< UJobe 35 >

1 UElihu wasephendula wathi:
Mgbe ahụ, Elihu sịrị:
2 Ukhumbula ukuthi lokhu kuqondile yini? Uthe: Ukulunga kwami kwedlula okukaNkulunkulu.
“Ị na-eche na nke a ziri ezi? Ị sịrị, ‘Na m ziri ezi ọ bụghị Chineke.’
3 Ngoba uthe kusizani kuwe, kungisizani okwedlula isono sami?
Nʼagbanyeghị ihe ndị a, ị na-ajụ ya si, ‘Uru gịnị ka ọ baara m, gịnị bụ uru m ma ọ bụrụ na emehieghị m?’
4 Mina ngizakuphendula, labangane bakho kanye lawe.
“Ọ ga-amasị m ịzaghachi gị, zaghachikwa ndị enyi gị na ha nọ.
5 Khangela amazulu ubone; ukhangele amayezi, aphakeme kulawe.
Lelie anya na eluigwe ma hụkwa. Legide mbara igwe na igwe oji niile, nke dị anya karịa gị.
6 Uba usona, wenzani kuye? Uba iziphambeko zakho zizinengi, wenzani kuye?
Ọ bụrụ na i mehie, olee ụzọ nke a si metụta ya? Ọ bụrụ na mmehie gị bara ụba, gịnị ka nke a pụrụ ime ya?
7 Uba ulungile, umnikani, kumbe wemukelani esandleni sakho?
Ọ bụrụ na ị bụ onye ezi omume, gịnị ka ị na-enye ya, maọbụ gịnị ka ọ na-anata site nʼaka gị?
8 Ububi bakho buthinta umuntu onjengawe, lokulunga kwakho indodana yomuntu.
Ajọ omume gị na-emetụta naanị mmadụ dịka gị, ma ezi omume gị na-emetụta naanị ụmụ ndị mmadụ.
9 Ngenxa yobunengi bencindezelo babenza bakhale; bayakhala ngenxa yengalo yabalamandla.
“Ụmụ mmadụ na-eti mkpu akwa nʼihi ịba ụba nke mmegbu, ha na-arịọ arịrịọ enyemaka site nʼaka ndị dị ike.
10 Kodwa kakho othi: Ungaphi uNkulunkulu umenzi wami, onika amahubo ebusuku,
Ma ọ dịghị onye na-asị, ‘Olee ebe Chineke onye kere m nọ, onye na-enye abụ nʼime abalị,
11 osifundisa okwedlula inyamazana zomhlaba, asenze sihlakaniphe okwedlula inyoni zamazulu?
onye na-akụziri anyị ihe karịa ka ọ na-akụziri ụmụ anụ ọhịa nke ụwa, onye na-eme ka anyị bụrụ ndị maara ihe karịa ụmụ nnụnụ nke igwe?’
12 Lapho bayakhala, kodwa kaphenduli, ngenxa yokuzigqaja kwababi.
Ọ dịghị azaghachi mgbe ụmụ mmadụ na-eti mkpu akwa, nʼihi ịnya isi nke ndị ajọ omume.
13 Isibili uNkulunkulu kayikuzwa ize, loSomandla kayikukunanza.
Nʼezie, Chineke adịghị aṅa ntị nʼarịrịọ efu ha; Onye pụrụ ime ihe niile a dịghị elebara ya anya.
14 Yebo, lanxa usithi: Kawumboni, kanti isahlulelo siphambi kwakhe; ngakho umlindele.
Ma ya bụrụzie nke a ị na-ekwu, ọ ga-esi aṅaa gee ntị mgbe ị na-ekwu na ị dịghị ahụ ya anya, na i burula ikpe gị bịa nʼihu ya na ị ga-anọkwa na-eche ya!
15 Kodwa khathesi, ngoba intukuthelo yakhe ingajezisanga, laye kayikwejwayela kakhulu yini ukuziphakamisa?
Ọzọ, nʼihi na iwe ya adịghị eweta ntaramahụhụ, nʼihi na ọ dịghị arịba ama ajọ omume ọ bụladị nke dịkarịsịrị nta.
16 Ngakho uJobe uvule umlomo wakhe ngeze, wandisa amazwi engelalwazi.
Ya mere, Job saghere ọnụ ya kwuo okwu dịka onye na-amaghị ihe; ka onye na-enweghị uche ọ na-ekwu okwu nkwukwasị efu.”

< UJobe 35 >