< UJeremiya 51 >

1 Itsho njalo iNkosi: Khangela ngizavusela iBhabhiloni lalabo abahlala enhliziyweni yalabo abangivukelayo umoya ochithayo.
Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Lee, aga m akpali mmụọ onye mbibi, ka ọ bịa megide Babilọn na ndị bi na Kaldịa.
2 Ngithume eBhabhiloni abelayo, abazakuyela, bathulule ilizwe layo, ngoba bazamelana layo bevela inhlangothi zonke ngosuku lobubi.
Aga m eziga ndị mba ọzọ nʼobodo Babilọn, ka ha gaa fụchaa ya, bibiekwa ala ya. Ha ga-emegide ya nʼakụkụ niile, nʼụbọchị ahụ ihe ọjọọ ga-abịakwasị ya.
3 Kakuthi otshokayo agobise idandili lakhe emelene loligobisayo, njalo emelene loziphakamisayo ebhatshini lakhe lensimbi; njalo lingawayekeli amajaha ayo, lilitshabalalise ibutho layo lonke.
Ekwela ka onye na-agba ụta kwee ụta ya, ekwekwala ka o yikwasị uwe agha ya. Enwekwala ọmịiko nʼebe ụmụ okorobịa ya nọ, kama bibie usuu ndị agha ya kpamkpam.
4 Ngokunjalo ababuleweyo bazakuwa elizweni lamaKhaladiya, labagwazwe ezitaladeni zayo.
Ha ga-ada, bụrụ ndị e gburu egbu nʼime Babilọn, ha ga-abụ ndị e merụrụ oke ahụ nʼokporoụzọ niile.
5 Ngoba uIsrayeli kayikutshiywa, loJuda nguNkulunkulu wabo, yiNkosi yamabandla, lanxa ilizwe labo ligcwele icala koNgcwele kaIsrayeli.
Ọ bụ ezie nʼala ha jupụtara nʼikpe ọmụma, nʼihu Onye nsọ nke Izrel, ma Chineke bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile agbakụtabeghị ndị Izrel na Juda azụ.
6 Balekani liphume phakathi kweBhabhiloni, likhulule ngulowo lalowo umphefumulo wakhe; lingaqunywa esiphambekweni sayo; ngoba lesi yisikhathi sempindiselo yeNkosi, ophindisela impindiselo kuyo.
“Sinụ na Babilọn gbapụ ọsọ. Gbasienụ ọsọ ike nʼihi ndụ unu. Unu ekwela ka e bibie unu nʼihi mmehie ya. Oge ịbọ ọbọ Onyenwe anyị eruola, ọ ga-akwụghachi ya ihe ruuru ya.
7 IBhabhiloni yayiyinkezo yegolide esandleni seNkosi, eyayidakisa umhlaba wonke; izizwe zanatha okwewayini layo; ngenxa yalokho izizwe zahlanya.
Babilọn dị ka iko ọlaedo nʼaka Onyenwe anyị. O mere ka ụwa niile si nʼiko ahụ ṅụbiga ihe ọṅụṅụ oke. Mba niile nke ụwa ṅụrụ mmanya ya. Ugbu a ha niile na-ayị ara.
8 IBhabhiloni yahle yawa, yephuka; qhinqani isililo ngayo, lithathele ubuhlungu bayo ibhalisamu, mhlawumbe ingelatshwa.
Na mberede, Babilọn ga-ada, a ga-etipịakwa ya. Kwasierenụ ya akwa ike. Wetanụ ọgwụ tee ya, ma eleghị anya ọnya ahụ ga-adị ya mma.
9 Besingayelapha iBhabhiloni, kodwa kayelaphekanga; itshiyeni, asihambeni ngulowo lalowo aye elizweni lakhe; ngoba isigwebo sayo sifinyelele emazulwini, siphakanyisiwe kwaze kwafika esibhakabhakeni.
“‘Anyị gaara agwọ Babilọn, ma ọrịa ji ya enweghị ngwọta. Ka anyị hapụnụ ya; ka anyị niile nʼotu nʼotu laghachi nʼobodo nke aka anyị, nʼihi na ikpe ọmụma dịrị ya eruola mbara eluigwe. Ọ na-arịgokwa ruo nʼigwe ojii.’
10 INkosi ikhuphe ukulunga kwethu; wozani, silandise eZiyoni umsebenzi weNkosi uNkulunkulu wethu.
“‘Onyenwe anyị emeela ka ezi omume anyị pụta ìhè. Ka anyị kwupụta ihe Onyenwe anyị Chineke anyị mere na Zayọn.’
11 Lolani imitshoko, liqoqe izihlangu; iNkosi ivusile umoya wamakhosi amaMede; ngoba icebo layo limelene leBhabhiloni ukuyichitha; ngoba lokho kuyimpindiselo yeNkosi, impindiselo yethempeli layo.
“Mụọnụ ọnụ àkụ unu; bulienụ ọta unu! Onyenwe anyị akwaliela ndị eze ndị Midia, nʼihi na nzube ya bụ ịla Babilọn nʼiyi. Onyenwe anyị ga-abọrọ onwe ya ọbọ, ọ ga-abọtara ụlọnsọ ukwu ya ọbọ.
12 Phakamisani isiboniso phezu kwemiduli yeBhabhiloni, liqinise ukulinda, libeke abalindi, lilungise abacathami, ngoba iNkosi isikucebile, futhi izakwenza lokho ekukhulume ngabahlali beBhabhiloni.
Bulienụ ọkọlọtọ nʼihi imegide mgbidi Babilọn. Tinyekwanụ ndị agha ọzọ nʼetiti ndị nche, ka ọnụọgụgụ ha hie nne Kwadoonụ ndị ga na-elepụ anya. Kwadoonụ ndị agha ga-ezo onwe ha, nʼihi na Onyenwe anyị ga-eme ka ihe o zubere mezuo, bụ ihe ahụ o kpebiri megide ndị Babilọn.
13 Wena ohlala emanzini amanengi, owande ngamagugu, ukuphela kwakho sekufikile, isilinganiso senzuzo yakho embi.
Unu bụ ndị bi nʼakụkụ ọtụtụ mmiri, ndị nwere akụnụba dị ukwuu, ọgwụgwụ unu abịaruola. Oge ahụ eruola mgbe e ji wezuga unu.
14 INkosi yamabandla ifungile ngomphefumulo wayo yathi: Isibili ngizakugcwalisa ngabantu njengamacimbi, njalo bazahlabelela umkhosi ngawe.
Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ji onwe ya ṅụọ iyi, sị, Nʼezie, aga m eme ka ndị mmadụ ọnụọgụgụ ha ga-aha ka igurube jupụta nʼime gị. Ha ga-etikwa mkpu ọṅụ megide gị.
15 Wenza umhlaba ngamandla akhe, walimisa ilizwe ngenhlakanipho yakhe, langokuqedisisa kwakhe wendlala amazulu.
“O sitere nʼike ya mee ụwa; ọ tọrọ ntọala ụwa mee ka o guzosie ike site nʼamamihe ya, ọ jikwa nghọta ya setịpụ eluigwe niile.
16 Lapho ekhupha ilizwi lakhe, kulokuhlokoma kwamanzi amanengi emazulwini, ukhuphula inkungu ivela emkhawulweni womhlaba, enze imibane kanye lezulu, akhuphe umoya eziphaleni zakhe.
Mgbe o bigbọrọ, mmiri niile nke dị nʼeluigwe na-ebigbọkwa. Ọ na-eme ka igwe ojii site na nsọtụ niile nke ụwa kwụlie. Ọ na-ezipụ amụma mgbe mmiri na-ezo, na-esitekwa nʼụlọ nkwakọba ihe ya na-ewepụta ifufe.
17 Wonke umuntu uyisiphukuphuku kalalwazi; wonke umkhandi wegolide uyangiswa yisithombe esibaziweyo, ngoba isithombe sakhe esibunjwe ngokuncibilikisa siyinkohliso, njalo kakulamoya kuzo.
“Onye ọbụla bụ onye na-enweghị uche nke ihe ọmụma kọrọ. Emeela ka ihere mee onye ọkpụ ụzụ ọlaedo ọbụla site nʼarụsị ọ kpụrụ. Nʼihi na oyiyi niile ọ na-akpụ bụ aghụghọ; ha enweghị nkuume ọbụla nʼime ha.
18 Ziyize, umsebenzi wezinkohliso; ngesikhathi sokuhanjelwa kwazo zizabhubha.
Ha bụ ihe efu, na ihe ịkwa emo, mgbe ikpe ọmụma ha bịakwasịrị ha, ha ga-ala nʼiyi.
19 Isabelo sikaJakobe kasinjengazo; ngoba yena nguye umbumbi wakho konke, loIsrayeli uyintonga yelifa lakhe; iNkosi yamabandla libizo lakhe.
Ma onye ahụ bụ Oke Jekọb adịghị ka ihe ndị a, nʼihi na Ọ bụ ya na-eke ihe niile, tinyere Izrel bụ ebo nke ihe nketa ya. Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile bụ aha ya.
20 Wena uyinduku yami yempi, izikhali zempi; ngoba ngawe ngizaphahlaza izizwe, langawe ngichithe imibuso,
“Ị bụ mkpọrọ osisi m ji ebu agha, na ngwa agha m ga-eji gaa nʼihu agha. Gị ka m ga-eji tipịa mba niile dị iche iche, gị ka m ga-eji laa alaeze niile nʼiyi;
21 langawe ngiphahlaze ibhiza lomgadi walo, langawe ngiphahlaze inqola lomkhweli wayo,
gị ka m ga-eji tipịa ịnyịnya na onye na-agba ya, gị ka m ga-eji tipịa ụgbọ agha na onye na-anya ya;
22 langawe ngiphahlaze indoda lowesifazana, langawe ngiphahlaze ixhegu lomutsha, langawe ngiphahlaze ijaha lentombi,
gị ka m ga-eji tipịa nwoke na nwanyị, gị ka m ga-eji tipịa agadi nwoke na okorobịa, gị ka m ga-eji tipịa okorobịa na nwaagbọghọ,
23 langawe ngiphahlaze umelusi lomhlambi wakhe, langawe ngiphahlaze umlimi lesipani sakhe, langawe ngiphahlaze ababusi lezinduna.
gị ka m ga-eji tipịa onye ọzụzụ atụrụ na igwe ewu na atụrụ ya, gị ka m ga-eji tipịa onye ọrụ ubi na ehi ya; gị ka m ga-ejikwa tipịa ndị na-achị achị na ndịisi ọchịchị eze.
24 Njalo ngizayiphindisela iBhabhiloni labo bonke abahlali beKhaladiya konke okubi kwabo abakwenzileyo eZiyoni emehlweni enu, itsho iNkosi.
“Nʼihu gị ka m ga-anọ kwụghachi Babilọn na ndị niile bi na Babilọn ihe ọjọọ niile ha mere na Zayọn,” ọ bụ ihe Onyenwe anyị kwubiri.
25 Khangela, ngimelana lawe, wena ntaba echithayo, itsho iNkosi, echitha umhlaba wonke; ngizakwelulela isandla sami kuwe, ngikugiqe usuke emadwaleni, ngikwenze ube yintaba yokutshiswa.
“Edoola m onwe m imegide gị, gị ugwu ukwu na-emebisi ihe, gị onye na-ala ụwa niile nʼiyi.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. “Aga m esetipụ aka m megide gị, kwapụ gị site na nkume dị elu. Aga m emekwa gị ka ị bụrụ ugwu ukwu e suru ọkụ.
26 Njalo kabayikuthatha kuwe ilitshe libe ngelengonsi, lelitshe libe ngelezisekelo; ngoba uzakuba ngamanxiwa aphakade, itsho iNkosi.
A gaghị esite nʼime gị weta nkume e ji ewu isi nkuku ụlọ, maọbụ nke e ji ewu ntọala ụlọ ọbụla, nʼihi na ị ga-abụ ebe tọgbọrọ nʼefu ruo mgbe ebighị ebi,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
27 Phakamisani isiboniso elizweni, livuthele uphondo phakathi kwezizwe, lilungise izizwe ukumelana layo, liyibizele ndawonye imibuso yeArarathi, iMini, leAshikenazi; libeke umlawuli webutho emelene layo, lenyuse amabhiza njengentethe ezimaxhakaxhaka.
“Bulienụ ọkọlọtọ elu nʼala ahụ. Fụọnụ opi ike nʼetiti mba niile. Kwadoonụ mba niile maka ibu agha megide ya; kpọkuonụ alaeze ndị a niile imegide ya: Ararat, na Mini, na Ashkenaz. Họpụtanụ ọchịagha ga-edu usuu ndị agha megide ya; ziganụ ịnyịnya ga-adị ukwuu nʼọnụọgụgụ, dịka igurube.
28 Lungisani izizwe ukumelana layo, amakhosi amaMede, induna zayo, lababusi bayo bonke, lelizwe lonke lombuso wayo.
Kwadoonụ mba niile maka ibu agha megide ha, kwadoonụ ndị eze Midia, na ndị ha na-achị achị, na ndịisi ọchịchị, na mba niile nke ha na-achị.
29 Lelizwe lizazamazama libe lobuhlungu, ngoba ngalinye lamacebo eNkosi lima limelene leBhabhiloni, ukwenza ilizwe leBhabhiloni libe yincithakalo engelamhlali.
Ala ahụ na-ama jijiji, na-atakwa ikikere eze nke ihe mgbu, nʼihi na nzube Onyenwe anyị zubere megide Babilọn ga-emezu. Ọ ga-eme ka ala Babilọn ghọọ ebe tọgbọrọ nʼefu, ka mmadụ ọbụla gharakwa ibi nʼime ya.
30 Amaqhawe eBhabhiloni ayekele ukulwa, ahlala ezinqabeni, amandla awo aphelile, sebengabesifazana; bathungele indawo zayo zokuhlala, imigoqo yayo yephukile.
Ndị bụ dike nʼagha na Babilọn akwụsịla ịlụ ọgụ; ha anọgidela nʼebe ha e wusiri ike. Ike agwụla ha; ha adịla ka ndị inyom. E sunyela ebe obibi ya niile ọkụ, tijiekwa mkpọrọ e ji akpọchi ọnụ ụzọ ama ya niile.
31 Isigijimi sizagijima ukuhlangana lesigijimi, lombiki ukuhlangana lombiki, ukutshela inkosi yeBhabhiloni ukuthi umuzi wayo uthunjiwe kusukela ekucineni,
Otu onye na-agba ọsọ na-agbaso ọgba ọsọ ibe ya, otu onyeozi na-esochikwa onyeozi ọzọ nʼazụ; ha niile na-abịa izi eze Babilọn ozi sị ya na a dọtala obodo ya nʼagha,
32 lamazibuko abanjiwe, lamaxhaphozi atshiswe ngomlilo, lamadoda empi ethukile.
na ndị iro anọchiela ụzọ e si agafe iyi, na e sunyela ala mmiri mmiri niile ọkụ, na ndị agha niile na-amakwa jijiji.”
33 Ngoba itsho njalo iNkosi yamabandla, uNkulunkulu kaIsrayeli: Indodakazi yeBhabhiloni injengebala lokubhulela; kuyisikhathi sokuyinyathela; kuseyisikhatshana, lesikhathi sesivuno sizafika kuyo.
Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, “Ada Babilọn dịka ebe ịzọcha ọka, nʼoge a na-azọcha ya. Mgbe a ga-ewe ya dịka e si ewe ihe ubi na-abịa nso.”
34 UNebhukadirezari inkosi yeBhabhiloni ungidlile, ungichobozile; wangibeka ngaba yimbiza engelalutho, wangiginya njengomgobho, wagcwalisa isisu sakhe ngezibondlo zami, wangixotsha.
“Nebukadneza eze Babilọn eripịala anyị, o tinyela anyị nʼọnọdụ mgbagwoju anya. O meela ka anyị dịrị ka ite ihe na-adịghị nʼime ya. O lodara anyị dịka ọ bụ agwọ ọjọọ, jiri ihe ụtọ anyị niile mejuo afọ ya. Emesịa, ọ gbọpụtara anyị.
35 Udlakela lwami lolwenyama yami kube phezu kweBhabhiloni, utsho umhlalikazi weZiyoni; legazi lami libe phezu kwabahlali beKhaladiya, itsho iJerusalema.
Ka ihe ike ahụ niile o mere anyị na ụmụ anyị dịkwasịkwa Babilọn nʼisi.” Ọ bụ ihe ndị bi na Zayọn kwuru. Jerusalem na-ekwukwa sị, “Ka ọbara anyị dịkwa nʼisi ndị bi na Babilọn.”
36 Ngakho itsho njalo iNkosi: Khangela, ngizalumela udaba lwakho, ngiphindisele impindiselo yakho; ngomise ulwandle lwayo, ngenze umthombo wayo wome.
Nʼihi ya, ihe ndị a ka Onyenwe anyị na-ekwu, “Lee, aga m ekwuchitere gị ọnụ gị, bọtakwara gị ọbọ. Aga m emekwa ka osimiri taa, meekwa ka isi iyi mmiri niile taakwa.
37 LeBhabhiloni izakuba ngamadundulu, indawo yokuhlala yemigobho, isesabiso, lento yokuncifelwa, kungelamhlali.
Babilọn ga-aghọ mkpọmkpọ ebe, ọ ga-aghọ ebe obibi nke nkịta ọhịa, bụrụkwa ihe iju anya, na ihe nkọcha, na ebe mmadụ ọbụla na-agaghị ebikwa.
38 Bazabhonga kanyekanye njengamabhongo ezilwane, bahwabhe njengemidlwane yezilwane.
Ndị ya niile na-agbọ ụja dịka ụmụ ọdụm, ha na-emekwa ụzụ dịka ụmụ ọdụm na-aṅụ ara.
39 Ekutshisekeni kwabo ngizabenzela amadili, ngibadakise ukuze bathokoze, balale ubuthongo obulaphakade, bangavuki, itsho iNkosi.
Ma nʼoge ahụ a kpaliri ha, aga m edo oriri nʼihu ha. Aga m eme ka ha ṅụbiga mmanya oke, si otu a mee ka ha jiri oke ịchị ọchị tie mkpu ọṅụ. Nʼikpeazụ, ha ga-arahụ ụra ebighị ebi, nke ha na-agaghị esite na ya bilie.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
40 Ngizabehlisa njengamawundlu ekuhlatshweni, njengezinqama kanye lezimpongo.
“Aga m akpụdata ha, dịka ụmụ atụrụ a na-aga igbu egbu, dịka ebule na mkpi.
41 Ithunjwe njani iSheshaki; yebo, lubanjiwe udumo lomhlaba wonke! IBhabhiloni isibe njani yisesabiso phakathi kwezizwe!
“Lee ka a ga-esi dọta Sheshak nʼagha, jichie ihe ụwa niile ji anya isi nʼagha. Lee ka Babilọn ga-esi ghọọ ihe tọgbọrọ nʼefu nʼetiti mba niile!
42 Ulwandle lukhukhumele phezu kweBhabhiloni, isibekelwe ngobunengi bamagagasi alo.
Osimiri ga-eri Babilọn, mmali elu nke mmiri ya ga-ekpuchi ya.
43 Imizi yayo isingamanxiwa, ilizwe elomileyo, lenkangala, ilizwe okungahlali muntu kulo, okungadluli kulo indodana yomuntu.
Obodo ya niile ga-atọgbọrọ nʼefu, ọ ga-abụ ebe kpọrọ nkụ, na ala ọzara, ọ ga-aghọ ala onye ọbụla na-agaghị ebi nʼime ya, nke mmadụ ọbụla na-agaghị esi nʼetiti ya gafee.
44 Njalo ngizajezisa uBheli eBhabhiloni, ngikhuphe emlonyeni wakhe lokho akuginyileyo; lezizwe kazisayikujulukela kuyo; yebo, umduli weBhabhiloni uwile.
Aga m ata Bel dị na Babilọn ahụhụ, mee ya ka ọ gbọpụta ihe ndị ahụ o loro. Mba dị iche iche agakwaghị agakwurukwa ya ọzọ. Mgbidi Babilọn ga-adakwa.
45 Phumani phakathi kwayo, bantu bami, likhulule ngulowo lalowo umphefumulo wakhe ekuvutheni kolaka lweNkosi.
“Sinụ nʼime ya pụta, unu ndị m! Gbapụnụ ọsọ nʼihi ndụ unu. Gbapụnụ ọsọ site nʼiwe dị ọkụ nke Onyenwe anyị.
46 Njalo hlezi inhliziyo yenu ibe buthakathaka, lesabe ngombiko ozwakala elizweni; ngoba kuzafika umbiko ngomunye umnyaka, lemva kwalokho umbiko ngomnyaka olandelayo, lodlakela elizweni, lombusi avukele umbusi.
Unu adala mba, unu atụkwala ụjọ, mgbe unu nụrụ akụkọ dị iche iche nʼala ahụ. Nʼihi na otu ụdị akụkọ ka a ga-anụ nʼafọ a, akụkọ ọzọ dị iche ka a ga-anụkwa nʼafọ nke ọzọ. A ga-anụ akụkọ iwusi ọbara nʼala ahụ, nụkwa akụkọ onye ọchịchị nke na-ebuso onye ọchịchị ọzọ agha.
47 Ngakho khangela, insuku ziyeza lapho engizahambela izithombe ezibaziweyo zeBhabhiloni; lelizwe lonke layo lizayangeka, lababuleweyo bayo bonke bawele phakathi kwayo.
Nʼihi na oge ahụ aghaghị ịbịa mgbe m ga-ata arụsị niile dị na Babilọn ahụhụ. A ga-eme ka ihere mee ala ahụ niile. Ndị ya niile e gburu egbu ga-ada, tọgbọrọkwa nʼime ya,
48 Kuzakuthi-ke amazulu lomhlaba lakho konke okukukho kuhlabelele ngeBhabhiloni, ngoba abachithi bazayifikela bevela enyakatho, itsho iNkosi.
mgbe ahụ, eluigwe na ụwa, na ihe niile dị nʼime ha ga-eti mkpu ọṅụ nʼihi ihe dakwasịrị Babilọn. Ndị ga-ebuso ya agha ga-esitekwa nʼugwu bịa.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
49 Njengalokhu iBhabhiloni yenza bawe ababuleweyo bakoIsrayeli, ngokunjalo ababuleweyo bomhlaba wonke bazakuwa eBhabhiloni.
“Babilọn ga-ada nʼihi ndị Izrel e gburu, dịka ndị niile e gburu nʼụwa si daa site nʼaka ndị Babilọn.
50 Lina eliphunyukileyo enkembeni, hambani, lingemi; khumbulani iNkosi lisekhatshana, leJerusalema ivele enhliziyweni yenu.
Unu ndị siterela nʼihu mma agha gbapụ ọsọ, wezuganụ onwe unu, unu eguzokwala. Chetanụ Onyenwe anyị nʼala ahụ dị anya, na-echetakwa Jerusalem.”
51 Siyangekile ngoba sizwile ihlazo; inhloni zisibekele ubuso bethu, ngoba abezizwe sebefikile ezindaweni ezingcwele zendlu yeNkosi.
“Ihere emeela anyị, nʼihi na a kparịala anyị. Ihere ekpuchiekwala ihu anyị, nʼihi na ndị mba ọzọ abatala nʼebe nsọ nke ụlọnsọ Onyenwe anyị.”
52 Ngakho khangela, insuku ziyeza, itsho iNkosi, lapho engizahambela izithombe zayo ezibaziweyo; lakulo lonke ilizwe layo kuzabubula ogwaziweyo.
“Ma ụbọchị ndị ahụ na-abịa,” ka Onyenwe anyị kwupụtara, “mgbe m ga-ata arụsị ya niile ahụhụ. Ndị e merụrụ ahụ ga-asụkwa ude nʼala ahụ niile.
53 Loba iBhabhiloni ingaphakamela emazulwini, njalo loba ingaqinisa ukuphakama kwamandla ayo, kube kanti abachithi bazayifikela bevela kimi, itsho iNkosi.
A sịkwarị na Babilọn a arịgoruo nʼeluigwe, ma a sịkwa na o wusie ebe dị elu nke ike ya mee ka o siwanyekwuo ike karịa, aga m ezite ndị mbibi ga-abịa megide ya.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
54 Kulomsindo wokukhala ovela eBhabhiloni, lokufohlela okukhulu elizweni lamaKhaladiya.
“Ụzụ ịkwa akwa si na Babilọn na-apụta, ụzụ oke ịla nʼiyi sikwa nʼala ndị Babilọn na-apụta.
55 Ngoba iNkosi ichithile iBhabhiloni, yabhubhisa kuyo ilizwi elikhulu. Lapho amagagasi abo ahlokoma njengamanzi amanengi, umsindo wawo uzakhupha ilizwi.
Onyenwe anyị ga-ala Babilọn nʼiyi. Ọ ga-emekwa ka oke ụzụ ha kwụsị. Mbigbọ nke ndị iro ga-adịkwa ka mbigbọ nke ọtụtụ mmiri, mkpọtụ nke olu ha ga-ada ụda dị ukwuu.
56 Ngoba umchithi wehlela phezu kwayo, phezu kweBhabhiloni, amaqhawe ayo azathunjwa, amadandili awo ephukile; ngoba iNkosi, uNkulunkulu wezimpindiselo, uzayivuza sibili.
Onye mbibi ga-ebuso Babilọn agha. A ga-adọta ndị bụ dike ya nʼagha, gbajisiekwa ụta ha niile. Nʼihi na Onyenwe anyị bụ Chineke onye na-akwụghachi; ọ ga-akwụghachikwa nʼuju ya.
57 Ngizadakisa-ke iziphathamandla zayo, lezihlakaniphi zayo, ababusi bayo, lenduna zayo, lamaqhawe ayo; njalo bazalala ubuthongo obulaphakade, bangavuki, itsho iNkosi, obizo layo nguJehova wamabandla.
Aga m eme ka ndịisi ọchịchị ya niile, na ndị maara ihe ha ṅụbiga mmanya oke; aga m emekwa ndị ha na-achị achị, na ndịisi ha, na ndị ha bụ dike nʼagha otu ihe ahụ. Ha ga-arahụ ụra ruo mgbe ebighị ebi. Ha agaghị esitekwa nʼụra ahụ bilie ọzọ.” Ọ bụ ihe Eze ahụ kwubiri, bụ onye ahụ aha ya bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile.
58 Itsho njalo iNkosi yamabandla: Imiduli ebanzi yeBhabhiloni izadilizwa ngokupheleleyo, lamasango ayo aphakemeyo athungelwe ngomlilo, labantu batshikatshikele ize, lezizwe zitshikatshikele umlilo, zikhathale.
Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “A ga-akwada mgbidi Babilọn nke sara mbara, mee ka ọ daruo ala, a ga-eji ọkụ sunye nʼọnụ ụzọ ama ya niile dị elu. Ndị dị iche iche na-adọgbu onwe ha nʼọrụ nʼefu. Ndọgbu nʼọrụ nke mba niile dị iche iche ga-abụ nkụ a na-akwanye nʼọkụ.”
59 Ilizwi uJeremiya umprofethi alilaya uSeraya indodana kaNeriya, indodana kaMahaseya, ekuhambeni kwakhe loZedekhiya inkosi yakoJuda ukuya eBhabhiloni emnyakeni wesine wokubusa kwakhe. Njalo uSeraya wayeyisiphathamandla sokuthula.
Ndị a bụ ozi Jeremaya, bụ onye amụma ziri onyeisi ozi aha ya bụ Seraya nwa Neraya, nwa Mahseia, mgbe o so Zedekaya eze Juda gaa Babilọn. E ziri ya ozi a nʼafọ nke anọ nke ọchịchị Zedekaya.
60 UJeremiya wasebhala egwalweni konke okubi okuzakwehlela iBhabhiloni, wonke lamazwi abhaliweyo emelene leBhabhiloni.
Jeremaya depụtara nʼakwụkwọ ihe banyere ihe ọjọọ ndị ahụ niile ga-abịakwasị Babilọn, ya bụ ihe niile e dere banyere Babilọn.
61 UJeremiya wasesithi kuSeraya: Lapho usufikile eBhabhiloni, ubone ufunde wonke lamazwi.
Ọ sịrị Seraya, “Mgbe i ruru Babilọn, lezie anya hụ na ị gụpụtara okwu ndị a niile ebe ndị mmadụ ga-anụ ya.
62 Ubususithi: Nkosi, wena ukhulumile ngalindawo ukuthi uzayiquma, ukuze kungabi khona umhlali kiyo, kusukela emuntwini kusiya enyamazaneni, kodwa ibe zincithakalo phakade.
Emesịa, ị ga-ekwukwa sị, ‘Onyenwe anyị, gị onwe gị ekwuola na i ga-ebibi ebe a, ma mmadụ maọbụ anụmanụ agaghị ebikwa nʼime ya. I kwuokwala na ọ ga-aghọ mkpọmkpọ ebe ruo mgbe ebighị ebi.’
63 Kuzakuthi-ke usuqedile ukulufunda lolugwalo, ubophele ilitshe kulo, uluphosele phakathi kweYufrathi,
Mgbe ị gụsịrị ihe dị nʼakwụkwọ a, kegide ya nkume, tụnye ya nʼetiti iyi ukwu Yufretis.
64 ubususithi: Ngokunjalo iBhabhiloni izatshona, ingabe isavumbuluka, ngenxa yobubi engizayehlisela bona; njalo bazadinwa. Kuze kube lapha ngamazwi kaJeremiya.
Ị ga-asịkwa, ‘Otu a ka Babilọn ga-esi mikpuo. Ọ gaghị ebilikwa ọzọ, nʼihi ihe ọjọọ ahụ m ga-eme ka ọ bịakwasị ya. Ndị ya ga-adakwa.’” Ebe a ka okwu Jeremaya niile gwụrụ.

< UJeremiya 51 >