< UJeremiya 52 >

1 UZedekhiya wayeleminyaka engamatshumi amabili lanye esiba yinkosi, wabusa iminyaka elitshumi lanye eJerusalema; lebizo likanina lalinguHamuthali, indodakazi kaJeremiya weLibhina.
Zedekaya gbara iri afọ abụọ na otu mgbe ọ malitere ịbụ eze. Ọ chịrị dị ka eze na Jerusalem afọ iri na otu. Aha nne ya bụ Hamutal nwa Jeremaya, onye Libna.
2 Wasesenza okubi emehlweni eNkosi, njengakho konke akwenzayo uJehoyakhimi.
O mere ihe jọrọ njọ nʼanya Onyenwe anyị dịka Jehoiakim mere.
3 Ngoba ngenxa yokuthukuthela kweNkosi kwenzeka eJerusalema loJuda yaze yabaphosela khatshana lobuso bayo; uZedekhiya wasevukela inkosi yeBhabhiloni.
Ọ bụ nʼihi iwe Onyenwe anyị ka ihe ndị a niile ji bịakwasị Jerusalem na Juda. Nʼikpeazụ, o sitere nʼihu ya chụpụ ha. Nʼoge a, Zedekaya nupuru isi nʼokpuru eze Babilọn.
4 Kwasekusithi ngomnyaka wesificamunwemunye wokubusa kwakhe, ngenyanga yetshumi, ngolwetshumi lwenyanga, uNebhukadirezari inkosi yeBhabhiloni wafika, yena lebutho lakhe lonke, ukumelana leJerusalema; basebemisa inkamba bemelene layo, bayakhela izinqaba zokuvimbezela bemelene layo inhlangothi zonke.
Nʼihi ya, nʼafọ nke itoolu, nke ọchịchị Zedekaya, nʼụbọchị nke iri nʼọnwa nke iri, nke afọ ahụ, Nebukadneza, eze Babilọn, duuru usuu ndị agha ya niile bịa ibuso Jerusalem agha. Ha mara ụlọ ikwu ndị agha nʼazụ obodo ahụ, wuokwa mgbidi nnọchibido gburugburu obodo ahụ.
5 Ngokunjalo umuzi wangena ekuvinjezelweni kwaze kwaba ngumnyaka wetshumi lanye wenkosi uZedekhiya.
Anọchibidoro obodo a nʼagha ruo nʼafọ nke iri na otu nke ọchịchị eze Zedekaya.
6 Ngenyanga yesine, ngolwesificamunwemunye lwenyanga, lapho indlala yayiqinile phakathi komuzi, abantu belizwe kababanga lokudla.
Nʼabalị nke itoolu, nke ọnwa anọ nʼafọ ahụ, oke ụnwụ siri ike dị nʼobodo ahụ ruo na ọ dịkwaghị nri dị nke ndị mmadụ ga-eri.
7 Basebewufohlela umuzi; wonke amadoda empi asebaleka, aphuma emzini ebusuku, ngendlela yesango, phakathi kwemiduli emibili, elisesivandeni senkosi (amaKhaladiya ayemelene lomuzi inhlangothi zonke), ahamba ngendlela yegceke.
Mgbe ahụ, e tipuru oghere nʼaja mgbidi obodo ahụ, ndị agha niile ji abalị gbapụ site nʼọnụ ụzọ ama nke dị nʼetiti mgbidi abụọ nʼakụkụ ubi eze a gbara ogige, nʼagbanyeghị na ndị Babilọn nọ obodo ahụ gburugburu. Ha gbapụrụ chee ihu nʼụzọ Araba.
8 Kodwa ibutho lamaKhaladiya laxotshana lenkosi, lafica uZedekhiya emagcekeni eJeriko; lebutho lakhe lonke lahlakazeka lisuka kuye.
Ma usuu ndị agha Babilọn chụsoro Zedekaya bụ eze nʼazụ, chụkwute ya na mbara ala Jeriko. Ndị agha ya niile sitere nʼebe ọ nọ gbasasịa, hapụ ya,
9 Basebeyibamba inkosi, bayenyusela enkosini yeBhabhiloni eRibila elizweni leHamathi, eyakhuluma izigwebo kuyo.
e jide ya. Ha kpụgara ya eze Babilọn, nʼobodo Ribla, nke dị nʼala Hamat, ebe a nọ maa ya ikpe.
10 Inkosi yeBhabhiloni yasibulala amadodana kaZedekhiya emehlweni akhe, futhi yazibulala lazo zonke iziphathamandla zakoJuda eRibila.
Na Ribla ka eze Babilọn nọ gbuo ụmụ ndị ikom Zedekaya niile, nʼihu ya, o gbukwara ndịisi ọchịchị Juda niile.
11 Yasiphumputhekisa amehlo kaZedekhiya, yambopha ngamaketane ethusi amabili, ukuze inkosi yeBhabhiloni imuse eBhabhiloni, yamfaka entolongweni, kwaze kwaba lusuku lokufa kwakhe.
Ọ ghụpụrụ anya Zedekaya abụọ, jiri ụdọ bronz kee ya agbụ, kpụrụ ya gaa Babilọn, ebe o tinyere ya nʼụlọ mkpọrọ tutu ruo ụbọchị ọnwụ ya.
12 Njalo ngenyanga yesihlanu, ngolwetshumi lwenyanga (lo umnyaka wawungumnyaka wetshumi lesificamunwemunye wenkosi uNebhukadirezari inkosi yeBhabhiloni), uNebuzaradani induna yabalindi, eyayimi phambi kwenkosi yeBhabhiloni, wangena eJerusalema.
Nʼụbọchị nke iri, nʼọnwa nke ise, nke afọ iri na itoolu, nke ọchịchị Nebukadneza eze Babilọn, Nebuzaradan ọchịagha ndị nche eze, onye na-ejere eze Babilọn ozi, bịarutere Jerusalem.
13 Watshisa indlu kaJehova, lendlu yenkosi, lezindlu zonke zeJerusalema lezindlu zonke zabakhulu wazitshisa ngomlilo.
O sunyere ụlọnsọ Onyenwe anyị ọkụ, ụlọeze na ụlọ niile dị na Jerusalem, ụlọ ọbụla bụ nke dị mkpa ka o surere ọkụ.
14 Lebutho lonke lamaKhaladiya, elalilenduna yabalindi, labhidliza yonke imiduli yeJerusalema inhlangothi zonke.
Usuu ndị agha Kaldịa niile bụ ndị nọ nʼokpuru onyeisi ndị nche eze ahụ, kwaturu mgbidi ahụ niile gbara Jerusalem gburugburu.
15 UNebuzaradani induna yabalindi wasethumba abathile kwabangabayanga babantu, lensali yabantu eyayisele emzini, lalabo ababehlamukile, ababehlamukele enkosini yeBhabhiloni, labaseleyo bexuku.
Nebuzaradan, ọchịagha ndị nche eze, buru ụfọdụ nʼime ndị dakarịsịrị nʼogbenye na ndị fọdụrụ nʼime obodo ahụ, ha na ndị ǹka niile fọdụrụ, na ndị ahụ ji aka ha gbakwuru eze Babilọn, bulaa ha Babilọn, ka ha ga biri nʼala ọzọ.
16 Kodwa uNebuzaradani induna yabalindi watshiya abanye kwabangabayanga belizwe ukuthi babe ngabaphathi bezivini labalimi.
Ma Nebuzaradan, hapụrụ ndị ahụ bụ nnọọ ndị ogbenye ọnụ ntụ, ka ha na-elekọta ubi vaịnị niile a gbara ogige na ala ubi niile.
17 Lensika zethusi ezazisendlini yeNkosi, lezisekelo, lolwandle lwethusi olwalusendlini yeNkosi, amaKhaladiya akuphahlaza, athwala lonke ithusi lakho alisa eBhabhiloni.
Ma ndị Babilọn tipịara ogidi bronz niile, ha na ihe ndọkwasị niile na Oke osimiri bronz ndị ahụ dị nʼụlọnsọ Onyenwe anyị, buru bronz ahụ niile bulaa Babilọn.
18 Athatha izimbiza, lamafotsholo, lezindlawu, lemiganu yokufafaza, lezinkezo, lazo zonke izitsha zethusi abakhonza ngazo,
Ha chịkọọrọ ite niile, na shọvel niile na ihe ịkpakepụ ọkụ niile, na efere ịkwọsa mmiri niile, na ngaji ukwu niile, na ihe bronz niile, bụ nke e ji eje ozi nʼime ụlọnsọ ahụ.
19 lemiganu, lezitsha zokuthwala umlilo, lemiganu yokufafaza, lezimbiza, lezinti zezibane, lezinkezo, lemiganu yomnikelo wokuthululwa; okwakuligolide golide lokwakuyisiliva siliva induna yabalindi yakuthatha.
Ọchịagha ndị nche eze ahụ sikwa nʼụlọnsọ ahụ chịrị ihe ndị a: efere ukwu niile, ihe ịgụnye ọkụ niile, efere ịkwọsa mmiri niile, ite niile, ihe ịdọkwasị oriọna niile, ngaji ukwu niile na iko e ji enye onyinye ihe ọṅụṅụ, ya bụ ihe ndị ahụ niile e ji ọlaedo a nụchara anụcha maọbụ ọlaọcha kpụọ.
20 Insika zombili, ulwandle olulodwa, lenkabi zethusi ezazilitshumi lambili ezazingaphansi kwezisekelo inkosi uSolomoni eyayikwenzele indlu yeNkosi; ithusi lazo zonke lezizitsha lalingelakulinganiswa ngesisindo.
O burukwara bronz sitere nʼogidi abụọ ahụ, oke Osimiri ahụ na ehi iri na abụọ e ji bronz kpụọ, bụ nke dị nʼokpuru ya, na ihe ndọkwasị ya niile, nke eze bụ Solomọn mere nʼihi ụlọnsọ Onyenwe anyị. Ha karịrị ihe a ga-eji ihe ọtụtụ tụọ.
21 Mayelana lezinsika, ubude bensika eyodwa babuzingalo ezilitshumi lesificaminwembili, lentambo yezingalo ezilitshumi lambili yayigombolozela, lohlonzi lwayo lwaluyiminwe emine, yayilomwolo.
Ị dị elu nke otu nʼime ogidi abụọ ndị a bụ mita asatọ na ụma nʼọtụtụ. Ị dị gburugburu ya bụkwa mita ise na ụma anọ, nke ọbụla nʼime ha bụ mkpịsịaka anọ. Oghere dịkwa nʼime ha.
22 Lesiduku esiphezu kwayo sasilithusi, lobude besiduku esisodwa babuzingalo ezinhlanu, lembule, lamapomegranati phezu kwesiduku inhlangothi zonke; konke kwakulithusi. Lensika yesibili yayilokufanana lalezi, lamapomegranati.
Isi bronz nke e kpụkwasịrị nʼotu ogidi dị mita abụọ na ụma atọ nʼịdị elu. Ọ bụkwa ihe yiri mkpụrụ pomegranet e ji bronz kpaa, ka e ji chọọ ya mma gburugburu ya niile. Ogidi nke abụọ nwekwara pomegranet, yiri ibe ya.
23 Njalo kwakulamapomegranati angamatshumi ayisificamunwemunye lesithupha eceleni; wonke amapomegranati ayelikhulu phezu kwembule inhlangothi zonke.
Pomegranet ndị ahụ dị iri itoolu na isii, ọ bụkwa nʼakụkụ ọbụla ka ọ dị. Ọnụọgụgụ pomegranet niile dị nʼelu ihe ahụ a kpụrụ akpụ dị otu narị.
24 Induna yabalindi yasithatha uSeraya umpristi oyinhloko, loZefaniya umpristi owesibili, labalindi bombundu labo bobathathu.
Ọchịagha ndị nche eze ahụ, kpụụrụ Seraya, onyeisi nchụaja, na Zefanaya, bụ onye nchụaja na-esote ya nʼọkwa, na ndị nche atọ na-eche ọnụ ụzọ mbata dịka ndị mkpọrọ.
25 Yasithatha emzini umthenwa othile owayengumphathi phezu kwamadoda empi, lamadoda ayisikhombisa kulabo ababona ubuso benkosi, atholakala emzini, lomabhalane wenduna yebutho eyayibuthela abantu belizwe emabuthweni, lamadoda angamatshumi ayisithupha abantu belizwe, ayetholakala phakathi komuzi.
O sitere nʼetiti ndị ahụ fọdụrụ nʼobodo kpụụrụ otu onyeisi na-ahụ maka ndị agha, na ndị ikom asaa na-enye eze ndụmọdụ. O kpukwaara ode akwụkwọ, onye isi ọrụ na-ahụ maka ịmanye ndị ga-aga agha, jidekwa iri ndị ikom isii bụ ndị a hụrụ nʼime obodo ahụ.
26 UNebuzaradani induna yabalindi wasebathatha, wabasa enkosini yeBhabhiloni eRibila.
Nebuzaradan, bụ ọchịagha kpụụrụ ha niile, dute ha nʼihu eze Babilọn na Ribla.
27 Inkosi yeBhabhiloni yasibatshaya, yababulalela eRibila elizweni leHamathi. Ngokunjalo uJuda wathunjwa esuswa elizweni lakhe.
Nʼebe ahụ na Ribla, dị nʼobodo Hamat, ka eze nọ nye iwu ka e gbuo ha niile. Ya mere, a dọọrọ Juda nʼagha, mee ka ọ ga biri nʼala ọzọ.
28 Laba ngabantu uNebhukadirezari abathumbayo: Ngomnyaka wesikhombisa, amaJuda azinkulungwane ezintathu lamatshumi amabili lantathu;
Nke a bụ ọnụọgụgụ ndị ahụ Nebukadneza mere ka ha gaa biri nʼala ọzọ. Nʼafọ nke asaa nke ọchịchị ya, puku atọ ndị Juu na iri abụọ na atọ, 3,023.
29 ngomnyaka wetshumi lesificaminwembili kaNebhukadirezari, kwasuka eJerusalema imiphefumulo engamakhulu ayisificaminwembili lamatshumi amathathu lambili;
Nʼafọ nke iri na asatọ nke ọchịchị Nebukadneza, ka o mere ka narị mmadụ asatọ na iri atọ na abụọ, 832 si na Jerusalem gaa biri nʼala ọzọ.
30 ngomnyaka wamatshumi amabili lantathu kaNebhukadirezari, uNebuzaradani induna yabalindi wathumba amaJuda, imiphefumulo engamakhulu ayisikhombisa lamatshumi amane lanhlanu; yonke imiphefumulo yayizinkulungwane ezine lamakhulu ayisithupha.
Nʼafọ nke iri abụọ na atọ, Nebuzaradan, onyeisi ndị nche alaeze Babilọn bulara ndị dị narị ndị Juu asaa na iri anọ na ise, 745 ka ha ga biri nʼala ọzọ. Ọnụọgụgụ ha niile dị puku anọ na narị isii, 4,600.
31 Kwasekusithi ngomnyaka wamatshumi amathathu lesikhombisa wokuthunjwa kukaJehoyakhini inkosi yakoJuda, ngenyanga yetshumi lambili ngolwamatshumi amabili lanhlanu lwenyanga, uEvili-Merodaki inkosi yeBhabhiloni, ngomnyaka wokuqala wokubusa kwakhe, waphakamisa ikhanda likaJehoyakhini inkosi yakoJuda, wamkhupha entolongweni,
Nʼafọ nke iri atọ na asaa, site na mgbe e mere ka Jehoiakin eze Juda gaa biri nʼala ọzọ, nʼafọ Awel-Maduk ghọrọ eze Babilọn. Mgbe ahụ, o mere ka Jehoiakin eze Juda, si nʼụlọ mkpọrọ pụta, nwere onwe ya. O mere nke a nʼụbọchị iri abụọ na ise nke ọnwa iri na abụọ.
32 wasekhuluma kuhle laye, wabeka isihlalo sakhe sobukhosi phezu kwesihlalo sobukhosi samakhosi ayelaye eBhabhiloni.
Ọ gwara ya okwu ọma, nyekwa ya ọnọdụ ugwu dị elu karịa ọnọdụ ndị eze ndị ọzọ niile ha na ya nọ na Babilọn.
33 Wasentshintsha izigqoko zokubotshwa kwakhe; njalo wadla isinkwa phambi kwayo njalonjalo insuku zonke zempilo yakhe.
Nʼihi nke a, Jehoiakin gbanwere uwe mkpọrọ ya, wezuga ya. Sitekwa nʼoge ahụ tutu ruo mgbe ọ nwụrụ, ya na eze na-erikọ nri.
34 Mayelana lesabelo sakhe, isabelo esimiyo wasinikwa yinkosi yeBhabhiloni, into yosuku ngosuku lwayo, kwaze kwaba lusuku lokufa kwakhe, zonke insuku zempilo yakhe.
Site nʼụbọchị ruo nʼụbọchị, eze Babilọn na-enye Jehoiakin oke ihe ruru ya kwa ụbọchị niile nke ọ dị ndụ, ruokwa nʼụbọchị ọnwụ ya.

< UJeremiya 52 >