< UGenesisi 19 >

1 Ingilosi ezimbili zasezifika eSodoma sekuhlwile. LoLothi wayehlezi esangweni leSodoma. Kwathi uLothi ezibona, wasukuma ukuzihlangabeza, wathi mbo ngobuso emhlabathini;
Nʼoge anyasị, ndị mmụọ ozi abụọ ahụ bịarutere Sọdọm. Lọt nọ ala nʼọnụ ụzọ ama obodo ahụ. Mgbe ọ hụrụ ha, o biliri jekwuru ha, hulata ihu ya nʼala.
2 wasesithi: Khangelani-ke makhosi ami, ngicela liphendukele endlini yenceku yenu, lilale ubusuku, ligeze inyawo zenu, beselivuka ngovivi, lihambe indlela yenu. Zathi-ke: Hatshi, kodwa sizalala endleleni.
Ọ sịrị, “Ndị nwe m, batanụ nʼụlọ ohu unu. Unu nwere ike saa ụkwụ unu, nọọkwa ọnọdụ abalị. Chi bọọ, unu nwere ike ibilikwa bido ịga nʼihu nʼije unu.” Ha zara sị, “Ee, anyị ga-edina nʼama.”
3 Wasezincenga kakhulu zaze zaphendukela kuye zangena endlini yakhe; wazenzela idili, wapheka isinkwa esingelamvubelo, zasezisidla.
Ma Lọt rịọsiri ha ike. Nʼikpeazụ ha sooro ya laa nʼụlọ ya. Ọ kwadooro ha ihe oriri, ya bụ achịcha na-ekoghị eko ka o ghere. Ha rikwara ya.
4 Zingakalali, amadoda omuzi, amadoda eSodoma, azingelezela indlu, kusukela komutsha kusiya komdala, bonke abantu bevela ephethelweni lomuzi.
Tupu ha abanye ịrahụ ụra, ndị ikom obodo ahụ, ndị ikom Sọdọm, bịara gbaa ụlọ ahụ gburugburu, ma ụmụ okorobịa ma ndị agadi, ndị niile si nʼakụkụ obodo ahụ.
5 Asembiza uLothi athi kuye: Angaphi amadoda afike kuwe lobubusuku? Akhuphele phandle kithi ukuze siwazi.
Ha kpọrọ Lọt oku sị ya, “Olee ebe ha nọ, bụ ndị ikom ahụ bịara nʼụlọ gị nʼabalị a? Kpọpụtara anyị ha ka anyị na ha dinakọọ.”
6 ULothi wasephumela kuwo emnyango, wavala umnyango ngemva kwakhe.
Lọt pụkwuru ha nʼezi, mechie ụzọ ụlọ ya,
7 Wathi: Ngiyacela bazalwane, lingenzi okubi.
sị ha, “Bikonu, ndị enyi m, unu emela ihe ọjọọ dị otu a.
8 Khangelani-ke, ngilamadodakazi amabili, angakazi indoda; ake ngilikhuphele wona, beselisenza kuwo njengokuhle emehlweni enu; kodwa kulamadoda lingenzi lutho, ngoba yikho engene emthunzini wophahla lwami.
Leenụ, enwere m ụmụ nke aka m, ụmụ agbọghọ abụọ na-amaghị nwoke. Ka m kpọpụtara unu ha, ka unu mee ha ihe masịrị unu. Ma hapụnụ ndị ikom ndị a, nʼihi na ha bụ ndị batara izere ndụ nʼụlọ m.”
9 Kodwa athi: Xekela le. Athi njalo: Yena lo yedwa wafika engowezizwe, kambe ngeqiniso angaba ngumahluleli? Khathesi sizakwenza okubi kuwe okwedlula wona. Acindezela kakhulu indoda uLothi, asondela ukuze afohloze isivalo.
Ha zara sị ya, “Pụọra anyị nʼụzọ. Mbịarambịa ka ị bụ! Leenụ mbịarambịa a! Ọ chọrọ ịbụ onye ikpe. Anyị mee gị ihe, ọ ga-ajọrọ gị njọ karịa ihe anyị ga-eme ha.” Ha nuru Lọt aka nughachi ya azụ, malite itiwa ọnụ ụzọ ụlọ ya.
10 Kodwa lawomadoda elula isandla sawo, amngenisa uLothi kuwo endlini, avala umnyango.
Ma ndị ikom ahụ nọ nʼụlọ Lọt, setịpụrụ aka ha dọbata ya nʼụlọ, ma mechie ụzọ ahụ.
11 Asetshaya amadoda ayesemnyango wendlu ngobuphofu, kusukela komncinyane kusiya komkhulu, aze adinwa yikudinga umnyango.
Ha tiri ndị ikom ndị ahụ nọ nʼọnụ ụzọ ihe otiti nke mere ka ha kpụọ ìsì, onye ukwu ha na onye nta ha. Nʼihi ya, ha enweghị ike ịchọta ọnụ ụzọ ụlọ ahụ.
12 Amadoda asesithi kuLothi: Useselobani lapha? Umkhwenyana lamadodana akho lamadodakazi akho, laye wonke olaye emzini, mkhuphe kulindawo,
Ndị ikom abụọ ahụ gwara Lọt sị, “O nwere onye ọbụla ọzọ i nwere nʼebe a? Ndị ọgọ nwoke, maọbụ ụmụ gị ndị ikom, maọbụ ụmụ gị ndị inyom, na ọ bụ onye ọbụla bụ nke gị nʼobodo a. Site nʼebe a kpọpụ ha!
13 ngoba sizabhubhisa lindawo, ngoba isikhalo sabo sikhulu phambi kweNkosi; njalo iNkosi isithumile ukuthi siyibhubhise.
Nʼihi na anyị na-aga imebi obodo a, mkpu akwa ruru Onyenwe anyị ntị megide ndị bi nʼobodo a adịla ukwuu, nke mere o ji zite anyị ibibi ya.”
14 ULothi wasephuma, wakhuluma labakhwenyana bakhe ababezathatha amadodakazi akhe, wathi: Sukumani liphume kulindawo; ngoba iNkosi izabhubhisa umuzi. Kodwa waba njengosomayo emehlweni abakhwenyana bakhe.
Ya mere, Lọt pụrụ gaa gwa ndị ọgọ ya nwoke, ndị na-akwado ịlụ ụmụ ya ndị inyom, sị ha, “Ọsọ, sinụ nʼobodo a pụọ. Nʼihi na Onyenwe anyị na-akwado ibibi ya.” Ma ndị ọgọ ya nwoke ndị a chere na ọ na-egwu egwu.
15 Kwathi emadabukakusa, ingilosi zamcindezela uLothi, zisithi: Suka, uthathe umkakho lamadodakazi akho womabili atholakalayo, hlezi ubhujiswe ebubini bomuzi.
Nʼụtụtụ, mgbe chi na-abọta, ndị mmụọ ozi a kwagidere Lọt sị ya, “Ọsọ, kpọrọ nwunye gị na ụmụ gị ndị inyom abụọ ndị a site nʼebe a gbapụ, ma ọ bụghị ya, a ga-ekpochapụ unu nʼihi ajọ omume ndị obodo a.”
16 Kodwa esazilazila, amadoda abamba isandla sakhe, lesandla somkakhe, lesandla samadodakazi akhe womabili, ngoba iNkosi ilomusa kuye, asemkhupha, ambeka ngaphandle komuzi.
Mgbe Lọt ka nọ na-eche ihe ọ ga-eme, ndị ikom ahụ jidere ya nʼaka, jidekwa nwunye ya, na ụmụ ya ndị inyom abụọ duru ha pụọ nʼobodo ahụ, nʼihi na Onyenwe anyị nwere obi ebere nʼebe ha nọ.
17 Kwasekusithi esebakhuphele ngaphandle, yathi: Baleka ngenxa yempilo yakho, ungakhangeli ngemva kwakho, ungemi egcekeni lonke; balekela entabeni hlezi ubhujiswe.
Mgbe ha si nʼime obodo kpọpụta ha, otu onye nʼime ha gwara ha sị, “Gbalaganụ nʼihi ndụ unu. Unu elekwala anya nʼazụ. Unu akwụsịkwala ebe ọbụla na mbara ala. Gbaganụ nʼugwu, nʼihi na ọ bụrụ na unu emeghị otu a, a ga-ekpochapụ unu.”
18 ULothi wasesithi kuwo: Kakungabi njalo, Nkosi yami.
Ma Lọt sịrị ha, “Mba, ndị nwe m, bikonu,
19 Khangela-ke, inceku yakho ithole umusa emehlweni akho, ukhulisile isihawu sakho, osenze kimi, ukugcina uphila umphefumulo wami; kodwa mina ngingeke ngiphephele entabeni, hlezi ububi bunamathele kimi, besengisifa.
ohu unu achọtala amara nʼihu unu, unu egosila m obi ebere dị ukwuu site nʼichebe ndụ m. Ma agaghị m enwe ike gbalaga nʼugwu ka mbibi a ghara ịdakwasị m, m nwụọ.
20 Khangela-ke, lumuzi useduze ukubalekela kuwo; futhi umncinyane. Ngicela ngibalekele kuwo (kambe kawumncinyane?) lomphefumulo wami uphile.
Lee obodo dị nso nke m nwere ike ịgbaga. Ọ bụ obodo dị nta. Kwere ka m gbaga nʼebe ahụ. Obodo nta ka ọ bụ, ọ bụghị ya? Aga m echebekwa ndụ m na ya.”
21 Yasisithi kuye: Khangela, ngibemukele ubuso bakho lakulolu udaba, ukuze ngingawuchithi umuzi okhulume ngawo.
Ọ zara sị ya, “Ọ dị mma, aga m emere gị dịka arịrịọ gị si dị. Agaghị m emebi obodo nta ahụ.
22 Phangisa, balekela kuwo; ngoba ngingeze ngenza ulutho uze ufike kuwo. Ngakho babiza ibizo lomuzi ngokuthi yiZowari.
Ma mee ngwangwa, nʼihi na o nweghị ihe ọbụla m ga-eme tutu ruo mgbe i ruru nʼebe ahụ.” (Ọ bụ nke a mere e ji akpọ aha obodo ahụ Zoa.)
23 Ilanga laseliphumile phezu komhlaba lapho uLothi engena eZowari.
Mgbe Lọt rutere obodo Zoa, anwụ awalitela nʼala ahụ.
24 INkosi yasinisa phezu kweSodoma laphezu kweGomora isibabule lomlilo, kuvela eNkosini kuvela emazulwini.
Mgbe ahụ Onyenwe anyị sitere nʼeluigwe zokwasị obodo Sọdọm na Gọmọra nkume ọkụ nke Onyenwe anyị mere ka o si nʼeluigwe zoo.
25 Yasibhubhisa leyomizi legceke lonke, labo bonke ababehlala emizini, lokuhlumayo komhlaba.
Otu a ka o si kwatuo obodo ndị ahụ niile dị na mbara ala ahụ niile, na ndị niile bi nʼobodo ndị ahụ. O kwatukwara ihe niile na-epu nʼala.
26 Kodwa umkakhe wakhangela emuva engemuva kwakhe, wasesiba yinsika yetshwayi.
Ma mgbe nwunye Lọt lere anya nʼazụ, otu mgbe ahụ, ọ ghọrọ ogidi nnu.
27 UAbrahama wasevuka ekuseni kakhulu, waya endaweni lapho ayemi khona phambi kweNkosi.
Nʼụtụtụ echi ya, Ebraham biliri jeruo ebe ahụ o guzoro nʼihu Onyenwe anyị nʼụbọchị gara aga.
28 Wasekhangela phansi ngaseSodoma leGomora langasemhlabathini wonke wegceke, wabona, njalo khangela, intuthu yathunqa emhlabeni njengentuthu yesithando.
Ọ lepụrụ anya nʼebe obodo Sọdọm na Gọmọra dị, na nʼebe mbara ala ndị ahụ niile dị. Ọ hụrụ anwụrụ ọkụ dị ukwuu nke si nʼala ahụ na-alali elu. Anwụrụ ọkụ a dị ka anwụrụ ọkụ si nʼebe a kwanyere ọkụ na-enwusi ike.
29 Kwasekusithi uNkulunkulu esebhubhisile imizi yegceke uNkulunkulu wamkhumbula uAbrahama, wamkhokhela uLothi emkhupha phakathi kwencithakalo, mhla ebhubhisa imizi ayehlala kuyo uLothi.
Ya mere, mgbe Chineke bibiri obodo ndị ahụ dị na mbara ala, o chetara Ebraham, kpọpụta Lọt site nʼoke mbibi ahụ e bibiri obodo ndị ahụ Lọt bi nʼime ha.
30 ULothi wasesenyuka esuka eZowari, wahlala entabeni, lamadodakazi akhe womabili laye, ngoba wayesesaba ukuhlala eZowari; wahlala obhalwini, yena lamadodakazi akhe womabili.
Emesịa, Lọt na ụmụ ya ndị inyom abụọ hapụrụ obodo Zoa, nʼihi na ọ tụrụ egwu ibi nʼime Zoa. Ọ gara biri nʼime ọgba nkume ya na ụmụ ya ndị inyom abụọ.
31 Endala yasisithi kwencinyane: Ubaba usemdala, njalo kakulandoda emhlabeni ukungena kithi, ngokwendlela yomhlaba wonke.
Otu ụbọchị, ada ya sịrị nke nta, “Nna anyị emeela agadi, ọ nwekwaghị nwoke ọbụla nọ nʼụwa a, onye ga-enye anyị ụmụ, dịka omenaala si dị nʼụwa niile.
32 Woza simnathise ubaba iwayini, silale laye sigcine iphila inzalo evela kubaba.
Ka anyị mee ka nna anyị ṅụọ mmanya, ka anyị na ya dinakọọ, ka anyị chebe agbụrụ anyị site na nna anyị.”
33 Asemnathisa uyise iwayini ngalobobusuku; endala yasingena yalala loyise, futhi kakwazanga ekulaleni kwayo lekusukeni kwayo.
Nʼabalị ahụ, ha mere ka nna ha ṅụọ mmanya, nke ada banyere soro nna ya dina. Ha abụọ nwere mmekọ. Ma ọ amaghị mgbe ada ya dinara maọbụ mgbe o bilikwara.
34 Kwasekusithi ngosuku olulandelayo endala yathi kwencinyane: Khangela, bengilele lobaba ngobusuku obedlulileyo; asimnathise iwayini langalobubusuku, ubusungena ulale laye, ukuze sigcine iphila inzalo evela kubaba.
Nʼechi ya, ada gwara nwanne ya nke nta, “Mụ na nna anyị dinara nʼabalị gara aga. Ka anyị mee ka ọ ṅụọkwa mmanya nʼabalị taa, ka ị gaakwa ka gị na ya dina. Ka anyị mee ka agbụrụ anyị dịgide site na nna anyị.”
35 Asemnathisa uyise iwayini langalobobusuku; lencinyane yasukuma yalala laye, futhi kakwazanga ekulaleni kwayo lekusukeni kwayo.
Ha mere ka nna ha ṅụọ mmanya nʼabalị ahụ, ada ya nke nta banyere ya na nna ya dinaa. Dịka ọ dịkwa na mbụ, nna ha amataghị mgbe o dinara ala maọbụ mgbe o bilitere.
36 Ngokunjalo amadodakazi womabili kaLothi athatha izisu kuyise.
Ya mere, ụmụ ndị inyom Lọt abụọ ndị a tụrụ ime site nʼaka nna ha.
37 Endala yasizala indodana, yayitha ibizo yathi nguMowabi; lowo nguyise wamaMowabi kuze kube lamuhla.
Nke ada mụtara nwa nwoke onye ọ gụrụ Moab. Ọ bụ ya bụ nna nna ndị Moab ruo taa.
38 Lencinyane layo yazala indodana, yayitha ibizo yathi nguBenami; lowo nguyise wabantwana bakoAmoni kuze kube lamuhla.
Nwa ya nke nta mụtakwara nwa nwoke onye ọ gụrụ Ben-Ammi. Ọ bụ ya bụ nna nna ndị Amọn ruo taa.

< UGenesisi 19 >