< UGenesisi 39 >
1 UJosefa wasesehliselwa eGibhithe; njalo uPotifa, umphathi kaFaro, induna yabalindi, indoda engumGibhithe, wamthenga esandleni samaIshmayeli, ababemehlisele khona.
A kpọọrọ Josef gaa nʼala Ijipt. Pọtifa, bụ nwoke Ijipt, otu nʼime ndịisi na-ejere Fero ozi, na onyeisi ndị agha na-eche nche zụụrụ ya site nʼaka ndị Ishmel, bụ ndị duuru ya gaa nʼebe ahụ.
2 Njalo iNkosi yayiloJosefa, waze waba ngumuntu ophumelelayo; wayesendlini yenkosi yakhe, umGibhithe.
Onyenwe anyị nọnyeere Josef, nke mere na ihe gaara ya nke ọma nʼụlọ nna ya ukwu onye Ijipt.
3 Inkosi yakhe yasibona ukuthi iNkosi ilaye, lokuthi konke akwenzayo iNkosi yakuphumelelisa esandleni sakhe.
Nna ya ukwu hụrụ na Onyenwe anyị nọnyeere Josef, hụkwa na Onyenwe anyị na-eme ka ihe niile o mere gaara ya nke ọma.
4 UJosefa wasethola umusa emehlweni ayo, wayisebenzela; njalo yamenza waba ngumphathi wendlu yayo, lakho konke eyayilakho yakunikela esandleni sakhe.
Josef hụtara amara nʼihu ya, ghọọ onyeozi nke aka ya. Pọtifa mere ya onye na-elekọta ezinaụlọ ya. Nyefee ya ihe niile o nwere ka ọ bụrụ onye na-elekọta ha.
5 Kwasekusithi kusukela esikhathini eyamenza ngaso umphathi wendlu yayo, lakho konke eyayilakho, iNkosi yabusisa indlu yomGibhithe ngenxa kaJosefa; lesibusiso seNkosi saba phezu kwakho konke eyayilakho, endlini lensimini.
Site nʼoge a, o mere ka ọ bụrụ onye na-elekọta ezinaụlọ ya na ihe niile o nwere, Onyenwe anyị gọziri ezinaụlọ onye Ijipt ahụ nʼihi Josef. Ngọzị Onyenwe anyị dịkwasịrị nʼihe niile Pọtifa nwere, ma ihe o nwere nʼụlọ ma ndị o nwere nʼubi ya.
6 Yasitshiya konke eyayilakho esandleni sikaJosefa; yayingazi lutho lwayo, ngaphandle kokudla eyayikudla. Futhi uJosefa wayemuhle ngesimo, ekhangeleka kuhle.
Ya mere, ọ hapụrụ ihe niile o nwere nʼaka Josef. Nke a mere na ọ mazighị ihe ọzọ na-eme, ma ọ bụghị nri nke ọ na-eri. Josef nʼonwe ya mara mma ahụ dịkwa mma ile anya.
7 Kwasekusithi emva kwalezizinto, inkosikazi yenkosi yakhe yaphakamisela amehlo ayo kuJosefa; yathi: Lala lami.
Mgbe oge nta gasịrị, nwunye Pọtifa lere Josef anya sị ya, “Bịa ka anyị abụọ dinaa.”
8 Kodwa wala, wathi enkosikazini yenkosi yakhe: Khangela, inkosi yami kayikwazi okulami endlini, njalo konke elakho ikunikela esandleni sami;
Ma Josef jụrụ. Ọ gwara nwunye nna ya ukwu sị, “Lee, nna m ukwu anaghị echegbu onwe ya banyere ihe ọbụla nʼụlọ a. O werela ihe niile o nwere nyefee m nʼaka ka m lekọta ha anya.
9 kakho omkhulu kulami endlini le; njalo kayingigodlelanga lutho, ngaphandle kwakho, ngalokhu ukuthi ungumkayo; njalo ngingenza njani lobububi obukhulu, ngone kuNkulunkulu?
O nweghị onye ọnọdụ ya dị elu karịa nke m nʼụlọ a. O gbochighị m ihe ọbụla ma ọ bụghị gị, nʼihi na ị bụ nwunye ya. Olee otu m ga-esi mee oke ihe ọjọọ dị otu a, mee mmehie megide Chineke.”
10 Kwasekusithi ekukhulumeni kwakhe kuJosefa insuku ngensuku, kazange amlalele, ukulala laye, lokuba laye.
Ọ bụ ezie na nwanyị a nọgidere na-enye Josef nsogbu site nʼụbọchị ruo ụbọchị ma Josef jụrụ iso ya dinaa, jụkwa ịnọnyere ya.
11 Kwasekusithi ngosuku oluthile wangena endlini ukuyakwenza umsebenzi wakhe, njalo kwakungekho owamadoda endlu lapho endlini,
Otu ụbọchị, Josef batara nʼime ụlọ ịrụ ọrụ ya. O nweghị ndị ọzọ na-eje ozi nọ nʼime ụlọ nʼụbọchị ahụ.
12 yasimbamba ngesembatho sakhe isithi: Lala lami. Kodwa watshiya isembatho sakhe esandleni sayo, wabaleka, waphumela phandle.
Nwunye Pọtifa jidere Josef nʼuwe mwụda ya, rịọọ ya sị ya, “Bịa ka anyị dinaa.” Ma Josef si nʼime ụlọ ahụ gbapụ, hapụ uwe mwụda ya nʼaka nwunye Pọtifa.
13 Kwasekusithi isibonile ukuthi utshiyile isembatho sakhe esandleni sayo, wabalekela phandle,
Mgbe nwanyị a hụrụ na Josef agbapụla, hapụ uwe ya,
14 yabiza amadoda endlu yayo, yakhuluma kuwo isithi: Bonani, usilethele indoda engumHebheru ukudlala ngathi; uze kimi ukuze alale lami, ngamemeza ngelizwi elikhulu;
ọ kpọrọ ndị na-eje ozi nʼezinaụlọ ya sị ha, “Lee, onye Hibru a di m kpọbatara nʼụlọ a chọrọ iji anyị gwurie egwu. Ọ bịakwutere m nʼime ụlọ chọọ ka mụ na ya dinaa. E tiri m mkpu nʼolu ike.
15 kwasekusithi esezwile ukuthi ngiphakamise ilizwi lami ngakhala, watshiya isembatho sakhe eceleni kwami, wabaleka, waphumela phandle.
Mgbe ọ nụrụ ka m welitere olu m tie mkpu enyemaka m tiri, o sitere nʼime ụlọ a gbapụ, ma hapụrụ m uwe ya.”
16 Yasisibeka isembatho sakhe eceleni kwayo, yaze yafika inkosi yakhe ekhaya.
Nwanyị a debere uwe ahụ nʼakụkụ ya ruo mgbe nna ya ukwu lọtara nʼụlọ.
17 Njalo yakhuluma kuyo njengalamazwi isithi: Inceku engumHebheru, osilethele yona, izile kimi ukuze idlale ngami;
Mgbe ahụ, ọ gwara di ya okwu ndị a sị, “Onye ohu Hibru a ị kpọbataara anyị bakwutere m iji m gwurie egwu.
18 kwasekusithi sengiphakamise ilizwi lami ngakhala, yatshiya isembatho sayo eceleni kwami, yabalekela phandle.
Ma mgbe m welitere olu tie mkpu enyemaka o sitere nʼụlọ gbapụ hapụrụ m uwe ya.”
19 Kwasekusithi inkosi yakhe isizwe amazwi omkayo, ewakhulume kuyo, esithi: Njengalamazwi inceku yakho yenze kimi, ulaka lwayo lwavutha.
Mgbe nna ya ukwu nụrụ ihe nwunye ya gwara ya sị, “Otu a ka ohu gị si meso m mmeso,” o were iwe dị ọkụ.
20 Inkosi kaJosefa yasimthatha yamfaka entolongweni, indawo lapho izibotshwa zenkosi ezazibotshelwa khona; wasesiba lapho entolongweni.
Nna ukwu Josef weere ya tụnye nʼụlọ mkpọrọ, nʼebe a na-etinye ndị mkpọrọ eze Ijipt. Ma ebe ahụ Josef nọ nʼụlọ mkpọrọ,
21 Kodwa iNkosi yaba loJosefa, yelulela umusa kuye, yasimupha umusa emehlweni enduna yentolongo.
Onyenwe anyị nọnyeere ya. O meere ya ebere, mekwa ka o nweta ihuọma nʼebe onyeisi ndị nche ụlọ mkpọrọ ahụ nọ.
22 Induna yentolongo yanikela-ke esandleni sikaJosefa zonke izibotshwa ezazisentolongweni; lakho konke ezazikwenza lapho, wayengumenzi.
Onyeisi ndị na-eche ụlọ mkpọrọ mere Josef onyeisi ndị mkpọrọ niile nọ nʼime ụlọ mkpọrọ ahụ. Josef ghọrọ onye a na-ajụ otu ihe si aga nʼime ụlọ mkpọrọ ahụ.
23 Induna yentolongo kayisakhangelanga lutho olwalusesandleni sakhe, ngoba iNkosi yayilaye; lalokho akwenzayo iNkosi yakuphumelelisa.
Onyeisi ndị nche ụlọ mkpọrọ ahụ enyeghịkwa onwe ya nsogbu maka ihe ọbụla. Nʼihi na Onyenwe anyị nọnyeere Josef, mee ka ihe ọbụla ọ na-eme gaa nke ọma.