yisidumbu, kumbe indoda okuphuma kuyo ubudoda bokuhlangana,
“‘Onye ọbụla bụ nwa nwa Erọn nke ọrịa ekpenta na-arịa, maọbụ nke ihe si nʼahụ ya na-asọpụta agaghị eri aja dị nsọ tutu ruo mgbe e mere ka ọ dịrị ọcha. Ọ ga-abụkwa onye rụrụ arụ ma ọ bụrụ na o metụ ozu aka, maọbụ onye mkpụrụ nwa na-esite nʼahụ awụsị,
5 kumbe loba ngubani othinta loba yiyiphi into ehuquzelayo, angcoliswa yiyo, kumbe umuntu angcoliswa nguye, ngakho konke ukungcola kwakhe,
maọbụ na o metụrụ anụ na-akpụgharị akpụgharị nʼala aka, nke na-emerụ ya, maọbụ na ọ metụrụ mmadụ aka nke mere ka ọ bụrụ onye rụrụ arụ nʼagbanyeghị ihe ọ bụ na-emerụ ya.
6 umuntu othinta lokhu uzakuba ngongcolileyo kuze kuhlwe, angadli okwezinto ezingcwele ngaphandle kokuthi ageze umzimba wakhe ngamanzi.
Onye ahụ metụrụ ihe ndị a aka ga-abụ onye rụrụ arụ ruo uhuruchi. Ọ gaghị eri ihe nsọ ọbụla tutu ruo mgbe ọ sachara ahụ.
7 Nxa selitshonile ilanga uzahlambuluka; lemva kwalokho angadla okwezinto ezingcwele, ngoba kuyikudla kwakhe.
Mgbe anyanwụ dara ka ọ ga-adị ọcha, nweekwa ike iri ihe dị nsọ, nʼihi na ọ bụ nri ya.
8 Ingcuba lokudatshuliweyo kangakudli ukuzingcolisa ngakho. NgiyiNkosi.
Ọ gaghị eri anụ nwụrụ anwụ, maọbụ nke anụ ọzọ dọgburu, nʼihi na ihe ndị a ga-emerụ ya. Abụ m Onyenwe anyị.
9 Ngakho bazagcina umlayo wami, ukuze bangathwali isono ngawo, bafele kuso, sebewungcolisile. NgiyiNkosi ebangcwelisayo.
“‘Ndị nchụaja kwesiri idebe ụkpụrụ m, ka ha ghara ịbụ ndị ikpe mara si otu a nwụọ nʼihi na ha lelịrị ha anya. Abụ m Onyenwe anyị onye na-edo ha nsọ.
10 Njalo kakho owemzini ozakudla into engcwele. Ohlala lompristi loyisisebenzi esiqhatshiweyo kangadli into engcwele.
“‘O nweghị onye ọbụla na-esiteghị nʼezinaụlọ ndị nchụaja ga-eri aja nsọ ahụ. Onye bụ ọbịa na onye e goro ọrụ nọ nʼụlọ onye nchụaja agaghị eri ya.
11 Kodwa uba umpristi ethenga umuntu eyintengo yemali yakhe, yena angadla okwayo, lozelwe emzini wakhe, bona bangadla okokudla kwakhe.
Otu ọ dị, ọ bụrụ na onye nchụaja weere ego nke aka ya gbata ohu, maọbụ na a mụrụ ohu ahụ nʼụlọ ya, ohu ahụ nwere ike iri aja nsọ ahụ.
12 Lendodakazi yompristi, uba isiba ngeyendoda yemzini, yona kayingadli okomnikelo wezinto ezingcwele.
Ọ bụrụ na nwa nwanyị onye nchụaja alụọ onye na-abụghị onye nchụaja, ọ gaghị eri ihe ọbụla site nʼime aja nsọ a.
13 Kodwa indodakazi yompristi, nxa ingumfelokazi loba ingelahliweyo ingelanzalo, isibuyele emzini kayise njengebutsheni bayo, izakudla okokudla kukayise; kanti kakho owemzini ongadla kukho.
Ma nwa nwanyị onye nchụaja nke di ya nwụrụ, maọbụ na ya na di ya ebikwaghị, ọ bụrụkwa na ọ mụtaghị nwa ọbụla, ọ lọghachi bịa biri nʼụlọ nna ya dịka o mere mgbe ọ bụ agbọghọ, o nwere ike iri nri dị nʼụlọ nna ya. Ọ dịkwaghị onye na-ekwesighị iri ya, nke ga-eri ya.
14 Njalo nxa umuntu esidla into engcwele ngokungazi, uzakwengezelela kuyo ingxenye yesihlanu yayo, anike umpristi into engcwele.
“‘Ọ bụrụ na onye ọbụla erie onyinye nsọ ahụ na-amaghị ama, ọ ga-eweghachiri onye nchụaja ihe niile o riri tụkwasịkwa ya otu ụzọ nʼụzọ ise ọzọ.
15 Njalo kabayikungcolisa izinto ezingcwele zabantwana bakoIsrayeli abaziphakamisela iNkosi,
Ndị nchụaja ekwesighị imerụ onyinye nsọ ụmụ Izrel na-eche nʼihu Onyenwe anyị,
16 babenze bathwale ububi becala, lapho besidla izinto zabo ezingcwele; ngoba ngiyiNkosi ebangcwelisayo.
site nʼikwenye ka ndị mmadụ efu rie onyinye nsọ ahụ, si otu a wetara ndị riri ya ikpe ọmụma nke ya na nkwụghachi so. Abụ m Onyenwe anyị onye na-edo ha nsọ.’”
17 INkosi yasikhuluma kuMozisi isithi:
Onyenwe anyị gwara Mosis sị,
18 Tshono kuAroni, lakumadodana akhe, lakubo bonke abantwana bakoIsrayeli, uthi kubo: Ngulowo lalowo owendlu kaIsrayeli, lowabezizweni koIsrayeli, ozanikela umnikelo wakhe ngezithembiso zabo zonke, langokweminikelo yabo yonke yesihle, abazayinikela eNkosini kube ngumnikelo wokutshiswa,
“Gwa Erọn na ụmụ ya ndị ikom na ụmụ Izrel niile okwu sị ha, ‘Ọ bụrụ na onye ọbụla, onye Izrel maọbụ onye ọbịa nʼIzrel, eweta aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị imezu nkwa o kwere, maọbụ dịka onyinye afọ ofufu,
19 ukuze lemukeleke, iduna elingelasici, elezinkomo, elezimvu, loba elembuzi.
ọ ga-eweta otu oke nke na-enweghị nkwarụ nke si nʼigwe ehi, maọbụ atụrụ, maọbụ ewu, ka a nabata ya nʼaha.
20 Linganikeli loba ngakuphi okulesici kukho, ngoba kakuyikwemukeleka kini.
Ewebatala ihe ọbụla nke nwere nkwarụ, nʼihi na agaghị m anabata ya nʼaha gị.
21 Umuntu, nxa enikela-ke umhlatshelo weminikelo yokuthula eNkosini wesithembiso esikhethekileyo loba womnikelo wesihle, enkomeni loba ezimvini, kumele uphelele ukuze wemukeleke, kungabi lasici kuwo.
Mgbe onye ọbụla wetara ehi maọbụ atụrụ maọbụ ewu site nʼigwe anụ, dịka onyinye aja udo ọ na-enye Onyenwe anyị maka imezu nkwa, maọbụ onyinye afọ ofufu, ọ ga-abụ nke na-enweghị ọrụsị maọbụ ntụpọ ọbụla tupu a nabata ya.
22 Eziyiziphofu, kumbe ezephukileyo, kumbe eziyizilima, kumbe ezilensumpa, kumbe eziloqweqwe, kumbe ezilamathumba, linganikeli lezi eNkosini, futhi linganikeli kulezi umnikelo owenziwe ngomlilo eNkosini phezu kwelathi.
Anụmanụ ọbụla kpuru ìsì, maọbụ nke merụrụ ahụ, maọbụ nke ụkwụ maọbụ aka gbajiri, maọbụ nke akpụkpa dị nʼahụ ya, maọbụ ihe nwere ure, maọbụ nke ọnya dị nʼahụ, agaghị abụ ihe onyinye nye Onyenwe anyị. Unu atụkwasịkwala ha nʼebe ịchụ aja dịka onyinye nye Onyenwe anyị.
23 Kodwa inkunzi loba imvu elesitho eselulekileyo kumbe esidundubeleyo lingayinikela ibe ngumnikelo wesihle; kodwa kayiyikwemukeleka ukuba ngeyesithembiso.
Unu nwere ike jiri ehi maọbụ atụrụ nke akụkụ ahụ ya tara ata, maọbụ nke otu akụkụ ya buru ibu karịa ibe ya chụọ aja onyinye si nʼobi, ma a gaghị e ji ya chụọ aja imezu nkwa.
24 Njalo linganikeli eNkosini okuhluzukileyo kumbe okugxotshiweyo loba okudatshuliweyo loba okuqunyiweyo; lingakwenzi elizweni lakini.
Unu agaghị enye anụmanụ ọbụla nke mkpụrụ amụ ya chipịara echipịa, maọbụ nke pịara apịa, maọbụ nke a dọwapụrụ adọwapụ maọbụ nke a chakapụrụ achakapụ, dịka onyinye nʼihu Onyenwe anyị. Unu enyekwala ụdị onyinye a nʼala unu.
25 Ngokuvela esandleni sowemzini linganikeli isinkwa sikaNkulunkulu wenu okuvela kuzo zonke lezi; ngoba ukonakala kwazo kukuzo, isici sikuzo, kaziyikwemukeleka kini.
Unu esitekwala nʼaka onye ọbịa nata ụdị onyinye a, ma webata ya dịka nri a na-enye Chineke unu. A gaghị anabata ha nʼọnọdụ unu, nʼihi na ha nwere nkwarụ, nwekwa ntụpọ.’”
26 INkosi yasikhuluma kuMozisi isithi:
Onyenwe anyị sịrị Mosis,
27 Nxa kuzalwa inkunzi loba imvu loba imbuzi, izakuba ngaphansi kukanina insuku eziyisikhombisa. Njalo kusukela kusuku lwesificaminwembili njalo kusiya phambili izakwemukeleka ibe ngumnikelo, umnikelo owenzelwe iNkosi ngomlilo.
“Mgbe a mụrụ nwa ehi, maọbụ nwa atụrụ, maọbụ ewu ọhụrụ, a ga-ahapụ ya na nne ya ụbọchị asaa. Site nʼụbọchị nke asatọ gaa nʼihu a ga-anabata ya dịka onyinye ihe oriri i ji chụọ aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị.
28 Kodwa inkomokazi loba imvukazi lingayihlabi lomntwana wayo ngasuku lunye.
Egbula nne anụ na nwa ya nʼotu ụbọchị, maọbụ ehi maọbụ atụrụ.
29 Njalo nxa lihlabela iNkosi umhlatshelo wokubonga, lizawuhlaba ukuze lemukeleke.
“Mgbe unu na-achụrụ Onyenwe anyị aja ekele, chụọnụ ya nʼụzọ ahụ a ga-anabata ya.
30 Uzadliwa ngalolosuku, lingatshiyi okwawo kuze kube sekuseni. NgiyiNkosi.
Riekwanụ anụ aja ahụ nʼotu ụbọchị ahụ, ka ọ hapụ ịfọdụ ruo echi ya. Abụ m Onyenwe anyị.
31 Ngakho gcinani imilayo yami, liyenze. NgiyiNkosi.
“Unu ga-edebe iwu m ndị a niile, mee ha nʼihi na abụ m Onyenwe anyị.
32 Njalo lingeyisi ibizo lami elingcwele, kodwa ngizangcweliswa phakathi kwabantwana bakoIsrayeli. NgiyiNkosi elingcwelisayo,
Unu emekwala ka aha m ghara ịdị nsọ. A ga-edo aha m nsọ nʼetiti ụmụ Izrel, nʼihi na abụ m Onyenwe anyị onye na-edo unu nsọ.
33 eyalikhupha elizweni leGibhithe ukuze ngibe nguNkulunkulu wenu. NgiyiNkosi.
Ọ bụ m kpọpụtara unu site nʼala Ijipt ka m bụrụ Chineke unu. Abụ m Onyenwe anyị.”

< ULevi 22 >