< UHezekheli 31 >
1 Kwasekusithi ngomnyaka wetshumi lanye, ngenyanga yesithathu, ngolokuqala lwenyanga, ilizwi leNkosi lafika kimi, lisithi:
O ruo, nʼafọ nke iri na otu, nʼọnwa nke atọ, nʼụbọchị nke mbụ ya, okwu nke Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
2 Ndodana yomuntu, tshono kuFaro inkosi yeGibhithe lexukwini lakhe: Ufanana lobani ebukhulwini bakho?
“Nwa nke mmadụ, gwa Fero eze Ijipt na ndị agha ya niile okwu sị ha, “‘Olee onye ahụ yiri gị nʼịdị ukwuu?
3 Khangela, iAsiriya yayingumsedari eLebhanoni, omuhle ngengatsha, njengegusu elilomthunzi, njalo umude ngokuphakama, lesihloko sawo sasiphakathi kwengatsha eziqatha.
Tulee nʼobi gị ihe gbasara Asịrịa, nke bụ oke obodo bụrụkwa mba a maara aha ya. Ọ dị ka osisi sida nke Lebanọn, nke jupụtara nʼalaka mara mma, nke ọtụtụ alaka ya na-enye ndo, nke dị ezi ogologo, nke alaka ọnụ ya topụrụ tokarịa osisi ọhịa niile.
4 Amanzi awukhulisa, inziki yawuphakamisa, imifula yawo yageleza yazingelezela indawo ohlanyelwe kiyo, wakhuphela izifudlana zawo kuzo zonke izihlahla zeganga.
O nwetara mmiri mere ka o buo ibu, na isi iyi mmiri miri emi nke mere ka o too ogologo. Iyi ha niile na-asọ nʼokpuru ya. Ebe ahụ ka ha si ezipu ụzọ mmiri ndị na-enye osisi ndị ọzọ dị nʼọhịa mmiri.
5 Ngakho-ke ubude bawo baphakama bedlula zonke izihlahla zeganga, lengatsha zawo zanda, lamahlumela awo aba made, ngenxa yamanzi amanengi, lapho uwaphumisa.
Nʼihi ya, o toro tokarịa osisi niile nʼogologo. Ngalaba ya bara ụba, alaka ya topụkwara ogologo nʼihi ịdị ukwuu nke mmiri ha na-enweta.
6 Lazo zonke izinyoni zamazulu zakha izidleke zazo ezingatsheni zawo, lenyamazana zonke zeganga zazalela ngaphansi kwengatsha zawo, langaphansi komthunzi wawo kwahlala izizwe zonke ezinkulu.
Nʼalaka ya niile ka anụ ufe niile nke eluigwe na-akpa akwụ, nʼokpuru ndo nke alaka ya niile ka ụmụ anụ ọhịa niile mụrụ ụmụ, oke mba niile dị iche iche bikwara nʼokpuru ndo ya.
7 Ngokunjalo wawumuhle ebukhulwini bawo, ebudeni bengatsha zawo; ngoba impande yawo yayingasemanzini amanengi.
Ọ mara mma nʼịdị ukwuu ya, nʼogologo nke alaka ya nʼawasa, nʼihi na mgbọrọgwụ ya mibara emiba nʼebe mmiri dị ukwuu.
8 Imisedari esivandeni sikaNkulunkulu yayingewufiphaze; izihlahla zamafiri zazingafanani lengatsha zawo; lezingelamaxolo zazingafanani lamahlumela awo; futhi kwakungekho sihlahla esivandeni sikaNkulunkulu esinjengawo ebuhleni bawo.
Osisi sida niile dị nʼubi Chineke a gbara ogige erughị ya nʼọtụtụ. Ọ dịghị osisi junipa niile nwere ngalaba a ga-eji tụnyere nke ya, osisi plenụ niile adịghịkwa ka alaka ya, ọ dịghịkwa osisi dị nʼubi Chineke a gbara ogige, nke yiri ya nʼịma mma ya
9 Ngawenza waba muhle ngobunengi bezingatsha zawo, kwaze kwathi zonke izihlahla zeEdeni, ezazisesivandeni sikaNkulunkulu, zaba lomhawu ngawo.
Emere m ya ka ọ maa mma site nʼịba ụba nke alaka o nwere, ọ bụ ihe ekworo nye osisi niile nọ nʼIden nʼubi Chineke a gbara ogige.
10 Ngakho itsho njalo iNkosi uJehova: Ngenxa yokuthi uziphakamisile ngobude, uthutshise isihloko sawo ngaphakathi kwezingatsha eziqatha, lenhliziyo yawo yaziphakamisa ngobude bawo;
“‘Nʼihi ya, ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Nʼihi na o toro ogologo tokarịa osisi ọhịa niile, nʼihi na ọ nyara isi banyere ọnọdụ ịdị ogologo ya karịa ndị ọzọ,
11 ngakho ngizawunikela esandleni solamandla wezizweni; uzakwenza lokwenza lawo; ngiwuxotshile ngenxa yenkohlakalo yawo.
Eweere m ya nyefee nʼaka onye ahụ na-achị mba niile, ka o mesie ya ike, dịka ịba ụba nke ajọ omume ya si dị. Ewezugakwara m ya nʼakụkụ.
12 Njalo abemzini, abesabekayo bezizwe, bawuqumile bawutshiya; lengatsha zawo ziwele ezintabeni lakuzo zonke izihotsha; lamahlumela akhe ephulwe kuyo yonke imifula yelizwe; labo bonke abantu bomhlaba behlile basuka emthunzini wawo, bawutshiya.
Mba ahụ kachasị mba niile njọ na-enweghị obi ebere gbuturu ya, hapụ ya ka ọ tọgbọrọ nʼala. Ngalaba ya dara nʼelu ugwu ukwu niile nakwa nʼime ndagwurugwu niile. Alaka ya kwa dajisịrị danyesịa nʼime ebe niile gbawara agbawa nke ala mmiri si eru. Mba niile nke ụwa sitere nʼokpuru ndo ya pụta wezuga onwe ha.
13 Zonke inyoni zamazulu zizahlala phezu kwencithakalo yawo, lazo zonke inyamazana zeganga zizakuba phezu kwengatsha zawo.
Ụmụ nnụnụ niile bere nʼelu ukwu osisi ahụ dara ada, nʼetiti alaka ya niile ka ụmụ anụ ọhịa bịara biri.
14 Ukuze kungabi khona kuzo zonke izihlahla ngasemanzini eziziphakamisayo ngenxa yobude bazo, futhi zingafuqi isihloko sazo ngaphakathi kwezingatsha eziqatha, futhi zingemi ngokwazo ngobude bazo, zonke ezinatha amanzi; ngoba zonke zinikelwe ekufeni endaweni engaphansi yomhlaba, phakathi kwabantwana babantu, kulabo abehlela egodini.
Ya mere, ka osisi niile nke dị nʼakụkụ mmiri gharakwa eto ogologo, maọbụ ka ọnụ ọnụ ya ghakwara ịdị elu karịa alaka ndị ahụ bara ụba. Nyekwa na ọ dịkwaghị osisi ọbụla na-enwetazu mmiri nke ga-etoru osisi ndị ahụ nʼogologo. Nʼihi na edebela ha nye ọnwụ, nye ịrịdaru nʼokpuru ụwa, nʼetiti ndị mmadụ ndị na-arịda nʼolulu omimi ahụ.
15 Itsho njalo iNkosi uJehova: Mhla usehlela engcwabeni ngenza isililo, ngasibekela inziki ngenxa yawo, ngavimba izifula zayo, lamanzi amanengi amiswa; ngenza iLebhanoni ibe mnyama ngenxa yawo, lezihlahla zonke zeganga zabuna ngenxa yawo. (Sheol )
“‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Nʼụbọchị ahụ e mere ka ọ rịdaruo nʼala mmụọ, a kwụsịrị m ogbu mmiri niile were ha kpuchie ya. A kwụsịrị nsọgharị nke mmiri, meekwa ka ịba ụba nke mmiri ya niile kwụsị. Nʼihi ya, eyinyere m Lebanọn uwe mkpe, osisi niile nke ọhịa kpọnwụkwara nʼihi ya. (Sheol )
16 Ngenza izizwe zithuthumele ngomdumo wokuwa kwawo, lapho ngiwehlisela esihogweni lalabo abehlela egodini; lazo zonke izihlahla zeEdeni, ikhethelo lokuhle kweLebhanoni, zonke ezinatha amanzi, zaziduduza endaweni engaphansi yomhlaba. (Sheol )
Emere m ka mba niile maa jijiji nʼegwu nʼihi ọdịda ya, mgbe m tụnyere ya na ndị ahụ na-aga nʼolulu nʼime ala mmụọ. Mgbe ahụ, a kasịrị osisi niile mara mma obi, bụ osisi ndị ahụ dị nʼogige Iden, na osisi ọma niile nke Lebanọn, ndị nke mgbọrọgwụ ha na-enweta mmiri nke ọma. (Sheol )
17 Lazo zehlela esihogweni kanye lawo, kulabo ababebulewe ngenkemba; lababeyingalo yawo ababehlala ngaphansi komthunzi wawo phakathi kwezizwe. (Sheol )
Ha onwe ha kwa, dịka sida ukwuu ahụ, sokwaara gbadaruo nʼala mmụọ, gakwuru ndị niile eji mma agha gbuo, ha na ndị ikom ji mma agha bụ ndị biri nʼokpuru ndo ya nʼetiti mba dị iche iche. (Sheol )
18 Ufanana lobani ngokunjalo ngodumo langobukhulu phakathi kwezihlahla zeEdeni? Kanti uzakwehliselwa kanye lezihlahla zeEdeni endaweni engaphansi yomhlaba, ulale phakathi kwabangasokanga, kanye labo ababulewe ngenkemba. Lo nguFaro lexuku lakhe lonke, itsho iNkosi uJehova.
“‘Olee osisi dị nʼIden a ga-eji tụnyere gị nʼịma mma, na nʼịdị ebube? Ma gị onwe gị kwa, na osisi ndị a niile dị nʼIden ka a ga-eme ka unu rịdaruo nʼokpuru ụwa. Ị ga-edina nʼetiti ndị a na-ebighị ugwu, gị na ndị eji mma agha gbuo. “‘Nke a bụ Fero na usuu ndị agha ya niile, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.’”