< KwabaseGalathiya 6 >
1 Bazalwane, uba-ke umuntu esehlelwa yisiphambeko esithile, lina abakaMoya mlungiseni onjalo ngomoya wobumnene, uziqaphele, hlezi lawe ulingwe.
Ụmụnna m, ọ bụrụ na-anwude onye ọbụla dabara na mmehie, unu onwe unu bụ ndị Mmụọ na-achị kwesiri iji mmụọ nke ịdị nwayọọ na obi dị umeala nyere onye ahụ aka, ime ka ọ gazie nʼezi ụzọ. Ma lezienụ onwe unu anya, onye ọbụla nʼime unu, nʼihi na a pụrụ ịnwakwa unu.
2 Thwalisanani imithwalo yenu, langokunjalo gcwalisani umlayo kaKristu.
Na-eburịtanụ nsogbu dịrị ibe unu, ma site nʼotu a ka unu nwee ike debezuo iwu Kraịst.
3 Ngoba uba umuntu ezitsho ukuthi uyilutho, engesilutho, uyazikhohlisa;
Ọ bụrụ na onye ọbụla na-eche na o nwere ihe ya bụ mgbe o nweghị ihe ọ bụ, onye ahụ na-eduhie onwe ya ụzọ.
4 kodwa ngulowo lalowo kahlole owakhe umsebenzi, khona-ke ezakuba lokuzincoma ngokungokwakhe yedwa, njalo kungabi ngokomunye.
Ka onye ọbụla nyocha ọrụ ya, ma ọ bụrụ na ọrụ ya dị mma, mgbe ahụ ka ọ ga-enwe ihe ịnya isi nʼime onwe ya na-abụghị nʼebe ọrụ onye ọzọ dị.
5 Ngoba ngulowo lalowo uzathwala owakhe umthwalo.
Nʼihi na onye ọbụla ga-ebu ibu nke dịịrị ya.
6 Lofundiswa ilizwi kahlanganyele ezintweni zonke ezinhle lalowo ofundisayo.
Ka onye a na-akụziri okwu ahụ jisie ike ka ya na onye nkuzi ya na-ekekọ ezi ihe niile.
7 Lingakhohliswa, uNkulunkulu kahlekwa usulu; ngoba loba yini ayihlanyelayo umuntu yiyo leyo azayivuna.
Unu ekwela ka e duhie unu, nʼihi na mmadụ ọbụla apụghị ịkwa Chineke emo. Mkpụrụ ọbụla mmadụ kụrụ ka ọ na-aghọrọ.
8 Ngoba ohlanyela kweyakhe inyama, uzavuna ukubhubha kuvela enyameni; kodwa ohlanyela kuMoya uzavuna impilo elaphakade ivela kuMoya. (aiōnios )
Ọ bụrụ na mmadụ akụọ mkpụrụ nke anụ ahụ, ọ ga-esikwa nʼanụ ahụ ghọta mmebi, ma ọ bụrụ na mmadụ akụọ mkpụrụ nke Mmụọ, ọ ga-esitekwa na Mmụọ ghọta ndụ ebighị ebi. (aiōnios )
9 Kodwa kasingadinwa ekwenzeni okuhle; ngoba ngesikhathi esifaneleyo sizavuna, uba singadinwanga.
Ya mere, ka ike ghara ịgwụ anyị ime ihe ọma. Nʼihi na mgbe e mesiri, mgbe oge ya ruru, anyị ga-eweta ngọzị dị ukwuu dị ka ihe ubi, ma ọ bụrụ na anyị adaghị mba.
10 Ngakho-ke njengoba silethuba, asenze okuhle kubo bonke, kodwa ikakhulu kwabendlu yokholo.
Nʼihi nke a, mgbe anyị nwere oghere ka anyị na-emere mmadụ niile ihe ọma, ọkachasị nʼebe ndị ezinaụlọ nke okwukwe anyị nọ.
11 Bonani amabala amakhulu kangaka engilibhalela ngawo ngesami isandla.
Leenu otu mkpụrụ akwụkwọ m ji aka m dee nʼakwụkwọ ozi a si gbaa okpotokpo.
12 Bonke abafuna ukubukeka enyameni, yibo abalicindezela ukuthi lisokwe, kuphela ukuze bangazingelwa ngenxa yesiphambano sikaKristu.
Ọ bụ ndị na-achọ ka a hụ ha nʼanụ ahụ, bụ ndị ga-amanye unu ka e bie unu ugwu, naanị ihe ha ji eme otu a bụ ka a ghara ịkpagbu ha nʼihi obe Kraịst.
13 Ngoba ngitsho lalabo abasokwayo kabawugcini umlayo, kodwa bafuna ukuthi lisokwe, ukuze bazincome enyameni yenu.
Ọ bụladị ndị kwere ka e bie ha ugwu, anaghị edebe iwu, kama ha chọrọ ka e bie unu ugwu ka ha nwee ike jiri ya nyaa isi nʼanụ ahụ.
14 Kodwa kimi kakungabi khona ukuzincoma ngaphandle kwesiphambanweni seNkosi yethu uJesu Kristu, okubethelwe ngaso umhlaba kimi, lami kuwo umhlaba.
Ka m gharakwa ịnya isi nʼihe ọbụla karịakwa nʼobe Onyenwe anyị Jisọs Kraịst. Nke e sitere na ya kpọgbuo ụwa nʼebe m nọ, ma kpọgbukwaa mụ onwe m nʼebe ụwa nọ.
15 Ngoba kuKristu Jesu ukusoka kakusizi lutho, kumbe ukungasoki, kodwa isidalwa esitsha.
Obibi ugwu abụghị ihe, ebighị ugwu abụghịkwa ihe, kama ị bụ onye e kere ọhụrụ bụ ihe dị mkpa.
16 Njalo bonke abazahamba ngalesisimiso, ukuthula kakube phezu kwabo, lesihawu, laphezu kukaIsrayeli kaNkulunkulu.
Ka udo na ebere dịnyere ndị niile na-ebi ndụ ha nʼusoro a, dakwasịkwa unu Izrel nke Chineke.
17 Kusukela khathesi, kakungabi lamuntu ongihluphayo; ngoba mina ngithwele emzimbeni wami impawu zeNkosi uJesu.
Site ugbu a gaa nʼihu, achọghị m ka onye ọbụla nye ndụ m nsogbu, nʼihi na-ebu m apa nke Jisọs nʼahụ m.
18 Umusa weNkosi yethu uJesu Kristu kawube lomoya wenu, bazalwane. Ameni.
Ụmụnna m, ka amara Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịnyere mmụọ unu. Amen.