< U-Isaya 46 >

1 UBeli uyakhothama, uNebo uyazithoba; izithombe zabo zazingezezifuyo, njalo zazingezezinkomo; imithwalo yenu ethwelweyo ingumthwalo enyamazaneni ediniweyo.
Bel na Nebo, arụsị ndị Babilọn makpu amakpu. Lee, arụsị niile ha ka ebukwasịrị ha nʼazụ ịnyịnya ibu. Arụsị niile apịrị apị bụ nke a na-ebugharị bụ ibu dị arọ, ibu arụ nye ụmụ anụmanụ na-ada mba!
2 Bayaguqa, bakhothame kanyekanye, kabalakophula umthwalo, kodwa bona ngokwabo baya ekuthunjweni.
Ha makpuuru, rudakọkwa ala nʼotu; ha enweghị ike iwezuga ibu ndị a nʼonwe ha, ha onwe ha kwa, a dọtala ha nʼagha.
3 Ngilalela, ndlu kaJakobe, lensali yonke yendlu kaIsrayeli, abathwalwa yimi kwasesibelethweni, abasingathwe kwasesizalweni.
“Geenụ m ntị, unu ụmụ ụmụ Jekọb, unu ndị fọdụrụ nʼụlọ Izrel, unu bụ ndị m na-elekọta siterị na mgbe a mụrụ unu na-akpọgharịkwa unu siterị na mgbe amụpụtara unu.
4 Kuze kube sekugugeni nginguye; yebo, kuze kube sebumpungeni mina ngizalithwala; mina ngenzile, mina-ke ngizaphakamisa, ngitsho mina ngithwale, ngikhulule.
Mụ onwe m, bụ onye ahụ, ọ bụ m ga-elekọtakwa unu anya, ọ bụladị ruo mgbe isi awọ jupụtara unu nʼisi, nʼagadi unu. Nʼihi na ọ bụ m kere unu, aga m elekọtakwa unu. Aga m agba unu ume, bụrụkwa onye nzọpụta unu.
5 Lizangifananisa, lingilinganise, lingiqathanise lobani ukuze sifanane?
“Onye ka unu ga-asị na o yiri m? Onye kwa ka mụ na ya ha? Onye ka unu ga-eji tụnyere m?
6 Bathulula igolide esikhwameni, balinganise isiliva esilinganisweni, baqhatshe umkhandi akwenze unkulunkulu; bathi mbo phansi, yebo, bakhonze.
Ụfọdụ mmadụ na-emeghe akpa ego ha wụpụta ọlaedo dị nʼime ya, na-atụpụtakwa ọlaọcha nʼihe ọtụtụ, were ya goo onye ọkpụ ụzụ ọlaedo ka o jiri ya kpụọrọ ha chi, emesịa, ha na-akpọ isiala na-efe arụsị ahụ ofufe.
7 Bametshata ehlombe, bamthwale, bambeke endaweni yakhe, ame; angasuki endaweni yakhe. Yebo, umuntu ememeza kuye, kodwa kaphenduli, kamsindisi enkathazweni yakhe.
Ha na-ebuli arụsị ahụ buru ya nʼubu ha, buru ya debe ya nʼọnọdụ ya, nʼebe ahụ ka ọ na-akwụrụ. Ọ dịghị apụ site nʼebe ahụ jegharịa. Ọ bụrụ na mmadụ e tikuo ya mkpu, ọ gaghị aza, ọ pụghị ịzọpụtakwa ha pụọ na nsogbu ha niile.
8 Khumbulani lokhu, lizibonakalise liqinile; kubuyiseleni enhliziyweni, lina bahlamuki.
“Chetanụ nke a, ma tuleekwa ya, ka ọ dịgidekwa unu nʼobi, unu ndị na-enupu isi.
9 Khumbulani izinto zakuqala zendulo; ngoba nginguNkulunkulu, njalo kakho omunye; nginguNkulunkulu, njalo kakho ofanana lami;
Chetakwanụ ihe ndị ahụ niile mere nʼoge gara aga, nʼihi na abụ m Chineke, chi ọzọ adịghịkwa. Naanị m bụ Chineke, ọ dịkwaghị onye ọzọ dị ka m.
10 engimemezela isiphetho kwasekuqaleni, njalo kusukela endulo izinto ezingakenziwa, ngisithi: Icebo lami lizakuma, njalo ngizakwenza yonke intokozo yami;
Ọ bụ m na-egosi ikpeazụ site na mmalite, ọ bụ m na-ekwu site na mgbe ochie ihe ga-eme nʼọdịnihu. Ana m asị, ‘nzube m ga-eguzogide. Ọ bụkwa ihe dị m mma nʼobi ka m ga-eme.’
11 engibiza inyoni edla inyama ivela empumalanga, umuntu wecebo lami evela elizweni elikhatshana; yebo, ngikhulumile, yebo, ngizakufeza; ngikumisile, yebo, ngizakwenza.
Aga m esite nʼọwụwa anyanwụ kpọọ anụ ufe, e, sitekwa nʼala ebe dị anya kpọọ nwoke ahụ ga-abịa mee nzube m. Nʼihi na ihe m kwuru ya ka m ga-eme ka o mezuo; ọ bụkwa atụmatụ m ka m ga-emekwa.
12 Ngilalelani, lina abalenhliziyo eziqinileyo, lina elikhatshana lokulunga.
Geenụ m ntị, unu ndị isi ike, unu ndị nọpụrụ ezi omume m nʼebe dị anya.
13 Ngiyasondeza ukulunga kwami, kakuyikuba khatshana; losindiso lwami kaluyikuphuza; kodwa ngizanika usindiso eZiyoni, udumo lwami koIsrayeli.
Ana m eweta ezi omume nso, ọ dịghị nʼebe dị anya, nzọpụta m agaghị anọkwa ọdụ. Aga m enye Zayọn nzọpụta, nyekwa Izrel ịma mma m.

< U-Isaya 46 >