< UJeremiya 17 >

1 Isono sakoJuda sibhaliwe ngepheni yensimbi, ngomcijo wendayimana; sibhalwe ngokugujwa esibhebheni senhliziyo yabo, lezimpondweni zamalathi enu;
“E ji mkpisi igwe gbunye mmehie Juda, jikwa ọnụ nkume siri ike a pịrị ọnụ ya apị, depụta nʼelu mbadamba nkume, bụ obi ha, nakwa nʼelu mpi niile nke ebe ịchụ aja ha.
2 abantwana babo besakhumbula amalathi abo lezixuku zabo ngasezihlahleni eziluhlaza phezu kwamaqaqa aphakemeyo.
Ọ bụladị ụmụ ha na-echeta ebe ịchụ aja ha, na ogidi a manyere nʼala nʼihi arụsị Ashera, nke dị nʼebe ọtụtụ osisi ndụ na-etokọ ọnụ, ma nʼelu ugwu nta niile.
3 Wena ntaba yami esegangeni, ngizanikela imfuyo yakho lakho konke okuligugu kwakho empangweni, lezindawo zakho eziphakemeyo, ngenxa yesono kuyo yonke imingcele yakho.
Ugwu m, nke dị nʼala ahụ, na ihe niile ha nwere, na akụnụba ha ka m ga-eweta nye ndị ga-adọta ha nʼagha. Aga m enyekwa ha ihe niile ahụ dị nʼelu ugwu, nʼihi mmehie gị, nke jupụtara nʼala gị niile.
4 Lawe, ngitsho ngokwakho, uzayekela ilifa lakho engakunika lona; njalo ngizakwenza usebenzele izitha zakho elizweni ongalaziyo; ngoba usuphembe umlilo ekuthukutheleni kwami; uzavutha kuze kube nininini.
Ihe nketa ahụ m nyere gị ga-efunarị gị, nʼihi ihe i ji aka gị wetara onwe gị. Aga m emekwa ka ị bụrụ ohu ndị iro gị nʼala nke ị na-amaghị, nʼihi na ị kpasuola iwe m, ọ ga-adịgidekwa ruo mgbe niile ebighị ebi.”
5 Itsho njalo iNkosi: Uqalekisiwe umuntu othembela emuntwini, esenza inyama ibe yingalo yakhe, lonhliziyo yakhe iphambuka eNkosini.
Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Onye a bụrụ ọnụ ka mmadụ ahụ bụ nke na-atụkwasị mmadụ ibe ya obi, onye olileanya ya dị nʼinyeaka ga-esi nʼaka mmadụ rute ya aka, onye wezugara obi ya site nʼebe Onyenwe anyị nọ.
6 Ngoba uzakuba njengesihlahlanyana enkangala, esingayikubona nxa okuhle kusiza; kodwa uzahlala ezindaweni ezomileyo enkangala, elizweni letshwayi, elingahlalwayo.
Onye ahụ ga-adị ka osisi na-eto nʼala tọgbọrọ nʼefu. Ọ gaghị ahụkwa mgbe ọ dịmma na-abịara ya. Ọ ga-ebi nʼebe niile kpọrọ nkụ nke ọzara, nʼala nnu nnu, ebe ndị mmadụ na-ebighị.
7 Ubusisiwe umuntu othembela eNkosini, lothemba lakhe liyiNkosi.
“Ma ngọzị na-adịrị onye ahụ na-atụkwasị Onyenwe anyị obi ya. Onye ịnya isi ya bụ nʼime Onyenwe anyị.
8 Ngoba uzakuba njengesihlahla esihlanyelwe ngasemanzini, esinabisela impande zaso ngasemfuleni, esingesabi lapho kufika ukutshisa, kodwa ihlamvu laso lizakuba luhlaza; kasikhathazeki emnyakeni wokubalela, kasiyekeli ukuthela isithelo.
Onye dị otu a ga-adị ka osisi a kụrụ nʼakụkụ iyi, nke mgbọrọgwụ ya na-awasa banye nʼiyi ahụ. Ụjọ adịghị atụ ya nʼoge okpomọkụ, akwụkwọ ndụ na-adịgidekwa nʼelu ya. Ọ dịghị echegbu onwe ya nʼafọ ụnwụ dị. Ọ dịkwaghị mgbe ọ na-akwụsị ịmị mkpụrụ.”
9 Inhliziyo ilenkohliso okwedlula konke, futhi imbi kakhulu; ngubani ongayazi?
Obi mmadụ dị aghụghọ karịa ihe niile, o nwekwaghị ngwọta. Onye pụrụ ịghọta ya?
10 Mina Nkosi ngihlola inhliziyo, ngilinge izinso, ngitsho ukupha wonke umuntu njengokwezindlela zakhe, njengokwesithelo sezenzo zakhe.
“Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị na-enyocha obi, na-anwụpụta ihe dị nʼime mmụọ, nʼihi ịkwụ mmadụ ụgwọ dịka ọrụ ya si dị, na dịka ihe ruuru ya si dị nʼihi ọrụ ya.”
11 Njengethendele elifukamela amaqanda lingawachamuseli, unjalo lowo owenza inotho kodwa hatshi ngokulunga; uzakutshiya phakathi kwensuku zakhe, lekucineni kwakhe abe yisithutha.
Dịka ọkwa si ekpokọba akwa ọ na-eyighị, otu a ka ndị na-akpakọba akụ nʼụzọ na-ezighị ezi dị. Nʼetiti ụbọchị ndụ ha, akụ ndị a ga-efunarị ha. Nʼikpeazụ ha ga-aghọ ndị nzuzu.
12 Isihlalo sobukhosi esilenkazimulo, esiphakanyisiweyo kwasekuqaleni, siyindawo yendlu yethu engcwele.
Ocheeze dị ebube, nke e mere ka ọ dị elu site na mmalite, ka ebe nsọ anyị bụ.
13 Nkosi, themba likaIsrayeli, bonke abakudelayo bazayangeka; labasuka kimi bazabhalwa emhlabathini, ngoba bayidelile iNkosi, umthombo wamanzi aphilayo.
Onyenwe anyị, olileanya Izrel ka ị bụ. A ga-emekwa ka ihere mee ndị na-agbakụta gị azụ. A ga-edekwa aha ndị ahụ niile si nʼebe ị nọ wezuga onwe ha nʼala, nʼihi na ha ewezugala onwe ha site nʼebe Onyenwe anyị, isi iyi nke mmiri na-enye ndụ, nọ.
14 Ngisilisa, Nkosi, njalo ngizasila; ngisindisa, njalo ngizasindiswa; ngoba uyindumiso yami.
Onyenwe anyị, ọ bụrụ na i mee ka ahụ sie m ike aga m adị ndụ. Ọ bụrụ na ị zọpụta m aga m abụ onye azọpụtara, nʼihi na ọ bu naanị gị ka m na-eto.
15 Khangela, bathi kimi: Lingaphi ilizwi leNkosi? Kalize khathesi!
Ha nọ na-ajụ m ọnụ, na-asị m, “Olee ebe okwu Onyenwe anyị dị? Ya mezuonụ ugbu a!”
16 Kodwa mina kangiphangisanga ukuthi ngingabi ngumelusi emva kwakho; futhi kangilufisanga usuku olwesabekayo; wena uyakwazi; okwaphuma emlonyeni wami kwakuphambi kobuso bakho.
Ma esitebeghị m na ị bụ onye ọzụzụ atụrụ gị wezuga onwe m. Ị maara na ọ bụghị ọchịchọ obi m ịhụ ụbọchị ahụ na-eweta ịda mba. Ị maara ụdị okwu niile na-esite nʼọnụ m na-apụ.
17 Ungabi luvalo kimi; wena uyisiphephelo sami osukwini lobubi.
A ghọrọla m ihe na-eyi egwu, nʼihi na ị bụ ebe mgbaba m nʼụbọchị mbibi.
18 Kabayangeke labo abangizingelayo, kodwa mina kangingayangeki, kabesabe bona, kodwa mina kangingesabi; behlisele usuku lobubi, ubephule ngokwephula okuphindiweyo.
Mee ka ihere mee ndị na-akpagbu m. Ekwekwala ka ihere mee m. Mee ka ha tụọ ụjọ, ma chebe m site nʼihe egwu. Mee ka ụbọchị mbibi bịakwasị ha, werekwa okpukpu ihe mbibi abụọ tipịa ha.
19 Itsho njalo iNkosi kimi: Hamba uyekuma esangweni labantwana babantu, angena ngalo amakhosi akoJuda, aphuma ngalo, lakuwo wonke amasango eJerusalema,
Ihe a ka Onyenwe anyị gwara m, “Gaa, guzo nʼọnụ ụzọ ama obodo, ebe ndị eze Juda na-esi apụ, ma na-abatakwa. Guzokwa nʼọnụ ụzọ ama ndị ọzọ niile dị na Jerusalem.
20 ubususithi kubo: Zwanini ilizwi leNkosi, lina makhosi akoJuda, loJuda wonke, labo bonke abahlali beJerusalema, abangena ngala amasango!
Gwa ha sị, ‘Nụrụnụ okwu Onyenwe anyị, unu ndị eze Juda na ndị Juda niile, na ndị niile bi na Jerusalem, ndị na-esi nʼọnụ ụzọ a apụ, na-abatakwa.’
21 Itsho njalo iNkosi: Ziqapheleni, lingathwali mthwalo ngosuku lwesabatha, kumbe liwungenise ngamasango eJerusalema.
Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Lezienụ onwe unu anya ịhụ na unu ebughị ibu ọbụla nʼụbọchị izuike; lezienụ onwe unu anya ịhụ na unu esiteghị nʼọnụ ụzọ ama Jerusalem bufee ya.
22 Futhi lingakhuphi umthwalo ezindlini zenu ngosuku lwesabatha, lingenzi loba yiwuphi umsebenzi; kodwa lungcweliseni usuku lwesabatha, njengalokhu ngalaya oyihlo.
Unu esitela nʼụlọ unu buputa ihe ọbụla, unu arụkwala ọrụ ọbụla nʼụbọchị izuike. Doonụ ụbọchị izuike nsọ dịka m nyere nna unu ha nʼiwu.
23 Kodwa kabalalelanga, kababekanga indlebe yabo, kodwa benza intamo yabo yaba lukhuni ukuze bangezwa, lokuze bangemukeli ukulaywa.
Ma ha egeghị ntị, maọbụ kpọọ ya mkpa ha. Ha bụ ndị ntị ike, ndị na-adịghị aṅa ntị nʼịdọ aka na ntị, maọbụ nabata ya.
24 Kuzakuthi-ke uba lina lingilalela lokungilalela, itsho iNkosi, ukuthi lingangenisi mthwalo ngamasango alumuzi ngosuku lwesabatha, kodwa lilungcwelise usuku lwesabatha, ukuthi lingenzi loba yiwuphi umsebenzi ngalo;
Ma otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, ọ bụrụ na unu ga-elezi anya rubere m isi, hapụ isi nʼọnụ ụzọ ama obodo a bufee maọbụ bubata ibu nʼụbọchị izuike, kama debe ụbọchị izuike nsọ, site na-arụghị ọrụ ọbụla nʼime ya,
25 khona kuzangena ngamasango alumuzi amakhosi leziphathamandla abahlala esihlalweni sobukhosi sikaDavida, begade izinqola lamabhiza, wona leziphathamandla zawo, abantu bakoJuda, labahlali beJerusalema; lalumuzi uzahlalwa kuze kube nininini.
mgbe ahụ, ndị eze ndị ga-anọkwasị nʼocheeze Devid ga-edu ndị na-ejere ya ozi na-agafe na-abatakwa site nʼọnụ ụzọ ama a. Ha na ndị na-ejere ha ozi ga-anọkwasị nʼịnyịnya ha, na nʼụgbọ agha ha, mgbe ha sị nʼọnụ ụzọ ama a na-abata, ma na-apụ. Ndị Juda, na ndị bi na Jerusalem ga-esokwa ha nʼazụ. Aga m emekwa ka ndị mmadụ biri nʼobodo a ruo mgbe ebighị ebi.
26 Bazakuza-ke bevela emizini yakoJuda, lezindaweni ezizingelezele iJerusalema, lelizweni lakoBhenjamini, legcekeni, lezintabeni, lasezansi, beletha umnikelo wokutshiswa, lomhlatshelo, lomnikelo wokudla, lenhlaka, beletha umhlatshelo wokubonga, endlini yeNkosi.
Ndị mmadụ ga-esite nʼobodo niile nke Juda, na nʼobodo nta gbara Jerusalem gburugburu; ha ga-esitekwa nʼala ndị Benjamin, na nʼala ndagwurugwu nke ugwu ndị ahụ dị nʼọdịda anyanwụ, sitekwa nʼala Negev, na-ewebata onyinye aja nsure ọkụ, na aja dị iche iche, na onyinye ọka, na onyinye ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, na onyinye ekele, nʼime ụlọ Onyenwe anyị.
27 Kodwa uba lingangilaleli, ukwenza usuku lwesabatha lube ngcwele, ukuthi lingathwali mthwalo nxa lingena ngamasango eJerusalema ngosuku lwesabatha, khona ngizaphemba umlilo emasangweni ayo, ozaqothula izigodlo zeJerusalema, ongayikucitshwa.
Ma ọ bụrụ na unu enupu isi jụ idebe ụbọchị izuike nsọ, ọ bụrụ na unu anọgide na-ebubata ihe site nʼọnụ ụzọ ama Jerusalem nʼụbọchị izuike, aga m amụnye ọnụ ụzọ ama niile dị na Jerusalem ọkụ, nke a na-apụghị imenyụ emenyụ. Ọ ga-erepịakwa ebe niile e wusiri ike na Jerusalem.’”

< UJeremiya 17 >