< ULevi 14 >

1 INkosi yasikhuluma kuMozisi isithi:
Onyenwe anyị gwara Mosis, sị,
2 Lo uzakuba ngumlayo womlephero ngosuku lokuhlanjululwa kwakhe: Uzalethwa kumpristi.
“Ndị a bụ usoro iwu gbasara onye ọrịa ekpenta nʼoge a na-eme mmemme ịdị ọcha ya, mgbe e dutere ya bịakwute onye nchụaja.
3 Umpristi uzaphuma-ke ngaphandle kwenkamba. Uba umpristi ezabona ukuthi, khangela, isifo sobulephero seselaphekile kumlephero,
Onye nchụaja ga-apụ gaa nʼazụ ebe obibi nọdụ nʼebe ahụ lee ya ahụ, ịchọpụta ma ọrịa ekpenta ya ọ laala nʼezie. Ọ bụrụ na ọrịa ya alaala,
4 umpristi uzalaya-ke ukuthi kuthathelwe lowo ozahlanjululwa inyoni ezimbili eziphilayo ezihlambulukileyo, lesigodo somsedari, lokubomvu, lehisope;
onye nchụaja ga-enye iwu ka e weta nnụnụ abụọ dị ndụ, na ụfọdụ osisi sida, na eriri ogho uhie, na hisọp, maka onye ahụ a ga-emere mmemme ịdị ọcha.
5 umpristi alaye ukuthi enye inyoni ibulawelwe embizeni yebumba phezu kwamanzi agobhozayo.
Onye nchụaja ga-enye iwu ka e gbuo otu nʼime nnụnụ abụọ ahụ nʼelu mmiri e si nʼọdọ mmiri na-asọ asọ kute nke dị nʼime ite aja.
6 Inyoni ephilayo, uzayithatha lesigodo somsedari, lokubomvu, lehisope, akugxamuze lenyoni ephilayo egazini lenyoni ehlatshelwe phezu kwamanzi agobhozayo,
Ọ ga-ewere nnụnụ nke ọzọ dị ndụ, ya na osisi sida ahụ, na ogho uhie ahụ, na hisọp ahụ, denye ha nʼime ọbara nnụnụ ahụ e gburu nʼelu mmiri ahụ.
7 amfafaze lowo ozahlanjululwa kubulephero kasikhombisa, atsho ukuthi uhlambulukile, ayekele inyoni ephilayo ikhululekile endle.
Mgbe ahụ, onye nchụaja ga-efe ọbara ahụ ugboro asaa nʼahụ onye ahụ a na-eme ka ọ dị ọcha site nʼọrịa ekpenta. Ọ ga-ekwupụtakwa na a gwọọla onye ahụ. Emesịa, ọ ga-ahapụ nnụnụ ahụ ka o felaa nʼọhịa.
8 Lalowo ozahlanjululwa uzahlamba izembatho zakhe, aphuce zonke inwele zakhe, ageze ngamanzi, ahlambuluke; emva kwalokho uzangena enkambeni, kodwa ahlale ngaphandle kwethente lakhe insuku eziyisikhombisa.
“Onye ahụ e mere ka ọ dị ọcha ga-asacha uwe ya, kpụchaa ntutu isi ya, saakwa ahụ ya. Mgbe ahụ, ọ ga-adị ọcha. Emesịa, ọ ga-esoro ndị mmadụ biri nʼobodo. Ma ọ gaghị abanye nʼụlọ nke aka ya tutu ụbọchị asaa agafee.
9 Kuzakuthi-ke ngosuku lwesikhombisa uzaphuca zonke inwele zakhe, ikhanda lakhe lezindevu zakhe lezintshiya zakhe, yebo, aphuce zonke inwele zakhe, awatshe izembatho zakhe, ageze umzimba wakhe ngamanzi, ahlambuluke.
Nʼụbọchị nke asaa, ọ ga-akpụchapụ ntutu isi ya, na afụọnụ ya, na ikuanya ya, na ajị ndị ọzọ dị ya nʼahụ. Ọ ga-asa uwe ya na ahụ ya niile. Mgbe ahụ, a ga-agụ ya nʼonye dị ọcha.
10 Langosuku lwesificaminwembili uzathatha amawundlu amabili amaduna angelasici, lewundlu elisikazi elilomnyaka owodwa elingelasici, lengxenye ezintathu etshumini zempuphu ecolekileyo kube ngumnikelo wokudla, kuxubene lamafutha, lelogi eyodwa yamafutha.
“Nʼụbọchị nke asatọ, ọ ga-ewere ebule abụọ na-enweghị ntụpọ, na otu nne atụrụ nke na-enweghị ntụpọ gbara otu afọ, ya na iri iko ọka a kwọrọ nke ọma a gwakọtara mmanụ oliv maka aja mkpụrụ ọka, na otu iko mmanụ.
11 Umpristi ohlambululayo uzamisa-ke indoda ezahlanjululwa lezinto phambi kweNkosi, emnyango wethente lenhlangano.
Onye nchụaja ahụ lere ya ahụ sị na ha dị ọcha, ga-ewere aja ndị a, ha na onye ahụ a na-aga ime ka ọ dị ọcha chee nʼihu Onyenwe anyị nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute.
12 Njalo umpristi uzathatha elinye iwundlu eliduna, alinikele libe ngumnikelo wecala, lelogi yamafutha, akuzunguze kube ngumnikelo wokuzunguzwa phambi kweNkosi;
“Mgbe ahụ, onye nchụaja ahụ ga-ewere otu nʼime ụmụ ebule ahụ, na otu iko mmanụ chụọ ya dịka onyinye aja ikpe ọmụma. Ọ ga-efufe ha nʼihu Onyenwe anyị dịka aja mfufe.
13 ahlabe iwundlu endaweni lapho okuhlatshelwa khona umnikelo wesono lomnikelo wokutshiswa, endaweni engcwele; ngoba umnikelo wecala ungowompristi njengomnikelo wesono; uyingcwelengcwele.
Ọ ga-egbu nwa ebule ahụ nʼakụkụ ebe nsọ ahụ, nʼebe a na-anọ egbu anụ aja mmehie na aja nsure ọkụ. Ọ bụ onye nchụaja ga-ewere anụ aja ikpe ọmụma a, dịka o were nke aja mmehie. Ọ bụ ihe dịkarịsịrị nsọ.
14 Umpristi uzathatha-ke okwegazi lomnikelo wecala, umpristi uzakufaka eqwangeni lwendlebe yokunene yalowo ozahlanjululwa, lesithupheni sesandla sakhe sokunene, lezwaneni olukhulu lonyawo lwakhe lokunene.
Onye nchụaja ahụ ga-ewere ụfọdụ nʼime ọbara aja ikpe ọmụma ahụ, tee nʼọnụ ntị aka nri nke onye ahụ a na-eme ka ọ dị ọcha. Ọ ga-etekwa ya nʼisi mkpụrụ aka nke aka nri ya, na nʼelu isi mkpụrụ ụkwụ nke ụkwụ aka nri ya.
15 Futhi umpristi uzathatha okwelogi yamafutha, akuthele esandleni sompristi sokhohlo.
Emesịa onye nchụaja ga-awụnyetụ mmanụ oliv ahụ nʼọbụaka nke aka ekpe ya,
16 Njalo umpristi uzagxamuza umunwe wakhe wokunene emafutheni asesandleni sakhe sokhohlo, afafaze okwamafutha kasikhombisa ngomunwe wakhe phambi kweNkosi.
ọ ga-arụnye otu mkpịsịaka nri ya nʼime mmanụ dị nʼọbụaka ya, ọ ga-ewere mkpịsịaka ya fesa ụfọdụ nʼime ya ugboro asaa nʼihu Onyenwe anyị.
17 Lokuseleyo kwamafutha asesandleni sakhe umpristi uzafaka eqwangeni lwendlebe yokunene yalowo ozahlanjululwa, lesithupheni sesandla sakhe sokunene, lezwaneni olukhulu lonyawo lwakhe lokunene, phezu kwegazi lomnikelo wecala.
Onye nchụaja ga-ewere mmanụ ahụ fọdụrụ nʼọbụaka ya tee ya onye ahụ nʼọnụ ntị aka nri nke onye ahụ a na-aga ime ka ọ dị ọcha, na nʼisi mkpụrụ aka nke aka nri ya, na nʼisi mkpụrụ ụkwụ nke aka nri ya, nʼelu ọbara aja ikpe ọmụma ahụ mee.
18 Lokuseleyo kwamafutha asesandleni sompristi uzakufaka ekhanda lalowo ozahlanjululwa. Ngalokho umpristi uzamenzela inhlawulo yokuthula phambi kweNkosi.
Ọ ga-ete mmanụ ahụ fọdụrụ nʼaka ya, nʼisi onye ahụ a na-eme ka ọ dị ọcha. Onye nchụaja ga-ekpuchikwara ha mmehie ya nʼihu Onyenwe anyị.
19 Umpristi uzanikela-ke umnikelo wesono amenzele inhlawulo yokuthula lowo ozahlanjululwa ekungcoleni kwakhe, lemva kwalokho ahlabe umnikelo wokutshiswa.
“Mgbe ahụ, onye nchụaja ga-achụ aja mmehie, kpuchiere onye ahụ a ga-eme ka ọ dị ọcha site na-adịghị ọcha ha mmehie ya. Emesịa, onye nchụaja ga-egbu aja nsure ọkụ ahụ,
20 Njalo umpristi uzanikela umnikelo wokutshiswa lomnikelo wokudla elathini. Ngalokho umpristi uzamenzela inhlawulo yokuthula, njalo uzahlambuluka.
were ya na onyinye mkpụrụ ọka chụọrọ onye ahụ aja, maka ikpuchiri ya mmehie ya. Mgbe ahụ, a ga-agụ onye ahụ nʼonye dị ọcha.
21 Kodwa-ke uba engumyanga, lesandla sakhe singakufinyeleli, uzathatha iwundlu elilodwa libe ngumnikelo wecala lokuzunguzwa ukumenzela inhlawulo yokuthula, lengxenye eyodwa etshumini lempuphu ecolekileyo ixubene lamafutha kube ngumnikelo wokudla, lelogi yamafutha,
“Ọ bụrụ na ọ bụ ogbenye onye na-enweghị ike iweta ihe ndị a, ha aghaghị iwere otu nwa ebule dịka aja ikpe ọmụma nke a ga-efufe nʼihi aja ikpuchi mmehie ha, Ọ ga-ewetakwa iko ọka a kwọrọ nke ọma asaa maọbụ ihe ọtụtụ efaa a gwara mmanụ oliv dịka aja mkpụrụ ọka, ya na otu iko mmanụ.
22 lamajuba amabili loba amaphuphu amabili enkwilimba, isandla sakhe esingakufinyelela, njalo okunye kube ngumnikelo wesono lokunye kube ngumnikelo wokutshiswa.
Ọ ga-ewetakwa nduru abụọ maọbụ kpalakwukwu abụọ, nke ọbụla o nwere ike iweta. Otu ga-abụ maka aja mmehie, nke ọzọ ga-abụ maka aja nsure ọkụ.
23 Langosuku lwesificaminwembili uzakulethela ukuhlanjululwa kwakhe kumpristi, emnyango wethente lenhlangano, phambi kweNkosi.
“Ọ ga-ewere ha nye onye nchụaja nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute nʼihu Onyenwe anyị, nʼụbọchị nke asatọ ya, maka ime ka ha dị ọcha.
24 Umpristi uzathatha-ke iwundlu elomnikelo wecala, lelogi yamafutha; njalo umpristi uzakuzunguza kube ngumnikelo wokuzunguzwa phambi kweNkosi.
Onye nchụaja ga-ewerekwa nwa atụrụ aja ikpe ọmụma ahụ, ya na otu iko mmanụ oliv ahụ, fufee ha nʼihu ebe ịchụ aja nye Onyenwe anyị.
25 Ahlabe iwundlu elomnikelo wecala; njalo umpristi athathe okwegazi lomnikelo wecala, akufake eqwangeni lwendlebe yokunene yalowo ozahlanjululwa, lesithupheni sesandla sakhe sokunene, lezwaneni olukhulu lonyawo lwakhe lokunene;
Ọ ga-egbu nwa atụrụ aja ikpe ọmụma ahụ, were ụfọdụ ọbara ya tee nʼọnụ ntị aka nri onye ahụ a na-aga ime ka ọ dị ọcha, na nʼisi mkpụrụ aka nke aka nri ya, na nʼisi mkpụrụ ụkwụ nke aka nri ya.
26 njalo umpristi uzathela okwamafutha esandleni sompristi sokhohlo;
Onye nchụaja ahụ ga-awụnye ụfọdụ mmanụ oliv ahụ nʼọbụaka nke aka ekpe ya,
27 umpristi uzafafaza-ke okwamafutha asesandleni sakhe sokhohlo kasikhombisa phambi kweNkosi ngomunwe wakhe wokunene;
ọ ga-ewere mkpịsịaka nri ya fesa ụfọdụ mmanụ ahụ nke dị nʼọbụaka ya ugboro asaa nʼihu Onyenwe anyị.
28 njalo umpristi uzafaka okwamafutha asesandleni sakhe eqwangeni lwendlebe yokunene yalowo ozahlanjululwa, lesithupheni sesandla sakhe sokunene, lezwaneni olukhulu lonyawo lwakhe lokunene, endaweni yegazi lomnikelo wecala.
Ọ ga-etekwa ụfọdụ mmanụ ahụ dị nʼaka ya nʼebe ndị ahụ o tere ọbara ikpe ọmụma ahụ, nke bụ nʼọnụ ntị onye ahụ nke a na-eme ka ọ dị ọcha, na nʼisi mkpụrụ aka nke aka nri ya, na nʼisi mkpụrụ ụkwụ nke aka nri ya.
29 Lokuseleyo kwamafutha asesandleni sompristi uzakufaka ekhanda lalowo ozahlanjululwa, ukumenzela inhlawulo yokuthula phambi kweNkosi.
Mmanụ nke fọdụrụ nʼaka ya ka onye nchụaja ga-ete nʼisi onye ahụ a na-eme ka ọ dị ọcha, ikpuchi mmehie ha nʼihu Onyenwe anyị.
30 Njalo uzanikela elinye lamajuba loba elamaphuphu enkwilimba, kulokho isandla sakhe esifinyelele kukho,
Emesịa, ọ ga-eji nduru abụọ ahụ maọbụ kpalakwukwu abụọ ahụ, nke ọbụla o nwere ike iweta, chụọ aja.
31 lokho isandla sakhe esifinyelele kukho, okunye kube ngumnikelo wesono lokunye kube ngumnikelo wokutshiswa, kanye lomnikelo wokudla. Lompristi uzamenzela ohlanjululwayo inhlawulo yokuthula phambi kweNkosi.
Otu ga-abụ maka aja mmehie, nke ọzọ ga-abụ maka aja nsure ọkụ, ha na aja mkpụrụ ọka. Nʼụzọ dị otu a, onye nchụaja ga-ekpuchiri ya mmehie ya nʼihu Onyenwe anyị, bụ onye ahụ a na-eme ka ọ dị ọcha.”
32 Lo ngumlayo ngalowo esikuye isifo sobulephero, osandla sakhe kasifinyeleli ekuhlanjululweni kwakhe.
Ndị a bụ usoro iwu dịrị onye ọbụla e sitere nʼọrịa ekpenta mee ka ọ dị ọcha, onye aka ya na-erughị iweta ihe o kwesiri iweta, bụ nke e ji eme ka ọ dị ọcha.
33 INkosi yasikhuluma kuMozisi lakuAroni isithi:
Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn okwu sị,
34 Lapho selifikile elizweni leKhanani engilinika lona libe yimfuyo, uba ngifake isifo sobulephero endlini yelizwe lelifa lenu,
“Mgbe unu banyere ala Kenan, bụ ala ahụ m na-enye unu, ọ bụrụ na o nwee ụlọ ọbụla m webatara ọrịa na-efe efe,
35 umninindlu uzakuza ambikele umpristi, esithi: Kubonakala kimi kungathi kulesifo endlini.
onyenwe ụlọ ahụ ga-ejekwuru onye nchụaja sị ya, ‘Ahụla m ihe yiri ọrịa na-efe efe nʼụlọ m.’
36 Umpristi uzalaya ukuthi bakhuphe okusendlini, engakafiki umpristi ukubona isifo, ukuze konke okusendlini kungangcoli. Emva kwalokho umpristi uzangena ukukhangela indlu.
Onye nchụaja ahụ ga-enye iwu ka a kwapụsịa ihe niile dị nʼụlọ ahụ tupu ọ gaa lezie ụlọ ahụ anya, ka ihe niile dị nʼụlọ ahụ ghara ịbụ ihe rụrụ arụ, ma ọ bụrụ na achọpụta ọrịa na-efe efe nʼụlọ ahụ. Mgbe a kwapụtasịrị ihe dị nʼụlọ ahụ, onye nchụaja ga-aga lee ụlọ ahụ.
37 Lapho ebona isifo, khangela-ke, uba isifo sisemidulwini yendlu, silamagodigodi aluhlazana loba abomvana, lokubonakala kwawo kutshonile kulomduli,
Ọ ga-ele ntụpọ dị nʼahụ ụlọ ahụ. Ọ bụrụ na ntụpọ ahụ na-acha ahịhịa ndụ ahịhịa ndụ, maọbụ ọbara ọbara, ọ bụrụkwa na ha miri emi karịa aja ụlọ ahụ nʼile anya,
38 umpristi uzaphuma endlini aye emnyango wendlu, ayivale indlu insuku eziyisikhombisa.
onye nchụaja ga-esi nʼọnụ ụzọ ụlọ ahụ pụọ, kpọchie ụlọ ahụ ụbọchị asaa.
39 Njalo umpristi uzabuya ngosuku lwesikhombisa; uba ebona ukuthi, khangela, isifo sesiqhelile emidulwini yendlu,
Nʼụbọchị nke asaa, onye nchụaja ga-alọghachi bịa lee ụlọ ahụ ọzọ. Ọ bụrụ na ntụpọ ahụ agbasaala nʼaja ụlọ ahụ,
40 umpristi uzalaya ukuthi bakhuphe izitina isifo esikuzo, bazilahlele ngaphandle komuzi endaweni engcolileyo,
onye nchụaja ga-enye iwu ka e tida akụkụ aja ụlọ ahụ bufuo ya nʼebe a na-ekpofu ihe rụrụ arụ nʼazụ obodo.
41 njalo uzakwenza ukuthi indlu iphalwe phakathi inhlangothi zonke, babesebethululela uthuli abaluphalileyo ngaphandle komuzi endaweni engcolileyo.
Ọ ga-enyekwa iwu ka a kpụchaa aja ụlọ niile dị nʼime ụlọ ahụ, bufukwaa aja niile a kpụchapụtara nʼebe a na-ekpofu ihe rụrụ arụ nʼazụ obodo.
42 Babesebethatha ezinye izitina, bazifake endaweni yalezozitina, njalo uzathatha olunye udaka ayibhade indlu.
A ga-ebute nkume ọzọ jiri ha dochie ndị ahụ e bupụsịrị. A ga-ejikwa ụrọ ọhụrụ tee ụlọ ahụ ọzọ.
43 Kodwa uba isifo sibuya futhi siqhamuke endlini emva kokukhupha kwakhe izitina, lemva kokuphalwa kwendlu, lemva kokubhadwa,
“Ma ọ bụrụ na ntụpọ ahụ apụta ọzọ, mgbe e bupụsịrị nkume ndị ahụ, ma mgbe a kpuchasịrị aja ụlọ ma techikwaa ya,
44 umpristi uzabuya; uba ebona ukuthi, khangela, isifo sesiqhelile endlini, kuyibulephero obuvukuzayo endlini; ingcolile.
onye nchụaja ga-abịa lee ya. Ọ bụrụ na ọ hụ na ntụpọ ahụ agbasaala ọzọ, ọ ga-agụ ụlọ ahụ dịka ihe rụrụ arụ, nʼihi na ntụpọ ahụ bụ ọrịa na-efe efe.
45 Njalo uzayidiliza indlu, izitina zayo, lezigodo zayo, lalo lonke udaka lwendlu, akukhuphele ngaphandle komuzi endaweni engcolileyo.
Ọ ga-enye iwu ka a kwatuo ụlọ ahụ bufukwaa ihe niile e jiri rụọ ya, nkume niile, osisi niile na ụrọ niile, nʼebe a na-ekpofu ihe rụrụ arụ nʼazụ obodo.
46 Lalowo ongena kuleyondlu zonke izinsuku eseyivalile uzakuba ngongcolileyo kuze kuhlwe.
“Onye ọbụla banyere nʼụlọ ahụ nʼoge e mechiri ya, ga-abụ onye rụrụ arụ ruo nʼoge uhuruchi.
47 Lalowo olala kuleyondlu uzahlamba izembatho zakhe; lalowo odlela kuleyondlu uzahlamba izembatho zakhe.
Onye ọbụla dinara ala maọbụ rie nri nʼime ya, ga-asacha uwe ya.
48 Kodwa nxa umpristi esengenile lokungena abone ukuthi, khangela, isifo kasiqhelanga endlini emva kokubhadwa kwendlu, umpristi uzakutsho ukuthi indlu ihlambulukile, ngoba isifo seselatshiwe.
“Ma ọ bụrụ na onye nchụaja abịa hụ na ntụpọ ahụ apụtaghị ọzọ, mgbe e techara ụlọ ahụ ụrọ nke ugboro abụọ, ọ ga-agụ ya nʼụlọ dị ọcha, nʼihi na ọrịa ahụ na-efe efe alaala.
49 Lokuze indlu ihlambuluke, uzathatha inyoni ezimbili, lesigodo somsedari, lokubomvu, lehisope,
Ọ ga-ejikwa nnụnụ abụọ, na osisi sida, na ogho uhie, na osisi hisọp mee mmemme ido ihe ọcha.
50 abulalele enye inyoni embizeni yebumba phezu kwamanzi agobhozayo,
Ọ ga-egbu otu nʼime nnụnụ ndị ahụ nʼelu mmiri e si nʼiyi na-asọ asọ kute, nke dị nʼime ite aja.
51 athathe isigodo somsedari lehisope lokubomvu lenyoni ephilayo, akugxamuze egazini lenyoni ebuleweyo lemanzini agobhozayo, afafaze indlu kasikhombisa,
Ọ ga-edenye osisi sida ahụ, na ogho uhie ahụ, na osisi hisọp ahụ, nʼime ọbara nnụnụ ahụ na mmiri ahụ. Ọ ga-efesa ọbara ahụ nʼụlọ ahụ ugboro asaa.
52 ahlambulule indlu ngegazi lenyoni langamanzi agobhozayo langenyoni ephilayo langesigodo somsedari langehisope langokubomvu,
Ọ bụ ọbara nnụnụ ahụ, na mmiri ahụ, na nnụnụ nke ọzọ ahụ dị ndụ, na osisi sida ahụ na hisọp ahụ, na ogho uhie ahụ ka ọ ga-eji mee ka ụlọ ahụ dị ọcha.
53 ayiyekele inyoni ephilayo iye ngaphandle komuzi endle. Ngakho uzayenzela indlu inhlawulo yokuthula, njalo ihlambuluke.
Ọ ga-ahapụ nnụnụ ahụ dị ndụ ka o fepụ felaa nʼọhịa dị nʼazụ obodo. Nke a ga-abụ otu e si kpuchiere ụlọ ahụ mmehie ya. Ọ ga-adịkwa ọcha.”
54 Lo ngumlayo waso sonke isifo sobulephero, lowoqweqwe,
Ndị a bụ usoro iwu metụtara ọrịa ekpenta, na ọkọ,
55 lowobulephero besembatho, lowendlu,
na ọrịa na-efe efe dị nʼuwe maọbụ nʼụlọ,
56 lowethumba, lowokhwekhwe, lowebala elikhanyayo,
maọbụ etuto, maọbụ ntụpọ, maọbụ ọnya.
57 ukufundisa mhla kungcolile lamhla kuhlambulukile. Lo ngumlayo wobulephero.
Iwu ndị a ga-enye aka ịmata ihe rụrụ arụ maọbụ ihe na-adịghị ọcha. Ndị a bụ usoro iwu metụtara ọrịa ekpenta na ọrịa na-efe efe.

< ULevi 14 >