< UGenesisi 13 >

1 UAbrama wasesenyuka eGibhithe, yena lomkakhe lakho konke ayelakho loLothi kanye laye, waya eningizimu.
Ebram na nwunye, na ihe niile ha nwere hapụrụ ala Ijipt, gaa ije bịaruo Negev. Lọt sokwa ha.
2 Njalo uAbrama wayenothile kakhulu, ngezifuyo, ngesiliva, langegolide.
Nʼoge a, Ebram aghọọla ọgaranya dị ukwuu, onye nwere akụnụba nke ọtụtụ anụ ụlọ, na ọlaọcha, na ọlaedo.
3 Wasehamba kuzinhambo zakhe esuka eningizimu, waze wafika eBhetheli, endaweni lapho ithente lakhe elalikhona kuqala, phakathi kweBhetheli leAyi;
Ha sitere na Negev pụọ ije site nʼotu ebe ruo nʼebe ọzọ tutu ha erute Betel, nʼebe dị nʼetiti Betel na Ai, ebe ọ mara ụlọ ikwu ya na mbụ.
4 endaweni yelathi ayelenzile khona kuqala; uAbrama wasebiza ibizo leNkosi lapho.
Nʼebe nsọ o wukwara ebe ịchụ aja na mbụ, nʼebe ahụ Ebram kpọkuru aha Onyenwe anyị.
5 LoLothi laye, owayehamba loAbrama, wayelezimvu lezinkomo lamathente.
Ugbu a Lọt, onye ya na Ebram so na njem ya, bụkwa onye nwere akụnụba nke igwe ewu na atụrụ, na igwe ehi, na ọtụtụ ụlọ ikwu.
6 Njalo ilizwe lalingebathwale ukuthi bahlale ndawonye, ngoba impahla yabo yayinengi, ukuthi babengeke bahlala ndawonye.
Ma ala ebe ha nọ ezurughị ha mgbe ha nọkọrọ ọnụ nʼihi na ihe onwunwe ha dị ukwuu ruo na ha enweghị ike ịnọkọ ọnụ.
7 Kwasekusiba khona ukuxabana phakathi kwabelusi bezifuyo zikaAbrama labelusi bezifuyo zikaLothi. Ngalesosikhathi amaKhanani lamaPerizi ayehlala elizweni.
Nke a mere esemokwu ji dapụta nʼetiti ndị ọzụzụ anụ ụlọ Ebram na ndị ọzụzụ anụ ụlọ Lọt. Ndị Kenan na ndị Periz bikwa nʼala ahụ nʼoge ahụ.
8 UAbrama wasesithi kuLothi: Ake kungabi khona ukuxabana phakathi kwami lawe, laphakathi kwabelusi bami labelusi bakho, ngoba singamadoda osendo.
Ya mere Ebram gwara Lọt sị, “Biko, ka esemokwu ghara ịdị nʼetiti mụ na gị, maọbụ nʼetiti ndị ọzụzụ anụ ụlọ m na ndị ọzụzụ anụ ụlọ gị, nʼihi na anyị bụ ụmụnne.
9 Ilizwe lonke kaliphambi kwakho yini? Yehlukana-ke lami; uba usiya kwesokhohlo, ngizakuya kwesokunene; kodwa uba kwesokunene, ngizakuya kwesokhohlo.
Lee, ọ bụ na ala a niile adịghị nʼihu gị? Ka anyị kewaa. Ọ bụrụ na ị gaa nʼakụkụ aka ekpe, aga m aga nʼakụkụ aka nri. Ma ọ bụrụ na i gaa nʼakụkụ aka nri gị, aga m aga nʼakụkụ aka ekpe.”
10 ULothi wasephakamisa amehlo akhe, wabona lonke igceke leJordani ukuthi lalithelelwe kuhle lonke. INkosi ingakachithi iSodoma leGomora, lalinjengensimu yeNkosi, njengelizwe leGibhithe, nxa usiya eZowari.
Lọt lelitere anya hụ na mbara ala Jọdan bụ ala mmiri na-ezokwasị nke ọma, ala dịka ubi a gbara ogige Onyenwe anyị, dịka ala ndị Ijipt nke dị na nso nso Zoa. (Ihe a mere tupu Onyenwe anyị ebibie obodo Sọdọm na Gọmọra.)
11 ULothi wasezikhethela lonke igceke leJordani; uLothi wasesiya empumalanga; basebezehlukanisa omunye komunye.
Ya mere, Lọt họọrọ nye onwe ya mbara ala Jọdan niile, chee ihu ịga nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ. Ya na Ebram kewara.
12 UAbrama wahlala elizweni leKhanani, uLothi wasehlala emizini yemagcekeni, wamisa ithente lakhe eduze leSodoma.
Ebram nọdụrụ nʼala Kenan, ma Lọt gara biri nʼetiti obodo ndị ahụ dị na mbara ala. Ọ mara ụlọ ikwu ya nso nso obodo Sọdọm.
13 Kodwa abantu beSodoma babebabi babeyizoni phambi kweNkosi kakhulu.
Ma ndị Sọdọm bụ ndị obi tara mmiri, ndị na-emehie nke ukwuu megide Onyenwe anyị.
14 INkosi yasisithi kuAbrama emva kokuthi uLothi esehlukaniswe laye: Phakamisa-ke amehlo akho, ukhangele endaweni lapho okhona, ngasenyakatho langaseningizimu langasempumalanga langasentshonalanga,
Mgbe Lọt siri nʼebe ahụ pụọ, Onyenwe anyị gwara Ebram okwu sị ya, “Site nʼebe ahụ ị nọ lelie anya gị, lee anya nʼugwu na ndịda, nʼọwụwa anyanwụ na ọdịda anyanwụ.
15 ngoba ilizwe lonke olibonayo ngizalinika wena, lakunzalo yakho kuze kube nininini.
Ala ahụ niile ị hụrụ ka m ga-enye gị na mkpụrụ gị ruo mgbe ebighị ebi.
16 Njalo ngizakwenza inzalo yakho ibe njengothuli lomhlaba, kuze kuthi uba umuntu engabala uthuli lomhlaba, izabalwa lenzalo yakho.
Aga m eme ka mkpụrụ gị baa ụba dịka aja dị nʼala. Ọ bụrụ na mmadụ enwe ike ịgụta ọnụọgụgụ aja dị nʼala, ha ga-enwe ike gụta ọnụọgụgụ mkpụrụ gị.
17 Sukuma uhambe udabule ilizwe, ebudeni balo lebubanzini balo, ngoba ngizalinika wena.
Bilie jegharịa nʼala ahụ niile nʼakụkụ ya ọbụla, nʼihi na ana m enye gị ha niile.”
18 UAbrama wasesusa amathente wafika wahlala ezihlahleni zama-okhi zeMamre, eziseHebroni, wakhela lapho iNkosi ilathi.
Ya mere, Ebram bugharịrị ụlọ ikwu ya, gaa biri nʼakụkụ osisi ukwu Mamre nke dị na Hebrọn. O wuru ebe ịchụ aja nye Onyenwe anyị nʼebe ahụ.

< UGenesisi 13 >