< UJobe 10 >
1 Umphefumulo wami ukhathele yimpilo yami; ngizatshiya insolo yami phezu kwami; ngizakhuluma ekubabeni komphefumulo wami.
“Ike ịdị ndụ agwụla m. Hapụnụ m ka m kwuo ihe dị m nʼobi, kwupụta ya dịka obi ilu nke mkpụrụobi m si dị.
2 Ngizakuthi kuNkulunkulu: Ungangilahli; ngazisa ukuthi kungani uphikisana lami.
Ihe m ga-agwa Chineke bụ nke a: Apụtala maa m ikpe, kama gwa m ihe mere i ji ama m ikpe.
3 Kuhle yini kuwe ukuthi ucindezele, ukuthi udelele umsebenzi wezandla zakho, ukhanye phezu kwecebo lababi?
Ọ dị gị mma nʼobi imegbu m, si otu a leda ọrụ aka gị anya, mgbe ị na-anabata atụmatụ nke ndị na-emebi iwu?
4 Ulamehlo enyama yini? Ubona njengokubona komuntu?
Ị nwere anya nke anụ ahụ? Ị na-ahụ ụzọ dịka mmadụ si ahụ?
5 Insuku zakho zinjengensuku zomuntu na? Iminyaka yakho injengensuku zomuntu yini,
Ụbọchị nke gị, ha dịka nke ndị nwere anụ ahụ, ka afọ nke gị, ha dịka nke mmadụ dị ike?
6 ukuthi udinge ngobubi bami, uhlolisise ngesono sami?
Nke ga-eme na i na-achọpụta ikpe ọmụma m ma nyochaa mmehie m?
7 Ngoba usazi ukuthi kangikhohlakalanga, lokuthi kakho ongakhulula esandleni sakho.
Ọ bụ ezie na ị maara na ikpe amaghị m, na ọ dịghị onye pụrụ ịnapụta m site nʼaka gị.
8 Izandla zakho zangibumba zangenza kanyekanye inhlangothi zonke, kanti uyangichitha.
“Ọ bụ aka gị kpụrụ m kee m. Ọ ga-atụgharịa ugbu a bibie m?
9 Ake ukhumbule ukuthi wangenza njengebumba. Pho, uzangibuyisela ethulini?
Cheta na ị kpụrụ m dịka ụrọ. Ị ga-eme ka m laghachi nʼaja ọzọ?
10 Kawungithululanga njengochago, wangijiyisa njengamasi yini?
Ọ bụ na ị wụpụghị m dịka mmiri ara ehi mee ka m kpụkọta dịka mmiri ara rahụrụ arahụ?
11 Ungigqokise isigogo lenyama, wangihlanganisa ndawonye ngamathambo langemisipha.
Yikwasị m akpụkpọ ahụ na anụ ahụ, werekwa ọkpụkpụ na akwara kpaa m dịka uwe?
12 Ungenzele impilo lomusa, lokunakekela kwakho kulondolozile umoya wami.
I nyere m ndụ gosikwa m obiọma gị, nʼịdị mma gị chebekwara mmụọ m.
13 Kanti lezizinto uzifihlile enhliziyweni yakho; ngiyazi ukuthi lokhu kukuwe.
“Ma nke a bụ ihe i zoro nʼime obi gị, amakwa m na ọ bụ ihe dị gị nʼuche.
14 Uba ngisona, ungiqaphele, kawuyikungiyekela ngingelacala esonweni sami.
Ọ bụrụ na m mehiere, ị ga na-ele m anya, ị gaghị ekwe ka m ghara ịta ahụhụ nʼihi mmehie m.
15 Uba ngimubi, maye kimi! Uba ngilungile, bengingayikuphakamisa ikhanda lami. Ngigcwele ihlazo, ngakho bona inhlupheko yami.
Ọ bụrụ na ikpe mara m, ahụhụ na-adịrị m! A sịkwarị na aka m dị ọcha, apụghị m iweli isi m elu nʼihi na ejupụtara m nʼihere, bụrụkwa onye e mibara nʼime nsogbu m.
16 Ngoba kuyaziphakamisa; uyangizingela njengesilwane; ubuye uzenze okumangalisayo kimi.
Ọ bụrụ na m welie m isi elu, dịka ọdụm ị ga-eji nwayọọ na-eso m nʼazụ ma werekwa ike gị dị egwu megide m.
17 Uyavuselela abafakazi bakho abamelene lami, wandise ulaka lwakho kimi; izinguquko lempi kulami.
I na-eweta ndị ama ọhụrụ megide m, mee ka iwe gị baa ụba nʼebe m nọ; ị na-eme ka ndị agha gị na-abịakwute m, otu nʼelu ibe ya dịka ebili mmiri.
18 Pho kungani wangikhupha esizalweni? Kungathi ngabe ngaphela, lelihlo lingangibonanga!
“Gịnị mere i ji wepụta m site nʼafọ nne m? Ọ gaara aka m mma ịnwụ tupu anya ọbụla ahụ m.
19 Ngangizakuba njengokungathi kangikho; ngangizathwalwa ngisuswe esizalweni ngisiwe engcwabeni.
A sịkwarị na amụpụtaghị m maọbụ na e sitere nʼafọ nne m buba m nʼime ili!
20 Insuku zami kazinlutshwana yini? Khawula phela, ungiyekele ukuze ngithokoze kancinyane,
Ụbọchị ndụ m ọ dịghị ole na ole? Si nʼebe m nọ wezuga onwe gị ka m nwetu ọṅụ nwa mgbe nta,
21 ngingakayi - ngingabuyi- elizweni lomnyama lethunzi lokufa,
tupu m hapụ laa nʼala ọchịchịrị na onyinyo nke ọnwụ ebe m na-agaghị esi pụtakwa.
22 ilizwe lomnyama, njengobumnyama, ithunzi lokufa, elingelahlelo, lokukhanya kunjengobumnyama.
Nʼala nke oke ọchịchịrị, ala nke onyinyo ọnwụ, nke usoro na-adịghị, ebe ọbụladị ìhè dịkwa ka ọchịchịrị.”