< UGenesisi 38 >
1 Kwasekusithi ngalesosikhathi uJuda wehla esuka kubafowabo, waphambukela endodeni yeAdulamu, obizo layo linguHira.
Nʼoge ahụ, Juda hapụrụ ụmụnne ya gaa binyere otu nwoke onye Adulam a na-akpọ Hira.
2 UJuda wasebona lapho indodakazi yendoda umKhanani, obizo lakhe linguShuwa; wayithatha wangena kuyo.
Nʼebe ahụ, Juda hụrụ otu nwaagbọghọ, nwa otu nwoke onye Kenan, aha ya bụ Shua. Ọ lụrụ ya ma bakwuru ya.
3 Yasithatha isisu, yazala indodana; waseyitha ibizo layo uEri.
Ọ tụụrụ ime mụọ nwa nwoke, onye Juda gụrụ aha Ịa
4 Yasiphinda ithatha isisu, yazala indodana; yayitha ibizo layo uOnani.
Nwunye ya dịkwara ime ọzọ mụta nwa nwoke nke ya bụ nwunye ya gụrụ Onan.
5 Yasisengezelela futhi yazala indodana, yayitha ibizo layo uShela; kodwa wayeseKezibi ekuyizaleni kwayo.
Ọ mụkwara nwa nwoke ọzọ, onye ọ kpọrọ Shela. Ọ bụ na Kezib ka ọ mụrụ ya.
6 UJuda wasemthathela uEri izibulo lakhe umfazi, njalo ibizo lakhe linguTamari.
Juda lụtaara Ịa, ọkpara ya, nwunye onye aha ya bụ Tama.
7 Kodwa uEri, izibulo likaJuda, wayemubi emehlweni eNkosi; iNkosi yasimbulala.
Ma nʼihi na Ịa, ọkpara Juda, dị njọ nʼanya Onyenwe anyị. Onyenwe anyị gburu ya.
8 UJuda wasesithi kuOnani: Ngena kumkamfowenu, wenze kuye imfanelo yomfowabo wendoda, umvusele umfowenu inzalo.
Mgbe ahụ, Juda sịrị Onan, “Bakwuru nwunye nwanne gị ka ịkuchie ya, ka i si otu a wulite mkpụrụ maka nwanne gị.”
9 UOnani wayesazi-ke ukuthi inzalo kayiyikuba ngeyakhe. Kwasekusithi lapho engena kumkamfowabo, wayichithela emhlabathini, ukuze angamniki umfowabo inzalo.
Onan ma na mkpụrụ a agaghị abụ nke ya. Nʼihi ya, mgbe ọbụla ọ bakwuru nwunye nwanne ya, ọ na-anyụsa mkpụrụ nwa ya nʼala, ime ka ọ ghara inye nwanne ya nwoke nwa.
10 Kwasekusiba kubi emehlweni eNkosi lokho akwenzayo; ngakho yambulala laye.
Ma ihe a o mere jọrọ njọ nʼanya Onyenwe anyị. Nʼihi ya Onyenwe anyị gbukwara ya.
11 UJuda wasesithi kuTamari umalokazana wakhe: Hlala ungumfelokazi endlini kayihlo, aze akhule uShela indodana yami; ngoba wathi: Hlezi laye afe njengabafowabo. UTamari wasehamba wahlala endlini kayise.
Juda sịrị nwunye nwa ya, bụ Tama, “Laa nʼụlọ nna gị nọrọ dịka nwanyị di ya nwụrụ tutu Shela nwa m nwoke etoo.” Ma echiche ya bụ, “ka ọ ghara ịnwụ dịka ụmụnne ya.” Tama lara gaa biri nʼụlọ nna ya.
12 Emva kwensuku ezinengi yafa indodakazi kaShuwa, umkaJuda. UJuda eseziduduzile, wenyukela kubagundi bezimvu zakhe eThiminathi, yena lomngane wakhe uHira umAdulamu.
Mgbe ọtụtụ oge gasịrị, nwunye Juda nwa Shua nwụrụ. Mgbe oge nkasiobi ya gasịrị, Juda jere Timna, ya na enyi ya Hira, onye Adulam, ilekọta ndị na-akpụchapụ igwe ewu na atụrụ ya ajị.
13 Kwasekusaziswa kuTamari ukuthi: Khangela, uyihlozala wenyukela eThiminathi ukugunda izimvu zakhe.
A gwara Tama sị ya, “Nna di gị na-aga Timna ịkpacha atụrụ ya ajị.”
14 Wasekhulula izembatho zobufelokazi bakhe, wazimbomboza ngesimbombozo, wazigoqela, wahlala esangweni iEnayima, elisendleleni eya eThiminathi; ngoba wabona ukuthi uShela wayesekhulile, njalo wayengamnikwanga ukuba ngumkakhe.
O yipụrụ uwe mkpe ya, were akwa mkpuchi kpuchie onwe ya gaa nọdụ ala nʼọnụ ụzọ ama Enayim, nke dị nʼụzọ e si aga Timna. O mere otu a nʼihi na ọ matara na Shela etoola, ma enyeghị ya ka ọ bụrụ nwunye ya.
15 Lapho uJuda esembonile, wacabanga ukuthi uliwule, ngoba embomboze ubuso bakhe.
Mgbe Juda hụrụ ya, o chere na ọ bụ otu nwanyị akwụna, ebe ọ bụ na o kpuchiri ihu ya.
16 Wasephambukela kuye endleleni wathi: Woza-ke, ngingene kuwe; ngoba wayengazi ukuthi ngumalokazana wakhe. Wasesithi: Uzanginikani ukuze ungene kimi?
Ma ebe ọ mataghị na ọ bụ nwunye nwa ya, o jekwuru ya ebe ọ nọdụrụ ala nʼakụkụ ụzọ sị ya, “Bịa, kwere ka mụ na gị dinaa.” Tama jụrụ, “Gịnị ka ị ga-enye m ma ọ bụrụ na m kwere ka mụ na gị dinaa?”
17 Wasesithi: Mina ngizathumela izinyane lembuzi elivela emhlanjini. Wasesithi: Uzanginika isibambiso uze ulithumele yini?
Ọ zara, “Aga m ezitere gị otu nwa ewu site nʼigwe ewu na atụrụ m.” Ọ jụrụ, “Ị ga-enye m ihe akaebe ruo mgbe ị ga-ezite ya?”
18 Wasesithi: Sibambiso bani engizakunika sona? Wasesithi: Indandatho elophawu lwakho, lentambo yakho, lodondolo lwakho olusesandleni sakho. Wasemupha, wangena kuye; wasethatha isisu sakhe.
Ọ sịrị, “Kedụ ihe akaebe m ga-enye gị?” Ọ zara, “Mgbaaka akara gị na eriri ya, na mkpanaka dị gị nʼaka.” O nyere ya ihe ndị a. Ọ bakwuru ya nke mere na ọ tụụrụ ime.
19 Wasesukuma wahamba, wakhulula isimbombozo sakhe, wafaka izembatho zobufelokazi bakhe.
Mgbe o si nʼebe ahụ pụọ, o yipụrụ akwa ahụ o ji kpuchie ihu ya, yirikwa uwe mkpe ya.
20 UJuda wasethumela izinyane lembuzi ngesandla somngane wakhe umAdulamu ukuze athathe isibambiso esandleni sowesifazana; kodwa kamtholanga.
Mgbe Juda zigara enyi ya onye Adulam ka ọ gaa wegara ya nwa ewu ahụ, ma nataghachi ihe ibe ahụ, ọ hụghị ya.
21 Wasebuza amadoda endawo yakowesifazana esithi: Lingaphi iwule elaliseEnayima endleleni? Asesithi: Kakuzanga kube khona iwule lapha.
Ọ jụrụ ndị ikom bi nʼebe ahụ sị, “Olee nwanyị akwụna ụlọ arụsị ahụ na-anọdụ nʼọnụ ụzọ ama Enayim?” Ha sịrị, “O nweghị nwanyị akwụna ụlọ arụsị nọrọla nʼebe a.”
22 Wasebuyela kuJuda wathi: Kangilitholanga, futhi lamadoda endawo athi: Kakuzanga kube khona iwule lapha.
Ya mere, ọ laghachiri gaa gwa Juda, “Ahụghị m ya. Ọzọkwa, ndị ikom ndị bi nʼebe ahụ sịrị, ‘O nweghị nwanyị akwụna ụlọ arụsị nọrọla nʼebe a.’”
23 UJuda wasesithi: Kalizithathele, hlezi sideleleke; khangela, ngithumele lelizinyane, kodwa wena kawumtholanga.
Juda zara, “Ka o jide ihe niile o ji, ma ọ bụghị otu a anyị ga-aghọ ihe ọchị. Lee, ezigarala m ya nwa ewu a, ma gị onwe gị achọtaghị ya.”
24 Kwasekusithi phose emva kwenyanga ezintathu kwaziswa kuJuda ukuthi: UTamari umalokazana wakhe ufebile, futhi khangela-ke, ulesisu sokufetshwa. UJuda wasesithi: Mkhupheni atshiswe.
Mgbe ọnwa atọ gasịrị, ozi ruru Juda ntị sị, “Tama nwunye nwa gị gbara akwụna, bịa site nʼịgba akwụna dịrị ime.” Juda sịrị, “Kpọpụtanụ ya ka akpọọ ya ọkụ.”
25 Esekhutshiwe, yena wathumela kuyisezala, esithi: Ngoniwe yindoda engumnini walezizinto. Wathi futhi: Ake uhlolisise ukuthi ngezikabani lezizinto, indandatho elophawu lezintambo lodondolo.
Ma mgbe ha kpọ ya na-apụta, o zigara nna di ya ozi, sị, “Ọ bụ nwoke nwee ihe ndị a tụwara m ime. Ọ sịkwara, Leruo anya ma ị ga-amata onye nwe ihe ndị a: mgbaaka akara a na eriri ya, na mkpanaka a.”
26 UJuda wasezivuma wathi: Ulungile kulami, ngakho njengoba ngingamnikanga uShela indodana yami. Njalo kabanga esamazi futhi.
Juda ghọtara ha, sị, “Ọ bụ onye ezi omume karịa m, ebe ọ bụ na m jụrụ ịkpọrọ ya kpọnye nwa m nwoke Shela ka ọ bụrụ nwunye ya.” O dinakwaghị ya ọzọ.
27 Kwasekusithi esikhathini sokubeletha kwakhe, khangela-ke, amaphahla ayesesiswini sakhe.
Mgbe oge ọmụmụ nwa ya ruru, ejima ka ahụrụ nʼakpanwa ya.
28 Kwasekusithi ekubeletheni kwakhe, elinye lakhupha isandla; umbelethisi wasithatha, wabopha intambo ebomvu esandleni salo, esithi: Lo uzaphuma kuqala.
Mgbe ọ na-amụ ha, otu nʼime ha sepụtara aka ya. Nwanyị na-aghọ nwa weere eriri na-acha uhie uhie kee ya na nkwoji aka kwuo sị, “Ọ bụ nke a bụ ụzọ pụta.”
29 Kodwa kwathi lifinyeza isandla salo, khangela-ke umfowabo waphuma; wasesithi: Ufohle njani? Ukufohla kakube phezu kwakho. Wasemutha ibizo lakhe uPerezi.
Ma nwa ahụ mesịrị sekpuo aka ya, nwanne ya nke ọzọ eburu ya ụzọ pụta. Nwanyị ahụ sịrị, “Ọ bụ otu a ka ị si tikapụta?” A kpọrọ ya Perez.
30 Emva kwalokhu kwasekuphuma umfowabo owayelentambo ebomvu esandleni sakhe; wasemutha ibizo lakhe uZera.
Emesịa, nwanne ya, nke bu eriri uhie uhie ahụ na nkwoji aka pụtakwara. A kpọrọ ya Zera.